Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
NAJS, Jọn 13


NAJS, Jọn 13:8–10 (tụlee ihe dị iche na Jọn 13:8–10)

(Jisus sachara ụkwụ nke Ndị-ozi.)

8 Pịta wee sị ya, Ọdịghị mkpa na ị ga-asa ụkwụ m. Jisus zara ya, Ọ bụrụ na-asaghịm gị, mụ na gị enweghị oke ọbụla.

9 Saịmọn Pịta wee si ya, Onye-nwe, ọbụghị ụkwụ m nanị, kama aka m abụọ kwa na isi m.

10 Jisus sị ya, Onye nke na-asawo aka ya abụọ na isi ya, e nweghị mkpa ewezuga ịsa ụkwụ ya, kama ọ dị ọcha akụkụ ọbụla, unu dị kwa ọcha, kama ọbụghị unu nile. Ugbua nke a bụụrụ omena ala ndị Juu n’okpuru iwu ha; ya mere, Jisus mere nke a ka e wee mezuo iwu.