Ọgbakọ Zuru ọha
O Biliwo jiri Ọgwụgwọ na Nku Ya: Anyị Nwere ike Ị bụ Karịa Ndị Nwe mmeri
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2022


O Biliwo jiri Ọgwụgwọ na Nku Ya:

Anyị Nwere ike Ị bụ Karịa Ndị Nwe mmeri

Jizọs emeriwo mmetọ niile nke ụwa nke a inye gị ike ọ bụghị naanị ịnya ndụ mana otu ụbọchị, site na Ya, imeri ma ọbụna merie.

Marin, a bụ m Okenye Holland, ma ihe niile chọrọ ịkpọnye ọnụ n’ala.

Anyị Bụ Karịa Ndị Nwe mmeri

Anyị niile na-enwe mgbagwoju anya site n’akụkọ ndị gbasara ịnya ndụ. Anyị na-anụ akụkọ nke ndị nchọcha na-enweghị ụjọ na ndị nkịtị dị ka ha ndị gbalịrị idobe onwe ha ndụ na-agbanyeghị ihe niile na ihe ndị a na-atụanya, ma anyị enweghị ike nye aka kama jụọ onwe anyị, “M gaara emeli nke ahụ?”

Ana m eche ozugbo banyere onye Britain na-eme njem Ernest Shackleton na ndị ọkwọ ụgbọ mmiri ya HMS Endurance, ụgbọ mmiri mebiri emebi na Antarctic ice ma mesịa tọ na agwa etiti tọgbọọrọ n’efu ruo ihe dị ka afọ abụọ. Ndu pụrụ iche na mkpebi ekwe ekwe nke Shackleton zọpụtara ndụ nke ụmụnwoke ya, na-agbanyeghị ọnọdụ ndị kachasị njọ.

Mgbe ahụ e chere maka ndị na-anya ụgbọ elu nke Apollo 13 na-efeje n’ikuku ịda n’ọnwa! Mana ọghọm dị egwu dara mgbe tank ikuku na-enye ndụ gbawara, ma ozi ahụ a bụrụ ihe a kwụsịrị. Na-enweghị ume ndụ, ndị ahụ na-anya ụgbọ elu na ndị njikwata ozi weere akọ na uche mepụta ihe na-emeghị nkwadobe ma kpọghachi mmadụ atọ ndị ahụ na-eme njem n’ọnwa n’ụwa na nchekwa.

O juru m anya na ịnya ndụ dị ịtụnaanya nke ndị mmadụ na ndị ezi na ụlọ agha mekpara ahụ, ndị a tụrụ nga na kampụ niile, na ndị na-aghọ ndị gbara ọsọ ndụ, ndị jiri obi ike ma site na mgbam ume debe ndụ ire ọkụ nke olileanya maka ndị ha na ha na-ata ahụhụ, ndị nyere ọdịmma ebe ihe arụ chere ha niihu, na ndị otu ọbụla gbalịrị inyere ndị ọzọ aka nwee nnagide naanị otu mkpụrụ ụbọchị ọzọ.

Mụ na unu enwere ike ịnya ndụ n’otu niime ọnọdụ ọbụla na ndị a jọgburu onwe ya?

Ikekwe ụfọdụ niime unu, ka osila dị, na-eche maka nkọwapụta nke ndị nyara ndụ, ma mkpụrụ obi unu a na-etipu na unu na ebi ndụ akụkọ onye nyara ndụ oge ugbu a dị ka onye na-ata ahụhụ nke mmetọ, nlelị anya, ndị na-eyi egwu, ime ihe ike n’ụlọ, ma ọ bụ ntaram ahụhụ ọbụla yiri ụdị nke a. Unu nọ n’etiti nke oke mgbalị nke unu ịnya ndụ n’ọnọdụ nke na-emetụta nke ukwuu dị ka oke ụgbọ mmebi dị egwu ma ọ bụ ozi a tụrụ anya ga-eme nke ọma bụrụ ihe a kwụsịrị n’ike. A ga-enwe ike zọpụta gị; ị ga-adịkwa ndụ ruo n’isi akụkọ ịnya ndụ nke onwe gị?

Ọsịsa ya bụ ee. Ị pụrụ ịnya ndụ. N’ezie anapụtawo gị rịị; ị bụrụworịị onye a zọpụtara—site n’aka Onye ahụ nke taworo ahụhụ nke ahụhụ ahụ nnọọ ị na-ata ma nagide nnọọ oke mgbu ahụ nke ị na-anagide.1 Jizọs emeriwo mmetọ niile nke ụwa nke a2 inye gị ike ọ bụghị naanị ịnya ndụ mana otu ụbọchị, site na Ya, imeri ma ọbụna, merie—ibilite merie kpam kpam mgbu, oke ntaram ahụhụ, nhuju anya, ma hụ ka ejiri udo dochie ha.

Onyeozi Pọl jụrụ:

“Onye ga-ekewapụ anyị site n’ịhụnaanya nke Kraịst? Ọ bụ mkpagbu, ma ọ bụ oke mkpa, ma ọ bụ nsogbu, ma ọ bụ oke ụnwụ, ma ọ bụ ịgba ọtọ, ma ọ bụ ize ndụ, ma ọ bụ mma agha? …

“Mba, niime ihe ndị a nille anyị karịrị ndị nwe mmeri site na ya nke hụrụ anyị naanya.”3

Nkwa niile e kwere Israel Gbara ndụ

Ị ga-echeta mgbe Onyeisi Russell M. Nelson nyere ọkpụkpọ oku nke a na-esote n’ọgbakọ zuru ọha. Ọ sịrị: “Dị ka ị na-amụ akwụkwọ nsọ … , ana m agba gị ume idetu nkwa niile nke Onyenwe anyị kweworo nkwa na Ọ ga-emere Izrel gbara ndụ. E chere m na ọ ga-atụ gị n’anya!”4

Ndịa a bụ nnọọ ụzọ ole ma ole nke nkwa niile dị ike ma na-enye nkasi obi ezi na ụlọ anyị na-ahụwo. Tụgharịa uche hụ ka Onyenwe anyị na-ekwuru unu okwu ndị a—nye unu bụ ndị na-anya ndụ—niihi na ha bụ maka unu:

Atụla egwu.5

A maara m iru uju unu, ma a bịawo m ịnapụta unu.6

Agaghị m ahapụ unu.7

Aha m nọnyeere unu ma ndị mmụọ ozi m nwere oke na ọrụ ilekọta unu.8

Aga m eme ihe ndị dị ịtụnaanya n’etiti unu.9

Soro m na-eje; mụọ ihe banyere m; aga m enye unu ezumiike.10

A nọ m n’etiti unu.11

Unu bụ ndị m.12

Nye Ndị ahụ Bụ Ndị Na-anya ndụ

Site na mmasi obi ike ndị ahụ juru m n’uche, a chọrọ m ikwu n’ụzọ kwụ ọtọ nye ndị ahụ ọ na-emetụta dị ka ọ bụ na-enweghị ụzọ ha ga-esi enweta akụkọ ịnya ndụ nke onwe ha niihi nkụja etinyere site omume obi ịta mmiri nke ndị ọzọ. Ọ bụrụ na nke a bụ akụkọ ịnya ndụ nke gị, anyị so gị ebe akwa. Anyị na-enwe oke agụụ maka gị imeri mgbagwoju anya ahụ, ihere, na ụjọ, ma na-enwe agụụ maka gị, site na Jizọs Kraist, i nwe mmeri.

Site na Onye emegburu ruo na Onye nyara ndụ ruo na Onye nwe mmeri

Ọ bụrụ na inwetuwo nhụmiihe ụdịrị mmetọ ọbụla, mmegbu, ma ọ bụ ọchịchị aka ike, i nwere ike na-eche na ihe ndị a mere elemaanya bụ ihe ndị ịkpatara o ji mee ma na o ruuru gị iburu ihere ahụ na ikpe ọmụma i chere. I nwere ike chewo echiche ndị dị ka:

  • Agaara m egbochi nke a.

  • Chineke ahụzighị m naanya ọzọ.

  • Enweghị onye ga-ahụ m naanya ọzọ.

  • Emebiwo m nke na-enweghị mmeta.

  • Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta dịịrị ndị ọzọ mana orughịrị m.

Echiche ọjọọ na mmetụta ọjọọ ndị a nwere ike a bụrụwo ihe mgbochi nye ịchọ enyemaka site na ezi na ụlọ, ndị enyi, ndị ndu, ma ọ bụ ndị ọkachamara, ma si otu a imewo mgbalị naanị gị. Ọ bụrụ na ị chọwo enyemaka site n’aka ndị ịtụkwasịrị obi, ị ka nwekwara ike na-adọgbu onwe gị na-echiche nke ihere ma ọbụna na-asọ onwe gị oyi. Oke mmetụta nke ihe ndị a mere nwere ike ịnọgide ruo ọtụtụ afọ. Ị na-atụanya na otu ụbọchị ị ga-adị mma karịa, mana otu ọ dị, ụbọchị ahụ a ka abịabeghị.

Mmetọ ahụ abụraghị, bụghị, ma nweghị ike ị bụ ihe imetere, na-agbanyeghị ihe onye metọrọ gị ma ọ bụ onye ọbụla ọzọ nwere ike kwuwo imegide nke a. Mgbe ị ghọworo onye emegburu site n’aka onye obi tara mmiri, ndina ụgwa, ma ọ bụ njehie ọbụla ọzọ, ọ bụghị gị bụ onye nwere mkpa ichegharị; ọ bụghị gị ka ọ dị n’aka.

Dị ka mmadụ, ma ọ bụ dị ka nwaada ma ọ bụ nwa ọkpara nke Chineke, ị dịghị ntakịrị na ntozu oke ma ọ bụ baa uru ntakịrị ma ọ bụ bụrụ onye a hụrụ naanya n’ụzọ dị ntakịrị, niihi ihe onye ọzọ meworo gị.

Chineke ahụbeghị ugbu a, ma ọ bụ na o nwetuwo mgbe Ọ hụrụ, gị dị ka onye a ga-eleda anya. Ihe ọbụla na-emewo gị, ihere gị adịghị eme Ya ma ọ bụ nweghị ngharịpụ n’ebe ị nọ. Ọ hụrụ gị naanya n’ụzọ na-inwebeghị ike chọpụta. Ma ị ga achọpụta ya mgbe ị na-atụkwasị obi na nkwa Ya niile na mgbe ị na-amụ ikwere na Ya mgbe Ọ sịrị na ị “dị oke ọnụ ahịa n’anya [Ya].”13

Akọwaghị onye ị bụ site na oke ihe ọjọọ ndị a emeworo gị. Ị bụ, n’eziokwu dị ebube, onye a kọwara site na njirimara gị ama ama dị ebighị ebi dị ka nwa ọkpara ma ọ bụ nwaada nke Chineke ma site n’ịhụnaanya na-enweghị nsọtụ na ọkpụkpọ oku ịnata ọgwụgwọ dum bụ dam site n’aka Onye Okike gị zuru oke.

Na-agbanyeghị na o nwere ike yie ihe na-ekweghị omume, mee ka okweghị omume, ọgwụgwọ nwere ike bịa site na ọrụ ebube nke nnukwu ikike nke mgbapụta nke Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraist, onye na-ebiliwo “jiri ọgwụgwọ na nku ya.”14

Onye Nzọpụta anyị nwere obi ebere, nwere mmeri megide ọchịchịrị na mmetọ, nwere ike imezi ihe niile mebiri emebi, eziokwu na-enye ndụ maka ndị ahụ emejọrọ site n’aka ndị ọzọ.15

Biko mara na Onye Nzọpụta agbadatawo n’okpuru ihe niile, ọbụna ihe ahụ meworo gị. Niihi nke ahụ, Ọ maara kpọm kwem ihe ezigbo oke egwu na ihere dị ka ya na ka o si emetụta ị bụ onye a jụrụ ajụ ma merụọ ahụ.16 Site n’omimi ahụhụ nke aja mgbaghara mmehie Ya, Onye Nzọpụta na-enye olileanya nke I chere furu efu ruo ebighị ebi, ume nke I kwere na ịnweghị ike enwe, na ọgwụgwọ nke inwetụghị ike iche na o kwerer omume.

Agwa Iji okwu ọjọọ enye mkparị Bụ ihe Ekwutọrọ n’Ụzọ doro anya site n’aka Onyenwe anyị na site n’aka Ndị amụma Ya

E nweghị ebe e nwere maka ụdịrị mmetọ ọbụla—nke anụ ahụ, nke mmekọrịta nwoke na nwanyị, nke mkpụrụ obi, ma ọ bụ nke okwu ọnụ—na-ebe obibi ọbụla, mba ọbụla, ma ọ bụ omenaala ọbụla. E nweghị ihe ọbụla nke nwunye, nwata, ma ọ bụ di nwere ike ime ma ọ bụ kwuo ga-eme ka ha “kwesi” iti ihe. O nweghị onye ọbụla, nọ na mba ọbụla ma ọ bụ omenaala ọbụla, nọ mgbe ọbụla “na-arịọ maka” mbuso agha ma ọ bụ omume ike sitere n’aka onye ọbụla ọzọ nọ n’ọchịchị ma ọ bụ site n’aka mmadụ onye nke kacha nnukwu ma kacha sie ike.

Ndị ahụ na-emetọ ma na-achọ izo mmehie ha jọgburu onwe ya nwere ike lagbụrụ ya nwa mgbe nta. Mana Onyenwe anyị, onye na-ahụ ihe nille, maara ihe niile e mere na echiche niile, na nzube niile nke obi.17 Ọ bụ Chineke nke ikpe ziri ezi, ma ikpe ziri ezi Ya dị nsọ ka a ga-enye.18

N’ụzọ dị ebube, Onyenwe anyị bụkwa Chineke nke ebere nye ndị nwere ezi nchegharị. Ndị mmetọ—tinyere ndị ahụ bụ ndị emetọworo otu mgbe n’onwe ha—ndị na-ekwupụta, jụ mmehie ha, ma na-eme ihe niile dị n’ike ha iji nwee ntaram ahụhụ ma kwụghachi ụgwọ, nwere ohere ịnata mgbaghara mmehie site n’ọrụ ebube nke Aja mgbaghara mmehie nke Kraịst.

Maka onye e boro ebubo ụgha, arọ nke ọnụ apụghị ịkọ nke ebubo ụgha ndị a na-ebute ebe ntaram ahụhụ nke onwe ya Mana ha onwe hakwa bụ ndị a gọziri agọzi site na ahụhụ Onye Nzọpụta tara maka ha na mmata ihe na eziokwu ga-enwe mmeri ma emesịa.

Mana ndị na-eme mmetọ na-enweghị nchegharị ga-eguzo niihu Onyenwe anyị inye nkọwapụta maka mpụ ha jọgburu onwe ya.

Onyenwe anyị n’Onwe Ya mere ka o doo anya nke ọma na amamikpe Ya banyere mmetọ n’ụdị ọbụla: “ Mana onye ọbụla nke ga-emehie otu onye niime ndị a dị nta … , ọ gaara akara onye ahụ mma na anyanyere ya okwute eji mee akara n’olu ya, ma na ọ kaara ya mma na o rugburu n’ogbu nke oke osimiri.”19

Ngwụcha

Ezi ndị enyi bụ ndị e nyere ọnya dị egwu—ma niihi nke ahụ, onye ọbụla nke na-ediwo mmegide niile nke ndụ—unu nwere ike nwee mmalite ọhụrụ ma bido ọhụrụ. Na Getsemane na n’elu ugwu Kalvarị, Jizọs “wekwasịrị Onwe Ya … nhụjuanya na ntaram ahụhụ niile nke nhujuanya na ntaram ahụhụ mụ na gị na-enwetuwo oge ọbụla,”20 ma O meriwo ha niile! Site n’ogwe aka gbatịrị agbatị, Onye Nzọpụta nyere gị onyinye nke ọgwụgwọ. Site na mgbam ume, ndidi, na ilekwasị Ya anya n’okwukwe, mgbe na-adịghị anya inwere ike bịa n’uju ịnabata onyinye nke a. I nwere ike ichefu mgbu gị ma tọgbọ ya na nkwonkwo ụkwụ Ya.

Onye Nzọpụta gị dị nwayọọ mara ọkwa, “Onye ohi anaghị abịa, kama maka izu ohi, na igbu mmadụ, na ibibi: Ana m abịa ka [unu] wee nwee ndụ, nakwa ka [unu] wee nwejupụta ya n’uju.”21 Ị bụ onye nyara ndụ, ị pụrụ ịgwọ ọrịa, ma i nwere ike nwee ntụkwasị obi site n’ike na amara nke Jizọs Kraist, ị ga-emeri ma nwee mmeri.

Jizọs kachasị arụ ọrụ niihe ndị yiri ihe na-adịghị ekwe omume. Ọ bịara ebe a ime ka ihe na-anaghị ekwe omume wee kwe omume, ndị na-ekweghị enwe mgbapụta wee nwee mgbapụta, ịgwọ ndị na-ekweghị ọgwụgwọ, imezi ndị na-ekweghị mmezi, ikwe nkwa ndị na-enweghị nkwa.22 Ma Ọ na-eme ya otu dị mma. N’ezie, O zuru oke na ya. N’aha nke Jịzọs Kraịst, Onye Ọgwụgwọ anyị, amen.

Maka ozi ndị ọzọ na njụ niile, lee “Abuse” niime mpaghara Enyem aka Ndụ nọ na NzukọnsọnkeJizọsKraịst.org na niime app. Ọba akwụkwọ Ozi ọma.