Akwụkwọ nsọ
Jakọb 5


Isi 5

Jekọb wee n̄omie Zinọs n’ihe gbasara ogologo akụkọ ịtụ ilu nke osisi-olive ụlọ na nke ọhịa—Ha bụ ihe yiri Israel na ndị Jentaịlụ—Mkposasị na mkpọkọta nke Israel bụ ihe ngosi maka ọ dị n’iru—E kwuru n’ụdị aghụghọ gbasara ndị Nifaị na ndị Leman na ụlọ nke Israel nile—Ndị Jentaịlụ ka a ga-anyakụdo n’ime Israel—E mesịa ubi-vine ahụ ka a ga-akpọ ọkụ. Ihe dịka n’afọ 544 ruo 421 tutu amụọ Kraịst.

1 Lee, ụmụnne m nwoke, unu echetaghị na unu agụwo okwu nile nke onye-amụma Zinọs, nke ọ gwara ụlọ nke Israel, na-asị:

2 N̄aa nụ ntị, O unu ụlọ nke Israel, ma nụrụ okwu nke m, onye-amụma nke Onye-nwe.

3 N’ihi na lee, otu a ka Onye-nwe kwuru, Aga m atụnyere unu, O ụlọ nke Israel, dịka osisi olive-ụlọ, nke mmadụ weere ma zụọ n’ubi-vine ya; ma o wee too, ma mee ochie, ma malite ire.

4 Ma o wee ruo na onye nwe ubi-vine garuru ya nso, ma ọ hụrụ na osisi olive ya malitere ire; ma o wee si: Aga m abacha ya, ma gwuo gburu-gburu ya, ma zụọ ya, na eleghị anya o nwere ike ipupụta ụmụ ngalaba ndị dị nro, ma ọ gaghị ala n’iyi.

5 Ma o wee ruo na ọ bachara ya, ma gwuo gburu-gburu ya, ma zụọ ya dịka okwu ya siri dị.

6 Ma o wee ruo na mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị ọ malite ipupụta ihe dịka ntakiri, ụmụ ngalaba ndị dị nro; mana lee, nke bụ ịsị elu ya malitere ịla n’iyi.

7 Ma o wee ruo na onye nwe ubi-vine ahụ hụrụ ya, ma ọ sị nwa-oru ya: Ọ na-ewute m na m ga-atụfu osisi a; ya mere, gaa ma kụta ngalaba nile sitere n’osisi-olive ọhịa, ma wetere m ha; ma anyị ga akụpụ ngalaba ndị mbụ ahụ nke na-amalite ịkpọnwụ, ma anyị ga-atụba ha n’ime ọkụ ka ha wee repịa.

8 Ma lee, ka Onye-nwe ubi-vine ahụ kwuru, aga m ewepụ ọtụtụ ụmụ ngalaba ndị a dị nro, ma a ga m anyakụdo ha ebe ọbụla ọ soro m, ma o nweghị ihe o mere ma a sị na mgborọgwụ nke osisi a ga-ala-n’iyi, e nwere m ike idokwa mkpụrụ osisi ahụ nye onwe m; ya mere, a ga m ewere ụmụ ngalaba ndị a dị nro, ma aga m anyakụdo ha ebe ọbụla ọ soro m.

9 Were ngalaba nile nke osisi-olive ọhịa ahụ, ma nyakụdo ha, n’ọnọdụ ha; ma ndị a ndị m kupụtaworo aga m atụba ha n’ime ọkụ ahụ ma kpọọ ha ọkụ, ka ha ghara ịnọchi ala nke ubi-vine m.

10 Ma o wee ruo na nwa-oru nke Onye-nwe ubi-vine ahụ mere dịka okwu nke Onye-nwe ubi-vine ahụ siri dị, ma nyakụdo ngalaba nile nke osisi-olive ọhịa ahụ.

11 Ma Onye-nwe ubi-vine ahụ mere ka e gwuo gburu-gburu ya, ma bechaa, ma zụọ, na asị nwa-oru ya: Ọ na ewute m na m ga-atụfu osisi a; ya mere, ka m nwe ike eleghị anya chekwa mgbọrọgwụ ya ka ha ghara ila n’iyi, ka m wee chekwaa ha nye onwe m, e mewo m ihe nke a.

12 Ya mere, gaa n’ụzọ nke onwe gị, na-eche osisi ahụ nche, ma na-azụ ya, dịka okwu m nile siri dị.

13 Ma ihe ndị a ka m ga edebe n’ime ime akụkụ nke nsọtụ ubi vine m, ebe ọbụla sọrọ m, ọ gbasaghị gị; ma a na m eme ya ka m chekwaara onwe m ụdị akụkụ nke ngalaba nile nke osisi ahụ; na kwa, ka m wee debe mkpụrụ sitere na ya maka oge ọrụ, nye onwe m; n’ihi na ọ na-ewute m na m ga-atụfu osisi a, na mkpụrụ sitere na ya.

14 Ma o wee ruo na Onye-nwe ubi-vine ahụ gara, ma zoo ụdị akụkụ nke ngalaba nile nke osisi-olive ụlọ ahụ na nsọtụ nile nke ubi-vine ahụ, ụfọdụ n’otu ebe ma ụfọdụ n’ebe ọzọ, dịka ọchịchọ na mmasị Ya siri dị.

15 Ma o wee ruo ka ogologo oge gafere, na Onye-nwe ubi-vine ahụ wee sị nwa-oru ya: Bịa, ka anyị gbada n’ime ubi-vine, ka anyị wee rụọ ọrụ n’ime ubi-vine ahụ.

16 Ma o wee ruo na Onye-nwe ubi-vine ahụ, na kwa nwa-oru ya, gbadara n’ime ubi-vine ahụ ịrụ ọrụ. Ma o wee ruo na nwa-oru ahụ sịrị nna ya ukwu: Lee, hụ ebe a; lee osisi ahụ.

17 Ma o wee ruo na Onye-nwe ubi-vine ahụ lere ma hụ osisi ahụ nke n’ime ya anyakụdoro ngalaba osisi-olive ọhịa ndị ahụ; ma o pupụtawo ma malite ịmị mkpụrụ. Ma o wee ruo hụ na ọ dị mma; ma mkpụrụ ya dị ka nke ụdị akụkụ mkpụrụ ahụ.

18 Ma ọ gwara nwa-oru ahụ: Lee, ngalaba nile nke osisi ọhịa ahụ ejidewo ịdị mmiri mmiri nke mgbọrọgwụ ya, nke mere na mgborọgwụ ya ewepụtawo nnukwu ume; ma n’ihi nnukwu ume nke mgbọrọgwụ ya ahụ ngalaba osisi ọhịa ahụ ewepụtawo mkpụrụ ụlọ. Ugbua ọbụrụ na anyị anyakụdoghị ngalaba osisi ndị a, osisi ahụ gaara ala-n’iyi. Ma ugbua, lee, aga m enweta nnukwu mkpụrụ, nke osisi ahụ wepụtaworo; ma mkpụrụ osisi ahụ ka m ga-edebe maka oge ọrụ, nye mụ n’onwe m.

19 Ma o wee ruo na Onye-nwe ubi-vine ahụ sịrị nwa-oru ahụ: Bịa, ka anyị ga na nsọtụ nile nke ubi-vine ahụ, ma lee ọbụrụ na ngalaba nke ụdị-akụkụ ahụ nile nke osisi ahụ ewepụtabeghị nnukwu mkpụrụ kwa, ka m wee debe mkpụrụ sitere na ya maka oge ọrụ, nye mụ n’onwe m.

20 Ma o wee ruo na ha garuru ebe nna ya ukwu zoworo ụdị akụkụ ngalaba nile nke osisi ahụ, ma ọ sịrị nwa-oru ahụ: Lee ndị a; ma ọ hụrụ nke mbụ na o wepụtawo nnukwu mkpụrụ; ma ọ hụkwara na ọ dị mma. Ma ọ sịrị nwa-oru ahụ: Wepụta ụfọdu mkpụrụ osisi n’ebe ahụ, ma debe ha maka oge ọrụ, ka m wee chekwa ya nye mụ n’onwe m; n’ihi na lee, ka o kwuru, ogologo oge a ka m zụworo ya, ma o wepụtawo nnukwu mkpụrụ.

21 Ma o wee ruo na nwa-oru ahụ sịrị nna ya ukwu: Olee otu i siri bịa n’ebe a ịkụ osisi a, ma-ọbụ ngalaba nke osisi a? N’ihi na lee, ọ bụụrụ ebe kachasị na-amịghị mkpụrụ n’ime ala nile nke ubi-vine gị.

22 Ma Onye-nwe ubi-vine ahụ sịrị ya: Adụla m ọdụ; a matara m na ọ bu ebe ala na-anaghị ami mkpụrụ; ya mere, a sịrị m gị, a zụwo m ya ogologo oge a, ma ị hụwo na ọ mịtawo nnukwu mkpụrụ.

23 Ma o wee ruo na Onye-nwe ubi-vine ahụ sịrị nwa-oru ya: Lee anya n’ebe a; lee na m akụwo ngalaba ọzọ nke osisi ahụ kwa, ma ị matara na ala ebe a kara na-amịghị mkpụrụ karịa nke mbụ. Ma na lee osisi ahụ. A zụwo m ya ogologo oge a, ma o wepụtawo nnukwu mkpụrụ; ya mere, tụtụkọta ya, ma debe ya maka oge ọrụ, ka m wee chekwaa ya nye mụ n’onwe m.

24 Ma o wee ruo na Onye-nwe ubi-vine ahụ sịrị nwa-oru ya ọzọ: Lee anya n’ebe a, ma hụ ngalaba ọzọ kwa, nke m kụworo; lee na azụwo kwa m ya, na o wepụtawo mkpụrụ.

25 Ma o wee sị nwa-oru ahụ: Lee n’ebe a ma hụrụ nke ikpe-azụ. Lee, nke a ka m kụworo n’ime ebe ala dị mma; ma a zụwo m ya ogologo oge a, ma nanị otu akụkụ nke osisi ahụ wepụtaworo mkpụrụ ụlọ, ma akụkụ nke ọzọ nke osisi ahụ ewepụtawo mkpụrụ ọhịa; lee, a zụwo m osisi nke a dịka ndị nke ọzọ nile.

26 Ma o wee ruo na Onye-nwe ubi-vine ahụ sịrị nwa-oru ahụ: Kụpụ ngalaba nile ndị ahụ na-amịtaghị mkpụrụ ọma, ma tụba ha n’ime ọkụ.

27 Mana lee, nwa-oru ahụ sịrị ya: Ka anyị bechapụ ya, ma gwuo gburu-gburu ya, ma zụọ ya nwa ogologo oge karịa, na eleghị anya o nwere ike wepụta mkpụrụ ọma nye gị, ka i nwe ike debe ya maka oge ọrụ.

28 Ma o wee ruo na Onye-nwe ubi-vine ahụ na nwa-oru nke Onye-nwe ubi-vine ahụ zụrụ mkpụrụ nile nke ubi-vine ahụ.

29 Ma o wee ruo na ogologo oge agafewọrịị, ma Onye-nwe ubi-vine ahụ sịrị nwa-oru ya: Bịa, ka anyị gbadaa n’ime ubi-vine ahụ, ka anyị wee rụọ ọrụ ọzọ n’ime ubi-vine ahụ. N’ihi na lee, oge ahụ na-abịa nso, ma nsọtụ ya na-abịa ọsọ-ọsọ; ya mere, aga m edeberịrị mkpụrụ osisi maka oge ọrụ, nye mụ n’onwe m.

30 Ma o wee ruo na Onye-nwe ubi-vine ahụ na nwa-oru ahụ gbadara n’ime ubi-vine ahụ; ma ha bịaruru n’osisi ahụ nke a gbajipụworo ngalaba ụdị okike ya nile, ma ngalaba ọhịa nile ka a nyakụdoworo; ma lee ụdị mkpụrụ osisi nile kpugidere osisi ahụ.

31 Ma o wee ruo na Onye-nwe ubi-vine ahụ detụrụ mkpụrụ osisi ahụ ọnụ, ụdị nile dịka ọnụ-ọgụgụ ya siri dị, ma Onye-nwe ubi-vine ahụ sịrị: Lee, ogologo oge a ka anyị zụworo osisi a, ma e debeworo m onwe m maka oge ọrụ nnukwu mkpụrụ osisi.

32 Mana lee, n’oge a o wepụtawo nnukwu mkpụrụ, ma onweghị nke ọbụla n’ime ya nke dị mma. Ma lee, e nwere ụdị mkpụrụ osisi ọjọọ nile; ma ọbaghịrị m uru ọbụla, na-agbanyeghị ọrụ anyị nile; ma ugbua ọ na-ewute m na osisi a ga-efunarị m.

33 Ma Onye-nwe ubi-vine ahụ sịrị nwa-oru ahụ: Gịnị ka anyị ga-eme osisi ahụ, ka m nwe ike chekwaa ọzọ ezigbo mkpụrụ osisi sitere na ya nye mụ n’onwe m.

34 Ma nwa-oru ahụ sịrị nna ya ukwu: Lee, n’ihi na ị nyakụdoro ngalaba nile nke osisi olive ọhịa ahụ, ha azụwo mgborọgwụ ha nile, nke mere na ha dị ndụ ma ha alabeghị n’iyi; ya mere ị hụrụ na ha ka dị mma.

35 Ma o wee ruo na Onye-nwe ubi-vine ahụ sịrị nwa-oru ya: Osisi ahụ abaghịrị m uru ọbụla, ma mgbọrọgwụ si na ya abaghịrị m uru, ma ọbụrụra na ọ ga na-ewepụta mkpụrụ osisi ọjọọ.

36 Otu o sila dị, ama m na mgbọrọgwụ ya nile dị mma, ma maka ebum-n’obi nke m echekwawo m ha; na n’ihi nnukwu ume ha nwere, ha ebuwo ụzọ wepụta, site na ngalaba ọhịa ahụ nile, mkpụrụ osisi ọma.

37 Ma lee, ngalaba ọhịa nile ahụ etowo ma tokarịa mgbọrọgwụ nile dị ya; ma n’ihi na mgbọrọgwụ ọhịa ndị ahụ etokarịwo mgborọgwụ nile dị ya, o wepụtawo nnukwu ajọọ mkpụrụ; ma n’ihi na o wepụtawo nnukwu ajọọ mkpụrụ ị na-ahụ na ọ na-amalite ịla n’iyi; ma ọ ga acha na nso nso, ka e wee tụba ya n’ime ọkụ, nanị ma anyị ga-emere ya ihe iji chekwaa ya.

38 Ma o wee ruo na Onye-nwe ubi-vine ahụ sịrị nwa-oru ya: Ka anyị gbada n’ime ime nsọtụ nile nke ubi-vine ahụ, ma lee ma ngalaba nile nke okike nile ewepụtawo kwa ajọọ mkpụrụ.

39 Ma o wee ruo na ha gbadara n’ime ime nsọtụ nile nke ubi-vine ahụ. Ma o wee ruo na ha hụrụ na mkpụrụ nke okike ngalaba nile emebiwo kwa; e, nke mbụ na nke abụọ na kwa nke ikpe-azụ; na ha nile emebiwo.

40 Ma mkpụrụ ọhịa nke ikpe-azụ etokarịwo akụkụ osisi ahụ nke wepụtara mkpụrụ ọma, nke mere na ngalaba ahụ akpọnwụwo ma nwụọ.

41 Ma o wee ruo na Onye-nwe ubi-vine ahụ bere akwa, ma sị nwa-oru ahụ: Gịnị ka m gaara eme karịa maka ubi-vine m?

42 Lee, ama m na mkpụrụ nile nke ubi-vine ahụ, ma ewezuga ndị a, emebiwo. Ma ugbua ndị a ndị wepụtaworo mkpụrụ ọma mbụ emebiwo kwa; ma ugbua osisi nile nke ubi-vine m adịghị ihe ha dị mma ya ma ọbụghị igbutu ha ma tụba ha n’ime ọkụ.

43 Ma lee nke ikpe-azụ a, nke ngalaba ya kpọnwụworo, a kụrụ m ya n’ala ebe dị mma; e, ọbụna nke m họọrọ karịa akụkụ ọzọ nile nke ala ubi-vine m.

44 Ma ị hụwo na m gbudakwara nke ahụ kpuchiri ala ebe a, ka m wee kụọ osisi nke a n’ọnọdụ ya.

45 Ma ị hụrụ na otu akụkụ ya wepụtara mkpụrụ ọma, ma otu akụkụ ya wepụtara mkpụrụ ọhịa; ma n’ihi na akụpụghị m ngalaba ahụ nile ma tụba ha n’ime ọkụ, lee, ha etokarịwo ngalaba nke ọma nke mere na ọ kpọnwụwo.

46 Ma ugbua, lee, na-agbanyeghị nlekọta anya nile nke anyị lekọtaworo ubi-vine m, osisi ya nile emebiwo, na ha ewepụtaghị mkpụrụ ọma ọbụla; ma ndị a ka m nweworo olile-anya ichekwa, m gaara eji debe mkpụrụ ya maka oge ọrụ, nye mụ n’onwe m. Ma, lee, ha adịwo ka osisi-olive ọhịa ahụ, ma, ha abaghị uru ma ọbụghị igbutu ha ma tụba ha n’ime ọkụ; ma ọ na-ewute m na ha ga-efunarị m.

47 Ma gịnị ka m gaara eme ọzọ n’ime ubi-vine m? E welatara m aka m, nke mere na m azụghị ya? E-e, azụwo m ya, ma e gwuwo m gburu-gburu ya, ma e bechapụwo m ya, ma etinyewo m ya nsị anụ; ma e setịpụwo m aka m na ọfọtụrụ ka ọ bụrụ ogologo ụbọchị nile, ma ọgwụgwụ oge ahụ na-abịa nso. Ma ọ na-ewute m na m ga-egbutu osisi nile nke ubi-vine m, ma tụba ha n’ime ọkụ ka ha repịa. Onye ka ọbụ nke mebiworo ubi-vine m?

48 Ma o wee ruo na nwa-oru ahụ sịrị nna ya ukwu: Ọ bụghị oke mbuli-elu nke ubi-vine gị—ngalaba ha nile ha akabeghi mgbọrọgwụ nile ndị dị mma ike? Ma n’ihi na ngalaba nile ahụ akarawo mgborọgwụ nile di n’ebe ahụ ike, lee ha toro ọsọ-ọsọ karịa ume nke mgbọrọgwụ nile ahụ, na-enweta ume nye onwe ha. Lee, a sị m, ọbụghị ihe nke a kpatara osisi nke ubi-vine gị jiri mebie?

49 Ma o wee ruo na Onye-nwe ubi-vine ahụ sịrị nwa-oru ya: Ka anyị gaa ma gbutuo osisi nile nke ubi-vine ahụ ma tụba ha n’ime ọkụ, ka ha ghara ikpuchi ala nke ubi-vine m, n’ihi na e mewo m ihe nile. Gịnị ọzọ ka m gaara emere ubi-vine m?

50 Ma, lee, nwa-oru ahụ sịrị Onye-nwe ubi-vine ahụ: Hapụ ya nwa ntịntị oge.

51 Ma Onye-nwe ya wee sị: E, a ga m ahapụ ya nwantịntị oge, n’ihi na ọ na-ewute m na osisi nile nke ubi-vine m ga efunarị m.

52 Ya mere, ka anyị were ụfọdụ ngalaba nke ndị a nke m kụworo n’ime ime nsọtụ nile nke ubi-vine m, ma ka anyị nyakụdo ha n’ime osisi ahụ bụ ebe ha siri bịa; ma ka anyị kụpụ site n’osisi ahụ ngalaba ndị ahụ nile nke mkpụrụ ha lukarịrị n’ilu, ma nyakụdo n’ime ngalaba nile nke akụkụ osisi ahụ n’ọnọdụ ya.

53 Ma nke a ka m ga-eme ka osisi ahụ ghara ịla n’iyi, na, ma eleghị anya, e nwere m ike ichekwara onwe m mgborọgwụ ya nile maka ebum-n’uche nke mụ n’onwe m.

54 Ma, lee, mgbọrọgwụ nile nke ngalaba udi-okike nile nke osisi ahụ nke m kụworo n’ebe nile ọ masịrị m ka dị ndụ; ya mere, ka m wee chekwa ha kwa maka ebum-n’obi m, aga m ewere ụfọdụ ngalaba nke osisi a, ma aga m anyakụdo ha n’ime ha. E, a ga m anyakụdo n’ime ha ngalaba nile nke nne osisi ha, ka m wee chekwa mgbọrọgwụ nile kwa nye mụ n’onwe m, ka mgbe ha ga esiworịị ike ka o siri kwesị eleghị anya ha ga-ewepụta mkpụrụ ọma nye m, ma aga m enwe otuto n’ime mkpụrụ nke ubi-vine m.

55 Ma o wee ruo na ha webiri site n’osisi nke akụkụ ahụ nke ghọworo osisi ọhịa, ma nyakụdo ha n’ime nye osisi nke akụkụ nile, ndị ghọwokwara osisi ọhịa.

56 Ma ha werekwara site n’osisi nke akụkụ nile ndị ghọworo osisi ọhịa, ma nyakụdo n’ime nne osisi ha.

57 Ma Onye-nwe ubi-vine ahụ sịrị nwa-oru ya: Akụpụla ngalaba ọhịa nile site n’osisi nile ahụ, ma ọbụghị ndị ahụ kachasị ilu; ma n’ime ha ị ga-anyakụdo dịka ihe ahụ m kwuworo.

58 Ma anyị ga azụkwa osisi nile nke ubi-vine ahụ, ma anyị ga-ebechapụ ngalaba nile ahụ dị ya; ma anyị ga akụpụ site n’osisi ndị ahụ ngalaba ha chaworo acha, nke ga-alarịrị n’iyi, ma tụba ha n’ime ọkụ.

59 Ma nke a ka m na-eme ka, eleghị-anya, mgbọrọgwụ ahụ ga-eweta ume n’ihi ịdị mma ha; na n’ihi mgbanwe nke ngalaba nile ahụ, ka ndị dị mma wee ka ndị jọrọ njọ ike.

60 Ma n’ihi na e chekwawo m ngalaba nile nke okike ahụ na mgbọrọgwụ ya nile, na n’ihi na anyakụdowo m ngalaba nke okike nile ọzọ n’ime nne osisi ha, na-echekwawo m mgbọrọgwụ nile nke nne osisi ha, na-eleghị-anya, osisi nile dị n’ubi-vine m ga-ewepụta ọzọ mkpụrụ ọma; na ka m wee nwe ọn̄ụ ọzọ n’ime mkpụrụ nke ubi vine m, na, eleghị anya, ka m wee n̄ụria ọn̄ụ karịa na mụ echekwawo mgbọrọgwụ nile na ngalaba nile nke mkpụrụ mbụ ahụ—

61 Ya mere, gaa, ma kpọọ ụmụ-oru, ka anyị wee rụsie ọrụ ike site n’ike anyị n’ime ubi-vine ahụ, ka anyị wee dozie ụzọ ahụ, ka m wee wepụta ọzọ mkpụrụ okike ahụ, bụ mkpụrụ okike nke dị mma na nke kachasị dị mkpa karịa mkpụrụ osisi ndị ọzọ.

62 Ya mere, ka anyị gaa ma jiri ike anyị rụọ ọrụ nke ikpe-azụ a, n’ihi na lee ọgwụgwụ oge ahụ na-abịa nso, ma nke a bụ nke ikpe-azụ nke m ga-ebecha ubi-vine m.

63 Nyakụdo ngalaba nile ahụ; malite na ndị ikpe-azụ ka ha wee bụrụ ndị mbụ, ma ka ndị mbụ wee bụrụ ndị ikpe-azụ, ma gwuo gburu-gburu osisi ndị ahụ, ma ndị nke kara aka ma ndị nke nta, ndị mbụ na ndị ikpe-azụ; ma ndị ikpe-azụ ma ndị mbụ, ka a zụọ ha nile otu ugbọrọ ọzọ nke ikpeazụ.

64 Ya mere, gwuo gburu-gburu ha, ma becha ha, ma tinye ha nsị-anụ otu ugbọrọ ọzọ, nke ikpe-azụ, n’ihi na ọgwụgwụ oge ahụ na-abịa nso. Ma ọbụrụ na nnyakụdo ikpe-azụ ndị a ga-eto, ma wepụta mkpụrụ nke okike ahụ, mgbe ahụ ka ị ga-edoziri ha ụzọ, ka ha wee too.

65 Ma mgbe ha malitere ito, unu ga-ewepụ ngalaba nile nke na-eweta mkpụrụ dị ilu, dịka ume nke ịdị mma na ibu ha siri dị; ma unu agaghị ewepụ ndị ọjọọ dị ya n’otu oge ahụ, ma ọdịghị otu a mgbọrọgwụ nile dị na ya ga-esi oke ike maka nnyakụdo ahụ, na nnyakụdo ahụ ga-ala-n’iyi, ma osisi nile nke ubi-vine m e wee funarị m.

66 N’ihi na ọ na-ewute m na osisi nile ahụ nke ubi-vine m ga-efunarị m; ya mere unu ga na-ewepụ ndị ọjọọ dịka ndị ọma ga na-eto, ka mgborọgwụ ahụ na elu osisi ahụ wee hara ahara n’ume, ruo mgbe ndị ọma ga-akarị ndị ọjọọ, ma ndị ọjọọ e gbutuo ha ma tụba ha n’ime ọkụ, ka ha ghara ikpugide ala nke ubi-vine m; ma otu a ka m ga-azachapụ ndị ọjọọ site n’ubi-vine m.

67 Ma ngalaba nile nke osisi okike ahụ ka m ga-anyakụdo ọzọ n’ime osisi okike ahụ;

68 Ma ngalaba nile nke osisi okike ahụ ka m ga-anyakụdo n’ime ngalaba nke osisi okike ahụ; ma otu a ka m ga-ewetakọta ha ọzọ, ka ha wee wepụta mkpụrụ okike ahụ, ma ha ga-abụ otu.

69 Ma ndị ọjọọ ka a ga-etụfu, e, ọbụna site n’ala nile ahụ nke ubi-vine m; n’ihi na lee; nanị otu ugbọrọ a ka m ga-ebecha ubi-vine m.

70 Ma o wee ruo na Onye-nwe ubi-vine ahụ zipụrụ nwa-oru ya; ma nwa-oru ahụ gara ma mee dịka Onye-nwe ya nyeworo ya iwu, ma kpọta ụmụ-oru ndị ọzọ; ma ha dị ole na ole.

71 Ma Onye-nwe ubi-vine ahụ sịrị ha: Gaa nụ, ma rụọ ọrụ n’ime ubi-vine ahụ, site n’ume unu. N’ihi na lee, nke a bụ oge ikpe-azụ nke m ga azụ ubi-vine m; n’ihi na ọgwụgwụ oge ahụ dị nso, ma oge ahụ na-abịa ọsọ-ọsọ; ma o bụrụ na unu e soro m rụọ ọrụ site n’ike unu, unu ga-enwe ọn̄ụ na mkpụrụ ahụ nke m ga-edebere onwe m maka mgbe ahụ nke na-abịa nso-nso.

72 Ma o wee ruo na ụmụ-oru ahụ gara ma rụọ ọrụ site n’ike ha nile; ma Onye-nwe ubi-vine ahụ rụkwara ọrụ, ya na ha; na ha rubere isi n’iwu nile nke Onye-nwe ubi-vine ahụ n’ihe nile.

73 Ma e wee malite inwe mkpụrụ nke okike ọzọ n’ubi-vine ahụ; ma ngalaba nile nke okike ahụ malitere ito na ime nke ọma karịa; na a malitere ịkụpụ ngalaba nke ọhịa nile na ịtụfu ha; ma ha debere mgbọrọgwụ ahụ na elu ya ka ha hara n’otu, dịka ume ya siri dị.

74 Ma otu a ka ha rụrụ ọrụ, site n’ike ha nile, dịka iwu nile nke Onye-nwe ubi-vine ahụ siri dị, ọbụna ruo mgbe e wepụsịworo ndị ọjọọ site n’ime ubi-vine ahụ, ma Onye-nwe ubi-vine ahụ chekwawooro nye onwe ya n’osisi nile aghọwokwa nke mkpụrụ okike; ma ha wee dị ka nke otu arụ; ma mkpụrụ osisi ahụ nile haara n’otu; ma Onye-nwe ubi-vine ahụ echekwaworo onwe ya mkpụrụ nke okike ahụ, nke dịkarịsịrị ya mkpa site na mmalite.

75 Ma o wee ruo na mgbe Onye-nwe ubi-vine ahụ hụrụ na mkpụrụ-osisi ya dị mma, na n’ubi-vine ya abukwaghị ihe mebiri emebi, ọ kpọrọ ụmụ-oru ya nile, ma sị ha: Lee, n’ihi na oge ikpe-azụ a ka anyị zụworo ubi-vine m; ma unu hụrụ na e mewo m dịka ọchịchọ m si dị; ma e chekwawo m mkpụrụ osisi nke akụkụ ahụ, na ọ dị mma, ọbụna dịka otu ọ dịrị na mmalite. Ma ngọzi na-adịrị unu; n’ihi na maka na unu anọworịị na-eso m na-arụsi ọrụ ike n’ubi-vine m, ma debe iwu m nile, ma weghachitere m ọzọ mkpụrụ osisi nke okike ahụ, nke mere na ubi-vine m emebikwaghị emebi, ma ndị ọjọọ ka e wepụsịworo, lee unu ga e soro m nwe ọn̄ụ n’ihi mkpụrụ osisi nke ubi-vine m.

76 N’ihi na lee, ogologo oge ka m ga-edebe mkpụrụ osisi nke ubi-vine m nye mụ n’onwe m maka oge ọrụ, nke na abịa ọsọ-ọsọ; na nke ikpe-azụ ka m zụworo ubi-vine m, ma bechaa ya, ma gwuo ya gburu-gburu, ma tinye ya nsị anụ; ya mere aga m edebere mụ n’onwe m site na mkpụrụ ahụ, ruo ogologo oge, dịka ihe nke m kwuworo.

77 Ma mgbe oge ga-abịa na mkpụrụ ọjọọ ga-abịa ọzọ n’ime ubi-vine m, mgbe ahụ ka m ga-eme ka ekpokọta ndị ọma na ndị ọjọọ; ma ndị ọma ka m ga-echekwa nye mụ n’onwe m, ma ndị ọjọọ ka m ga atufusị n’ime ọnọdụ nke ya. Ma mgbe ahụ ka oge ọrụ na ọgwụgwụ oge ga-abịa, ma ubi m ka m ga-eme ka e jiri ọkụ repịa.