Akwụkwọ nsọ
Alma 29


Isi 29

Alma chọrọ iti mkpu nchegharị jiri ọnụnụ ọkụ n’obi nke mụọ-ozi—Onye-nwe nyere ndị nkụzi maka mba nile—Alma nwere an̄ụrị n’ọrụ nke Onye-nwe na n’inwe mmeri nke Amọn na ụmụnne ya nwoke. Ihe dịka n’afọ 76 tutu amụọ Kraịst.

1 O asị na m bụ onye mụọ-ozi, ma nwere ike inweta ọchịchọ nke obi m, na m ga-enwe ike gagharịa ma jiri opi nke Chineke kwuo okwu, n’olu nke ga-ama ụwa jijiji, ma tie mkpu nchegharị nye ndị ọbụla!

2 E, aga m ekwupụtara mkpụrụ-obi ọbụla, dịka n’olu nke egbe-elu-igwe, nchegharị na atụmatụ nke mgbapụta, ka ha wee chegharịa ma abịakwute Chineke anyị, ka a ghara inwe mwute ọzọ n’elu iru nile nke ụwa.

3 Mana lee, abụ m nwoke, ma na-eme mmehie n’ọchịchọ m; n’ihi na ekwesịrị m inwe afọ-ojujụ n’ihe nile nke Onye-nwe nyeworo m.

4 Ekwesịghị m inye onwe m ntaram-ahụhụ n’ọchịchọ m nile iwu ahụ kwụsiri ike nke Chineke nke ikpe zịrị-ezi, n’ihi na ama m na ọ na-enye ụmụ mmadụ dịka aọchịchọ ha siri dị, ma-ọbụ nke ruo nʼịnwụ ọnwụ ma-ọbụ nke ruo na ndụ; e, ama m na ọ na-enye ụmụ mmadụ, e, na-enye ha iwu nke a na-enweghị ike ịgbanwe, dịka buche ha nile siri dị, ma ha bụ ruo na nzọpụta ma-ọbụ ruo na mbibi.

5 E, ma a matara m na mma na njọ abịawo n’iru mmadụ nile; onye nke na-amaghị ihe dị mma site na ihe dị njọ enweghị ụta; mana onye nke amatara ihe dị mma na ihe dị njọ, ya ka a ga-enye dịka ọchịchọ ya nile siri dị, ma ọ chọrọ mma na ọbụ njọ, ndụ ma-ọbụ ọnwụ, ọn̄ụ ma-ọbụ bmụọ nke ịkwa mmakwaara.

6 Ugbua, ebe m hụrụ na m matara ihe nile ndị a, gịnị mere m ga-eji chọọ karịa ime nanị ọrụ ahụ nke a kpọworo m ịrụ?

7 Gịnị mere m ga-eji chọọ ka m bụrụ mụọ-ozi, ka m wee-nwe ike ịgwa nsọtụ nile nke ụwa okwu?

8 N’ihi na lee, Onye-nwe, na-enye amba nile, site na mba nke onwe ha na basụsụ ha, ịkụzi okwu ya, e, n’amamihe, ihe nile ọ chụrụ dị mma ka ha nwere; ya mere anyị hụrụ na Onye-nwe na-enye ndụnọdụ na amamihe, dịka ihe ahụ nke zịrị ezi ma bụrụ ezi-okwu siri dị.

9 A matara m ihe ahụ nke Onye-nwe nyeworo m iwu, ma a na m an̄ụrị ọn̄ụ n’ime ya. Anaghị m aan̄ụrị n’ike nke onwe m, kama a na m an̄ụrị n’ihe ahụ nke Onye-nwe nyeworo m n’iwu; e, ma nke a bụ an̄ụrị m, na eleghị anya aga m abụ ngwa-ọrụ n’aka nile nke Chineke iweta ụfọdụ mkpụrụ-obi na nchegharị; ma nke a bụ ọn̄ụ m.

10 Ma lee, mgbe m na-ahụ ọtụtụ ụmụnne m nwoke chegharịrị n’ezi-okwu, ma na-abịakwute Onye-nwe Chineke ha, mgbe ahụ ka mkpụrụ-obi m jupụtara na ọn̄ụ; mgbe ahụ ana m echeta aihe Onye-nwe mewooro m, e, ọbụna na ọ nụwo ekpere m; e, mgbe ahụ aga m echeta aka ebere ya nke o setịpụrụ n’ebe m nọ.

11 E, ma echetakwara m ndọkpụ n’agha nke ndị nna m ha; n’ihi na a matara m n’ezi-okwu na aOnye-nwe napụtara ha site n’ịbụ-oru, ma site na nke a o hiwere nzukọ-nsọ ya; e, Onye-nwe Chineke, Chineke nke Abraham, Chineke nke Aịsak, na Chineke nke Jekọb, napụtara ha site n’ịbụ-oru.

12 E, a na m echeta oge nile ndọkpụ n’agha nke ndị nna m ha; ma otu Chineke ahụ nke anapụtara ha site n’aka nile nke ndị Ijipt napụtara ha site n’ịbụ-oru.

13 E, ma otu Chineke ahụ hiwere nzukọ-nsọ ya n’etiti ha; e, ma otu Chineke ahụ akpọwo m site n’ọkpụkpọ dị nsọ, ikwusa okwu ahụ nye ndị ya, ma o nyewo m nnukwu mmeri, nke mere na aọn̄ụ m juru-eju.

14 Mana anaghị m enwe ọn̄ụ na mmeri nke nanị onwe m, kama ọn̄ụ m kara juo eju n’ihi ammeri nke ụmụnne m nwoke, ndị garuworo ala nke Nifaị.

15 Lee, ha arụwo ọrụ karịa, ma ha amịpụtawo nnukwu mkpụrụ; ma olee ka nnukwu ụgwọ ọrụ ha ga-adị!

16 Ugbua, mgbe m na-eche maka mmeri nke ụmụnne m ndị nwoke a mkpụrụ-obi m ka ana-ebupụ, ọbụna ruo n’ikewapụ ya site n’arụ, dịka o siri dị, otu a ka ọn̄ụ m siri dị ukwuu.

17 Ma ugbua, ka Chineke kwenyere ụmụnne m nwoke ndị a, ka ha nwe ike nọdụ ala n’ala-eze nke Chineke; e, na kwa ndị nile bụ mkpụrụ nke ọrụ aka ha nile ka ha wee ghara ịpụ kwa ọzọ, kama ka ha wee-too ya ruo mgbe nile. Ma ka Chineke kwere ka e mee ya dịka okwu m nile siri dị, ọbụna dịka m kwuworo. Amen.