2010–2019
Okwu Mmechi
Ọgbakọ ozuru ọha nke onwa iri 2019


Okwu Mmechi

Ntozu-oké nke onye ọbụla na-achọ mgbanwe zuru ezu nke uche na obi ịdịrịzi karịa dị ka Onye-nwe-anyị.

Ezigbo ụmụnne m ndi nwoke na ndi nwanyị, dịka anyị na-abịa na njedebe nke ọgbakọ nke a dị ịtụn’anya, anyị n’ekele Onye-nwe-anyị maka ozi nkwalite niile na egwu ndi juworo obi anyị. Anyị n’ezie eritewo oriri nke ime mụọ.

Anyị maara na ozi ọma nke Jizọs Kraịst eweghachiteworo ga ewete olile-anya na ọńụ nye ndi mmadụ ndi ga-anụ ma soro ozizi Ya. Anyị maarakwa na ezi-na-ụlọ ọbụla nwere ike bụrụzie ezi ebe mgbaba dị nsọ nke okwukwe, ebe udo, ịhụn’anya, na Mụọ nke Onye-nwe-anyị nwere ike ịnọ.

N’ezie, ihe kachasị mma nke Mweghachite bụ tempụl dị nsọ. Emume nsọ na ọgbụgba-ndụ ya niile dị oké mkpa maka ikwado ndi mmadụ ndi dị njikere ịnabata Onye-nzọpụta n’Ọbịbịa nke Abụọ Ya. Ugbu a anyị nwere tempụl 166 edoro nsọ, ma ndi ọzọ na-abịa.

Mmepe ụlọ ka a ga-eme tupu edoo nke ọhụrụ na nke arụgharịrị nsọ. Ọtụtụ ndi enyị n’abụghị nke okwukwe anyị ga-eso mee ihe na nlegharị nke tempụl ndi ahụ ma ga-amụta ihe banyere ngọzi niile nke tempụl. Ma ụfọdụ ndi ọbịa ahụ ka mụọ ga-akwalite ịmata karịa. Ụfọdụ ga-ajụ ajụjụ n’eziokwu otu ha g’esi nwee ike tozuo maka ngọzi niile nke tempụl.

Dịka ndi otu nke Nzukọ-nsọ, anyị kwesịrị ikwado inye azịza maka ajụjụ ha niile. Anyị nwere ike kọwaa na ngọzi niile nke tempụl dịịrị onye ọbụla na ndi mmadụ niile ndi ga-akwado onwe ha. Mana tupu ha ga-enwe ike banye n’ime tempụl edoro nsọ, ha kwesịrị itozu oke. Onye-nwe-anyị chọrọ ka ụmụ Ya niile rie ngọzi ebighi-ebi niile dị n’ime tempụl Ya. Ọ tụziwo-aka ihe onye ọbụla ga-emerịrị iji tozuo banye ụlọ Ya dị nsọ.

Ebe dị mma anyị g’esi bido ụdị ohere nkuzi a bụ ịtụgharị uche ha n’okwu ndi ebiri n’ezi tempụl: “Ịdị nsọ nye Onye-nwe-anyị: Ụlọ nke Onye-nwe-anyị.” Ozi nke Onye-isi Henry B. Eyring taa na ọtụtụ ndi ọzọ akwalitewo anyị ịdịrịzi nsọ karịa. Tempụl ọbụla bụ ebe dị nsọ; patrọn ọbụla na-agbalị ịdịrịzi nsọ karịa.

Ihe niile achọrọ iji banye na tempụl gbasara ịdị nsọ nke onwe. Inwete njikere ahụ, onye ọbụla nke chọrọ irite ngọzi niile nke tempụl g’enwe ajụjụ-ọnụ abụọ: nke mbụ ya na bishọp, onye ndụmọdụ bishọp, ma ọbụ onye-isi ngalaba nta; nke abụọ ya na onye-isi stek ma ọbụ mishọn ma ọbụ otu n’ime ndi ndụmọdụ ya. Na ajụjụ ọnụ ndi ahụ, ọtụtụ ajụjụ ka aga ajụ.

Ụfọdụ n’ime ajụjụ ndi ahụ ka edegharịrị na nso nso a maka nghọta. Ọ ga-amasị m ugbu a ịgụgharịrị unu ya ugbu a:

  1. I nwere okwukwe n’ime na ọgbụgba-ama nke Chineke, Nna nke Ebigh ebi; Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst; na Mụọ Nsọ?

  2. I nwere ọgbụgba-ama nke Aja-mgbaghara-mmehie nke Jizọs Kraịst na maka ọrụ Ya dịka Onye-nzọpụta na Onye-mgbapụta?

  3. I nwere ọgbụgba-ama nke Mweghachite nke oziọma nke Jizọs Kraịst?

  4. Ị na-akwado Onye-isi nke Nzukọ-nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndi Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a dịka onye amụma, ọhụụ ụzọ, na onye mkpughe na dịka onye nanị ya nwere ikikere n’elu ụwa iji ọtụghe niile nke ọkwa-nchụ-aja eme ihe?

    Ị na-akwado ndi otu nke Otu Ndi-Isi Mbụ na Ndi Kworum Ndi-Ozi Iri-na-Abụọ dịka ndi-amụma, ndi-ọhụụ ụzọ, na ndi-mkpughe?

    Ị na-akwado ndi ọzọ Ji Ikike Zuruọha na ndi ndụ ngalaba nke Nzukọ nsọ?

  5. Onye-nwe-anyị ekwuwo na ihe niile ka a ga “eme n’ịdị ọcha” n’ihu Ya (Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 42:41).

    Ị na-agba mbo maka agwa ịdị ọcha n’ime echiche gị niile na omume gị niile?

    Ị n’erube isi nye iwu nke ịdị-ọcha mmekọrịta?

  6. Ị n’esoro nkuzi niile nke Nzukọ-nsọ ahụ nke Jizọs Kraịst n’ime omume nke onwe gị na n’ihu ụwa n’etiti ndi otu nke ezi-na-ụlọ gị na ndi ọzọ niile?

  7. Ị na-akwado ma ọbụ busaa nkuzi niile ọbụla, omume, ma ọbụ ozizi megidere ndi ahụ nke Nzukọ-nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndi Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a?

  8. Ị na-agba mbo idebe ụbọchị Izu-ike nsọ, ma n’ebe obibi ma na nzukọ-nsọ; gaa ọgbakọ gị niile; kwadoo maka ma rie oriri nsọ na ntozu oke; ma bie ndụ gị ka ya na iwu niile na iwu nsọ niile nke ozi ọma dakọrịta?

  9. Ị na-agba mbo ịkwụwa aka gị ọtọ n’ime ihe niile ị na-eme?

  10. Ị bụ onye na-akwụzu otu-ụzọ-na-ụzọ-iri?

  11. Ị ghọtara ma rube isi nye Okwu nke Amamihe?

  12. Ị nwere ụgwọ ego iji ma ọbụ oke-n’ọrụ ndi ọzọ ị kwesịrị ị na-enye di ma ọbụ nwunye ị lụbụrụ mbụ, ma ọbụ ụmụ ndi ọzọ?

    Ọ bụrụ ee, ị na-emezukwa oke-n’ọrụ ndịa ma ugbua?

  13. Ị na-edebe ọgbụgba-ndụ niile nke ị meworo n’ime tempụl, tinyekọta iyi gament tempụl dịka enyere iwu n’onyinye dị nsọ?

  14. Enwere mmehie ọjọọ n’ime ndụ gị nke ekwesịrị idozi n’aka ndi ji ikike ọkwa-nchụ-aja dịka otu akụkụ nke nchegharị gị?

  15. Ị kwere na gị tozuru oke ịbanye ụlọ nke Onye-nwe-anyị ma soro n’emume nsọ niile nke tempụl?

Echi na-abịa abịa, ajụjụ ikwado maka tempụl niile ndi a edegharịrị ka aga ekesara ndi ndu Nzukọ-nsọ gburugburu ụwa.

Na mgbakwunye n’ịza ajụjụ ndi ahụ na nkwụwa aka ọtọ, a ghọtara na patrọn tempụl okenye ọbụla ga eyi gament dị nsọ nke ọkwa-nchụ-aja n’okpuru uwe ha n’eyi oge obụla. Nkea n’egosi nranye ime mụọ igba mbo ụbọchi ọbụla ịdịrịzi karịa dịka Onye-nwe-anyị. Ọ nakwa echetere anyị ịnọgide n’okwukwe kwa ụbọchi na ọgbụgba-ndụ niile anyị mere ma gaa ije n’ụzọ ọgbụgba-ndụ kwa ụbọchi n’ụzọ dị elu ma dịrị nsọ karịa.

Ugbu a, nanị na nwa oge, ọ ga-amasị m ịgwa ndi ntoroọbịa okwu. Anyị na-agba unu ume itozu oke maka limited-rekọmendị. A ga-ajụ gị nanị ajụjụ ndi ahụ gbasara gị na nkwado gị maka emume nsọ niile nke nnọchi anya baptizim na ime onye otu. Anyị jupụtara n’ekele maka ntozu oke gị na njikere gị isoro n’ọrụ ahụ dị nsọ nke tempụl. Anyị n’ekele gị!

Ntozu oke nke onwe ịbanye n’ụlọ nke Onye-nwe-anyị na-achọ nkwado ime mụọ nke onwe. Ma site n’enyem-aka nke Onye-nwe-anyị, enweghị ihe n’ekweghi omume. N’oge ụfọdụ, ọ dị mfe iwu tempụl karịa ka ọ dị iwulite ndi mmadụ akwadoro maka tempụl. Ntozu oke nke onye ọbụla na-achọ mgbanwe zuru ezu nke uche na obi ịdịrịzi karịa dị ka Onye-nwe-anyị. Ị bụ amaala kwụwara aka ya ọtọ, ị bụ ọmụmatụ dị mma karịa, na ị bụkwa onye dị nsọ karịa.

A na m agba-ama na ụdị ọrụ nkwado a n’ewete imerime ngọzi nime ndụ nke a, na ngọzi niile n’enweghị atụ maka ndụ na-abịa abịa, tinyekọta mmụbanye nke ezi-na-ụlọ gị mgbe ebighị ebi niile “n’ọnọdụ ańụrị n’enweghị ọgwụgwụ.”1

Ugbua a ga m achọ ikwu banyere isiokwu ọzọ: atụmatụ niile maka afọ nke na-abịa. N’oge udummiri nke afọ 2020, ọ ga-abụ afọ 200 kpọmkwem kemgbe Josef Smith hụtara ọhụ nke anyị maara dịka Ọhụ nke Mbụ. Chineke nke Nna na Ọkpara Ya Ahụrụ n’anya, Jizọs Kraịst, pụtakwutere Josef, nwa ntoroọbịa gbara afọ 14. Mmemme ahụ gosiri mbido nke Mweghachite nke oziọma nke Jizọs Kraịst n’uju ya, dịkwa ka esi kwuo n’ime Baibụl Nsọ.2

Emesịa nleta n’usoro n’usoro nke ndi ozi sitere n’eluigwe bịara, tinyekọta Moronaị, Jọn Omee Baptizm, na Ndi Ozi oge mbụ Pita, Jemis, na Jọn. Ndi ọzọ sooro, tinyekọta Mosis, Elias, na Elịaja. Onye ọbụla wetere ikike sị n’igwe iji gọzie ụmụ nke Chineke n’elu ụwa ọzọ kwa.

N’ọrụ ebube, anyị anatawokwa Akwụkwọ nke Mọmọn: Testament Ọzọ nke Jizọs Kraịst, akwụkwọ nsọ nsiso nke Baịbụl Nsọ. Mkpughe niile ebipụtara n’ime Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile na Ọla Pel Dị Oke Ọnụ Ahịa emelitewo ebe ọ dị ukwuu nghọta anyị nke iwu nsọ niile nke Chineke na eziokwu ebighị ebi.

Ọtụghe niile na ụlọ ọrụ niile nke ọkwa-nchụ-aja ka eweghachiteworo, tinyekọta ụlọ ọrụ nke Onye Ozi, Iri Asaa, onye-isi ezinaụlọ, high priest, okenye, bishọp, onye nkuzi, na dikọn. Ma ụmụ-nwanyị ndi hụrụ Onye-nwe-anyị n’anya n’eje ozi n’ike n’ike n’ime Otu Enyem aka, Prịamarị, NdiIyom Nta, Sọnde Skul, na ọkpụkpọ oku ndi ọzọ niile nke Nzukọ-nsọ—ha bụ akụkụ niile dị oké mkpa nke Mweghachite nke ozi-ọma nke Jizọs Kraịst n’uju ya.

Ya mere, afọ 2020 ka a ga-ewepụta dịka afọ narị afọ abụọ. Ọgbakọ zuru-ọha Eprel ọzọ ga-adị iche site n’ọgbakọ ndị gara aga. N’ọnwa isii n’abịa-abịa, e nwere m olile anya na onye otu ọbụla na ezi-na-ụlọ niile ga-akwado maka ọgbakọ pụrụ iche nke a ga-eji eche ntọala niile nke ozi-ọma eweghachitere.

I nwere ike bido nkwado gị site n’ịgụgharị ọhụrụ akụkọ Ọhụ nke Mbụ nke Josef Smith edere n’ime Ọla Pel Dị oke Ọnụ ahịa. Ihe anyị ga-amụ maka afọ na-abịa abịa n’ime Bịa, Soro M bụ Akwụkwọ nke Mọmọn. O nwere ike masị gị itule ajụjụ ndi dị mkpa dịka, “Olee otu ndụ m ga-esi dịrị iche ọbụrụ na amamihe m nweteworo site na Akwụkwọ nke Mọmọn ka ewepụrụ na ntabi anya?” ma ọbụ “Olee ụzọ mmemme ndi sotere Ọhụ nke Mbụ si dịrị mụ na ndi m hụrụ n’anya iche?” Nakwa, jiri vidiyo nke Akwụkwọ nke Mọmọn ndi nọ ugbua, o nwere ike ịmasị gị itinyekọta ya n’ime ihe ọmụmụ nke onwe gị na ezi-na-ụlọ gị.

Họrọ ajụjụ ndi nke onwe gị. Hazie atụmatụ nke onwe gị. Rukpuo onwe gị n’ime ihé ebube nke Mweghachite. Dị ka ị n’eme, ọgbakọ zuru-ọha Eprel na-abịa ga-abụ na-abụghị nanị ihe ncheta; ọ ga-abụ nke agaghị echefu.

Ugbua na mmechị, ịhụnanya m na ngọzi m ka m na-ahapụrụ unu na onye ọbụla n’ime unu ga-enwe ańụrị karịa ma dịrị nsọ karịa n’ụbọchị ọbụla gafere. Ka ọ dị ugbua, biko nwee obisike na mkpughe na-aganihu n’ime Nzukọ-nsọ ma ga na-aganihu n’okpuru ntụzi aka nke Onye-nwe-anyị ruo “ebumnuche niile nke Chineke emezuo, ma Jehova Ukwuu ga-asị na emezuwo ọrụ ahụ.”3

A na m agọzi unu, n’ekwupụtakwu ịhụnanya m nye unu, ya na ọgbụgba-ama m na Chineke dị ndụ! Jizọs bụ Kraịst ahụ! Nke a bụ Nzukọ-nsọ Ya ma anyị bụ ndi Ya. Site na aha dị nsọ nke Jịzọs Karist, amen