Emume nsọ niile na Ịma ọkwa niile
Ịma Ọkwa Mweghachi


Mweghachi ahụ nke Ozuzu nke Ozi ọma nke Jizọs Kraịst

Ịma Ọkwa Emume ncheta Narị Afọ Abụọ nye Ụwa

Ịma Ọkwa nke a ka Onye-isi Russell M. Nelson gụrụ dịka otu akụkụ nke ozi ya na Ọgbakọ Zuru oha nke ugboro 190, Eprel 5, 2020, na Obodo Salt Lake, Utah.

N’obi nwayọ anyị na-ama ọkwa na Chineke hụrụ ụmụ Ya n’anya n’ime mba niile nke ụwa. Chineke Nna enyewo anyị ọmụmụ dị nsọ, ndụ na-enweghị atụ, na aja mgbaghara mmehie n’enweghị oké nke Ọkpara Ya Ọ Hụrụ n’anya, Jizọs Kraịst. Site n’ike nke Nna, Jizọs bilitere ọzọ ma nwee mmeri megide ọnwụ. Ọ bụ Onye Nzọpụta anyị, Onye Ọmụmatụ anyị, na Onye Mgbapụta anyị.

Afọ narị abụọ gara aga, n’ọmarịcha ụtụtụ mmalite udu mmiri n’afọ 1820, Josef Smith nta, na-achọ ịmata nzukọ nsọ nke ọ ga-esonye, banyere n’ime ọdọ osisi ikpe ekpere n’akụkụ ebe obibi ya n’obodo New York, USA. O nwere ajụjụ ndị gbasara nzọpụta nke mkpụrụ obi ya ma nwee ntụkwasị obi na Chineke ga-edu ya.

N’ịdị umeala, anyị na ama ọkwa na n’azịza nye ekpere ya, Chineke Nna na Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, pụtakwutere Josef ma bido “nkwụghachi nke ihe niile” (Ọlụ 3:21) dịka ekwuru na mbụ n’ime Baịbụl. N’ime ọhụ nkea, ọ mụtara na mgbe Ndị Ozi isimbụ ahụ nwụworo, Nzukọ nsọ Agba Ọhụụ nke Kraịst furu efu site n’ụwa. Josef ga-abụ ngwa ọrụ na nlaghachi ya.

Anyị n’ekwenye na n’okpuru ntụzi aka nke Nna na Ọkpara, ndị ozi si n’eluigwe bịara ikuziri Josef ma rụpụtagharịa Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst. Jọn Omee Baptizm bilitere n’ọnwụ weghachitere ikike nke ime baptizm site n’ịmịkpu n’ime mmiri maka nsachapụ nke mmehie niile. Ndị Ozi atọ n’ime ndịozi isimbụ—Pịta, Jemes, na Jọn—weghachitere ịbụ onyeozi na ọtụghe niile nke ikike ọkwa nchụaja. Ndị ọzọ bịakwara n’ezie, tinyekọta Elaịja, onye weghachitere ikike nke ijikọ ezi na ụlọ ruo mgbe niile n’ime mmekọrịta ebighi ebi nke gafere ọnwụ.

Anyị n’aga n’ihu ịgba akaebe na enyere Josef Smith onyinye na ike nke Chineke ịtụgharị asụsụ otu ihe ndekọta nke gboo: Akwụkwọ nke Mọmọn—Ama Ọzọ nke Jizọs Kraịst. Peeji ederede a dị nsọ tinyekọtara akụkọ nke mgbasa ozi nke onwe nke Jizọs Kraịst n’etiti ndị mmadụ n’ime Western Hemisphere ngwa ngwa Mbilite n’ọnwụ Ya gafere. Ọ na-akuzi maka ebumnuche nke ndụ ma na-akọwa ozizi nke Kraịst, nke bụ isi ebumnuche ahụ. Dịka akwụkwọ nsọ nsiso nye Baịbụlụ, Akwụkwọ nke Mọmọn n’agba ama na mmadụ niile bụ ụmụ ndị nwoke na ụmụ ndị nwanyị nke Nna nke Eluigwe dị ịhụnanya, na O nwere atụmatụ dị nsọ maka ndụ anyị, ma na Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, n’ekwu okwu taa dịkwa ka otu ọ dị n’ụbọchi niile nke mgbe ochie.

Anyị na-ama ọkwa na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchi ikpeazụ a, ahaziri na Eprel 6, 1830, bụ Nzukọ nsọ Agba Ọhụrụ nke Kraịst eweghachitere. Nzukọ nsọ a dabeere na ndụ zuru oke nke isi nkume-njikọ ya, bụ Jizọs Kraịst, na Aja mgbaghara mmehie Ya n’enweghị oké na Mbilite n’ọnwụ Ya mere eme. Jizọs Kraịst ọzọkwa akpọwo Ndị Ozi ma nyewo ha ikike nke ọkwa nchụaja. Ọ na-akpọku anyị niile ịbịakwute Ya na Nzukọ nsọ Ya, ịnata Mmụọ Nsọ, emume nsọ nke nzọpụta, na irite ọńụ na anọgide.

Afọ narị abụọ agafewo ugbua kemgbe Mweghachi nkea bidoro site n’aka Chineke Nna na Ọkpara Ya Ọ Hụrụ n’anya, Jizọs Kraịst. Nde kwuru nde gburugburu ụwa anabatawo amamihe maka ihe ndịa eburu n’amụma.

Anyị n’obi ụtọ na-ama ọkwa na Mweghachi ekwere nkwa na-aganihu site na mkpughe na-aganihu. Ụwa agaghị ma ọlị abụrụ otu ọ dị ọzọ, dịka Chineke ga “achịkọta n’otu ihe niile n’ime Kraịst” (Ndị Efesọs 1:10).

Na nsọpụrụ na obi ekele, anyị dịka Ndị Ozi Ya n’akpọku onye niile ịmata—dịka anyị ma—na eluigwe ghe oghe. Anyị kwenyere na Chineke n’eme ka amata uche Ya maka ụmụ Ya ndị nwoke na ndị nwanyị. Anyị na-agba ama na ndị ahụ jupụtara n’ekpere ịmụ ozi nke Mweghachi ma mee ihe n’okwukwe ka aga agọzi irite akaebe nke onwe ha maka ịdị nsọ ya na nzube ya iji kwado ụwa maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ ekwere nkwa nke Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst.