Akwụkwọ nsọ
Jarọm 1


Akwụkwọ nke Jarọm

Isi 1

Ndị Nifaị na-edebe iwu nke Moses, na-ele anya ọbịbịa nke Kraịst, ma na-eme nke ọma n’ime ala ahụ—Ọtụtụ ndị-amụma rụrụ ọrụ idebe ndị mmadụ n’ụzọ nke ezi-okwu. Ihe dịka n’afọ 399 ruo 361 tutu amụọ Kraịst.

1 Ugbua lee, mụ, Jarọm, na-ede okwu ole na ole dịka iwu nke nna m, Inọs siri dị, ka e wee debe aakụkọ-agbụrụ anyị.

2 Ma dịka aepekele ndị a dị bntakịrị, ma dịka ihe ndị a nile ka e cdere maka nzube nke irite uru nke ụmụnne anyị dndị Leman, ya mere, ọ dịrịrị mkpa na m ga-ede ntakịrị; mana a gaghị m ede ihe ndị nke ibu-amụma m, ma-ọbụ nke mkpughe m nile. N’ihi na gịnị ka m ga-ede karịa nke ndị nna m ha deworo? N’ihi na ọbụ na ha ekpugheghị atụmatụ nke nzọpụta? A sị m unu, E; ma nke a ezuworo m.

3 Lee, ọ dị mkpa na a ga-arụ nnukwu ọrụ n’etiti ndị a, n’ihi isi-ike nke obi ha nile, na anụghị-ihe nke ntị ha nile, na ikpu-isi nke echiche ha nile, na aịkpọ-nkụ nke ekwe ha nile; otu o sila dị, Chineke dị ebere karịa n’ebe ha nọ, ma ruo n’oge a ọ bzachapụbeghị ha site n’elu iru nke ala ahụ.

4 Ma e nwere ọtụtụ n’etiti anyị ndị nwere ọtụtụ amkpughe, n’ihi na ha nile adịghị akpọ-ekwe-nkụ. Ma ka ha ra bụ ndị na adịghị akpọ-ekwe-nkụ ma nwee okwukwe, nwere bmmekọrịta ha na Mụọ Nsọ, nke na-ekpughere ụmụ nke mmadụ, dịka okwukwe ha siri dị.

5 Ma ugbua, lee, narị afọ abụọ agafewọrịị, ma ndị nke Nifaị na-agbasi ike n’ala ahụ. Ha na-ejisike an’idebe iwu nke Moses na bụbọchị izu-ike nsọ nye Onye-nwe. Ma ha cekwuhieghị; ọbụghị ma ha dkwutọrọ. Ma iwu nile nke ala ahụ siri ike karịa.

6 Ma ha gbasasịrị na nnukwu ebe nke iru nke ala ahụ, ma ndị Leman kwa. Ma ha ka n’ọnụ ọgụgụ karịa ka ha ra bụ ndị nke Nifaị; ma ha hụrụ aigbu mmadụ n’anya ma ha na-an̄ụ ọbara nke ụmụ anụ-ọhịa.

7 Ma o wee ruo na ha bịara ọtụtụ oge imegide anyị, ndị Nifaị, n’agha. Ma na andị eze anyị nile na ndị ndu anyị nile bụ ndị dike n’ime okwukwe nke Onye-nwe; ma ha kuziri ndị ahụ ụzọ nile nke Onye-nwe; ya mere, anyị guzogidere ndị Leman ma zachapụ ha site bn’ala anyị nile, ma malite iwusi obodo-ukwu anyị nile ike, ma-ọbụ ebe nile ọbụla nke nketa anyị.

8 Ma anyị mụbara karịa, ma gbasasịa n’elu iru nke ala ahụ, ma baa ụba karịa n’ọla-edo, na ọla-ọcha, na n’ihe nile dị oke-ọnụ-ahịa, ma n’ọmarịcha ọrụ-aka nke osisi, n’iwu ụlọ, na n’igwe-ọrụ, na kwa n’igwe na ọla-kọpa, na bras na igwe, na-eme ụdị ngwa-ọrụ nile n’ụdị ọbụla iji kọọ ala, ma angwa-ọgụ nile nke agha—e, arọ pịrị ọnụ nkọ, na ọbọ arọ, na ube-nta ọnụ gịrị-gịrị, na ube dị mfe ntụpụ na njikere nile maka agha.

9 Ma otu a ka anyị dị na njikere izute ndị Leman, ha emeghị nke ọma n’imegide anyị. Ma okwu nke Onye-nwe ka a chọpụtara n’ezi okwu, nke ọ gwara ndị nna anyị ha, na-asị na: Ọbụrụraa na unu ga-edebe iwu-nsọ m nile unu ga-eme nke ọma n’ala ahụ.

10 Ma o wee ruo na ndị-amụma nile nke Onye-nwe majara ndị nke Nifaị, dịka okwu Chineke siri dị, na ọbụrụ na ha edebeghị iwu-nsọ nile ahụ, ma daba n’ime njehie, a aga-ebibi ha site n’iru nke ala ahụ.

11 Ya mere, ndị-amụma nile, na ndị nchụ-aja nile, na ndị nkuzi nile, gbalịsiri ike, na-agba ndị ha ume site n’ogologo-ntachị obi ka ha nwee mgbalị; na-akụzi aiwu nke Moses, na nzube nke e jiri nye ya; na-agba ha ume bile anya chee Mesaịa iru, ma kwere na ya ịbịa cka a ga-asị na ọ bịaworịị. Ma otu a ka ha siri na akụziri ha.

12 Ma o wee ruo na site n’ime otu a ha debere ha site n’ịbụ ndị aebibiri n’iru nke ala ahụ; n’ihi na ha mere ka ha btaa onwe ha ụta site n’okwu ahụ, na-esepụghị aka na-akpalite ha ichegharị.

13 Ma o wee ruo na narị afọ abụọ na iri afọ atọ na afọ asatọ agafewọrịị—site n’ụdị agha nile, na ndọrọ-ndọrọ nile na nghọtahịe nile, ruo na ohere nke nnukwu oge.

14 Ma mụ, Jarọm, anaghị ede karịa, n’ihi na epekele ndị ahụ dị ntakịrị. Ma lee, ụmụnne m nwoke, unu nwere ike ịga an’epekele ndị ọzọ nke Nifaị; n’ihi na lee, n’elu ha ka a kanyere akụkọ-ndekọta nile maka agha anyị nile, dịka odide nile nke ndị eze, ma-ọbụ ndị nke ha mere ka e depụta.

15 Ma a na m e nyefee epekele ndị a n’aka nwa m nwoke, Ọmnaị, ka e debe ha dịka aiwu nile nke ndị nna m ha siri dị.