2018
Dịka Anyị Na-Agakọrịta-ọnụ N’ihu
April 2018


Ozi nke otu Ndị-Isi-Nduzi Mbụ Ọnwa Eprel 2018

Dịka Anyị Na-Agakọrịta-ọnụ N’ihu

Ezigbo ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị, e ji m obi umeala na anọnyere ụnụ n’ụtụtụ a. Ụbọchi anọ gara aga anyị liri n’ezumike nnukwu nwoke, onye-amụma nke Chineke—Onye-isi-nduzi Thomas S. Monson. Enweghị okwu ndị nwere ike iwete ikpe ziri ezi nye ịdị ukwu na ịma mma nye ndụ ya. A ga m eji enyị anyị kpọrọ ihe n’obi ekele maka ihe ọ kuziri m. Ugbua anyị ga rịrị ele anya n’ihu ruo ọganihu site n’okwukwe n’ime Onye-nwe-anyị Jisọs Kraịst, onye Nzukọ-nsọ nke a bụ nke Ya.

Ụbọchi abụọ gara aga Ndị-Ozi niile dị ndụ zukọtara n’ime ọnụ-ụlọ dị n’elu nke Tempụl Salt Lake. Ebe ahụ ha mere mkpebi siri ike, na mbụ, ịhazigharị Ndị-isi-nduzi Mbụ ugbua na, abụọ, na m ga-eje ozi dịka Onye-isi-nduzi nke Nzukọ-nsọ. Enweghị okwu zuru-ezu igwa gị ihe ọ dịirị ka inwe Ụmụnnem ndị Nwoke—Ụmụnnem ndị Nwoke ndị ji ọtụghe niile nke ọkwa-nchụ-aja eweghachitere site na Onye-Amụma Josef Smith n’ọgbọ nke a—tụkwasị aka ha n’elu isi m ichi m echichi ma dopụ m iche dịka Onye-isi-nduzi nke Nzukọ-nsọ. Ọ bụụrụ ahụmahụ dị nsọ ma dịrị umeala.

Ọ bụziri oke na ọrụ m imata ndị Onye-nwe-anyị kwadoworo I bụ ndị ndụmọdụ m. Kedụ otu m si ahọrọ nanị Ndị-Ozi abụọ n’ime iri-na-abụọ ndị ọzọ, ndị m hụrụ na anya nke ukwuu n’otu n’otu? E jupụtara m n’obi ekele n’ebe Onye-nwe-anyị nọ maka iza ekpere m dị ike. E jupụtara m n’ekele na Onye-isi-nduzi Dallin Harris Oaks na Onye-isi-nduzi Henry Bennion Eyring dịrị na njikere isoro m jee ozi dịka Ndị Ndụmọdụ Mbụ na Abụọ, n’otu n’otu. Onye-isi-nduzi Dieter F. Uchtdorf amalitegharịwo n’ọnọdụ ya n’ime Kworum Ndị-Ozi Iri-na-abụọ. O nweteworịị ọrụ ndị dị mkpa nke ọ toruru n’ụzọ pụrụ iche.

A na m akwanyere ya ugwu na kwa Onye-isi-nduzi Eyring maka ozi ha mara mma nke ukwu dịka ndị ndụmọdụ nye Onye-isi-nduzi Monson. Ha adịrịwo ike kpam kpam, dịrị uchu, ma nwee uche si n’ike mụọ nsọ. Anyị jupụtara n’obi ekele n’ihi ha. Onye ọbụla n’ime ha dị na njikere ije-ozi ugbua n’ebe enwere mkpa ya karịchaa.

Dịka Onye-ozi nke abụọ n’igba agadị, Onye-isi-nduzi Oaks bịakwara bụrụ Onye-isi-nduzi nke Kworum nke Ndị-Ozi Iri-na-abụọ. Otu-o-sila dị, n’ihi ọkpụkpọ-oku ya n’ime otu Ndị-isi-nduzi Mbụ na agbanweghị agbanwe site n’usoro nke Nzukọ-nsọ, Onye-isi-nduzi M. Russell Ballard, n’esote n’igba agadi, ga eje-ozi dịka Onye-nnọchite Onye-isi-nduzi nke Kworum ahụ. Ndị-isi-nduzi Mbụ ga-arụ-ọrụ aka na aka ha na ndị Iri-na-abụọ iji mata uche nke Onye-nwe-anyị ma mee ka ọrụ Ya dị nsọ na-aga n’ihu.

Anyị jupụtara n’obi ekele maka ekpere unu. Enyewo ha site na gburugburu ụwa maka anyị. N’ụtụtụ sotere ọnwụ Onye-isi-nduzi Monson, otu ụdị ekpere ka otu nwantakịrị nwoke gbara afọ anọ aha ya bụ Benson kpere. A na m ekwupụta okwu sitere n’ozi-akwụkwọ nne ya degara nye nwunye m, Wendy. Benson kpere ekpere, Nna nke Eluigwe, I meela na Onye-isi-nduzi Thomas S. Monson nwere ike ịhụ nwunye ya ọzọ. I meela maka onye-amụma anyị ọhụụ. Nyere ya aka inwe obi siri-ike ma na-atụghị egwu na ya dị ọhụụ. Nyere ya aka itolite etolite inwe ahụ-isi-ike ma dịrị ike. Nyere ya aka inwe ike n’ihi na o nwere ọkwa-nchụ-aja. Ma nyere anyị aka inwe agwa ọma mgbe niile.”

A na m ekele Chineke maka ụmụntakịrị dị otu a na maka ndị nne na nna ndị ji nkwa ịzụ-ụmụ site n’ezi-omume, ịkpachapụ-anya ji kpọrọ ihe—maka nne na nna niile, onye-nkuzi, na onye-otu onye n’eburu ibu-arọ niile ma n’agbanyeghị jiri obi ya jee-ozi. Ya pụtara, maka onye ọbụla n’ime unu, e ji m umeala n’ejupụta n’ekele.

Onye-nwe-anyị nọ N’isi

Dịka anyị na-agakọrịta n’ịhụ, a na m akpọku gị iche echiche gbasara ụzọ dị ebube nke Onye-nwe-anyị si achị Nzukọ-nsọ Ya. Mgbe otu Onye-isi-nduzi nke Nzukọ-nsọ nwụrụ anwụ, enweghị ihe omimi gbasara onye ga-esote aga-akpọ oku ije-ozi n’ọnọdụ ahụ. Enweghị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, enweghị ịchụ-nta mbịanye-aka, kama nanị ọrụ dị nwayọ nke atụmatụ nnọchi anya dị nsọ, etinyere site n’aka Onye-nwe-anyị N’Onwe Ya.

Ụbọchị ọbụla nke ije-ozi otu Onye-ozi bụ ụbọchi ihe ọmụmụ na nkwado maka oke-na-ọrụ ndị ọzọ dị n’ọdịnihu. Ọ na-ewe ọtụtụ iri afọ nke ije-ozi ime ka otu Onye-ozi site na oche nke obere galie n’oche nke agadi n’ime ogbo ahụ. N’ime oge ahụ, ọ na-enwete uche nke onwe n’aka ya n’ime akụkụ ọbụla nke ọrụ Nzukọ-nsọ. Ọ nakwa abịa matazie nke ọma ndị mmadụ nke ụwa, tinyekọtara akụkọ-ochie ha, omenaala ha, asụsụ ha dịka ọrụ na-akpọrọ ya mgbe na mgbe gafee ụwa. Ụzọ nnọchi-anya nke a n’ime ọchịchị nke Nzukọ-nsọ a pụrụ iche. Amaghị m maka ihe ọzọ dị otu a. Nke ahụ ekwesighị itụ anyị n’anya, n’ihi nke a bụ Nzukọ-nsọ nke Onye-nwe-anyị. Ọ naghị arụ-ọrụ site n’ụzọ nke mmadụ.

Ejewo m ozi n’ime Kworum nke Ndi-Ozi Iri-na-abụọ n’okpuru Ndị-isi-nduzi ise gara aga. Elewo m Onye-isi-nduzi ọbụla nata mkpughe ma zaghachi mkpughe ahụ. Onye-nwe-anyị enyewo mgbe niile ma ga na-enye ndị amụma Ya ndụmọdụ na mkwalite mụọ. Onye-nwe-anyị nọ n’isi. Anyị ndị echiworo echichi ikwupụta aka-ebe maka aha Ya dị nsọ gburugburu ụwa ga na-aga n’ihu ịchọ ịmata uche Ya ma soro ya.

Nọrọ n’Ụzọ ahụ

Ugbua, nye onye-otu ọbụla nke Nzukọ-nsọ a na m asị, nọrọ n’ụzọ nke ọgbụgba-ndụ. Mkpebi gị isoro Onye-nzọpụta site n’igba ọgbụgba-ndụ ha na Ya ma emesia n’edebe ọgbụgba-ndụ ndị ahụ ga-emepe ụzọ nke ngọzi ime mụọ niile na oghere-ọma dịrị ndị nwoke, ndị nwanyị, na ụmụntakịrị ebe niile.

Dịka Ndị-isi-nduzi ọhụụ, anyị chọrọ ibido site n’iburu ngwụcha n’obi. N’ihi ebumnuche nke a, anyị n’ekwuru unu taa site n’otu tempụl. Ngwụcha ahụ nke onye ọbụla n’ime anyị na-agbalị bụ iyenye ike n’ime ụlọ nke Onye-nwe-anyị, arachịkọta dịka ezi-na-ụlọ, jupụta n’okwukwe maka ọgbụgba-ndụ ndị emere n’ime otu tempụl nke na-eme anyị itoru maka onyinye nke Chineke kacha ibe Ya—nke bụ ndụ ebighị-ebi. Emume-nsọ niile nke tempụl na ọgbụgba-ndụ niile I na-eme ebe ahụ bụ ihe dị mkpa eji agba ndụ gị ume, alụm dị na nwunye gị, na ezi-na-ụlọ gị, na ike gị iji guzogịde agha niile nke onye-iro. Ofufe gị n’ime tempụl na ije-ozi gị n’ebe ahụ maka ndị nna nna nna gị ga eji mkpughe bara ụba nke onwe na udo gọzie gị, ma ga emezi nkwenye gị ịnọrọ n’ụzọ nke ọgbụgba-ndụ ahụ.

Ugbua, ọ bụrụ na I zọpụwo ụkwụ n’ụzọ ahụ, ka m jiri olile-anya niile dị n’ime obi m kpọkuo gị si biko laghachi azụ. Ihe ọbụla nke n’echegbu gị, ihe ọbụla bụ ihe aka mgba gị niile, enwere oghere nọọrọ gị n’ime n’ebe a, Nzukọ-nsọ nke Onye-nwe-anyị. Gị na ọgbọ niile nke ana amụbeghị ka aga agọzi site na omume gị niile ugbua ịlaghachi n’ụzọ nke ọgbụgba-ndụ ahụ. Nna anyị nke Eluigwe nwere mmasị n’ebe ụmụ Ya nọ, ma Ọ chọrọ ka onye ọbụla n’ime anyị laghachi n’ebe obibi Ya. Nke a bụ ebumnuche dị oke mkpa nke Nzukọ-nsọ nke Jisọs Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchi Ikpeazụ a—inyere onye ọbụla n’ime anyị aka ịlaghachi ebe obibi.

A na m ekwupụta oke ịhụnanya m maka gị—ịhụnanya nke toliteworo ọtụtụ iri afọ nke imata unu, n’efekọrịtara ofufe, na ijere unu ozi. Iwu dị nsọ nke anyị bụ iga n’obodo niile, ụmụnna niile, asụsụ niile, na mmadụ niile, na-enye aka ịkwado ụwa maka Ọbịbịa nke Abụọ nke Onye-nwe-anyị. Nke a ka anyị ga-eme site n’okwukwe n’ime Onye-nwe-anyị Jisọs Kraịst, mara na Ọ bụ Ya n’elekọta. Nke a bụ ọrụ Ya na Nzukọ-nsọ Ya. Anyị bụ ndị odibo Ya.

A na m ekwupụta nranye m nye Chineke Nna Ebighị-ebi anyị na Ọkpara Ya, Jisọs Kraịst. Ama m Ha, hụ Ha n’anya, ma kwe nkwa ijere Ha ozi—na gị—iji ume niile nke fọrọ na ndụ m. Site na aha di nsọ nke Jịsọs Karist, amen