Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
NAJS, Jọn 1


NAJS, Jọn 1:1–34 (tụlee ihe dị iche na Jọn 1:1–34)

(Ozi-ọma nke Jisus Kraịst ka e kwusara site na mmalite. Otu Elaịas (Jọn O Me Baptism) ga-edozi ụzọ maka Kraịst, na Elaịas ọzọ (Kraịst) ga-eweghachi ihe nile.)

1 Na mmalite ka e kwusara ozi-ọma ahụ site n’Ọkpara ahụ. Ozi-ọma ahụ bụụrụ kwa okwu ahụ, okwu ahụ na Ọkpara ahụ dịkwaara, Ọkpara ahụ na Chineke dịkwaara, Ọkpara ahụ site kwara na Chineke.

2 Onye ahụ na Chineke dịịrị na mmalite.

3 E mere ihe nile site n’aka ya; e meghị kwa ihe ọbụla nke e meworo ma ọ nọghị ya.

4 N’ime ya ka ozi-ọma ahụ dịịrị, ozi-ọma ahụ kwa bụụrụ ndụ, ndụ ahụ bụụrụ kwa ìhè nke ndị mmadụ;

5 Na ìhè ahụ wee na-amụke n’ime ụwa, ma ụwa amaghị maka ya.

6 Otu nwoke dịịrị e zitere site na Chineke, onye aha ya bụ Jọn.

7 Otu onye ahụ bịara n’ime ụwa ịbụ onye aka-ebe, ịgba aka-ebe nke ìhè ahụ, ịgba-ama nke ozi-ọma site n’Ọkpara ahụ, nye mmadụ nile, ka site na ya ndị mmadụ wee kwere.

8 Ya onwe ya abụghị ìhè ahụ, kama ọ bịara ka ọ gbaara ihe ahụ aka-ebe.

9 Nke bụ ezi ìhè ahụ, nke na-enye mmadụ ọbụla nke na-abịa n’ime ụwa ìhè;

10 Ọbụna Ọkpara Chineke. Ya onye nọọrọ n’ime ụwa, ọbụ ya mekwara ụwa, ma ụwa amaghị ya.

11 Ọ bịakwutere nke ya, ma nke ya anabataghị ya.

12 Kama ka ha ra bụ ndị nabatara ya, ha ka o nyere ike ịghọ ụmụ ndịkom nke Chineke; nanị ndị ahụ nke kwere n’aha ya.

13 A mụrụ ya, ọ bụghị site n’ọbara, ma-ọbụghị site n’ọchịchọ nke anụ arụ, ma-ọbụghị site n’ọchịchọ nke mmadụ, kama site na nke Chineke.

14 Otu okwu ahụ kwa ka e mere anụ arụ, wee biri kwa n’etiti anyị, anyị wee hụ kwa ebube ya, ebube ahụ dịka nke Onye Nna ahụ Mụrụ Nanị Ya, jupụtara na amara na ezi-okwu.

15 Jọn gbara aka-ebe maka ya, tie kwa mkpu, sị, Nke a bụ onye m kwuru okwu banyere ya; Onye ahụ nke na-abịa n’azụ m, ka e buliri n’iru m; n’ihi na o bu m ụzọ dịrị.

16 N’ihi n’okwu ahụ dịịrị na mmalite, ọbụna Ọkpara ahụ, onye nke ghọrọ anụ arụ, e zitekwaara anyị site n’ọchịchọ nke Nna ahụ. Na ka ha ra bụ ndị kwere n’aha ya ga-anata site n’uju nke ya. Site kwa n’uju nke ya ka anyị nile nataworo, ọbụna anwụgh-anwụ na ndụ ebighi-ebi, site n’amara ya.

17 N’ihi na e sitere n’aka Moses nye iwu ahụ, kama ndụ na ezi-okwu sitere n’aka Jisus Kraịst bịa.

18 N’ihi na iwu ahụ bụụrụ dịka iwu-nsọ nke anụ arụ, ruo n’ilekọta ọnwụ, kama ozi-ọma ahụ bụụrụ dịka ike nke ndụ na-adịghị agwụ agwụ, site na Jisus Kraịst, Ọkpara ahụ A Mụrụ Nanị ya onye nọ n’obi nke Nna.

19 Ọ dịghị kwa mmadụ ọbụla hụworo Chineke n’oge ọbụla, ewezuga ma ọ gbaworị ama banyere Ọkpara ahụ, n’ihi na ewezuga ma esitere na ya ọdịghị mmadụ ọbụla e nwere ike ịzọpụta.

20 Nke a bụ aka-ebe nke Jọn, mgbe ndị Juu zigara ndị nchụ-aja, na ndị Livaị site na Jerusalem, ịjụ ya ajuju; Onye ka ịbụ?

21 Ma o wee kwupụta, ọ gọghị kwa agọ na ya bụ Elaịas; kama o kwupụtara; A bụghị m Kraịst ahụ.

22 Ha wee jụọ kwa ya, na-asị, Mgbe ahụ o lee kwanụ otu i jiri bụrụ Elaịas? O wee sị kwa, abụghị m Elaịas nke ahụ onye ga-eweghachi ìhè nile. Ha wee jụọ kwa ya na-asị, Gị onwe gị bụ onye-amụma ahụ? O wee zaa kwa éè.

23 Mgbe ahụ ha sịrị ya, ị bụ onye? Ka anyị wee nye ndị zitere anyị ihe ọzịza. Gịnị ka ị sịrị banyere onwe gị?

24 Ọ sịrị, Mụ onwe m bu olu otu onye na-eti mkpu n’ọzara, Mee nụ ụzọ nke Onye-nwe ka ọ dị wara wara dịka Esaịas onye-amụma kwuru.

25 Ma ndị ahụ e zitere sitere na ndị Farisi.

26 Ma ha wee jụọ ya, sị kwa ya, Ọ bụ gịnị mere ị na-eme baptism ma ọbụrụ na ị bụghị Kraịst ahụ ma-bụghị Elaịas onye ga-eweghachi ihe nile; ma ị bụghị kwa onye-amụma ahụ?

27 Jọn zara ha na-asị; Mụ onwe m na-eji mmiri mee baptism, kama n’etiti unu ka otu onye na-eguzo, onye unu na-amataghị.

28 Ọ bụ ya bụ onye mụ onwe m gbaworo-ama banyere ya. Ọ bụ ya bụ onye-amụma ahụ, ọbụna Elaịas, onye, na-abịa n’azụ m, nke e buliri n’irum, onye mụ onwe m na-ekwesịghị ịtọpụ eriri akpụkpọ-ụkwụ ya ma-ọbụ onye mụ onwe m na-enweghị ike ịnọchi ọnọdụ ya, n’ihi na ọ gaghị eji nanị mmiri mee unu baptism, kama ọ ga-eji ọkụ na Mụọ Nsọ.

29 N’echi ya Jọn hụrụ Jisus ka ọ na-abịakwute ya, o wee sịkwa, Lee Nwa-atụrụ nke Chineke, onye na-ebupụ mmehie nke ụwa.

30 Na Jọn gbara-ama banyere ya nye ndị mmadụ ahụ na-asị, Nke a bụ onye mụ onwe m kwuru banyere ya sị, otu nwoke na-abịa n’azụ m onye e buliri n’iru m, n’ihi na o bu m ụzọ dịrị, na a maara m ya, na a ga-emekwa ka ọ puta ìhè nye Israel; ya mere mụ onwe m bịara na-eji mmiri eme baptism.

31 Na Jọn wee gbaa-ama, na-asị; Mgbe mụ onwe m na-eme ya baptism, ahụrụ m Mụọ ahụ ka o sitere n’elu-igwe na-arịdata dịka nduru, o wee na-anọkwasị kwa n’elu ya.

32 Na mụ onwe m maara ya; n’ihi na onye ahụ nke zitere m ka m na-eji mmiri mee baptism, onye ahụ sịrị m; N’elu onye ọbụla ị ga-ahụ Mụọ ahụ ka ọ na-arịdata kwasị, na-anọgide kwa n’elu ya, onye ahụ bụ onye na-ejị Mụọ Nsọ eme baptism.

33 Na mụ onwe m hụrụ, gbaa kwa ama na nke a bụ Ọkpara Chineke.

34 Ihe ndị a nile ka e mere na Betabara, n’ofe Jọdan ebe Jọn na-eme baptism.

NAJS, Jọn 1:42 (tụlee ihe dị iche na Jọn 1:42)

(Kifas pụtara “ọhụ-ụzọ” ma-ọbụ “nkume.”)

42 Na o wee duru ya bịakwute Jisus. Na mgbe Jisus hụrụ ya, ọ sịrị, Gị onwegị bụ Saịmọn, nwa-nwoke nke Jona, a ga-akpọ gị Kifas, nke bụ, na nsụgharị asụsụ, ọhụ-ụzọ, ma-ọbụ nkume. Ha bụkwa ndị ọkụ-azụ. Ngwa ngwa ha hapụkwara ihe nile soro kwa Jisus.