Akwụkwọ nsọ
Ọmnaị 1


Akwụkwọ nke Ọmnaị

Isi 1

Ọmnaị, Amarọn, Kemịsh, Abinadọm, Amalakaị, nke ọbụla mgbe o ruru ya, na edebe akụkọ-ndekọta nile—Mosaịa wee chọpụta ndị Zarahemla, ndị sitere Jerusalem bịa n’ụbọchị nile nke Zedekaịa—Mosaịa ka e mere eze ha—Ndị agbụrụ Miulek bi na Zarahemla achọpụtawọrịị Koriantamọ, nke ikpe-azụ na ndị Jared—Eze Benjamịn wee sotebe Mosaịa—Ndị mmadụ kwesịrị inye mkpụrụ-obi ha dịka onyinye nye Kraịst. Ihe dịka n’afọ 323 ruo 130 tutu amụọ Kraịst.

1 Lee, o wee ruo na mụ, Ọmnaị, ebe m nwetaworo iwu site n’aka nna m, Jarọm, na m ga-ede ihe ole na ole n’elu epekele ndị a, idokwa akụkọ-agbụrụ anyị.

2 Ya mere, n’ụbọchị m nile, Ọ dị m ka unu mata na a lụrụ m nnukwu ọgụ jiri mma-agha ichekwa ndị m, ndị Nifaị, site n’ịdaba n’aka ndị iro ha, ndị Leman. Ma lee, mụ n’onwe m bụ ajọọ-mmadụ, ma edebeghị m iwu e dere ede na iwu-nsọ nile nke Onye-nwe dịka m kwesịrị ime.

3 Ma o wee ruo na narị afọ abụọ na iri afọ asaa na isii agafeworịị, ma anyị nwere ọtụtụ oge nke udo; ma anyị nwere ọtụtụ oge nke agha dị mkpa na mkwafu-ọbara. E, ma na mkpirisi, narị afọ abụọ na iri afọ asatọ na abụọ agafewọrịị, ma e debewo m epekele ndị a dịka aiwu-nsọ nile nke nna m ha siri dị; ma e nyefere m ha n’aka nwa m nwoke Amarọn. Ma a na m akwụsị n’ebe a.

4 Ma ugbua mụ, Amarọn, na-ede ihe ndị a ihe ọbụla nke m dere, dị ole na ole, n’ime akwụkwọ nke nna m.

5 Lee, o wee ruo na narị afọ atọ na iri afọ abụọ agafewọrịị, na mpaghara kacha n’omume ọjọọ na ndị Nifaị ka e abibiri.

6 N’ihi na Onye-nwe agaghị ekwe, mgbe o dupụtaworo ha site n’ala Jerusalem ma debe ma chekwaa ha site n’ịdaba n’aka ndị iro ha, e, ọ gaghị ekwe na okwu ahụ nile agaghị abụ ihe na-akwadoghị, nke ọ gwara nna anyị ha, na-asị na: Ọbụrụraa na unu agaghị edebe iwu-nsọ m nile unu agaghị eme nke ọma n’ala ahụ.

7 Ya mere, Onye-nwe letara ha na nnukwu ikpe, otu o sila dị, O debere ndị-ezi-omume ka ha ghara ịla n’iyi, ma na ọ napụtara ha site n’aka ndị iro ha.

8 Ma o wee ruo na e nyefere m epekele ndị ahụ n’aka nwanne m nwoke Kemịsh.

9 Ugbua mụ, Kemịsh, na-ede ihe ole na ole m na-ede, n’ime otu akwụkwọ ahụ mụ na nwanne m nwoke; n’ihi na lee, a hụrụ m nke ikpe-azụ nke o dere, na o dere ya n’aka nke ya; ma o dere ya n’ụbọchị ahụ nke o nyefere ha n’aka m. Ma n’ụdị dị otu a ka anyị na-edebe akụkọ-ndekọta nile, n’ihi na ọ bụ dịka iwu-nsọ nile nke nna anyị ha siri dị. Ma a na m akwụsị n’ebe a.

10 Lee, mụ, Abinadọm, abụ m nwa nwoke nke Kemịsh. Lee, o wee ruo na a hụrụ m agha hie nne na ndọrọ-ndọrọ n’etiti ndị m, ndị Nifaị, na ndị Leman; ma mụ, na mma-agha nke m, ewerewo ndụ nke ọtụtụ ndị Leman n’ime nchedo nke ụmụnne m nwoke.

11 Ma lee, akụkọ-ndekọta nke ndị a ka a kanyere n’elu epekele nke dị n’aka ndị eze, dịka ọgbọ nile siri dị; ma a mataghị m maka mkpughe ọbụla ma ọbụghị nke ahụ e deworo, ọbụghị ma-ọbụ ibu-amụma; ya mere, nke ahụ zuworo ka e deworo. Ma a na m akwụsị n’ebe a.

12 Lee, abụ m Amalakaị, nwa nwoke nke Abịnadọm. Lee, a ga m agwa unu okwu di an̄aa gbasara Mosaịa, onye e mere eze n’ala Zarahemla; n’ihi na lee, ya ebe adoworo ya aka na ntị site n’aka Onye-nwe na ọ ga-agbapụ site n’ala nke aNifaị, ma ndị nile ga-an̄a ntị n’olu Onye-nwe bga-apụ kwa site n’ala ahụ soro ya baa n’ime ọzara ahụ—

13 Ma o wee ruo na o mere dịka Onye-nwe nyeworo ya iwu. Ma ha pụrụ site n’ala ahụ gbaba n’ime ọzara, ndị nile nwere ike n̄aa ntị n’ọlụ Onye-nwe; ma a na-edu ha site n’ọtụtụ nkwusa ozi-ọma na ibu amụma. Ma a dọrọ ha aka na ntị na-esepụghị aka site n’okwu Chineke; ma a na-edu ha site n’ike nke aka ya, gafee ọzara ahụ, wee ruo mgbe ha bịaruru n’ime ala ahụ nke a na-akpọ ala nke Zarahemla.

14 Ma ha chọpụtara ndị mmadụ, ndị a na-akpọ ndị nke aZarahemla. Ugbua e nwere nnukwu in̄uri ọn̄ụ n’etiti ndị nke Zarahemla; na kwa Zarahemla n̄ụrị kwara ọn̄ụ karịa, n’ihi na Onye-nwe ezitawo ndị nke Mosaịa ji bepekele nke bras nke ihe dị n’ime ya bụ akụkọ-ndekọta nke ndị Juu.

15 Lee, o wee ruo na Mosaịa chọpụtara na andị Zarahemla sitere na Jerusalem pụta n’oge ahụ bZedekaịa, eze nke Juda, e bupụrụ ya na ndọkpụ n’agha baa n’ime Babịlọn.

16 Ma ha gara njem n’ime ọzara ahụ, ma a kpọtara ha site n’aka nke Onye-nwe gafee nnukwu mmiri nile ahụ, baa n’ime ala ahụ ebe Mosaịa chọpụtara ha; ma ha ebiwọrịị n’ebe ahụ site n’oge ahụ gaa n’iru.

17 Ma n’oge ahụ Mosaịa chọpụtara ha, ha adịworịị imerime n’ọnụ-ọgụgụ karịa. Otu o sila dị, ha enwewọrịị ọtụtụ agha na ndọrọ-ndọrọ dị mkpa, ma ha adawokwarịị site na mma agha site n’oge ruo n’oge; ma asụsụ ha agwawala ọgwa; ma ha ewetaghị aakụkọ-ndekọta nile ọbụla, ma ha gọnarịrị ọnọdụ nke Onye-okike ha; ma Mosaịa, ma ọbụladị ndị nke Mosaịa, enweghị ike ịghọta ha.

18 Ma na o wee ruo na Mosaịa mere ka a kuziere ha ihe n’asụsụ ya. Ma o wee ruo na mgbe a kụziworo ha ihe n’asụsụ nke Mosaịa, Zarahemla nyere akụkọ-agbụrụ nke ndị nna ya, dịka o siri cheta; ma e dere ha, ma ọbụghị n’epekele ndị a.

19 Ma o wee ruo na ndị Zarahemla, na ndị Mosaịa, ajikọtara onwe ha; ma bMosaịa ka ahọpụtara ka ọ bụrụ eze ha.

20 Ma o wee ruo n’ụbọchị nke Mosaịa, o nwere nnukwu okwute e wetaara ya nke nwere ihe ndị a kanyere n’elu ya; ma ọ asụgharịrị asụsụ ihe nkanye ndị ahụ site n’onyinye na ike nke Chineke.

21 Ma ha nyere nkọwasị ihe banyere otu aKoriantamọ, na ogbugbu nke ndị ya. Ma Koriantamọ ka a chọpụtara site n’aka ndị Zarahemla; ma o binyeere ha ruo ọnwa iteghete.

22 O kwukwara okwu ole na ole gbasara ndị nna ya ha. Ma nne na nna mbụ ya bịara site an’ụlọ elu tọwa ahụ, n’oge ahụ Onye-nwe wetara bmgbagwọjụ anya n’asụsụ nke ndị mmadụ ahụ; ma imesi-ike nke Onye-nwe wee dakwasị ha dịka ikpe Ya nile siri dị, bụ nke zịrị-ezi; ma cọkpụkpụ ha nile dịna ma gbasasịa n’ala nke di n’elu elu.

23 Lee, mụ, Amalakaị, ka a mụrụ n’ụbọchị ndị nke Mosaịa; ma e biwo m wee hụ ọnwụ ya; ma aBenjamịn, nwa ya nwoke, na-achị n’ọnọdụ ya.

24 Ma lee, a hụwo m, n’ụbọchị nke eze Benjamịn, agha siri ike na nnukwu ịkwafu ọbara n’etiti ndị Nifaị na ndị Leman. Ma lee, ndị Nifaị nwetara nnukwu uru karịa ha; e, nke mere na eze Benjamịn chụpụrụ ha site n’ala Zarahemla.

25 Ma o wee ruo na a malitere m ịka-nka; ma, ebe m na-enweghị mkpụrụ-afọ, ma, ebe m matara eze aBenjamịn na ọ bụ onye ezi-omume n’iru Onye-nwe, ya mere, a ga m benye ya epekele ndị a, na-agba mmadụ nile ume ka ha bịakwute Chineke, Onye-Nsọ nke Israel, ma kwere n’ibu-amụma, na mkpughe nile, na n’nkwusa ozi nke ndị mụọ-ozi, na n’onyinye nke ikwu n’asụsụ dị iche iche, na n’onyinye nke ịsụgharị asụsụ dị iche iche, na n’ihe nile ndị dị cmma; n’ihi na ọdịghị ihe ọbụla dị mma ma ọbụghị na o sitere n’aka Onye-nwe bịa; ma nke ahụ bụ ihe ọjọọ sitere n’aka ekwensu bịa.

26 Ma ugbua, ụmụnne m nwoke m hụrụ n’anya, ọ dị m ka unu abịakwute Kraịst, onye bụ Onye-Nsọ nke Israel, ma keta oke na nzọpụta ya, na ike nke mgbapụta ya. E, bịakwute ya, ma bnye mkpụrụ-obi unu nile dịka cihe-onyinye nye ya, ma ga n’iru dn’ibu ọnụ na ikpe-ekpere, ma nọgide ruo ọgwụgwụ; ma ebe ọbụ na Onye-nwe na-adị ndụ a ga-azọpụta unu.

27 Ma ugbua a ga m ekwutu ihe ole na ole gbasara ọnụ-ọgụgụ ndị nke gbagoro n’ime ọzara ahụ ịlaghachi ala nke Nifaị; n’ihi na e nwere ndị bara ụba n’ọnụ-ọgụgụ ndị chọsịrị ike inwere ala nke nketa ha.

28 Ya mere, ha gbagoro n’ime ọzara ahụ. Ma onye-ndu ha ebe ọ bụ onye gbasiri ike na dike, na onye na-akpọ ekwe-nkụ, ya mere o butere ndọrọ-ndọrọ n’etiti ha; ma ha nile ka e agbusịrị, ma ọbụghị iri ise, n’ime ọzara, ma ha laghachịrị ọzọ n’ala nke Zarahemla.

29 Ma o wee ruo na ha kpọọrọ kwara ndị ọzọ batụrụ ụba n’ọnụ-ọgụgụ, ma were njem ha ọzọ n’ime ọzara ahụ.

30 Ma mụ, Amalakaị, nwere nwanne nwoke, onye nke sokwara ha gaa; ma ke mgbe ahụ, amataghị m ihe gbasara ha. Ma ọ fọdụrụ nwantịntị ka m dina ala n’ime ili m; ma aepekele ndị a ejuwo. Ma abịa m na ngwụcha nke ikwu okwu m.