Akwụkwọ nsọ
Mosaịa 8


Isi 8

Amọn wee kuziere ndị nke Lịmhaị—Ọ mụrụ ihe banyere epekele iri abụọ na anọ nke ndị Jared—Akụkọ-ndekọta ndị mgbe-ochie nile ndị ọhụ-ụzọ nwere ike ịtụgharị asụsụ ha—Ọdịghị onyinye dị ukwuu karịa ịhụ-ụzọ. Ihe dịka n’afọ 121 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma o wee ruo na mgbe eze Lịmhaị bịaworo na ngwụcha nke ịgwa ndị ya okwu, n’ihi na ọ gwara ha ọtụtụ ihe ma nanị ole na ole n’ime ha ka m deworo n’ime akwụkwọ a, ọ gwara ndị ya ihe nile gbasara ụmụnne ha nwoke ndị nke nọ n’ala Zarahemla.

2 Ma o mere ka Amọn guzoro ọtọ n’iru igwe-mmadụ ahụ, ma kwugharịara ha ihe nile nke meworo ụmụnne ha nwoke site n’oge nke Zinịf gbagoro pụọ site n’ala ahụ ọbụna ruo oge nke ya n’onwe ya bịalitere pụọ site n’ala ahụ.

3 Ma o kwugharịkwaara ha okwu ndị-ikpe-azụ nke eze Benjamịn kụziworo ha, ma kọwaara ha ndị nke eze Lịmhaị, ka ha wee ghọta okwu nile nke o kwuru.

4 Ma o wee ruo na mgbe o meworo ihe a nile, na eze Lịmhaị gbasara igwe-mmadụ ahụ, ma mee ka ha laghachị onye ọbụla n’ụlọ nke aka ya.

5 Ma o wee ruo na o mere ka eweta epekele ndị ahụ nke ihe dị n’ime ha bụ aakụkọ-ndekọta nke ndị ya site n’oge nke ha hapụrụ ala nke Zarahemla ahụ, n’iru Amọn, ka o wee gụọ ha.

6 Ugbua, ngwa-ngwa Amọn gụsịworo akụkọ-ndekọta ahụ, eze ahụ jụrụ ya ịmata ma ọ ga-enwe ike ịsụgharị asụsụ nile, ma Amọn gwara ya na ya enweghị ike.

7 Ma eze ahụ gwara ya: Ebe m nwere mwute n’ihi mkpagbu nile nke ndị m, e mere m ka iri anọ na atọ n’ime ndị m ga njem n’ime ọzara ahụ, na site na nke ahụ ha ga-enwe ike chọta ala nke Zarahemla ahụ, ka anyị wee rịo ụmụnne anyị nwoke ka ha napụta anyị site n’ịbụ-oru.

8 Ma ha furu n’ime ọzara ahụ ọtụtụ ụbọchị, ma na ha nwere mgbalị, ma ha achọtaghị ala Zarahemla ahụ ma laghachịrị n’ala nke a, ebe ha gaworo njem n’ime ala di n’etiti ọtụtụ mmiri, ebe ha chọpụtaworo ala nke jupụtara na ọkpụkpụ nile nke ndị mmadụ, na nke ụmụ anụ ọhịa, ma e kpuchịkwara ya na mbibi nile nke ụlọ nile n’ụdị ọbụla, ebe a chọpụtaworo ala nke ndị mmadụ bara ụba ka igwe ndị Israel biworo n’ime ya.

9 Ma n’igba ama na ihe ndị nke ha kwuworo bụ ezi-okwu ha ewetawo aepekele iri abụọ na anọ nke jupụtara n’ihe nkanye nile, ma ha bụ nke ọla-edo n’enwegị ntụpọ.

10 Ma lee, kwa, ha ewetawo aepekele-nchekwa-obi, ndị nke buru ibu, ma ha bụ nke bbras na nke ọla-kọpa, ma ha dịcha ezigbo mma.

11 Ma ọzọ, ha ewetawo mma agha, ihe-njide aka ha alawo n’iyi, ma ihu-mma ha ka e kpuchitere site na nchara; ma ọdịghị onye ọbụla n’ala anyị nke nwere ike ịsụgharị asụsụ ahụ ma-ọbụ ihe nkanye nile nke dị n’elu epekele ahụ. Ya mere a sịrị m gị: Inwere ike ịtụgharị asụsụ?

12 Ma a sị m gị ọzọ: Imatara maka onye ọbụla nke nwere ike ịtụgharị asụsụ? N’ihi na achọsịrị m ike na a ga-atụgharị akụkọ-ndekọta nile ndị a n’asụsụ anyị, n’ihi na, eleghị anya, ha ga-enye anyị mmata maka ndị nke fọdụrụ nke ndị ahụ e bibiworọrịị, site na ebe akụkọ-ndekọta nile ndị a siri bịa, ma-ọbụ, eleghị anya, ha ga-enye anyị mmata maka ndị a e bibiworọ; ma a chọsịrị m ike ịmata ihe kpatara mbibi nke ha.

13 Ugbua Amọn sịrị ya: E nwere m ike n’ezie gwa gị, O eze, maka otu nwoke nke nwere ike aịtụgharị akụkọ-ndekọta nile ndị a; n’ihi na o nwere ebe o nwere ike ilere anya ma tụgharịa akụkọ-ndekọta nile bụ nke oge mgbe ochie; ma ọ bụ onyinye sitere na Chineke. Ma ihe ndị a ka a na-akpọ bihe ntụgharị asụsụ, ma ọdịghị mmadụ ọbụla nwere ike ileba anya n’ime ha ma ọbụghị na e nyere ya iwu, eleghị anya na ọ ga achọ ihe ndị ọ na-ekwesịghị ịchọ, ma ọ ga-ala-n’iyi. Ma onye ọbụla e nyere iwu ileba anya n’ime ha, onye ahụ ka a na-akpọ cọhụ-ụzọ.

14 Ma lee, eze ndị ahụ nke nọ n’ala Zarahemla bụ nwoke ahụ nke e nyere iwu ime ihe ndị a, na onye nwere onyinye nka dị elu site na Chineke.

15 Ma eze ahụ sịrị na onye ọhụ-ụzọ bụ nnukwu mmadụ karịa onye-amụma.

16 Ma Amọn sịrị na onye-ọhụ-ụzọ bụ onye-mkpughe na kwa onye-amụma; ma onyinye nke karịrị nke a ọdịghị mmadụ ọbụla pụrụ inwe ya, ma ọbụghị na o nwere ike nke Chineke, nke mmadụ ọbụla na-enweghị ike inwe; ma na mmadụ nwere ike inwe nnukwu ike e nyere ya site na Chineke.

17 Mana onye-ọhụ-ụzọ nwere ike ịmata maka ihe ndị gara aga, na kwa maka ihe ndị nke ga-abịa, ma site na ha ka a ga ekpughe ihe nile, ma-ọbụ, n’ụdị ọzọ, a ga-eme ka ihe nzụzọ nile gosipụta onwe ha, ma ihe ezoro-ezo ga-apụta ìhè, ma ihe ndị a na-amatabeghị ka a ga-eme ka a mata site na ha, na kwa ihe nile ka a ga-eme ka amata site na ha nke ma ọdịghị otu a e nweghị ike ịmata ha.

18 Otu a Chineke akwadowo ụzọ nile na mmadụ, site n’okwukwe, ga-arụ nnukwu ọrụ-ebube nile; ya mere ọ ghọwo nnukwu uru nye ndị mmadụ ibe ya.

19 Ma ugbua, mgbe Amọn bịaworo na ngwụcha nke ikwu okwu ndị a eze ahụ n̄ụrịrị ọn̄ụ karịrị akarị, ma nye Chineke, ekele, na-asị: N’enweghị obi abụọ, annukwu ihe omimi dị n’ime epekele ndị a, ma ndị-nsụgharị-okwu ndị a kwa n’enweghị obi abụọ ka akwadoro ha maka ebum-n’obi nke ikpughe ihe omimi nile dị otu a nye ụmụ nke mmadụ.

20 O lee otu ịdị ịtụ-n’anya ọrụ nile nke Onye-nwe dị, ma ruo ole mgbe ka ọ na enwe nnagide n’ebe ndị ya nọ; e, ma lee otu ikpu-isi na ekweghị itinye aka bụ nghọta nile nke ụmụ nke mmadụ dị; n’ihi na ha agaghị achọ amamihe, ọbụghị ma ha chọrọ na ọ ga-achị ha!

21 E, ha dịka igwe-anụ na azụghị azụ nke na-agbafu site n’aka onye-ọzụzụ-atụrụ ahụ, ma gbasasịa, ma a na-achụ ha, ma ụmụ anụ ọhịa wee rie ha.