Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 33


Nkeji 33

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith onye-amụma nye Ezra Thayre na Northrop Sweet, na Fayette, New York, Oktoba 1830 (History of the Church, 1:126–127). Na-ndekọta mkpughe nke a, Onye-amụma kweyere na “Onye-nwe dị na njikere mgbe nile ịkụziri ndị na-ejisike na-achọ n’okwukwe” (History of the Church, 1:126).

1–4, Ndị ọrụ ka akpọrọ ikwusa ozi-ọma n’oge awa nke iri na otu; 5–6, E hiwere nzukọ-nsọ, ma ndị ahọpụtara ka a ga-akpọkọta; 7–10, chegharia, n’ihi na ala-eze nke elu-igwe dị nso; 11–15, Nzukọ-nsọ ka ewuworo n’elu nkume nke ozi-ọma; 16–18, kwado maka ọbịbịa nke Onye na-alụ nwunye.

1 Lee, a si m unu, ndị odibo m Ezra na Northrop, meghee nụ ntị unu ma nụrụ olu Onye-nwe Chineke unu, onye okwu ya dị ndụ ma dịkwa ike, dị kwa nkọ karịa mma agha ọbụla nke nwere iru abụọ ruo n’ikewa njikọ nile na ụmị, mkpụrụ obi na mụọ; ma na-amazu ihe dị iche n’echiche nile na nzube nile nke obi.

2 N’ihi n’ezie, n’ezie, a sị m unu na-akpọrọ unu ka unu welite olu unu nile dịka olu nke opi, ikwusa ozi-ọma nye ọgbọ gbagọrọ agbagọ ma rụkwara-arụ.

3 N’ihi lee, ụbị ahụ chara-acha na-echere owuwe ihe-ụbị; ma ọ bụ kwa awa nke iri na otu, ma nke ikpe-azụ m ga-akpọ ndị ọrụ n’ime ubi vine m.

4 Ma ubi vine m emebiwo mpekere nile; ma ọdịghị onye na-eme ihe-ọma ma-ọbụghị ole na ole; ma ha na emehie n’ọtụtụ-ụzọ n’ihi ndị nchụ-aja aghụghọ ha nile ndị mebiworo n’uche.

5 Ma n’ezie, n’ezie a sị m unu, na nzukọ-nsọ nke a ka m hiwere ma kpọpụtakwa site n’ime ọzara.

6 Ma ọbụna otu aka ahụ ọ ga-akpọkọta ndị nkem ahọpụtara si n’akụkụ anọ nile nke ụwa, ọbụna ka ha ra bụ ndị ga-ekwere n’ime m, ma gee-ntị n’olu m.

7 E, n’ezie, n’ezie, a sị m unu, na ubi ahụ chara-acha na-echere owuwe ihe-ubi; ya mere tinye mma iwe-ihe ubi nile ma ghọọ n’ike unu nile, echiche, na ume.

8 Meghee ọnụ unu nile ma ha ga-eju ma unu ga-abịa dịrị ọbụna ka Nifaị nke ochie, onye jere njem site na Jerusalem n’ime ọzara.

9 E, meghee ọnụ unu nile ma egbochila, ma unu ga-achiju ukwu-ọka n’azụ unu nile, na lee, mụ onwe m nọnyeere unu.

10 E, meghee ọnụ unu nile ma ha ga-eju, na-asị; chegharịa, chegharịa, ma dozienụ ụzọ nke Onye-nwe, guzozie; n’ihi na ala-eze nke elu-igwe dị nso;

11 E, chegharịa ma mee baptism, onye obula n’ime unu, n’ihi nsachapụ nke mmehie unu nile; e, mee baptism ọbụna site na mmiri, mgbe ahụ baptism nke ọkụ na nke Mụọ Nsọ ga-abia.

12 Lee, n’ezie, n’ezie, a sị m unu, nke a bụ ozi-ọma nke m; ma chetakwa na ha garịrị enwe okwukwe na m; ma-ọbụ onweghị ụzọ a ga-esi azọpụta ha;

13 Ma n’elu nkume a ka m ga-ewu nzukọ-nsọ m; e, n’elu nkume a ewukwasịrị unu, ma ọbụrụ na unu a gaa-n’iru, ọnụ-uzọ ama nile nke ala-mụọ agaghị aka unu ike.

14 Ma unu ga-echeta ndepụta nile nke nzukọ-nsọ a na ọgbụgba-ndụ nile idebe ha.

15 Ma onye ọbụla nwere okwukwe ka unu ga-eme onye-otu nzukọ-nsọ m site n’ibịkwasị aka nile, ma a ga m enye onyinye nke Mụọ Nsọ n’elu ha.

16 Ma Akwụkwọ nke Mọmọn na akwụkwọ-nsọ ndị-ọzọ nile ka e nyere site na m maka iji kuziere unu ihe; ma ike nke Mụọ m na-eme ka ihe nile dị ndụ.

17 Ya mere, kwesị ntụkwasị-obi, na-ekpe ekpere oge nile, ma nwee ọwa-ọkụ unu na-njikere ma na-enwu, ma jirikwa mmanụ, ka unu nọrọ na njikere chere ọbịbịa nke onye nalụ nwunye—

18 N’ihi lee, n’ezie, n’ezie, a sị m unu, na a na m abịa ọsọ-ọsọ. Ọbụna otu a. Amen.