Akwụkwọ nsọ
Hilaman 8


Isi 8

Ndị ikpe ruru inyi wee chọọ ịkpasu ndị ahụ iwe megide Nifaị—Abraham, Moses, Zinọs, Zinọk, Izaịas, Aịsaịa, Jeremaịa, Lihaị, na Nifaị ha nile gbara ama maka Kraịst—Site na nkwalite nke mụọ Nifaị wee kwupụta ogbugbu nke onye-isi-ikpe. Ihe dịka nʼafọ 23 ruo 21 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua o wee ruo na mgbe Nifaị kwuworo okwu ndị a, lee, e nwere ndị nwoke ndị bụ ndị-ikpe, ndị bụ kwa ndị otu nzuzo nke Gadiantọn, ma iwe were ha, ma ha tipụtara mkpu megide ya, na-asị ndị ahụ: Gịnị mere unu ejideghị nwoke a ma kpọta ya, ka e wee ma ya ikpe dịka mmebi-iwu nke o meworo siri dị?

2 Gịnị mere unu jiri na-ahụ nwoke nke a, ma na-anụ ka ọ na-ekwugide ndị a na imegide iwu anyị?

3 N’ihi na lee, Nifaị agwawo ha okwu gbasara iru-inyi nke iwu ha; e, ọtụtụ ihe ka Nifaị kwuru nke a na-enweghị ike ide-ede; ma ọdịghị ihe o kwuru nke megidere iwu-nsọ nile nke Chineke.

4 Ma ndị-ikpe ahụ weere ya iwe n’ihi na ọ agwara ha okwu kwere nghọta gbasara ọrụ-nzuzo ha nile nke ọchịchịrị; otu o sila dị, ha anwaghị-anwa ibịtụ aka nke onwe ha nʼarụ ya, n’ihi na ha tụrụ egwu ndị ahụ eleghị anya ha etipụ mkpu megide ha.

5 Ya mere ha tikuru ndị ahụ, na-asị: Gịnị mere unu jiri kwe nwoke a ka o kwugide anyị? N’ihi na lee ọ mara ndị a nile ikpe, ọbụna ruo na mbibi; e, ma kwa na nnukwu obodo-ukwu anyị ndị a a ga-anapụ anyị ha, nke bụ na ọdịghị kwa ebe anyị ga-enwe nʼime ha.

6 Ma ugbua anyị matara na nke a agaghị-ekwe omume, n’ihi na lee, anyị siri ike, ma obodo-ukwu anyị nile dị ukwuu, ya mere ndị-iro anyị agaghị enwe ike imeri anyị.

7 Ma o wee ruo na otu a ka ha siri kpalite ndị ahụ iwe iwe megide Nifaị, ma palite ndọrọ-ndọrọ nʼetiti ha; n’ihi na e nwere ụfọdụ ndị tipụrụ mkpu: Hapụ nwoke a ka ọ nọdụrụ onwe ya, n’ihi na ọ bụ ezigbo nwoke, ma ihe ndị ahụ ọ na-ekwu ga-emezurịrị ma ọbụghị na anyị chegharịrị;

8 E, lee, ikpe nile ahụ ga-abịakwasị anyị ndị nke ọ gbaworo ama ha nye anyị; n’ihi anyị matara na ọ gbaara anyị ama ezi-okwu gbasara ajọọ-omume anyị nile. Ma lee ha dị ọtụtụ, ma ọ amatara nke-ọma ihe nile nke ga-adakwasị anyị dịka ọ matara maka ajọọ-omume anyị nile;

9 E, ma lee, ọ bụrụ na ọ bụghị onye-amụma ọ garaghị agba-ama gbasara ihe ndị ahụ.

10 Ma o wee ruo na ndị ahụ chọrọ ibibi Nifaị ka a manyere n’ihi ịtụ-egwu ha, nke mere na ha ebitụghị aka ha nʼarụ ya; ya mere o malitekwara ọzọ ịgwa ha okwu, ebe ọ hụrụ na ya e nwetawo nkwado nʼanya ụfọdụ, nke mere na ndị nke fọdụrụ nʼime ha tụrụ egwu.

11 Ya mere a kwagidere ya ikwuru ha ọzọ na-asị: Lee, ụmụnne m nwoke, unu agụbeghị na Chineke nyere otu onye ike, ọbụna Moses, itikwasị nʼelu mmiri nile nke aOsimiri Uhie ahụ, ma ha gbasasịrị nʼebe a nʼebe nke ọzọ, nke mere na ndị Israel, ndị bụụrụ ndị nna anyị ha, gafere nʼelu ala-akọrọ, ma mmiri nile ahụ kpuchikwasịrị ndị-agha nile nke ndị Ijipt ma lochapụ ha?

12 Ma ugbua lee, ọbụrụ na Chineke nyere nwoke a ike dị otu a, mgbe ahụ gịnị mere unu jiri na-arụ ụka nʼetiti unu nʼonwe unu, ma sị na ọdịghị ike o nyeworo m nke m ga-eji mata gbasara ikpe-ikpe nile nke ga-abịakwasị unu ma ọbụghị na unu chegharịrị?

13 Mana, lee, ọbụghị nanị na unu na-agọnarị okwu m nile, kama unu na-agọnarị kwa okwu nile nke ndị nna anyị ha kwuworo, na kwa okwu nile nke e kwuworo site nʼọnụ nwoke a, Moses, onye nwere ike dị otu a e nyere ya, e, okwu ndị ahụ nke o kwuworo gbasara ọbịbịa nke Mesaịa ahụ.

14 E, ọ gbaghị ama na Ọkpara nke Chineke ga-abịa? Ma dịka o abulitere agwọ-ọla-bras ahụ nʼime ọzara ahụ, ọbụna otu ahụ ka a ga-ebulite ya elu bụ onye ga-abịa.

15 Ma ka ha ra bụ ndị ga-elekwasị agwọ ahụ anya aga-adị ndụ, ọbụna otu ahụ ka ha ra bụ ndị ga-elekwasị Ọkpara nke Chineke anya nʼokwukwe, nwee mụọ nke nchegharị, bga-adị ndụ, ọbụna ruo na ndụ nke ahụ dị mgbe ebighi-ebi.

16 Ma ugbua lee, Moses nanị agbaghị ama maka ihe ndị a, kama andị-amụma nile dị nsọ kwa, site nʼụbọchị ya nile ọbụna ruo nʼụbọchị nile nke Abraham.

17 E, ma lee, aAbraham hụrụ maka ọbịbịa ya, ma o jupụtara nʼoke ọn̄ụ ma ọ n̄ụrịrị ọn̄ụ.

18 E, ma lee a sị m unu, na Abraham nanị amataghị maka ihe ndị a, kama aha dị ọtụtụ tutu ụbọchị nile nke Abraham ndị a kpọrọ site bnʼusoro nke Chineke; e, ọbụna nʼụdị usoro nke Ọkpara ya; ma nke a ka e wee gosị ya ndị ahụ, nnukwu ọtụtụ puku afọ tutu obibịa ya, ka ọbụna mgbapụta ga-abịakwasị ha.

19 Ma ugbua ọ ga-adị m mma ka unu mata, na ọbụna site nʼụbọchị nile nke Abraham e nwewo ọtụtụ ndị-amụma ndị gbaworo ama ihe ndị a; e, lee, onye-amụma aZinọs gbara ama nʼenweghị-egwu; n’ihi nke e jiri gbuo ya.

20 Ma lee, aZinọk kwa, na Izaịas kwa, na bAịsaịa kwa, na cJeremaịa, (Jeremaịa ebe ọ bụ otu onye-amụma ahụ nke gbara ama maka mbibi nke dJerusalem) ma ugbua anyị matara na Jerusalem e bibiri ya dịka okwu nile nke Jeremaịa siri dị. O mgbe ahụ gịnị mere Ọkpara nke Chineke agaghị abia, dịka ibu-amụma ya siri dị?

21 Ma ugbua, unu ga-aru ụka na ebibiri aJerusalem? Unu ga-asị na bụmụ nke Zedekaịa egbụghị ha, ha nile ewezuga cMiulek? E, ma unu ahụghị na mkpụrụ-afọ nke Zedekaịa anyị na ha nọ, ma a chụpụrụ ha site nʼala nke Jerusalem? Mana lee, nke a abụghị ihe nile—

22 Nna anyị Lihaị, a chụpụrụ ya site na Jerusalem n’ihi na ọ gbara-ama maka ihe ndị a. Nifaị kwa gbara-ama maka ihe ndị a, na kwa ọ fọdụrụ ntakịrị ka o bụrụ ndị nna anyị nile, ọbụna gbadata ruo oge nke a, e, ha agbawo-ama maka aọbịbịa nke Kraịst, ma ha elepụwo anya, ma ha an̄ụrịwo ọn̄ụ nʼụbọchị ya nke ga-abịa.

23 Ma lee, ọ bụ Chineke, ma ọ nọnyere ha, ma o gosipụtara ha onwe ya, nke mere na a gbapụtara ha site na ya; ma ha nyere ya otuto, n’ihi ihe ahụ nke ga-abịa.

24 Ma ugbua, ebe m hụrụ na unu matara ihe ndị a ma unu agaghị agọnarị ha ma ọbụghị na unu ga-ekwu okwu ụgha, ya mere na nke a unu emewo mmehie, n’ihi na unu ajụwo ihe ndị a nile, na-agbanyeghị ọtụtụ ihe ndị were-anya nke unu nataworo; e, ọbụna unu anatawo aihe nile, ma ihe ndị dị nʼelu-igwe, ma ihe nile nke dị nʼụwa, dịka ihe aka-ebe na ha bụ ezi-okwu.

25 Mana lee, unu ajụwo ezi-okwu ahụ, ma anupu-isi megide Chineke unu dị nsọ; ma ọbụna nʼoge nke a, kama ịkpadoro onwe unu bakụ nʼelu-igwe, ebe ana-enweghị ihe na-ere ure, na ebe ana-enweghị ihe ga-abịa nke na-adịghị ọcha, unu na-atụkọtalitere onwe unu iwe ọkụ maka ụbọchị nke cikpe.

26 E, ọbụna nʼoge nke a unu na-acha, n’ihi igbu-mmadụ unu nile na aịkwa-iko unu na ajọọ-omume, maka mbibi mgbe nile na-adigide; e, ma ọbụghị na unu chegharịrị ọ ga-abịakwute unu ọsọ-ọsọ.

27 E, lee ọ nọ ugbua ọbụna nʼọnụ-ụzọ unu nile; e, baruo nụ nʼoche-ikpe, ma chọọ; ma lee, onye-ikpe unu e gbuwo ya, ma o adịna nʼime ọbara ya; ma e gbuwo ya site nʼaka bnwanne ya nwoke, onye na-achọ ịnọdụ nʼoche-ikpe ahụ.

28 Ma lee, ha abụọ bụ ndị otu ihe nzuzo unu, nke onye amalitere ya bụ Gadiantọn na ajọọ-onye ahụ onye na-achọ ibibi mkpụrụ-obi nile nke ndị mmadụ.