2010–2019
Ịgba Ọgbụgba-ndụ
Ọgbakọ ozuru ọha nke onwa iri 2019


Ịgba Ọgbụgba-ndụ

Ịnọrọ na Chineke ma na-aga onye na ibe ya nʼụzọ Ya nke ọgbụgba-ndụ bụ inwe ngọzi site na ịgba-ndụ.

Ụmụnne m nwoke na nwanyị m hụrụ nʼanya, a kọrọ akụkọ nke nwatakịrị Prịmarị na-amụ ikpe-ekpere. “Ekele dịrị gị maka mkpụrụ-edemede A, mkpụrụ-edemede B, … mkpụrụ-edemede G.” Ekpere nke nwatakịrị gara n’ihu, “Ekeke dịrị gị maka ndị mkpụrụ-edemede X, Y, Z. Ezi Nna nke Elu-igwe, ekele dịrị gị maka ọnụ-ọgụgụ 1, ọnụ-ọgụgụ 2.” Onye-nkuzi Praịmarị nwee nsogbu kama nʼeche. Nwatakịrị ahụ kwuru, “Ekele dịrị gị maka ọnụ-ọgụgụ 5, ọnụ-ọgụgụ 6—ma ekele dịrị gị maka onye-nkuzi Praịmarị m. Ọ bụ nanị ya bụ onye hapụrụ m ikpecha ekpere m.“

Nna nke Elu-igwe n’anụ ekpere nke nwatakịrị ọbụla. Site n’ịhụnʼanya nʼenweghị-ọgwụgwụ, Ọ nʼakpọ ka anyị bia kwere ma bụrụ-onye-otu site na ọgbụgba-ndụ.

Ụwa nke a juputara na onyonyo, nkwenye-efu, mmegharị-anya. Ọtụtụ ihe dịka ọ na-aga aga ma emighị-emi. Mgbe anyị wepụrụ ihe-mkpuchi nile, ahụhọ, ihe nile ndị mmadụ chọrọ ma-ọbụ achọghị, anyị nʼachọ karịa ihe enweghị-isi, njikọta mgbe-nta, ma-ọbụ ọchịchọ nke ihe ụwa. Nʼobi-ekele, enwere ụzọ eji-enweta ọzịza nile dị mkpa.

Mgbe anyị bịakwutere iwu-nsọ nile nke Chineke ịhụ Ya nʼanya na ndị nile gbara anyị gburu-gburu site na ọgbụgba-ndụ, anyị nʼeme otu-ahụ n’abụghị dịka onye-amaghị-ama ma-ọbụ onye ọbịa, kama dịka nwa Ya na ebe-obibi.1 Okwu mgbe-ochie ka bụkwa ezi-okwu. Nʼichefu onwe anyị nke ụwa nʼime ịgba-ndụ, anyị nʼahụ ma bụrụ ndị kachasị-nma ebighị-ebi2—nwere-onwe, dị-ndụ, ihe-mere-eme—ma kọwa mmekọrịta anyị nile kachasị mkpa. Ịgba Ọgbụgba-ndụ bụ ime ma dobe nkwa nile dị-nrọ nye Chineke na onye-na-ibeya, site na emume-nsọ nile nke n’akpọta ike nke ndụ-iyi-Chineke ịpụta n’ime ndụ anyị nile.3 Mgbe anyị gbara-ndụ ihe nile anyị bụ, anyị nwere-ike ịbụ karịa ihe anyị bụ. Ịgba-ndụ n’enye anyị ohere, akụkọ, ikike ịbụ. Ọ na-emepụta okwukwe na ndụ na nzọpụta.4

Ọgbụgba-ndụ nile dị-nsọ n’abụ isi-iyi nke ịhụnʼanya maka ma site nʼaka Chineke, ma mgbe-ahụ maka ma onye ọbụla. Chineke, Nna anyị nke Elu-igwe, hụrụ anyị nʼanya karịa ma mara anyị karịa ka anyị hụrụ onwe anyị nʼanya ma-ọbụ mara onwe-anyị. Okwukwe nʼime Jizọs Kraịst na nchegharị n’eweta ebere, amara, mgbaghara. Ihe-ndị a nʼakasi-obi onye ihe metụrụ, onye-nanị ya nọ, mmegbu anyị nʼanata n’ime ụwa. Nke oji bụrụ Chineke, Nna anyị nke Elu-igwe chọrọ ka anyị nata onyinye nke Chineke kachasị—ọńụ Ya, ndụ ebighị-ebi Ya.5

Chineke anyị bụ Chineke nke ọgbụgba-ndụ. Site na okike Ya, Ọ “nʼedobe ọgbụgba-ndụ ma nʼegosi ebere.”5 Ọgbụgba-ndụ Ya nile nʼanọgịde “ogologo mgbe nile oge [ga] adịgịde, ma-ọbụ ụwa ga eguzoro, ma-ọbụ a [ga] enwe otu onye nʼelu iru ya a ga-azọpụta.”7 Anyị ekwesịghị ịdị nʼagagharị nʼefu na obi-abụọ,kama nwe ọńụ nʼime mmerịkọta ọgbụgba-ndụ nile “dị ike karịa ụdọ nile nke ọnwụ.”8

Emume-nsọ na ọgbụgba-ndụ nile nke Chineke zuru-ọha nʼime ọchịchọ ha ma nke-onye nʼime ohere-ọma ha. Nʼakpaghị-oke nke Chineke, onye-ọbụla nọ ebe-ọbụla na afọ ọbụla nwere-ike ịnata emume-nsọ nzọpụta nile. Ohere-ịhọrọ nʼadị—ndị-mmadụ na-ahọrọ ma ha ga-anabata emume-nsọ nile enyere. Emume-nsọ nile nke Chineke wetara ihe odudu nile nʼụzọ Ya nke ọgbụgba-ndụ nile. Anyị nʼakpọ atụmatụ nke Chineke ịkpọlata ụmụ Ya ụlọ atụmatụ nke mgbapụta, atụmatụ nke nzọpụta, atụmatụ nke ańụrị. Mgbapụta, nzọpụta, ańụrị selestial ga-ekwe omume maka Jizọs Kraịst “onye chụrụ-aja mgbaghara mmehie nke a zuru-oke.”9

Ịnọrọ na Chineke ma na-aga onye na ibe ya nʼụzọ Ya nke ọgbụgba-ndụ bụ inwe ngọzi site na ịgba-ndụ.

Nke-mbụ, ịgba-ndụ nọọrọ nʼime Jizọs Kraịst dịka “onye-ogbugbo nke ọgbụgba-ndụ ọhụrụ.”10 Ihe nile nwere-ike ịrụkọ-ọrụ ọnụ maka ọdị nma anyị mgbe anyị bụ ndị “asachara nʼime Kraịst … nʼime ọgbụgba-ndụ nke Nna.”11 Ngọzi ọbụla dị-nma ekwere na nkwa na-abịara ndị nwere okwukwe ruo na ọgwụgwụ. “Ọnọdụ ańụrị nke ahụ na-edebe iwu-nsọ nile nke Chineke” ka a ga“ agọziri nʼime ihe nile, ma nʼihe nke arụ ma nke mụọ,” ma “ha na Chineke ga-ebi … n’ọnọdụ ańụrị na enweghị ọgwụgwụ.”12

Dịka anyị n’akwanyere ọgbụgba-ndụ anyị nile ugwu, anyị nwere-ike mgbe ụfọdụ nwee mmetụta nke ndị-mụọ-ozi. Ma anyị ga-abụ—ndị-ahụ anyị hụrụ nʼanya na ndị na-agọzi anyị nʼakụkụ nke akwa-mgbochi na ndị-ahụ hụrụ anyị nʼanya ma gọzie anyị site na-akụkụ ọzọ nke akwa-mgbochi.

Mgbe-adịghị-anya Nwa-nne nwanyị Gong na mụ hụrụ ịgba-ndụ na-uju ya nʼime ụlọ-ọgwụ. Nna nta chọrọ akụrụ ọhụrụ. Ezi-na-ụlọ ya bere-akwaa, buo-ọnụ, kperee ya ekpere maka ịnata akụrụ. Mgbe a nụrụ na akụrụ ga-enye ya ndụ apụtala, nwunye ya jiri nwayọ sị, “E nwere m olile-anya na ezi-na-ụlọ nke ọzọ dị Mma.” Ịbụ-nke site na ọgbụgba-ndụ bụ, nʼime mkpụrụ-okwu nile nke Onye-ozi Pọl, “ka e wee kasie mụ na unu obi nʼetiti unu site nʼokwukwe anyị kwekọrọ ma nke unu ma nke mụ onwe m.”13

Nʼụzọ nke ndụ, anyị nwere-ike itufu okwukwe nʼime Chineke, kama Ọ naghị atufu okwukwe Ya nʼime anyị. Dika ọ dị, ọkụ Ya nʼenwu mgbe-ọbụla. Ọ na-akpọ anyị bia ma-ọbụ lọghachi na ọgbụgba-ndụ nile nọọrọ nʼụzọ Ya. Ọ na-eche ịmakụ anyị, ọbụnaghị mgbe anyị nọ “nʼebe dị anya.”14 Mgbe anyị ji anya nke okwukwe lee ihe-nlere-anya nile, arc, ma-ọbụ ihe ndị gbasara nhụmihe anyị, anyị nwere-ike hụ ebere na ịgba-ume Ya karịcha nʼime mnwale nile, iru-uju nile, na aka-mgba nile, dịka n’ime ọńụ anyị nile. Agbanyeghị na anyị na-ada ọtụtu-mgbe, ọbụrụ na anyị nʼagakwu Ya, Ọ ga-enyere anyị aka, otu-nzọ-ụkwụ na otu-oge.

Nke-abụọ, Akwụkwọ nke Mọmọn bụ ihe aka-ebe anyị ji naka nke ịgba-ndụ. Akwụkwọ nke Mọmọn bụ ngwọ-ọrụ ekwere na nkwa maka mkpokọta nke ụmụ Chineke, eburu na amụma dịka ọgbụgba-ndụ ọhụrụ.15 Dịka anyị nʼagụ Akwụkwọ nke Mọmọn, site na onwe anyị na ndị-ọzọ, nʼime obi ma-ọbụ ngụpụta, anyị nwere-ike jụọ Chineke “iji ezigbo obi, jiri ezigbo ebum-nʼobi, na-enwe okwukwe nʼime Kraịst,” ma nataa site na ike nke Mụọ-Nsọ mmasị-obi ike nke Chineke na Akwụkwọ nke Mọmọn bụ ezi-okwu.16 Nke a tinyere mmasị-obi ike na Jizọs Kraịst bụ Onye-nzọpụta anyị,Josef Smit bụ onye-amụma nke Mweghachi, na Nzukọ nke Onye-nwe-anyị ka akpọrọ aha Ya—Nzukọ nke Jizọs Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ.17

Akwụkwọ nke Mọmọn nʼekwu site na ọgbụgba-ndụ mgbe-ochie na mgbe-ọhụrụ nye unu ndị bụ ụmụ nke Lehi, “ụmụ nke ndị-amụma.”18 Ndị nna-nna unu natara nkwa ọgbụgba-ndụ na unu, ụmụ-ụmụ ha, ga-amata olu dịka osi na uzuzu nʼime Akwụkwọ nke Mọmọn.19 Olu ahụ ị nʼanụ dịka ị nʼagụ na-agba-ama na unu bụ “ụmụ nke ọgbụgba-ndụ ahụ”20 ma Jizọs bụ Onye-ọzụzụ-atụrụ Ọma unu.

Akwụkwọ nke Mọmọn nʼagwa onye-ọbụla nʼime anyị, nʼime mkpụrụ-okwu nile nke Alma, ịbanye “nime ọgbụgba-ndụ na [Onye-nwe-anyị], na [anyị] ga-ejere ya ozi ma dobe iwu-nsọ ya nile, ka o wee wụkwasị [anyị] Mụọ ya nʼuju ya nile.”21 Mgbe anyị chọrọ ịgbanwe nke ọma—dịka otu onye kwuru, “ịkwụsị ntamu ma nwee ọńụ”—anyị na-enweta odudu, enyem-aka, na ume. Mgbe anyị biara site na ọgbụgba-ndụ ịnọ nʼime Chineke na ọgbakọ nke ndị kwere-ekwe, anyị nwere-ike nata ngọzi ekwere na nkwa nʼime ozizi nke Kraịst22ugbua.

Ikike na ike nke ọkwa-nchụ-aja eweghachiri ịgọzi ụmụ Ya nile bụ akụkụ nke atọ nke ịgba ọgbụgba-ndụ. Nʼime ọgbọ nke a, Jọn nke nʼeme baptism na Ndị-ozi Pita, Jemes, na Jọn abiala dịka ndị-ozi enyere nsọpụrụ site nʼaka Chineke iweghachi ikike ọkwa-nchụ-aja Ya.23 Ọkwa-nchụ-aja nke Chineke na emume-nsọ Ya nile nʼeme mmekọrịta nile nʼelu ụwa ịdị-ụtọ ma nyee mmerịkọta nile ọgbụgba-ndụ ikike ịnwe ọnọdụ nʼime elu-igwe.24

Ọkwa-nchụ-aja nwere-ike gọzie site na nwata ruo na ọnwụ—site na mgbe enyere nwata aha na ngọzi ruo mgbe agọziri ili ya. Ngọzi nile nke ọkwa-nchụ-aja nʼagwọ-ọrịa, nyee nkasi-obi, nyee ndụmọdụ. Otu nna nọrọọ nʼewere nwa ya nwoke iwe tupu mgbaghara ịhụnʼanya abia dịka nna ahụ nyere nwa ya nwoke ngọzi ọkwa-nchụ-aja. Nanị onye-otu nke nzukọ nʼime ezi-na-ụlọ ya, otu nwa agbọghọ amataghị gbasara ịhụnʼanya nke Chineke ebe ọnọ ruo mgbe ọ natara ngọzi ọkwa-nchụ-aja kwalitere-mụọ. Na ụwa nile, ndị-isi-ezi-na-ụlọ nakwado nime mụọ inye ngọzi nile nke onye-isi ezi-na-ụlọ. Dịka onye-isi ezi-na-ụlọ dobere aka ya nile nʼelu isi gị, ọ na-enwete mmetụta ma gosikwa gị ịhụnʼanya nke Chineke ebe ịnọ. Ọ na-ekwpụta agbụrụ gị nʼime ụlọ nke Israel. Ọ na-ekwu ngọzi nile site nʼaka Onye-nwe-anyị. Na echiche ọma, otu nwunye nke onye-isi ezi-na-ụlọ gwara m otu ya na ezi-na-ụlọ ya ji anabata Mụọ ahụ na ụbọchị nile Nna ha nʼenye ngọzi nile onye-isi ezi-na-ụlọ.

Na-ikpeazụ, ngọzi nile nke ịgba ọgbụgba-ndụ n’abia mgbe anyị soro onye-amụma nke Onye-nwe-anyị ma nwee ọńụ n’ime ibi-ndụ ọgbụgba-ndụ temple, tinyere n’ime ọlụlụ di na nwunye. Ọgbụgba-ndụ ọlụlụ-di na nwunye na-adị mgbe ebigh-ebi dịka anyị nʼachọ kwa ụbọchị ańụrị nke nwunye na ezi-na-ụlọ anyị tupu nke anyị. Dịka “mụ” nʼabụrụzi “anyị,” anyị nʼetokọta ọnụ. Anyị na-etokọta okenye, anyị na-etokọta okorobia. Dịka anyị nʼagọzi onwe anyị na obibi-ndụ nke ichefu onwe anyị, anyị nʼahụ olile-anya na ọńụ anyị nile edoro-nsọ nʼime ugbua na ebigh-ebi.

Ka ọnọdụ nile dị iche-iche, mgbe anyị mechara ihe nile anyị nwere-ike mee, nke kachasị mma anyị nwere-ike mee, ma nʼezi-okwu jụọ ma chọọ enyem-aka Ya nʼụzọ ahụ, Onye-nwe-anyị ga-edu anyị, nʼoge na ụdị Ya, site na Mụọ-Nsọ.25 Ọgbụgba-ndụ ọlụlụ di na nwunye nyakọtara-ọnụ site na nhọrọ nke ndị nʼeme ha—ncheta nke nkwanye-ugwu nke Chineke na anyị maka ohere-ịhọrọ na ngọzi nke enyem-aka Ya mgbe anyị chọkọtara ya ọnụ.

Mkpụrụ nile nke ịgba-ndụ gara ọgbọ niile nke ezi-na-ụlọ ka a na-enweta nʼime ebe-obibi na obi anyị nile. Biko nye m ohere iji atụmatụ nile nke onwe kọwa.

Mgbe nwanne-nwanyị Gong na mụ hụwara onwe anyị nʼanya nʼọlụlụ di na nwunye, a mụtara m gbasara ohere-ịhọrọ na mkpebi. Nʼime oge nta, anyị nọ nʼime ụlọ-akwụkwọ na-amụ akwụkwọ nʼime obodo abụọ dị iche-iche nʼelu nnukwu obodo abụọ dị iche-iche. Ọ bụ ihe mere m g’enwe ike nʼezi-okwu sị E nwetara m PHD nʼime mmerịkọta nile ụwa.

Mgbe m jụrụ, “Nna nke Elu-igwe, ọ bụ m lụọ Susan?” E nwere m udo. Kama ọ bụ mgbe m mụtara iji ezi-obi kpee-ekpere, “Nna nke Elu-igwe, a hụrụ m Susan nʼanya ma chọọ ịlụ ya. A na m ekwe nkwa na aga m abụ di na nna kachasị mma m nwere-ike ịbụ”—mgbe m tinyere mkpebi m kachasị mma nʼọrụ, ọ bụ mgbe ahụ ka m natara nkwado kachasị ike nke mụọ.

Ugbu a osisi nile Ezi na ụlọ Gong na Lindsay Achọrọ, akụkọ nile, na foto nile n’enyere anyị aka ịchọpụta ma jikọta site na nhumihe ndụ nke ịgba ọgbụgba-ndụ ọgbọ.26 Maka anyị, ndị mụrụ anyị gụnyere:

Foto, oyiyi
Alice Blauer Bangerter

Nne-nne-nne Alice Blauer Bangerter,onye ndị di atọ biara nʼotu ụbọchị, mechara gwa di ya ka ọkpụọ igwe ụkwwụ nye bọta ya ka onwere-ike mee bọta, dụọ-akwa, ma gụọ-akwụkwọ otu oge.

Foto, oyiyi
Loy Kuei Char

Nna-nna-nna Loy Kuei Char kwọrọ ụmụ ya nʼazụ ya ma tinye ngwo-ngwo nile nke ezi-na-ụlọ ya nʼelu donkey dịka ha na-agafe ubi nile nʼelu Hawaiiʼs Big Island. Ịgba-mbọ na ịchụ-aja ọgbọ nile nke ezi-na-ụlọ Char nʼagọzi ezi-na-ụlọ anyị taa.

Foto, oyiyi
Mary Alice Powell Lindsay

Gram Mary Alice Powell Lindsay nwere ụmụntakịrị ise mgbe di ya na nwa ya nwoke kachasị nwụrụ na-mberede n’etiti ụbọchị ole-na-ole. Nwanyị-isikpe afọ 47, Gram ji ịhụnanya site nʼaka ndị-ndu na ndị-otu zụlite ezi-na-ụlọ ya. Nʼime afọ ndị-ahụ, Gram kwere Onye-nwe-anyị nkwa na ọbụrụ na Ọ ga-enyere ya aka, ọ gaghị emekwa mkpesa. Onye-nwe-anyị nyere ya aka. O meghịkwa mkpesa.

Ụmụnne m nwoke na nwanyị, dịka a gbara aka-ebe site na Mụọ-Nsọ ahụ, ihe ọbụla dị mma ma dị ebigh-ebi bụ ihe kwụrụ nʼime ịdị-ndụ nke Chineke, Nna anyị ebigh-ebi, na Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, na Aja-mgbaghara-mmehie Ya. Onye-nwe-anyị, Jizọs Kraịst, bụ onye-ogbugbo nke ọgbụgba-ndụ ọhụrụ. Ịgba-ama nke Jizọs Kraịst bụ nzube ọgbụgba-ndụ nke Akwụkwọ nke Mọmọn.27 Site na ịńụ-iyi na ọgbụgba-ndụ, ikike ọkwa-nchụ-aja nke Chineke eweghachiri bụ ihe emere ka ọgọzie ụmụ nke Chineke nile, tinyekwa site na ọgbụgba-ndụ ọlụlụ di na nwunye, ọgbọ ezi-na-ụlọ, na ngọzi nile nke onwe.

Onye-nzọpụta anyị kwupụtara, “Mụ onwe m bụ Alfa na Omega, Kraịst Onye-nwe-anyị; e, a bụ m Onye ahụ, mmalite na ọgwụgwụ, Onye-mgbapụta nke ụwa.”28

Ka anyị nọ na mbido, Ọ nọnyere anyị, nʼime ịgba-ndụ anyị, ruo njedebe. A na m agba-ama n’aha dị nsọ nke Jizọs Kraịst, amen.