2010–2019
Ụmụada Ndị m Hụrụ naanya
Ọgbakọ ozuru ọha nke onwa iri 2019


Ụmụada Ndị m Hụrụ naanya

Isi ihe kachasị ihe niile anyị na-eme n’otu Ụmụagbọghọbịa bụ mmasị anyị nwere iji nyere unu aka inwe okwukwe na-adịghị akwa aka nʼime Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.

Ụmụnne m nwanyị m hụrụ naanya, ọ bụ ihe ọńụ ị nọnyere unu! Anyị na-ahụta ka mkpughe na-eme ka obi anyị saa mbara ma jupụtakwa n’ọńụ si na-enupụta.

Dị ka anyị na-ebido, ọ ga-amasị m ime ka unu mata ụfọdụ ndị enyi m; ha bụ ụmụagbọghọbịa na-enweghị oyiri na akaraka, omenaala, nakwa na-ọnọdụ nke onwe ha na nke ezinaụlọ. Nke ọbụla n’ime ha, dị ka unu onwe unu, eritewo mkpụrụ obi m.

Foto, oyiyi
Bella

Nke mbụ, leenụ Bella. Oguzosịrị ike ebe ọ bụ naanị otu nwaagbọghọbịa nọ na ngalaba nta ya na Iceland.

Foto, oyiyi
Josephine

Leenụ Josephine si Afrịịka nke nyefere onwe ya kpam kpam, onye nke na-ebidogokwa ọzọ ị mụ Akwụkwọ nke Mọmọn ụbọchị niile. Ọ na ha achọpụta ike na ngọzi niile na-abịa site na-iji ntụkwasị obi eme ihe nke a doro anya.

Foto, oyiyi
Ashtyn

N’ikpeazụ leenụ ezi enyi m Ashtyn, nwaagbọghọbịa pụrụ iche onye nke nwụrụ ka ya na ọrịa kansa kwechara aka mgba afọ isii. Ama siri ike ọ gbara banyere Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst ka na-ehi ụda na mkpụrụ obi m.

Unu niile bụ ụmụagbọghọbịa ndị m ji eme ọnụ. Unu enweghị oyiri, onye ọbụla nwere onyinye na nhụmiihe nke aka ya mana yie ibe ya n’ụzọ ndị dị oke mkpa dịkwa ebighị ebi.

Unu bụ nnọọ ụmụada mmụọ nke Nne na Nna nke Eluigwe, o nweghị ihe pụrụ ikewapụ unu site n’ịhụnaanya Ha nakwa n’ịhụnaanya nke Onye Nzọpụta unu.1 Dị ka unu na-abịakwute Ya nso, ọbụladị aganiihu nʼụdị nzọm ụkwụ nwata, unu ga-ahụta udo nke na-anọgide na-adakwasị mkpụrụ obi unu dị ka ndị na-eso ụzọ Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi.

Onyeisi Russell M. Nelson, ezi onye amụma anyị anyị hụrụ naanya, a gwawo m ka m kọwapụta ụfọdụ ihe ndị a gbanwere site na mkpalite nke mmụọ nke ga-enyere unu aka “wulite ike [nke gị] ime ihe dị nsọ ”2 ma bawanye mmetụta nke ezi omume gị. A ga m ekwu ụzọ anọ nhazigharị a metụtara na-abalị a.

Isiokwu nke otu Ụmụagbọghọbịa

Nke mbụ, isi ihe niile anyị na-eme n’otu Ụmụagbọghọbịa bụ mmasị anyị nwere iji nyere unu aka inwe okwukwe na-adịghị akwa aka na Onyenwe anyị Jizọs Kraịst3 na mmụta doro anya banyere ejiri mara gị dị nsọ dị ka nwada nke Chineke.

Na-abalị a, ọ ga-amasị m ịma ọkwa mmegharị nke isiokwu nke Ụmụagbọghọbịa. Ekpere m bụ ka Mmụọ Nsọ gbaara unu ama eziokwu dị n’okwu ndị a ka m na-ekwupụta isiokwu ọhụrụ a:

Abụ m nwada nke nne na nna nke eluigwe hụrụ naanya,4 nwere ọdịdị dị nsọ na akaraka dị ebighị ebi.5

Dị ka onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst,6 a na m agbasi mbọ ike ịdị ka Ya.7 A na m achọ mkpughe nke onwe ma na-etinye ya n’ọrụ8 na-elekọta ndị ọzọ n’aha nsọ Ya.9

A ga m eguzo ka onye ama Chineke oge niile n’ihe niile nakwa na-ebe niile.10

Dị ka m na-agbasi mbọ ike itozu oke maka mbuli elu,11 onyinye nke nchegharị na-amasị m nke ukwuu12 a na m achọ ka ndụ m na-adịwanye mma ụbọchị ọbụlaghị.13 Site na okwukwe,14 a ga m akwalite ebe obibi m na ezinaụlọ m,15 mee ma dobe ọgbụgba ndụ niile dị nsọ,16 nata emume nsọ niile17 na ngọzi niile nke tempụl dị nsọ.18

Hụta mgbanwe si na “anyị” ruo na “m.”Eziokwu ndị a dịịrị gị onwe gị. Ị bụ nwada nke Nne na Nna nke Eluigwe hụrụ naanya. Ị bụ onye na-eso ụzọ Onye Nzọpụta anyị a, Jizọs Kraịst mere ọgbụgba ndụ. A na m akpọku gị ka ị mụọ ma tụgharịa uche n’okwu ndị a. A maara m na i mee nke a, ị ga-enweta ama banyere ị bụ eziokwu ha. Ịghọta eziokwu ndị a ga-agbanwe ụzọ ị na-esi ezute ihe aka mgba niile. Ị mata njiri mara na ebumnuuche gị ga-enyere gị aka ime ka uche gị makọọ na nke Onye Nzọpụta.

Udo na nduzi ga-abụ nke gị ka ị na-esoro Jizọs Kraịst.

Klas ndị nke otu Ụmụagbọghọbịa

Mpaghara nke abụọ e mere mgbanwe metụtara klas ndị nke otu Ụmụagbọghọbịa. Okenye Neal A. Maxwell sịrị na, “Ọtụtụ mgbe ihe na-akpakarị ndị mmadụ mkpa bụ inwe nchekwa site na-ogbachi nke ndụ na-ebe nsọ ha ga-anọ nwee nchekwa ma nwere onwe ha.”19 Klas anyị ha ga-abụ ebe dị nsọ na-enye nchekwa site na-ọgbachi, ebe e nwere ezi nchekwa maka inweta ịhụnaanya na i so biri. Na-ịgba mbọ iwulite ịdị n’otu dị ukwuu, mee ka ọdịmma enyi na enyi kwụsie ike, ma wulite mmetụta nke iso biri na-etiti Ụmụ Agbọghọbịa, anyị na-eme obere mgbanwe na-ọnọdụ klas.

Ke mgbe ihe karịrị 100 afọ, otu Ụmụ Agbọghọbịa bụrịị ihe e kewara ụzọ klas atọ. Na-etufụghị oge ọbụla, anyị na-akpọku ndị ndu otu Ụmụ Agbọghọbịa na ndị bishọp ka si na-ekpere tụlee mkpa nke nwa agbọghọbịa ọbụla ma hazie ha dị ka ọnọdụ ngalaba ukwu onye ọbụla siri dị. Ndị a bụ ụfọdụ ọmụmaatụ nke otu ihe a pụrụ ị dị.

  • Ọ bụrụ na i nwere ụmụ agbọghọbịa dị ole na ole, i nwere ike nwee otu klass nke otu Ụmụ Agbọghọbịa nke mmadụ niile ga-ezukọta ọnụ.

  • Elemaanya i nwere otu nke ụmụ agbọghọbịa ndị gbara afọ12 buru ibu ma nweekwa otu ụmụ agbọghọbịa ndị ọzọ dị obere ndị nke katu okenye. I nwere ike kpebie inwe klas abụọ: Ụmụ Agbọghọbịa gbara afọ 12 na Ụmụ Agbọghọbịa gbara afọ 13–18.

  • Mana ọbụrụ na i nwere nnukwu ngalaba ukwu nke ụmụ agbọghọbịa na-abịa ruru 60, i nwere ike klas isii, otu maka ole a gbara, nke a haziri site na-afọ.

Otu ọbụla e siri hazie klas ahụ niile, unu bụ ụmụ agbọghọbịa dị mkpa na iwulite ịdị n’otu. Bụrụ ihe nye ndị nọ gị gburugburu. Bụrụ isi ịhụnaanya na nlekọta nke ị na-atụanya ịnata site n’aka ndị ọzọ. Site na-ikpe ekpere n’obi gị, gaaniihu na-ezi ọrụ ma bụrụ onye eji ama atụ ihe ọma. Mgbe ị na-eme otu a, ndụ gị ga-ejupụta na afọ ọma. Ị ga-enwe mmetụta dị ukwuu na-ebe ndị ọzọ nọ ma milite ị hụta ọdịmma ha ma emesịa.

Aha Klas nke otu Ụmụ Agbọghọbịa

Nke atọ, site na klas nke a ahazigharịrị ọhụrụ, aga na-akpọ klas niile aha ahụ jikọtara ha ọnụ bụ “Otu Ụmụ Agbọghọbịa.”20 Anyị ga-ewepụ aha ndị nke “Beehive,” “Mia Maid,” na “Laurel.”

Gbaa Otu Ndịisi Klas ume

Mpaghara nke ikpeazụ m chọrọ ikwu ihe banyere ya bụ mkpa otu ndịisi klas dị. Na-agbanyeghị otu esi hazie klas nke otu Ụmụ Agbọghọbịa, klas ọbụla kwesịrị inwe otu ndịisi!21 Ọ bụ site na-atụmatụ dị nsọ ka esi kpọọ ụmụ agbọghọbịa ị bụ ndị ndu mgbe ha nọ na-agbọghọbịa.

Ebum nʼobi na ọrụ nke otu ndịisi klas kwesịrị ịrụ enwetawo mgbam ume na ezi nkọwa kacha doo anya. Ọrụ nke mgbapụta bụ otu nʼime ọrụ ndị ahụ dị mkpa, nke ka nke na akụkụ ndị gbasara nleta, ọrụ mgbasa oziọma, ime ka adị ire, ọrụ tempụl na ọrụ agụgụala ezinaụlọ.22 Ee, otu a ka anyị si ekpokọta Izrel23—ọrụ nwere otito nke ụmụ agbọghọbịa niile dị ka ndị otu igwe ndị agha nke Onyenwe anyị.

Dị ka unu maara, n’ogo ọbụla dị na Nzukọ nsọ, Onyenwe anyị na-akpọ otu ndịisi maka idu ndị Ya. Ụmụ agbọghọbịa, ị bụ onye otu nke otu ndịisi klas nwere ike bụrụ ohere mbụ i nwere iji soro mee ihe na usoro nduzi nke a si na mkpalite nke mmụọ. Ndị ndu ndi dimkpa, meenụ ọkpụkpọ oku otu ndịisi klas ihe dị oke mkpa ma na-edunụ nhatanha unu na ha, na-enye ndụmọdụ na nduzi ma nakwa a tụziri ha aka ka nwee ike nweta ihe a chọrọ n’aka ha.24 Na-agbanyeghị ogo nhụmiihe ị bụ onye ndu nke otu ndịisi klas nwere, si ebe ha nọ nyere ha aka iwulite ike ime ihe na ntụkwasị obi ga-agọzi ha dị ka ndị ndu. Nọrọ ha nso ma anapụkwala ha ọrụ ha. Mmụọ nsọ ga-edu gị mgbe ị na-edu ha.

Foto, oyiyi
Chloe

Iji gosịpụta ihe omume dị mkpa nke nne na nna na ndị ndu na-eme dị ka ndị nduzi na ndị ntụzi aka, ka m kọọrọ unu otu akụkọ. A kpọrọ Chloe oku ije ozi dị ka onyeisi klas. Onye ndu ọkwa nchụ aja ya nwere amamiihe gbara ya ume ka ọrịọ Onyenwe anyị maka enyemaka na-ịtụpụta aha maka otu ndịisi ya. Chloe kpere ekpere ma nata mkpalite nke mmụọ maka ndị ọ ga-asị ka a kpọọ dị ka ndị ndụmọdụ ya ọsịsọ karịa ka a tụrụ anya ya. Ka ọ garaniihu ịtụgharị uche na ikpe ekpere maka onye ode akwụkwọ, Mmụọ nsọ ahụ kpọlatara uche ya azụ ugboro ugboro na-ebe otu nwaagbọghọbịa nọ nke tụrụ ya naanya—onye ọ na-ara ahụ ị bịa nzukọ nsọ ma ọbụ ihe omume.

Na-enweghị ezi mmasi obiike na mkpalite nke mmụọ ahụ, Chloe na nne ya kpara nkata, onye nke kọwaara ya na otu n’ime ụzọ ndị esi anata mkpughe bụ site na-echiche na-abịacha abịagide. Site na ntụkwasị obi o nweghachitere, o metụrụ Chloe na-ahụ inyefe aha nwa agbọghọbịa nke a. Bishọp mere ọkpụkpọ oku ahụ nke nwa agbọghọbịa ahụ nabatakwara. Ka inye ya ngọzi ndokwa gafechara, ọmarịcha ode akwụkwọ a sịrị, “Ị ma na, o nweghị mgbe o metụrụ m na-ahụ dị ka m nwere ọnọdụ ma ọbụ na-enwere ebe a chọrọ m. O metụghị m na-ahụ na m ga-emelị ya. Mana site na ọkpụkpọ oku a, ọ dị m ka Nna nke Eluigwe nwere ebumnuuche na-ebe o doweere m.” Mgbe Chloe na nne ya hapụrụ nzukọ ahụ, Chloe tụgharịrị lee nne ya, na anya mmiri wee sị, “Mkpughe dị ire! Mkpughe na-arụ ọrụ na-ezia!”

Otu ndịisi klas, Chineke a kpọwo unu oku ma tụkwasị unu obi idu otu nke ụmụada Ya. Onyenwe anyị maara gị. … Ọ bụ Ya họọrọ gị.”25 E nyewo gị ngọzi site n’aka onye ji ọkwa nchụ aja; nke a pụtara na mgbe ị na-arụ ọrụ na-ọkpụkpọ oku gị, ị na-etinye ikikere ọkwa nchụ aja n’ọrụ. I nwere ọrụ dị mkpa ị ga-arụ. Dịrị nkọ na ma mee ihe site na mkpalite nke Mmụọ Nsọ. I mee otu a, i nwere ike jee ozi na ntụkwasị obi, n’ihi na ọ bụghị naanị gị na-arụ ọrụ!

Ndịisi klas, anyị chọrọ amamiihe unu, olu unu, na ume unu na kansụl ọhụrụ ndị ntoroọbịa na ngalaba ukwu nke Okenye Quentin L. Cook mara ọkwa ya taa. Unu so na ndị dị mkpa na-izute mkpa nke ụmụnne unu ndị nwoke na ndị nwanyị.26

Mgbanwe ndị a emere na otu klas na otu ndị ndu nwere ike i bido ngwa ngwa ndị ngalaba ukwu na ndị ngalaba nta dị na njikere mana nke a kwesịrị inwe isi na Jenụwarị 1, 2020.

Ezi ụmụnne m nwanyị, a na m agba aka ebe na mgbanwe ndị a m kwuru okwu ha taa bụ ntụzi aka si na mkpalite nke mmụọ site n’aka nke Onyenwe anyị. Mgbe anyị na-ejisi ike etinye mgbanwe ndị a n’ọrụ, ka anyị e chefukwala ebum n’obi anyị: i mesị mkpebi anyị ike na i soro Jizọs Kraịst ma nyere ndị ọzọ aka na-ịbịakwute Ya. A na m agba ama na nke a bụ Nzukọ nsọ Ya. Obi m juru na-ekele n’ihi na O nyere anyị ohere ị bụ ndị dị mkpa na i soro rụọ ọrụ Ya dị nsọ.

Ekpere m bụ ka otu Mmụọ ahụ nke duziri mgbanwe ndị a ga eduzi unu ka unu na-aganiihu na okporo nke ọgbụgba ndụ. Otu a ka m si gbaa ama n’aha Jizọs Kraịst, amen.