Akwụkwọ nsọ
1 Niphaị 9


Isi 9

Nifaị wee dee ụzọ akụkọ-ndekọta abụọ—Nke ọbụla n’ime ha ka a na-akpọ epekele nke Nifaị—Ndị nnukwu epekele ka e dere akụkọ ihe nke ụwa; ndị ntakịrị bụ ebe e dere akụkọ ihe ndị dị nsọ. Ihe dịka n’afọ 600 ruo 592 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ihe nile ndị a ka nna m hụrụ, ma nụkwa, ma kwuo kwa, oge obi n’ime ụlọ-ịkwuu dị na andagwụrụgwụ nke Lemuel, na kwa ọtụtụ nnukwu ihe ndị ọzọ, ndị ana-enweghị ike idepụta n’elu epekele ndị a.

2 Ma ugbua, dịka m kwuworo gbasara epekele ndị a, lee ha abụghị epekele ahụ nke m depụtara nkọwasị ndị m n’ujụ ya; n’ihi na aepekele ndị nke m deworo nkọwasị ndị m n’ujụ ka m nyere aha nke Nifaị; ya mere, a na-akpọ ya epekele nke Nifaị, bụ aha mụ onwe m; ma epekele ndị a kwa ka ana-akpọ epekele nke Nifaị.

3 Otu o sila dị, enwetawo m iwu-nsọ nke Onye-nwe na m kwesịrị ime epekele ndị a, n’ihi amkpa dị iche ọ dị na e kwesịrị ịkanye nkọwasị gbasara bije-ozi ọma ndị m.

4 N’elu epekele ndị nke ọzọ bụ ndị nke nnukwu ka a ga akanye nkọwasị nke ọchịchị ndị eze, na kwa agha nile, na ndọrọ-ndọrọ nile dị n’etiti ndị m; ya mere ihe e dere n’epekele ndị a kara bụrụ ihe gbasara ije-ozi ahụ; ma aepekele ndị ọzọ kara bụrụ ihe gbasara ọchịchị ndị eze na agha nile a lụrụ na esem-okwu dị n’etiti ndị m.

5 Ya mere, Onye-nwe enyewo m iwu ka m dee epekele ndị a maka aihe nke ya onwe-ya ma, nke mụ onwe m na-amaghị.

6 Ma Onye-nwe amaara ihe nile site na mmalite; ya mere, ọ na-edozi ụzọ ọ ga-esị mezuo ọlụ ya nile n’etiti ụmụ nke mmadụ; ma lee, o nwere bike nile imezu okwu ya. Ma otu a ka ọ dị. Amen.