Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 10


Nkeji 10

Mkpughe e nyere Joseph Smith Onye-amụma, na Harmony, Pennsylvania, na ọkọchị nke 1828 (History of the Church, 1:20–23). N’ebe a Onye-nwe na-agwa Joseph maka mgbanwe nke ndị ajọọ-mmadụ mere n’ibe-akwụkwọ 116 ahụ e jiri aka dee nke sitere na ntụgharị-asụsụ nke akwụkwọ nke Lihaị, n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn. Ibe-akwụkwọ ndị a e dere n’aka furu ebe Martin Harris dotara ha, onye nke e nyere ibe-akwụkwọ ndị a ka o dota nwantịị oge. (Lee isi-ọkwu nke Nkeji 3.) Atụmatụ ọjọọ ahụ bụ ka e chere ntụgharị-asụsụ ọzọ a na-ele anya ya nke okwu dị n’ibe-akwụkwọ ndị ahụ e zuru-ezu ma mgbe ahụ gosi na onye ntụgharị-asụsụ amaghị ihe site n’igosi ọdịche ndị mgbanwe a butara. Na ajọọ atụmatụ a bụ nke ajọọ-onye mere ma bụrụkwa nke Onye-nwe matararịị ọbụna mgbe Mọmọn, onye-akụkọ mgbe ochie nke ndị Nifaị, naara-edeputa na nkenke epekele nile e wekọtara, bụ nke e gosiri na Akwụkwọ nke Mọmọn (lee Okwu n’ile nke Mọmọn 1:3–7).

1–26, Setan na-akpalite ndị ajọọ-omume ịmegide ọrụ nke Onye-nwe; 27–33, Ọ na-achọ ibibi mkpụrụ-obi nile nke ndị mmadụ; 34–52, Ozi-ọma ahụ ga-agakwuru ndị Leman na mba nile site n’Akwụkwọ nke Mọmọn; 53–63, Onye-nwe ga-ehiwe Nzukọ-nsọ ya na ozi-ọma ya n’etiti ụmụ mmadụ; 64–70, Ọ ga-akpọkọta ndị chegharịrị baa n’ime Nzukọ-nsọ ya ma ga-azọpụtakwa ndị na-erube isi.

1 Ugbụa, lee, a sị m gị, na n’ihi na ị nyefere ihe odide nile nke ị nwere ike e nyere gị ịtụgharị-asụsụ site na aUrim na Tumim, n’aka nile nke bajọọ-mmadụ, i tufuwo ha.

2 Ma ị tụfukwara onyinye gị n’otu oge ahụ, ma auche gị abụrụ ihe gbara ọchịchịrị.

3 Otu osila dị, ugbua e awetaghachikwala ya ọzọ nye gị; ya mere hụ na ị kwesịrị ntụkwasị obi ma gaa-n’iru n’ịrụchapụ ọrụ nke fọdụrụ n’ime ntụgharị-asụsụ ahụ dịka ị bidoworo.

4 Agbakwala aọsọ karịa ma-ọbụ ịrụ-ọrụ karịa bịkịke gị na ngwa-ọrụ e nyere gị ka i jiri na atụgharị-asụsụ; mana crụsịe ọrụ ike ruo ọgwụgwụ.

5 aKpee ekpere oge nile, ka ị bụrụ onye mmeri; e, ka ị wee nwee ike merịe Setan, ma ka ị wee nwee ike gbanarị aka nile nke ndị odibo Setan ndị na-akwado ọrụ ya.

6 Lee, ha achọwo aibibi gị; e, ọbụna bnwoke ahụ nke ị tụkwasịrị ọbi achọwo ibibi gị.

7 Ma n’ihi nke a a sị m na ọ bụ ajọọ-mmadụ, n’ihi na ọ chọwo iwere ihe nile a ranyere n’aka gị; ma ọ chọwokwa ibibi onyinye gị.

8 Ma n’ihi ị nyefewo ihe odide nile n’aka ya, lee, ndị ajọọ-mmadụ ewerewo ha site n’aka gị.

9 Ya mere, ị nyefewo ha, e, nke ahụ dị-nsọ, nye ajọọ-omume.

10 Ma, lee, aSetan e tinyewo ya n’ime obi ha nile ịgbanwe okwu nile nke i mere ka e depụta, ma-ọbụ nke ị tụgharịworo, nke pụworo site n’aka gị.

11 Ma lee, a sị m gị, na n’ihi na ha agbanwewo okwu nile, ha pụtara ihe ọzọ n’abụghị nke ị tụgharịrị ma sịkwa ka e dee;

12 Ma, site na nke a, ekwensu achọwo ịtụ atụmatụ aghụghọ, ka o jiri bibie ọrụ nke a;

13 N’ihi na o tinyewo n’obi ha nile ime nke a, ka site n’ikwu okwu ụgha ha nwere-ike sị na ha aejidewo gị n’ime okwu nile ị chere na ị tụgharịrị.

14 N’ezie, a sị m gị, n’agaghị m ekwe ka Setan mezue ebum-n’obi ọjọọ ya n’ime ihe a.

15 N’ihi na, lee, o tinyewo n’obi ha inweta gị ka ị nwaa Onye-nwe Chineke gị, n’ịrịọ ka ịtụgharịa kwa ya ọzọ.

16 Ma mgbe ahụ, lee, ha na-ekwu ma na-eche n’ime n’obi ha—Anyị ga-ahụ ma Chineke onyere ya ike ịtụgharị-asụsụ, ọbụrụ otu a, ọ ga-enye ya ike ọzọ;

17 Ma ọbụrụ na Chineke enye ya ike ọzọ, ma-ọbụ ọ tụgharịa-asụsụ ya ọzọ, ma-ọbụ, n’ikwu ya n’uzọ ọzọ, ọbụrụ na ya ewepụta otu-udi okwu ndị ahụ, lee, anyị ji otu okwu ndị ahụ, ma anyị agbanwewo ha;

18 Ya mere ha agaghị ekwekọta, ma anyị ga-asị na o kwuwo okwu ụgha n’okwu ya nile, ma na o nweghị onyinye, ma na o nweghị ike ọbụla;

19 Ya mere anyị ga-ebibi ya, makwa ọrụ ahụ; na anyị ga-eme ihe nke a ka anyị ghara inwe ihere n’ikpe-azụ, na ka anyị nweta otuto nke ụwa.

20 N’ezie, n’ezie, a sị m gị, na Setan jịsịrị obi ha nile aka ike; ọ ana-akpalite ha ime bajọọ-omume megide nke ahụ bụ ihe-ọma;

21 Ma obi ha arere-ure, ma jupụta bn’ajọọ-omume na ihe arụ nile; ma ha chụrụ dọchịchịrị n’anya karịa ìhè; n’ihi na eomume ha bụ ihe-ọjọọ; ya mere ha agaghị-arịọ m.

22 aSetan na-akpalite ha elu, ka o nwee-ike bịduru mkpụrụ obi ha nile ruo na mbibi.

23 Ma otu a ọ tọọla atụmatụ aghụghọ, na-eche ịkwatu ọrụ nke Chineke, mana a ga m-achọ nke a n’aka ha nile, ma ọ ga-atụgharị buru ha ihe ihere na amamikpe n’ụbọchị aikpe.

24 E, ọ na-akpalite obi ha nile elu n’iwe megide ọrụ a.

25 E, ọ sịrị ha: Duhie ma dinaa na-nche ijide, ka unu nwee ike ibibi; lee, nke a abụghị ihe ọjọọ. Ma site otu a ọ na-ajafu ha, ma gwa ha n’ọbụghị mmehie aịgha-ụgha ka ha wee jide onye ọzọ n’ịgha-ụgha, ka ha bibie onye ahụ.

26 Ma otu a ire-ụtọ ya ana-edukwa ha n’aga rue mgbe ọ ga-adọkpụrụ mkpụrụ-obi ha nile gbada bala-mụọ; ma otu a o butere ha ijide onwe ha cn’ọnya ha siri.

27 Ma otu a ọ na-aga n’elu na n’ala, ana-aga n’iru ma n’azụ n’ụwa, na-achọ bibibi mkpụrụ-obi nile nke ụmụ mmadụ.

28 N’ezie, n’ezie, a sị m gị, ahụhụ ga-adịrị onye ahụ na-agha ụgha iji aduhie n’ihi na o chere na onye ọzọ na-agha ụgha iji duhie, n’ihi na agụpụghị ndị dị otu a site bn’ikpe ziri-ezi nke Chineke.

29 Ugbua, lee, ha agbanweworịị okwu ndia nile n’ihi na Setan sịrị ha: O duhiewo unu—ma site otu a ọ na-ajafu ha ịme ajọọ-omume iji nweta gị aịnwa Onye-nwe Chineke gị ọnwụnwa.

30 Lee, a sị m gị, na ị gaghị atụgharị-asụsụ okwu nile ndị ahụ ọzọ nke siworo n’aka gị pụọ;

31 N’ihi na, lee, ha agaghị-emezu atụmatụ ihe-ọjọọ ha nile site n’ịgha-ụgha megide okwu ndị ahụ. N’ihi na lee, ọbụrụ na i depụtakwa otu okwu ndị-ahụ ha ga-ekwu na ị ghara-ụgha ma na i mere dịka ị tụgharịrị-asụsụ, kama na ị deela degide onwe gị.

32 Ma, lee, ha ga-ebipụta nke a, ma Setan ga-emesi obi ndị mmadụ ike ka ọ kpasuo ha iwe megide gị, na ha agaghị ekwere okwu m nile.

33 Si otu a aSetan na-eche imeri ọgbụgba-ama gị n’ọgbọ nke a, ka ọrụ ahụ ghara ịpụta-ìhè n’ọgbọ nke a.

34 Mana lee, n’ebe a ka amamihe dị, ma n’ihi na m na-egosi gị aamamihe, ma nye kwa gị iwu-nsọ nile gbasara ihe ndia nile, ihe i ga-eme, ezikwala ya ndị ụwa, ruo mgbe i mesịrị ọrụ nke ntụgharị-asụsụ.

35 Ya atụla gị n’anya na a sị m gị: N’ebe a ka amamihe dị, ezikwala ya ndị ụwa—n’ihi asiri m ezikwala ya ndị ụwa, ka e nwee-ike chekwaa gị.

36 Lee, asịghị m na ị gaghị egosikwa ya ndị ezi-omume;

37 Mana n’ihi na ị gaghị enwe ike ikpe aonye ezi-omume ikpe, ma-ọbụ n’ihi na i gaghị enwe ike ịmata ajọọ-mmadụ oge nile site n’onye ezi-omume ya mere a sị m gị, bgba-nkịtị ruo mgbe m ga-ahụ na o kwesịrị ime ka ihe nile pụta ìhè n’ụwa nile gbasara okwu a.

38 Ma ugbua, n’ezie a sị m gị, na nkọwasi aihe nile nke ndị ahụ ị deworo, nke siworo gị n’aka pụọ, bụ ihe akanyeworo n’ime bepekele nile nke Nifaị;

39 E, ma ị chetara na e ekwuru na n’ime ihe-odide nile ndị ahụ na nkọwasị pụrụ iche ka e nyere maka ihe ndị a n’elu epekele nile nke Nifaị.

40 Ma ugbua, n’ihi na nkọwasi nke a kanyere n’elu epekele nile nke Nifaị pụrụ iche gbasara ihe nile nke, n’ime amamihe nke m, a ga m eweta na ọmụma-ihe nke ndị mmadụ na nkọwasi nkea—

41 Ya mere, ị ga-atụgharị-asụsụ ihe nkanye nile ndị nọ an’epekele nile nke Nifaị, gbada ruo mgbe ịbịaruru n’oge ọchịchị nke eze Benjamịn, ma-ọbụ ruo mgbe i bịaruru ndị nke ị tụgharịrị mbụ, ndị ahụ ịdebere;

42 Ma lee, ị ga-ekwụpụta ya dịka akụkọ-ndepụta nke Nifaị ma otu a aga m enye ndị gbanwere okwu m mgbagwoju anya.

43 A gaghị m ekwe na ha ga-ebibi ọrụ nke m; e, a ga m ezi ha na amamihe m karịrị aghụghọ nke ekwensu.

44 Lee, ha nwetara nanị otu akụkụ, ma-ọbụ nwa nkenke nke nkọwasi nke Nifaị.

45 Lee, enwere ọtụtụ ihe nkanye dị n’epekele nke Nifaị ndị na-enye nkọwa pụtara ìhè nye ozi-ọma m; ya mere, ọ bụ amamihe n’ime m na ị ga-atụgharị akụkụ nke mbụ nke nkanye nile Nifaị, ma zipụ n’ọrụ nke a.

46 Ma, lee, nke fọdụrụ an’ọrụ a nwere akụkụ nile nke bozi-ọma m nke ndị-amụma m nile dị nsọ, e, nakwa ndị na-eso ụzọ m, cchọrọ nime ekpere ha ka ọ pụta-ìhè rute ndị mmadụ ndị a.

47 Ma a sịrị m ha, na-aga aemere ha dịka bokwukwe ha si dị n’ekpere ha nile;

48 E, ma nke a bụ okwukwe ha—ka ozi-ọma m, nke m nyere ha ka ha kwusa n’ụbọchị ha nile, ka ọ bịakwute ụmụnne ha bụ andị Leman, nakwa ndị nile bụrụwororị ndị Leman n’ihi nghọtahie.

49 Ugbua, nke a abụghị ọgwụgwụ ya—okwukwe ha na ekpere ha nile bụ na ekwesịrị ime ka amata ozi-ọma nkea, ọbụrụ na ọ ga-ekwe mee ka mba nile ndị ọzọ nwee ala nke a;

50 Ma otu a ha hapụrụ ngọzi n’elu ala nke a n’ekpere ha, ka onye ọbụla ga-ekwere n’ozi-ọma ahụ n’ala nke a ga-enwe ndụ ebighi-ebi.

51 E, ka ọ bụrụ n’akwụghị-ụgwọ nye ndị nile si mba ọbụla, ebo, asụsụ, ma-ọbụ ndị mmadụ ha ga-abụ.

52 Ma ugbua, lee, dịka okwukwe ha siri dị n’ekpere ha ka m ga-eji weta akụkụ ozi-ọma m nke a na mmata nke ndị nke m. Lee, e wetaghị ya iji bibie nke ahụ ha nataworo, kama ka e wulie ya elu.

53 Ma n’ihi nkea ka m jiri sị: Ọbụrụ na ọgbọ nke a emesighị-obi ha ike, a ga m ehiwe nzukọ-nsọ m n’etiti ha.

54 Ugbua ekwughị m nke a iji bibie nzukọ-nsọ m, kama a na m ekwu nkea iwulite nzukọ-nsọ m;

55 Ya mere, onye ọbụla bụ onye nzukọ-nsọ m ekwesighị aịtụ egwu, n’ihi onye dị otu a bga-eketa cala-eze nke elu-igwe.

56 Mana ọ bụ ha bụ ndị n’adịghị aatụ m egwu, ma-ọbụ debe iwu-nsọ m nile kama na-ewu bnzukọ-nsọ nile nye onwe ha ịnweta curu, e, ma ndị nile na-eme ajọọ-omume ma na-ewulite ala-eze nke ekwensu—e, n’ezie, n’ezie, a sị m gị, na ọ bụ ha ka m ga-enye nsogbu, ma mee ka ha maa-jijiji na megharịakwa arụ ruo n’etiti ha.

57 Lee, a bụ m Jisus Kraịst aỌkpara nke Chineke. A bịakwutere m ndị nke m, ma ndị m a nabataghị m.

58 A bụ m aìhè ahụ na-amụke n’ọchịchịrị, ma ọchịchịrị ahụ aghọtaghị ya.

59 A bụ m onye ahụ sịrị—E nwere m aatụrụ bndị ọzọ ndị na-abụghị nke ogige-atụrụ nke a—nye ndị na-eso-ụzọ m, ma ọtụtụ ka ha dị bụ ndị cn’aghọtaghị m.

60 Ma a ga m egosi ndị a na m nwere atụrụ ndị ọzọ, na ha bụ ngalaba nke aụlọ nke Jekọb;

61 Ma a ga m ewepụta n’ìhè, ọrụ ịtụ n’anya ha nile, nke ha rụrụ n’aha m;

62 E, ma a gakwa m ewepụta n’ìhè ozi-ọma nke m nke a kuzịrị ha, ma, lee, ha agaghị agọnarị nke ahụ ị nataworo, kama ha ga-ewuli ya elu, ma wepụta na ìhè ezi okpụrụkpụ okwu nile nke aozizi m, e, ma nanị ozizi nke dị n’ime m.

63 Ma nke a ka m na-eme ka m wee hiwe ozi-ọma nke m, ka a ghara inwe oke ndọrọ ndọrọ; e, aSetan na-akpalite obi nile nke ndị mmadụ na bndọrọ-ndọrọ gbasra ọkpụrụkpụ okwu nile nke ozizi m; ma n’ime ihe nile a ha na-emejọ, n’ihi na ha cna-emegharị akwụkwọ-nsọ nile ma ha aghọtaghị ha.

64 Ya mere, a ga m egọsi ha ihe-omimi ukwu nke a;

65 N’ihi na, lee, a ga m aachịkọ ha dịka nnekwu ọkụkọ na-esi-achịkọta ụmụ nke aka ya n’okpuru nku ya abụọ, m’ọbụrụ na ha agaghị emesị obi ha ike;

66 E, ọbụrụ na ha ga-abịa, ha nwere ike, ma keta oke site na ammiri nile nke ndụ na akwụghị-ụgwọ.

67 Lee, nke a bụ ozizi m—onye ọbụla chegharịrị ma abịakwute m, onye ahụ bụkwa bnzukọ-nsọ m.

68 Onye ọbụla akwusara karịa ma-ọbụ nke dị nta karịa nke a, onye ahụ abụghị nke m, kama ọ na bemegide m; ya mere ọbụghị kwa nzukọ-nsọ m.

69 Ma ugbua, lee, onye ọbụla bụ nke nzukọ-nsọ m, ma nọgidekwa na nzukọ-nsọ m ruo ọgwụgwụ, ya ka m ga-ehiwe n’elu aoke nkume m, ma bọnụ-ụzọ-ama nke ala-mụọ agaghị akakwa ha ike.

70 Ma ugbua, chetakwa okwu nile nke onye ahụ bu ndụ na aìhè nye ụwa nile, Onye mgbapụta gị, bOnye-nwe gị na Chineke gị. Amen.