Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 16


Nkeji 16

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma nye Peter Whitmer, Nta, na Fayette, New York, Jun 1829 (History of the Church, 1:51). (Lee isi-ọkwu nke nkeji 14.) Peter Whitmer, Nta, mechara bụrụ otu n’ime ndị Aka-ebe Asatọ nye Akwụkwọ nke Mọmọn.

1–2, Ogwe-aka nke Onye-nwe na-ekpuchịta ụwa nile; 3–6, I kwusa ozi-ọma ma zọpụta mkpụrụ-obi nile bụ ihe kachasị baa uru.

1 N̄aa-ntị, nwa odibo m Peter, ma gee ntị n’okwu nile nke Jisus Kraịst, Onye-nwe gị na Onye-mgbapụta gị.

2 N’ihi na lee, a na m ekwuru gị okwu n’ịdị nkọ ma n’ike n’ihi na ogwe-aka m na-ekpuchịta ụwa nile.

3 Ma a ga m agwa gị ihe ahụ n’onweghị onye matara ya m’ọbụghị mụ na gị nanị—

4 N’ihi na ọtụtụ mgbe ị chọworo n’aka m ka ị mata ihe ahụ nke ga-akachasị ịba uru nye gị.

5 Lee, ngọzi dịịrị gị n’ihi ihe nke a, ma n’ihi ikwu okwu m nile nke m nyeworo gị dịka iwu-nsọ m nile siri dị.

6 Ma ugbụ a, lee, a sị m gị na ihe ahụ ga-akachasị ịba-uru nye gị ga-abụ ikwupụta nchegharị nye ndị nke a, ka i nwee ike iwetara m ọtụtụ mkpụrụ-obi, ka i nwee ike izu-ike gị na ha n’ala-eze nke Nna m. Amen.