Ọgbakọ Zuru ọha
Ọgbụgba ndụ niile anyị na Chineke gbara, Na-agba Anyị ume, echekwa, ma Na-akwado Anyị maka Otuto dị Ebighị ebi
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2022


Ọgbụgba ndụ niile anyị na Chineke gbara Na-agba Anyị ume, Echekwa, ma Na-akwado Anyị maka Otuto dị Ebighị ebi

Dị ka anyị na-ahọrọ ime ọgbụgba ndụ niile ma debe ha, a ga-agọzi anyị jiri ańụrị kacha niime ụwa nke a na ndụ ebighị ebi dị ebube na-abịa abịa.

Ụmụnne ndị nwanyị, olee ọńụ dị otu a ịgbakọta dị ka ụmụnne nwanyị na gburugburu ụwa! Dị ka ndịinyom ndị mere ma na-edebe ọgbụgba ndụ niile ha na Chineke, anyị nwekọrịtara njikọ nke ime mmụọ nke na-enyere anyị aka izute ihe aka mgba niile nke ụbịchị anyị ma kwadoo anyị maka Ọbịbịa Nke ugboro abụọ nke Jizọs Kraist. Ma idobe ọgbụgba ndụ niile ahụ na-enye anyị ohere ị bụ ndịinyom nwere ike mmetụta ndị nwere ike ịdọta ndị ọzọ nye Onye Nzọpụta.

Ndị ahụ emeworo baptizim gbara ndụ n’ụbọchị ahụ na-adịghị nchefu iwekwasị onwe ha aha nke Jizọs Kraist, ịdị na-echeta Ya mgbe niile, idebe iwu nsọ Ya niile, na ijere Ya ozi ruo ọgwụgwụ. Mgbe anyị mere ihe ndị a, Nna nke eluigwe na-ekwe nkwa ịgbaghara mmehie anyị niile ma nye anyị nsiso nke Mmụọ Nsọ. Ngọzi ndị a na-amalite anyị n’ụzọ ahụ nke na, ọ bụrụ na anyị anọgidesie ike gaaniihu ma nagide ruo ọgwụgwụ, ga-enye anyị ohere ibi anyị na Ya na Ọkpara Ya, Jizọs Kraist, na alaeze seleshal. Onye ọbụla emere baptizim nwere nkwa nke onyinye ndị a ma ọ bụrụ na ya bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị edobe ọgbụgba ndụ e mere n’ụbọchị ahụ pụrụ iche.

Ndị mekwuru ọgbụgba ndụ ndị ọzọ na tempụl na-anata nkwa ndị siri ike n’ọnọdụ ikwesị ntụkwasị obi nke onwe. Anyị ji umeala kwe nkwa irube isi na iwu nsọ niile nke Chineke, bie ndụ ozi ọma nke Jizọs Kraist, ibi ndụ ịdị ọcha na-enweghị ntụpọ, ma nyefee oge anyị na akaraka anyị n’aka nke Onyenwe anyị. N’ịkwụ ụgwọ, Chineke na-ekwe nkwa ngọzi ndị dị na ndụ nke a na ohere ịlọghachikwute Ya.1 N’usoro dị otu ahụ, enyere anyị, ma ọ bụ enyere site na onyinye nsọ, ike nke ịhụzi nke ọma n’etiti eziokwu na asị, n’etiti ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi, na igwe nke olu ndị mgbagwoju anya na ndị nke na-egbu mmụọ na-ebuso anyị agha. Lee oke onyinye dị otu a!

Na nkwadobe maka njem nke mbụ m na tempụl, nne m na ndị ụmụnne nwanyị ndị Otu Enyem aka nwere nhụmiihe nyeere m aka họta ihe ndị m ga-achọ, tinyere ọmarịcha uwe mmemme. Mana nkwado kachasị dị mkpa bịara ọbụna tupu amata ihe a ga-eyi. Mgbe a gbachara m ajụjụ ọnụ iji kpebie ma m tozukwara oke, bishọp m kọwara ọgbụgba ndụ niile m ga-eme. Nkọwa ọ kpachapụrụ anya nye nyere m ohere iche echiche gbasara ma dị na njikere ime ọgbụgba ndụ ndị ahụ.

Mgbe ụbọchị ahụ ruru, e soro m mee ihe na mmetụta nke obi ekele na udo. Ọbụna na-agbanyeghị na m aghọtaghị n’uju uru nke ọgbụgba ndụ niile ahụ m mere, a matara m na anyakọdoro mụ na Chineke site na ọgbụgba ndụ ndị ahụ ma e kwere nkwa ngọzi niile nke na-agaghị enye m nsogbu nghọta ma ọ bụrụ na m edobe ha. Kemgbe nhụmiihe nke mbụ ahụ, a gawo m niihu ịnata mmasi obi ike na idobe ọgbụgba ndụ niile anyị gbara anyị na Chineke na-enye anyị ohere inweta ike site n’ike nke Onye Nzọpoụta, nke na-agba anyị ume noge mnwale ndị anyị na-apụghị ịgbanarị, na-enye nchekwa site na-agha nke onye iro, ma kwadoo anyị maka otuto dị ebighị ebi.

Nhụmiihe nke ndụ nwere ike kwụrụ n’usoro sitere na nke na-atọ ọchị ruo na nke na-agbawa obi, sitere na nke tara akpụ ruo na nke na-enye otuto. Nhụmiihe nke ọbụla na-enyere anyị aka ịghọta karịa ịhụnaanya nke Nna anyị zuru oke na ike anyị iji gbanwee site na onyinye amara nke Onye Nzọpụta. Idobe ọgbụgba ndụ anyị niile na-enye ike nke Onye Nzọpụta ohere ịsachapụ anyị mgbe anyị na-amụ ihe site na nhụnmiihe—amaghị ma ọ bụ mkpehie ikpe dị nta ma ọ bụ ọdịda karịrị ukwuu. Onye Mgbapụta anyị nọ ebe ahụ ịghọta anyị mgbe anyị dara ma ọ bụrụ na anyị ga-elewa anya ebe Ọ nọ.

Foto, oyiyi
Inyuda ugwu site n’ijide eriri siri ike

I guzotuwo n’ebe ugwu dị elu kpọnyere ọnụ n’ala ebe mkpịsịrị ụkwụ gị niile begooro n’oke ya ma azụ gị adụnyere ndagwurugwu na-enweghị nsọtụ dị n’okpuru azụ? Mgbe ị na-enyuda jiri eriri siri ike, ọbụna na-agbanyeghị na-ekedosiri gị ike nke ọma n’usoro eriri ndị siri ike na ngwa ọrụ nwere ike ibudata gị na nchekwa, iguzo n’oke bụkwarịị ihe na-awụnye obi n’afọ. Ịzọghachi ụkwụ azụ pụọ n’oke ahụ na ịtụ akpọ banye niime ikuku dị gịrịgịrị bụ ihe chọrọ ntụkwasị obi n’okpi igwe ahụ ekechisịrị ike niihe na-enweghị nkwagharị. Ọ chọrọ ntụkwasị obi n’onye ahụ ga-adọsi eriri ahụ ike ka ị na-arịdata. Ma na-agbanyeghị na ngwa ọrụ ahụ na-enyetụ gị ike iji jikwata nrịda gị, ị ga-enwerịrị ntụkwasị obi na onye ọ bụ gị na ya agaghị ekwe ka ị daa.

Foto, oyiyi
Okpi igwe eji enyuda ugwu
Foto, oyiyi
Onyeinyom nta na-enyuda ugwu jiri eriri siri ike

E chetara m nke ọma mgbe mụ na otu ndịinyom nta naara enyuda jide eriri siri ike. A bụụra m onye mbụ niime otu ahụ ịmalite. Ka m zọghachiri ụkwụ azụ pụọ n’ugwu ahụ kpọnyere ọnụ n’ala, a malitere m ịda na-ejikwaghị onwe m. N’obi ekele, eriri ahụ kụjara ma mgbada ala m ahụ dị oke ọkụ ọkụ kwụsịrị. Dị ka m naara efegharị ruo otu ọkara ụzọ ịrịdata ihu nkume akpụ akpụ dị nkọ nke ogologo ugwu ahụ, e kpesịrị m ekpere ike maka onye ọbụla ma ọ bụ ihe ọbụla jidere m site na-ịdanye n’elu nkume ndị ahụ.

Ka emesịrị, a mụtara m na ekechisịghị ike okporo igwe eji emechi okpi igwe ahụ, ma mgbe m zọpụrụ ụkwụ pụọ n’oke ahụ, onye keere m eriri ka enuru aka mberede n’azụ ma dọrọ ya niike chuwe ihu n’oke nke ugwu ahụ kpọnyere ọnụ n’ala. Otu ọbụla, ọ fanyere ụkwụ ya megide ụfọdụ okwute. Mgbe ọ nọziri n’ọnọdụ ahụ, ọ bịara nwee ike gbalịsie ike kpọdata m, aka fere na aka, ya na eriri ahụ. Na-agbanyeghị na-enweghị m ike ịhụ ya, a maara m na o ji ike ya niile na-arụ ọrụ ịzọpụta m. Enyi ọzọ nọọra na ala ala nke ugwu ahụ kpọnyere ọnụ n’ala, kwadọọ ịghọta m ma ọ bụrụ na eriri ahụ kwụsịrị ijide. Ka m rutere ebe aka ruru, o jidere ụdọ eji kegide m ma kudata m ruo n’ala.

Ebe Jizọs Kraist bụ okpi igwe anyị na onye anyị na ya so zuru oke, anyị nwere mmasi obi ike n’ume nke ịhụnaanya Ya n’oge mnwale na nnapụta na-emecha bịa site na Ya. Dị ka Onyeisi M. Russell Ballard kuziri: “Okwukwe na Chineke na n’Ọkpara ya, Onyenwe anyị Jizọs Kraist, bụ … okpi igwe anyị na-ahaghị inwe na ndụ anyị ijidesị anyị ike n’oge niile nke oke nsogbu dị n’obodo na agwa ọjọọ. … Okwukwe anyị … garịrị ehiwe isi na Jizọs Kraist, ndụ ya na aja mgbaghara mmehie ya, na niime mweghachite nke ozi ọma ya.”2

Ngwa ọrụ nke ime mmụọ nke na-egbochi anyị site n’ịkụwasị n’elu nkume niile nke mkpagbu bụ ama anyị banyere Jizọs Kraist na ọgbụgba ndụ niile anyị na-eme. Anyị nwere ike ịdabere n’elu nkwado ndị a iduzi ma buru anyị ruo na nchekwa. Dị ka onye anyị na ya so dị na njikere, Onye Nzọpụta agaghị ekwe ka anyị daa karịa ebe aka Ya agaghị eru. Ọbụna n’oge ndị anyị nọ n’ahụhụ na mwute, Ọ nọ ebe ahụ ibuli anyị elu ma gbaa anyị ume. Ike Ya na-enyere anyị aka ịgbake site na mmetụta ọdịda ọtụtụ mgbe nke nhọrọ nke ndị ọzọ. Otu osila dị,anyị niile n’otu n’otu ahaghị iyiri ụdọ eji ekedo ihe ma hụ na ekechisiri akpụ ya niile ike. Anyị garịrị a họrọ ịbụ ndị ekedosiri ike na Onye Nzọpụta, ikedo anyị na Ya site na Ọgbụgba ndụ anyị.3

O lee otu anyị ga-esi mesie okpi igwe ahụ ike? Anyị na-ekpe ekpere n’obi dị umeala, na-amụ ma na-atụgharị uche n’akwụkwọ nsọ, rie oriri nsọ jiri mmụọ nke nchegharị na nkwanye ugwu, gbasie mbọ ike idebe iwu nsọ niile, ma gbasoro ndụmọdụ nke onye amụma. Ma mgbe anyị na-emejuputa ọrụ ndị anyị nwere ụbọchị niile n’ụzọ ndị “kacha dị elu ma kacha di nsọ”4, anyị na-aka enwe njikọ n’ebe Onye Nzọpụta nọ ma, n’otu oge ahụkwa, nyere ndị ọzọ aka bịakwute Ya.

Olee otu “ụzọ ahụ dị elu karịa ma dịrịkwa nsọ karịa” dị ka ya? Anyị na-agba mbọ ibi ndụ ozi ọma na ihe niile anyị na ndị mmadụ na-eme. Anyị na-elekọta ndị nọ na mkpa site n’ije ozi nlekọta n’ezie, na-egosipụta ịhụnaanya site n’ozi dị mfe. Anyị na-ekwusa ozi dị mma nke ozi ọma anyị na ndị ahụ nwere mkpa udo na ma “amaghị ebe a ga-achọta ya.”5 Anyị na-arụ ọrụ ijikọta ezi na ụlọ niile maka ebighị ebi n’akụkụ abụọ nke akwa mgbochi. Ma maka ndị ahụ meworo ọgbụgba ndụ n’ụlọ nke Onyenwe anyị, dị ka Onyeisi Russell M. Nellson kọwara, “Patron tempụl ọbụla gbara dimkpa ga-eyi uwe dị nsọ nke ọkwa nchụaja, [bụ nke] … na-echetara anyị … ije ije n’okporo ọgbụgba ndụ ụbọchị ọbụla n’ụzọ kacha dị elu ma kacha dị nsọ.”6 Ihe ndị a ana eme abụghị nnọọ ifesa ego kwamgbe kwamgbe kama ha dị oke mkpa nyere inwe ańụrị anyị kwa ụbọchị—na ọńụ anyị dị ebighị ebị.

Enweghị ihe ọbụla ọzọ kacha dị mkpa nye ịganiihu ebighị ebi anyị karịa idebe ọgbụgba ndụ anyị na Chineke niile. Mgbe ọgbụgba ndụ tempụl anyị dị n’ọrụ, anyị nwere ike nwee ntụkwasị obi n’ańụrị nke nzukọrịta anyị na ndị anyị hụrụ naanya nọ n’akụkụ nke ọzọ nke akwa mgbochi. Nwantakịrị ahụ ma ọ bụ onye nne/nna ma ọ bụ di/nwunye nke na-ebuwo ụzọ laa mmụọ na-atụanya n’obi ya niile na i ga-eguzosị ike na ọgbụgba ndụ niile nke jikọtara unu ọnụ. Ọ bụrụ na anyị eleghara anya ma ọ bụ were mee ihe efu ọgbụgba ndọ niile nke anyị na Chineke, anyị na-etinye njikọ ndị ahụ dị ebighị ebi na nsogbu. Ugbu a bụ oge ichegharị, rụzie, ma gbalịa ọzọ.

Ańụrị enweghị ihe dị ya ma ọ bụrụ na anyị agbanwee ngọzi niile nke ọńụ dị ebighị ebi maka inwere onwe na-adịghị adịgide. Na agbanyeghị afọ ole anyị gbara, nke ahụ bụ eziokwu niile dị ya: ọtụghe nye ańụrị na-adịgide bụ ibi ndụ ozi ọma nke Jizọs Kraist na idebe ọgbụgba ndụ niile nke anyị meworo. Onye amụma anyị, Onyeisi Nelson, ekwubiwo ya na “nchekwa anyị nke ikpeazụ na naanị ańụrị anyị dị nnagide dabeere n’ijide aka n’okporo igwe nke ozi ọma nke Jizọs Kraist eweghachitere, zuru oke ya na ọgbụgba ndụ ya niile na emume nsọ niile. Mgbe anyị mere otu a, anyị nwere ike merie ihe ọjọọ niile niihi na anyị nwere ohere inwete ike nke Chineke.”7

Ọtụtụ n’ime anyị na-agabiga ọtụtụ ọnọdụ ọjọọ. Dị ka ebili mmiri nke nhuju anya na-akwagharị anyị ma mgbe ụfọdụ ekpu anyị isi site na oke anya mmiri akwa na-abịa n’oge ihe isi ike ndị ahụ, anyị nwere ike gaghị ama ebe anyị ga-akwọala ụgbọ nke ndụ anyị. Anyị nwere ike chee na anyị enweghị ike ọbụna ịrute na ikpere mmiri. Icheta onye ịbụ—otu nwata Chineke hụrụ naanya—ihe mere iji bịa n’ụwa, na ebumnoobi gị banyere ibinyere chineke ma ndị ị hụrụ naanya nwere ike mee gị ahụ ụzọ nke ọma ma tụọrọ gị aka n’ụzọ ziri ezi. N’etiti oke ifufe mmiri ahụ, e nwere ihe na-enye ihe igosị ụzọ ahụ. A bụ m ìhè ahụ na-amụke n’ọchịchịrị,” Jizọs mara ọkwa.8 E nyere anyị mmasi obi ike maka nchekwa mgbe anyị lere anya na ihe Ya ma jigide nkwanye ugwu nke ọgbụgba ndụ anyị niile.

Ọ bụrụwo ohere dị iche izute ndịinyom gbara ogo afọ niile bi n’obosara ọnọdụ niile dị iche iche ndị na-edebe ọgbụgba ndụ ha niile. Ụbọchị ọbụla, ha na-elekwasị Onyenwe anyị na onye amụma Ya anya maka nduzi, karịa ile igwe e si ezisa ozi ama ama. Na-agbanyeghị aka mgba niile nke onye ọbụla niime ha na ọchịchọ inwe nghọta niile nke ụwa na-emebi iwu na-agbalị ịkwapụ ha ihu site n’idebe ọgbụgba ndụ ha, ha nwere mkpebi ị nọ n’ụzọ ọgbụgba ndụ. Ha na-adabere na nkwa nke “ihe niile [ahụ] Nna nwere.”9 Ma ihe ọbụla bụ afọ ole ịgbara, onye ọbụla niime unu ndịinyom nke meworo ọgbụgba ndụ niile ya na Chineke nwere ike ijigide ihe nke Onyenwe anyị ma duo ndị ọzọ nye Ya.10 Site n’idebe ọgbụgba ndụ gị niile, Ọ ga-agọzi gị jiri ike nke ọkwa nchụaja Ya ma nye gị ike inwe ike na-arụ ọrụ miri emi na ndi niile bụ ndị gị na ha na-emekọrịta ihe. Dị ka Onyeisi Nelson mara ọkwa, unu bụ ndịinyom ahụ ndị ga-emejupụta amụma niile nke ebuwororịị!11

Ezi ụmụnne nwanyị, karịsịa ihe niile, nọrọnụ n’ụzọ nke ọgbụgba ndụ na-eduba na Jizọs Kraist! A gọziwo anyị ị bịa n’ụwa n’oge tempụl juru gburugburu ụwa. Ime na idebe ọgbụgba ndụ niile nke tempụl bụ ihe dị nye onye otu Nzukọ nsọ ọbụla tozuru oke. Ndị dịmkpa nta, unu echela tutu alụm di na nwunye ma ọ bụ ije ozi mishọn iji mee ọgbụgba ndụ ndị ahụ dị nsọ. I nwere ike kwadoo dị ka onyeinyom nta ịnata nchekwa ahụ na ume nke ọgbụgba ndụ tempụl niile na-enye ozugbo agbachara afọ 18 dị ka ị dị na njikere ma nwee oke mmasị ịkwanyere emume nsọ ndị nke tempụl ahụ ugwu.12 Gị onye nke natawororịị ngọzi niile nke tempụl, e kwekwala ka ndị mmegharị anya ma ọ bụ ihe mmegharị anya niile dọpụ gị site n’eziokwu niile dị ebighị ebi. Mụọ ma jụọ ndị e si n’aka ha amata ihe ịtụkwasịrị obi maka nghọta kacha ukwuu banyere uru dị nsọ nke ọgbụgba ndụ niile i meworo. Gaa na tempụl ọtụtụ mgbe dị ka i nwere ike ma gee Mmụọ ahụ ntị. Ị ga-enweta mmasi obi ike dị ụtọ n’obi na ị nọ n’ụzọ nke Onyenwe anyị. Ị ga-achọta mgbam ume iji gaaniihu tinyekwara ịkpọta ndị ọzọ iso gị.

Ana m agba ama na dị ka anyị na-ahọrọ ime ọgbụgba ndụ niile anyị na Nna nke Eluigwe ma nwete ike nke Onye nzọpụta iji debe ha, a ga-agọzi anyị jiri ańụrị kacha niime ụwa nke a karịa ka anyị nwere ike iche ugbua na ndụ ebighị ebi dị ebube na-abịa abịa.13 N’aha nke Jizọs Kraịst, amen.