2010–2019
Akụ niile nke Ime mụọ
Ọgbakọ ozuru ọha nke onwa iri 2019


Akụ niile nke Ime mụọ

Dịka ị na-enwe okwukwe na ike ọkwa-nchụ-aja Ya, ike gị iwebata akụ ime mụọ nkea nke Onye-nwe-anyị wetewooro ga-amụba.

Unu emeela maka ọmarịcha egwu ahụ. Dịka anyị guzoro ịgụ egwu nke etiti ahụ, “Anyị Ekelee Gị, O Chineke, maka Onye-Amụma,” enwetere m uche abụọ ezuruoke bịakwutere m. Otu bụ nke gbasara Onye amụma Josef Smit, onye-amụma nke ọgbọ nke a. Ịhụnanya m na mmasị maka ya n’etolite ụbọchi niile n’agafe. Uche nke abụọ bịara dịka m lere nwunye m anya, ụmụada m, ụmụ-ụmụada m, na ụmụ-ụmụ-ụmụada m. O metụrụ m dịka m g’ewere onye niile n’ime unu dịka ndi ezinaụlọ m.

Ọtụtụ ọnwa gara aga, na njedebe nke onyinye dị nsọ nke nzukọ tempụl, a gwara m nwunye m Wendy, “E nwere m olile anya na ụmụnne ndi nwanyị ghọtara akụ niile nke ime mụọ nke bụ nke ha n’ime tempụl.” Ụmụnne ndi nwanyị, mgbe ụfọdụ a na m ahụta onwe m iche gbasara unu, tinyekọta ọnwa abụọ gara aga mgbe Mụ na Wendy gara nleta na Harmony Pennsylvania.

Foto, oyiyi
Mweghachite nke Ọkwa-nchụ-aja nke Erọn

Nkea bụụrụ njem anyị nke abụọ. N’ime oge abụọ ahụ anyị nwetere nnukwu mmetụta dịka anyị na-aga ije n’ala ahụ dị nsọ. Ọ bụụrụ n’akụkụ Harmony ka Jọn Omee Baptizm pụtakwutere Josef Smit ma weghachite Ọkwa-nchụ-aja Erọn.

Foto, oyiyi
Mweghachite nke Ọkwa-nchụ-aja nke Melkizedek

Ọ bụụrụ n’ebe ahụ ka Onye-ozi Pita, Jemis, na Jọn pụtakwutere iweghachite Ọkwa-nchụ-aja Melkizedek.

Ọ bụụrụ na Harmony ka Emma Hale Smit jere ozi dịka odee ihe nke mbụ nye di ya mgbe Onye-Amụma tụgharịrị Akwụkwọ nke Mọmọn.

Ọ bụkwaara na Harmony ka Josef natara mkpughe gosipụtara uche nke Onye-nwe-anyị nye Emma. Onye-nwe-anyị nyere Emma iwu ịkọwa nke ọma akwụkwọ nsọ niile, ịgba nzukọ nsọ ume, ịnata Mụọ Nsọ, na iji oge ya “na-amụta karịsịa.” Emma ka enyekwara ndụmọdụ “idewe n’akụkụ ihe niile nke ụwa ma chọọ maka ihe niile nke dị mma karịa” na kwa ijigidesi ike ọgbụgba ndụ niile ya na Chineke gbara. Onye-nwe-anyị ji okwu ndia n’akpalite mụọ mechie nkuzi Ya: “Nkea bụ olu m nye onye niile.”1

Ihe niile nke meworo na mpaghara nkea nwere ihe nsonazụ dị omimi nye ndụ unu . Mweghachite nke ọkwa-nchụ-aja, ya na ndụmọdụ nke Onye-nwe-anyị nye Emma, nwere ike idu ma gọzie onye ọbụla n’ime unu. Otu o si masị m ka unu ghọta na mweghachite nke ọkwa-nchụ-aja bụ nnọọ ihe dị mkpa nye gị dịka nwanyị nakwa dịka ọ dị nye nwoke. N’ihi eweghachitewo Ọkwa-nchụ-aja Melkizedek, ma ụmụnwanyị n’edebe ọgbụgba-ndụ na ụmụnwoke n’edebe ọgbụgba-ndụ nwere ohere na “ngọzi ime mụọniile nke nzukọ nsọ”2 ma ọbụ, anyị nwere ike kwuo, nye akụ ime mụọ niile nke Onye-nwe-anyị nwere maka ụmụ Ya.

Nwanyị niile na nwoke niile onye n’eme ọgbụgba ndụ ya na Chineke ma debe ọgbụgba ndụ ndi ahụ niile, na onye n’esoro eme emume nsọ niile nke ọkwa-nchụ-aja na ntozu oke, nwere ohere ọma ruo ike nke Chineke. Ndi ahụ nataworo onyinye dị nsọ ha n’ime ụlọ nke Onye-nwe-anyị na anata onyinye nke ike ọkwa-nchụ-aja site n’ike nke ọgbụgba ndụ ha, ya na onyinye nke amamihe ịmata otu esi anata ike ahụ.

Eluigwe ahụ ka emepeworo nye ụmụnwanyị ndi enyeworo onyinye dị nsọ site n’ike nke Chineke na-apụta site ọkwa-nchụ-aja dịka ha dịịrị ụmụnwoke ndi ji ọkwa-nchụ-aja. Ekpere m bụ ka eziokwu nọgide n’ime obi onye ọbụla n’ime unu n’ihi na e kwere m na ọ ga-agbanwe ndụ unu. Ụmụnne ndi nwanyị, o ruuru unu inwete n’ụzọ sara mbara ike nke Onye-nzọpụta inyere ndi ezinaụlọ unu na ndi ọzọ unu hụrụ n’anya aka.

Ugbua, I nwere ike i na-agwa onwe gị, “Nkea dị ịtụnanya, mana kedụ otu m ga-esi eme ya? Kedụ otu m ga-esi nwete ike nke Onye-nzọpụta n’ime ndụ m?”

I gaghị ahụta usoro nkea ebe edere ya n’ime akwụkwọ nkọwa ọbụla. Mụọ Nsọ ga-abụ onye nkuzi nke onwe gị dịka i na-achọ ịghọta ihe Onye-nwe-anyị ga-achọ ka gị mara ma mee. Usoro nkea adịghị ọsịsọ ma ọbụ dị mfe, mana ọ bụ nke n’akwalite ime mụọ. Olee ihe nwere ike ịdị ụtọ karịa iji Mụọ Nsọ rụọ-ọrụ ịghọta ike nke Chineke—ike nke ọkwa-nchụ-aja?

Ihe m nwere ike ịgwa gị bụ na ịchọta ike nke Chineke n’ime ndụ gị na-achọ ụdị ihe niile nke Onye-nwe-anyị nyere Emma na onye ọbụla n’ime unu iwu ime.

Ya mere, a na m akpọku unu iji ekpere mụọ nkeji 25 nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile ma chọta ihe Mụọ Nsọ ga-akuziri gị. Mgbalị ime mụọ na nke onwe unu ga-ewetere unu ọńụ dịka ị n’erite, ghọta, ma tinye n’ọrụ ike ahụ nke enyeworo gị.

Otu akụkụ nke mgbalị a ga-achọ gị iwezuga ọtụtụ ihe niile nke ụwa nkea. Oge ụfọdụ anyị n’ekwukarị na nkiti gbasara ịhapụ ihe nke ụwa ya na ndọrọ ndọrọ, ọnwụnwa nduhie niile, na nkuzi ụgha ya niile. Mana n’ezie ime otu ahụ ga-achọ gị iji nlezianya tulee ndụ gị ugboro ugboro. Dịka i na-eme otu ahụ, Mụọ Nsọ ahụ ga-akpalite gị gbasara ihe na-enweghị uru ọ bara, ihe n’etozughịkwa oge na ike gị.

Dịka ị na ewepụ nlezi anya unu site na ndọpụ uche nke ụwa, ụfọdụ ihe niile nke dịịrị ka ọ dị mkpa nye gị ga ala azụ n’ibu ụzọ. Ọ dị mkpa na ị ga-asị mba nye ụfọdụ ihe niile, ọbụna n’agbanyeghị ha nwere ike dịrị ka enweghị ihe ha mere. Dịka ị na ebido ma gaa n’ihu usoro nke ndụ nkea nke inyefechasị ndụ gị n’aka Onye-nwe-anyị, mgbanwe niile nke echiche gị, mmetụta niile, na ume ime mụọ gị ga-atụ gị n’anya!

Ugbua nwa obere okwu nke ịdọ aka na ntị. E nwere ndi ga-achọ ịmegide ike gị ịkpọku ike nke Chineke. E nwere ndi ga-achọ ka i nwee obi abụọ n’onwe gị ma belata ike ime mụọ gị pụrụ iche dịka nwanyị ezi omume.

N’ezie, onye iro achọghị ka gị ghọta ọgbụgba ndụ i mere na baptizm ma ọbụ onyinye dị nsọ dị omimi nke amamihe na ike ị nataworo ma ọbụ ga-anata n’ime tempụl—ụlọ nke Onye-nwe-anyị. Ma Setan n’ezie achọghị ka ị ghọta na oge niile i jere ozi na ntozu oke ma fee ufufe nime tempụl, ị na-eji ike nke Chineke na ndi mụọ ozi Ya nwere “iwu n’ihi” gị apụta.3

Setan na ndi agha ya mgbe niile ga-abụ agadagbachịrị ụzọ ịgbọchi gị site n’ịghọta onyinye ime mụọ niile nke ejiworo ma ọbụ e nwere ike iji gọzie gị. N’ịdị mwute, ụfọdụ agadagbachịrị ụzọ nwere ike bụrụ nsonazụ nke mmegherị agwa nke onye ọzọ. Ọ na-ewute m iche na onye ọbụla n’ime unu enwewo mgbe agụpụrụ ya ma ọbụ nwee mgbe otu onye ndu ọkwa-nchụ-aja ekweghị n’ihe o kwuru ma ọbụ na emegbuwo ya ma ọbụ gbawa ya obi site n’aka di, nna, ma ọbụ onye kwesịrị ịbụ enyi. E nwere mwute dị omimi na otu onye n’ime unu ka ahapụrụ, kparịa, ma ọbụ kpejọọ. Ụdị njehie ndia enweghị ọnọdụ n’ime alaeze nke Chineke.

Ọzọ, ọ na-enye m obi ụtọ mgbe m matara maka ndi ndu ọkwa-nchụ-aja ndi chọsịrị ike nsonye nke ụmụnwanyị n’ime kansụl ngalaba ukwu na stek. E nwere m mkpali mụọ site n’aka di ọbụla onye n’egosi na ọrụ ọkwa-nchụ-aja ya kacha dị mkpa bụ ilekọta nwunye ya.4 A na m eto nwoke nke ahụ onye na-akwanye nnukwu ugwu nye ike nke nwunye ya ịnata mkpughe ma n’ewere ya dịka onye enyem aka hara ọnụ na alụm di na nwunye ha.

Mgbe nwoke ghọtara ịdị ebube na ike nke nwanyị Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ ezi-omume, na-achọ, natara onyinye dị nsọ, ọ dị ịtụnanya na ọ dị ka o bilie mgbe ọ batara n’ime ụlọ?

Site na mbido nke oge, ụmụnwanyị ka ejiri ezi-uche pụrụ iche gọzie—ike nke ịkọwa n’etiti ezi ihe na njehie. Onyinye nkea ka emelitere n’ime ndi ahụ mere ma debe ọgbụgba ndụ. Ma ọ na-ebelata nime ndi ahụ ndi jiri obi ha gọnarịa iwu niile nke Chineke.

Ọ na-adị m ngwa ngwa ịgbakwunye na anaghị m ekwugide ndi nwoke n’ụzọ ọbụla site n’ọchịchọ nke Chineke maka ha kwa ịkọwa n’etiti ezi ihe na njehie. Mana ezigbo ụmụnne m nwanyị, ike gị ịghọta eziokwu site na ụgha, ịbụ ndi nche nke eziomume nke obodo, dị oke mkpa n’ụbọchị ikpeazụ ndia. Ma anyị n’atụkwasị obi na gị ikuzirị ndi ọzọ ime kwa otu ahụ. Ka m kwuo gbasara nkea ka o doo anya: ọ bụrụ na ụwa ahụ tufuo akárá eziomume nke ụmụnwanyị, ụwa agaghị agbake.

Anyị Ndi Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ abụghị nke ụwa; anyị bụ nke Izrel gbara ndụ. Akpọwo anyị ikwado ndi mmadụ maka Ọbịbịa nke Abụọ nke Onye-nwe-anyị.

Ugbua, ka kọwazie ọtụtụ atụ ejiri nkwanye ugwu nye ụmụnwanyị na ọkwa-nchụ-aja gbakwunye. Mgbe edoro gị nsọ ije-ozi n’ime ọkpụkpọ oku n’okpuru ntuziaka otu onye onye ji ọtụghe ọkwa-nchụ-aja—dịka bishọp gị ma ọbụ onye-isi stek gị—enwewo gị ikike ọkwa-nchụ-aja ịrụ ọrụ n’ọkpụkpọ oku ahụ.

N’otu aka ahụ, n’ime tempụl dị nsọ e nyere gị ikike ịrụ ọrụ ma soro mee ihe n’emume nsọ ọkwa-nchụ-aja oge niile ị gara. Onyinye dị nsọ tempụl gị n’akwado gị ime otu ahụ.

Ọ bụrụ na ịnatwo onyinye dị nsọ ma ị lụbeghị di onye ji ọkwa-nchụ aja ma otu onye a gwa gị sị, “o wutere m i nweghị onye ọkwa-nchụ-aja n’ebe obibi gị,” biko ghọta na okwu ahụ ezighị ezi. I nwere ike i nweghị onye ji ọkwa-nchụ-aja n’ebe obibi gị, mana ị natawo ma mewo ọgbụgba ndụ dị nsọ gị na Chineke n’ime tempụl Ya. Site n’ọgbụgba ndụ ndi ahụ ka onyinye dị nsọ nke ike ọkwa-nchụ-aja si na-adakwasị gị. Ma cheta, ọ bụrụ na di gị nwụọ, ga-edu n’ebe obibi gị.

Dịka nwanyị Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ eziomume nataworo onyinye dị nsọ, ị na-ekwu ma na-akuzi n’ike na ikike site na Chineke. Ma ọbụ n’ịgba ume ma ọbụ na mkparịta ụka, anyị chọrọ olu gị ikuzi ozizi nke Kraịst. Anyị chọrọ enyem aka gị n’ime kansụl ezinaụlọ, ngalaba ukwu, na stek. Nsonye gị dị mkpa ma ọbụghị ịchọ mma!

Ezigbo ụmụnne m ndi nwanyị, ike unu ga-amụba dịka unu n’ejere ndi ọzọ ozi. Ekpere unu, ibu-ọnụ, oge n’ime akwụkwọ nsọ, ije-ozi n’ime tempụl, na ọrụ akụkọ ezinaụlọ ga-emepere gị eluigwe.

A na m arịọ unu ịmụta n’ekpere eziokwu niile i nwere ike ịchọta gbasara ike ọkwa-nchụ-aja. I nwere ike jiri Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84 na 107 bido. Nkeji ndia ga-eduba gị banye na nkeji ndi ọzọ. Akwụkwọ nsọ na nkuzi niile sitere n’aka ndi amụma, ndi ọhụ-ụzọ, na ndi mkpughe nke ugbua jupụtara n’eziokwu ndia. Dịka nghọta gị na-abawanye na dịka ị na-enwe okwukwe n’ime Onye-nwe-anyị na ike ọkwa-nchụ-aja Ya, ike gị iwebata akụ ime mụọ nkea nke Onye-nwe-anyị wetewooro ga-amụba. Dịka ị na-eme otu ahụ, ị ga-ahụta onwe gị ịdị mma karịa n’inye aka kee ezinaụlọ ebigh ebi nke nọkọtara ọnụ, arachiri n’ime tempụl nke Onye-nwe-anyị, ma jupụta n’ịhụnanya maka Nna anyị nke Eluigwe na maka Jizọs Kraist.

Mgbalị anyị niile ije-ozi onye na ibe ya, kwupụta oziọma, metazie Ndi Nsọ, ma gbapụta ndi nwụrụ anwụ na-abịakọta n’ime tempụl. Ugbua anyị nwere tempụl 166 gburu gburu ụwa, ma ọzọ na-abịa.

Dịka unu ma, Tempụl Salt Lake, Sụkwịa Tempụl, na ụlọ-elu nọkọtara n’akụkụ Ụlọ Ọrụ Nzukọ nsọ ka a ga-arụgharị n’ọrụ nke ga-ebido na mmechi nke afọ a. Tempụlnkea dị nsọ ka a ga-edozirịrị ma kwadoo iji kwalite mụọ ọgbọ ndi na-abịa n’ihu, dịka nnọọ o si mmetụ anyị n’ime ọgbọ nkea.

Dịka Nzukọ nsọ n’etolite, tempụl ndi ọzọ ka aga arụ ka ezinaụlọ ndi ọzọ nwe ike nwete ohere ruo na ngọzi kacha ibe ya elu, nke ndu ebighị ebi.5 Anyị na ahụta tempụl dịka ụlọ kacha ibe ya ahụ dị nsọ. Mgbe ọbụla amara ọkwa atụmatụ ịrụ tempụl ọhụrụ, ọ na-abụrụzi otu akụkụ dị mkpa nke akụkọ anyị. Dịka anyị tuleworo n’ebe a n’abalịa, unu ụmụnne ndi nwanyị dị mkpa n’ọrụ nke tempụl, ma tempụl bụ ebe ị ga anata akụ ime mụọ gị kacha dị elu.

Biko jiri mkpachapụ anya na nsọpụrụ gee ntị dịka m ga-ekwupụta ugbua atụmatụ ndi anyị ji ewulite tempụl ọhụrụ asatọ. Ọbụrụ na enwere otu akpọpụtara nebe pụtara ihe nye gị, a na m atụpụta ka gị n’umeala hudata isi gị n’ekpere obi ekele n’ime obi gị. Ọ masịrị anyị ikwupụta atụmatụ iwulite tempụl n’ebe ndia sotere: Freetown, Sierra Leone; Orem, Utah; Port Moresby, Papua New Guinea; Bentonville, Arkansas; Bacolod, Philippines; McAllen, Texas; Cobán, Guatemala; na Taylorsville, Utah. Unu emeela, ezigbo ụmụnne nwanyị. Anyị jupụtara n’ekele unu ịnabata atụmatụ ndia na azịza unu na nsọpụrụ.

Ugbua, na mmechi, ọ ga-amasị m ịhapụ ngọzi n’isi unu, na unu ga-enwe ike ghọta ike ọkwa-nchụ-aja nke enyeworo unu ma na unu ga-emezu ike ahụ site n’inwe okwukwe nke gị n’imeOnye-nwe-anyị na n’ime ike Ya.

Ezi ụmụnne ndi nwanyị, na nkwanye ugwu na obi ekele ukwuu, a na m ekwupụta ịhụnanya n nye unu. N’umeala, a na m ekwupụta na Chineke dị ndụ! Jizọs bụ Kraịst ahụ. Nke a bụ Nzukọ-nsọ Ya. A na m agba-ama n’aha dị nsọ nke Jizọs Kraịst, amen.