Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
NAJS, Mak 14


NAJS, Mak 14:20–25 (tụlee ihe dị iche na Mak 14:22–25; NAJS, Matiu 26:22, 24–25)

(Jisus hiwere oriri-nsọ.)

20 Na mgbe ha na-eri ihe, Jisus weere achịcha gọzie kwa ya, na nyawaa, nyekwa ha, sị kwa, Nara nụ ya, rie kwa.

21 Lee, nke a bụ maka unu ime na ncheta nke arụ m; n’ihi n’ọtụtụ mgbe unu na-eme nke a unu ga-echeta oge awa a mgbe mụ na unu nọ.

22 O were kwa iko, ma mgbe o nyeworo ekele, o wee nye ha ya; ha nile wee nụọ kwa site na ya.

23 O wee sị kwa ha, Nke a bụ na ncheta nke ọbara m nke a na-akwafu n’ihi ọtụtụ, na ịgba-ama ọhụrụ ahụ nke m na-enye unu; n’ihi na gbasara m ka unu ga-agba ama nye ụwa dum.

24 Na dịka ọtụtụ mgbe unu na-eme emume-nsọ nke a, unu ga-echeta m n’oge awa nke a mgbe mụ na unu nọ n̄ụkọrịta kwa site n’iko a, ọbụna oge ikpe-azụ na nkwusa ozi m.

25 N’ezie asị m unu, Maka nke a ka unu ga-agba ama; n’ihi na agaghị m an̄ụ ma ọlị n’ihe sitere na mkpụrụ nke osisi vine mụ na unu, ruo ụbọchị ahụ m ga-an̄ụ ya ọhụrụ n’ala-eze Chineke.

NAJS, Mak 14:36–38 (tụlee ihe dị iche na Mak 14:32–34)

(Na Getsemane, ọbụna ụfọdụ n’ime Iri na Abụọ ahụ aghọtazughị nke ọma ọrụ Jisus dịka Mesaịa ahụ.)

36 Ha wee bịaruo kwa otu ebe nke a kpọrọ Getsemane, nke bụ ubi a gbara ogige; ibobo malitere ịnwụ ndị na-eso ụzọ ahụ n’arụ nke ukwuu na obi ịlọ ha mmiri ebe ọdị ukwuu, na-ikpesa kwa n’ime obi ha, na-enwe oke iju-anya ma nke a ọ bụ kwa Mesaịa ahụ.

37 Na Jisus ebe ọ matara obi ha nile, sịrị ndị na-eso ụzọ ya, Nọdụ nụ ebea, mgbe m na-ekpe ekpere.

38 O wee kpọrọ kwa Pịta, na Jemes, na Jọn, tinyere onwe ya, baakwara ha mba, sị kwa ha, Ọ na-ewute mkpụrụ obi m nke ukwuu, ọbụna ruo n’ọnwụ; nọgide nu n’ebe a na-eche kwa nụ nche.