Ọgbakọ Zuru ọha
Debe Mgbanwe ahụ
Ọgbakọ Zuru ọha Ọktoba 2020


Debe Mgbanwe ahụ

Site na Jizọs Kraịst, a na-enye anyị ume ime mgbanwe ndị ga-anọgide. Dịka anyị n’obi umeala n’atụgharị chewe Ya ihu, Ọ ga-amụba ike anyị.

Ụmụnne nwanyị, ọ bụ ihe ọńụ ị nọnyere unu.

Foto, oyiyi
Ịkwụ ụgwọ n’ime ahịa

Chee maka mmadụ ịga n’ahịa ịzụ ihe. Ọbụrụ na ya akwụọ onye nnata ego karịa ọnụ ahịa ahụ, onye nnata ego ga-enyeghachị ya nke fọrọ.

Foto, oyiyi
Ịnata ego mgbanwe fọdụrụ.

Eze Benjamin kuziiri ndị ya n’ime Amerịka ochie maka ezigbo ngọzi niile anyị na-anata site n’aka Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst. O kere eluigwe niile, ala na ihe niile mara mma anyị n’erite.1 Site n’Aja mgbaghara mmehie Ya, Ọ n’ewetere anyị ụzọ inwete mgbapụta site na njọ na ọnwụ.2 Dịka anyị n’egosi obi ekele anyị nye Ya site n’ịnọgide ibi ndụ iwu nsọ Ya niile, Ọ naghị egbu oge ịgọzi anyị, na-ahapụ anyị mgbe niile n’ebere Ya.

Ọ n’enye anyị nnukwu, nnukwu karịa oke anyị nwere ike iweghachịrị Ya mgbe niile. Ya mere, gịnị ka anyị nwere ike inye Ya, onye kwụrụ ụgwọ n’ekweghị ngụta maka njọ anyị? Anyị nwere ike inye Ya mgbanwe. Anyị nwere ike inye Ya mgbanweanyị. O nwere ike bụrụ mgbanwe nke echiche, mgbanwe nke omume, ma ọbụ mgbanwe n’ụzọ nke anyị na-aga. Na nkwụghachị maka ụgwọ Ya n’enweghị ọnụ ahịa maka onye ọbụla n’ime anyị, Onyenwe anyị na-arịọ ka anyị gbanwee obi anyị. Mgbanwe Ọ na-achọ n’aka anyị abụghị maka nrite nke onwe Ya kama maka nke anyị. Ya mere, n’adịghị ka onye ọzụụ ahịa onye ga-ewere ego mgbanwe ahụ anyị nyere, Onye Nzọpụta anyị dị ebere na-akpọ anyị ị debe mgbanwe ahụ

Mgbe ha nụtachara okwu niile nke Eze Benjamin kwuru, ndị ya bepụtara akwa, n’ekwupụta na obi ha niile agbanwewo sị, “N’ihi Mmụọ nke Onyenwe anyị Ji ike niile, nke weteworo anyị nnukwu mgbanwe nime anyị, … anyị enweghịkwa mmasị ime ihe ọjọọ, kama ịnọgide n’eme ihe dị mma mgbe niile.”3 Akwụkwọ nsọ asịghị na ha tozuru oké n’otu ntabi anya; kama, ọchịchọ ha ịgbanwe kpaliri ha ime ihe. Mgbanwe obi ha pụtara iwepụ mmadụ nwoke ma ọbụ nwanyị anụ ahụ na ikwe ike Mmụọ Nsọ dịka ha gbalịrị ịdịrịzi dịka Jizọs Kraịst karịa.

Onye isi Henry B. Eyring na-akuzi: “Ezi mgbanwe dabeere n’ịchọ n’okwukwe, jiri nnukwu mgbalị na obere mgbu. Emesịa Onyenwe anyị bụ onye nwere ike ịnye … ọrụ ebube nke nsacha na mgbanwe.”4 Ọbụrụ nanyị tinyekọta mgbalị anyị na ike nke Onye Nzọpụta nwere ịgbanwe anyị ọnụ, anyị na-abụrụzi ndị ekere eke ọhụrụ.

Mgbe m dị nta, a hụtara m onwe iga ije n’ụzọ gbaliri elu, sara mbara chere ihu n’ebumnuche m maka ndụ ebighị ebi. Oge ọbụla m mere ma ọbụ kwuo ihe n’adịghị mma, a na m ahụta onwe m dịka m na-ada ala n’ụzọ ahụ, ma bidogharịa njem m n’isi ọzọ. Ọ dịịrị ka ịdaru n’otu sukwịa n’ihe egwuregwu nke ụmụ ntakịrị Chutes na Ladas nke na-ashịda gị ala site n’elu bọd ahụ laghachị na mbido egwuregwu ahụ! Ọ naara eme ka m daa mba mgbe ahụ! Mana dịka m bidoro ịghọta ozizi nke Kraịst5 na otu esi etinye ya kwa ụbọchị na ndụ m, a chọtara m olile anya.

Foto, oyiyi
Usoro nke mgbanwe gụnyekọtara nnọgide rụọ ọgwụgwụ

Jizọs Kraịst enyewo anyị usoro gara n’ihu nke mgbanwe. Ọ na-akpọku anyị inwe okwukwe na Ya, nke na akwali anyị ichegharị—“nke okwukwe na nchegharị n’ewete mgbanwe nke obi.”6 Dịka anyị n’echegharị ma chịgharịa obi anyị nye Ya, anyị n’erite ọchịchọ dị elu ime ma bie ọgbụgba ndụ dị nsọ. Anyị na-anọgide ruo ọgwụgwụ site n’ịganihu itinye ụkpụrụ niile ndị ahụ n’ime ndụ anyị ma kpọkuo Onyenwe anyị ịgbanwe anyị. Ịnọgide ruo ọgwụgwụ pụtara ịgbanwe ruo ọgwụgwụ. Ugbua aghọtawo m na m anaghị ebidogharị n’isi na mbọ ọbụla m dara, kama na mbọ ọbụla, a na m aganihu n’usoro nke mgbanwe m.

Enwere ahịrị n’akwali mmụọ dị nime isiokwu nke Ndị Inyom Nta nke kwuru sị, “E ji m ịhụnanya nakwere onyinye nke nchegharị ma na-achọ imetazi kwa ụbọchị.”7 Ekpere m bụ ka anyị nakwere onyinye nkea mara mma, ma na anyị nwere ebumnobi n’ịchọta mgbanwe. Mgbe ụfọdụ mgbanwe anyị na-achọ ime bụ nke n’emekọ ya na njọ siri ike. Kama mgbe ụfọdụ, anyị na-agbalị imezi agwa anyị ịnọ n’otu ahịrị ya na njirimara nke Jizọs Kraịst. Nhọrọ anyị kwa ụbọchị ga-enwe ike nyere anyị aka ma ọbụ gbochie ọganihu anyị. Mgbanwe obere ama ama eme, na-anọgide, ga-enyere anyị aka imetazi. Adakwala mba. Mgbanwe bụ usoro ogologo ndụ. Obi jupụtara m n’ekele na nime mgbali nile anyị ịgbanwe, Onyenwe anyị na enwere anyị ndidi.

Site na Jizọs Kraịst, a na-enye anyị ume ime mgbanwe ndị ga-anọgide. Dịka anyị n’obi umeala n’atụgharị chewe Ya ihu, Ọ ga-amụba ike anyị.

N’ịgbakwunye nime ike mgbanwe nke Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta anyị, Mmụọ Nsọ ga-akwado ma duo anyị dịka anyị n’etinye mgbalị anyị. O nwekwara nnọọ ike ịnyere anyị aka mara ụdị mgbanwe anyị kwesịrị ịme. Anyị nwekwara ike ịchọta enyem aka na mgbam ume site n’aka ngọzi ọkwa nchụaja, ekpere, ibu ọnụ, na ịga tempụl.

N’otu aka ahụ, ndị ezi na ụlọ dị ntụkwasị obi, ndị ndu, na ndị enyi nwere ike inye aka na mgbalị anyị ime mgbanwe. Mgbe m gbara afọ asatọ, nwanne m nwoke nnukwu, Lee, na mụ ga-anọgide ndị enyi anyị n’egwu egwu na alaka osisi dị n’agbata obi anyị. Ọ masịrị anyị ịnọkọta ọnụ n’etiti ndị enyi anyị n’okpuru osisi ahụ. Otu ụbọchị, Lee si n’osisi ahụ daa ma gbajie aka ya. Inwe aka gbajiri agbaji mere ya araa ya ahụ ite elu osisi n’onwe ya. Mana ańụrị n’elu osisi ahụ nnọọ abụghị otu ọdị ebe ọ nọghị n’ebe ahụ. Ya mere, ụfọdụ n’ime anyị na anọrọ ya n’azụ ebe ndị ọzọ na-adọlie aka ya dị mma, n’etinyeghị oke mgbalị, Lee alaghachị n’elu osisi ọzọ. Aka ya ka gbajiri agbaji, mana ọ nọnyeerela anyị ọzọ n’ańụrị ọbụbụ enyi anyị dịka o nwetere ọgwụgwọ.

Echewo m mgbe na mgbe banyere nhumihe m nke igwu egwuregwu n’okpuru osisi ahụ dịka ịbụ otu ụdị ihe omume n’ime oziọma nke Jizọs Kraịst. N’okpuru akụkụ niile nke oziọma, anyị n’erite ngọzi ndị jikọtara ọgbụgba ndụ anyị. Ụfọdụ nwere ike ha adapụwo site na nchekwa nke ọgbụgba ndụ ha ma chọọ enyem aka anyị irigoghachị n’ime nchekwa nke ngalaba nke oziọma. O nwere ike ịra ha ahụ ịbịaghachị n’onwe ha. Anyị nwere ike cheretụ ma gbalisie ike nwa obere iji nyere ha aka nwete ọgwụgwọ mgbe ha n’ańụrị ọbụbụ enyi anyị?

Ọ bụrụ na ị na-ata ahụhụ sitere na ọdịda, biko kwe ka ndị ọzọ nyere gị aka laghachị n’ọgbụgba ndụ gị na ngọzi niile ha n’enye. Onye Nzọpụta nwere ike inyere gị aka nwete ọgwụgwọ na mgbanwe n’oge ahụ ndị ị hụrụ n’anya gbara gị gburugburu.

Mgbe ụfọdụ a na m ezute ndị enyi ndị m na-ahụbeghị ọbụna ruo ọtụtụ afọ. Mgbe ụfọdụ ha na-ekwu, “Ị nwebeghị mgbanwe ọbụla!” Oge ọbụla m nụrụ nke ahụ, a na m akụjatụ, n’ihi a tụrụ m anya na e mewom mgbanwe n’ime afọ ndịa niile. A tụrụ m anya na m agbanwewo kemgbe ụnyahụ! A tụrụ m anya na m dịtụ obi ọma, hapụtụ ịma ikpe, ma nwee ọmịiko karịa. A tụrụ m anya na m n’aza mkpa ndị ọzọ ọsọ ọsọ, ma a na m atụanya na m nwetụrụ ndidi nwa obere karịa.

Ọ na-amasị m inyi ugwu n’akụkụ ebe obibi m. Mgbe ụfọdụ, a na m enwete obere nkume n’ime akpụkpọ ụkwụ m n’ụzọ ahụ. N’ikpeazụ, a na m akwụsị ma kụchasịa akpụkpọ ụkwụ m. Mana ọ n’eju m anya ogololgo oge m na-ahapụ onwe m inyi elu na mgbu tupu mụ akwụsị ma wepụ ihe ahụ na-agbakasị m ahụ.

Dịka anyị n’eje n’ụzọ nke ọgbụgba ndụ, mgbe ụfọdụ okwute n’abanye n’ime akpụkpọ ụkwụ anyị n’ụdị agwa n’ekwesịghị ekwesị, njọ, ma ọbụ omume dị njọ. Ngwa ngwa anyị kụchasịrị ha site na ndụ anyị pụọ, ọńụ ga-ejupụta karịa na njem anụ ahụ anyị.

Ịnọgide n’enwe mgbanwe chọrọ mgbalị. Enweghị m ike iche ịkwụsị n’ụzọ ahụ maka itinyeghachị n’ime akpụkpọ ụkwụ m nkume ahụ n’agbakasị ahụ n’egbu mgbu m ka wepụrụ. Agaghị m achọ ime otu ahụ ọzọ karịa otu ọmarịcha nru ububa ga-ahọrọ ịlaghachịrị akwuru ya.

A na m agba ama na n’ihi Jizọs Kraịst, anyị nwere ike ịgbanwe. Anyị nwere ike belata agwa anyị, megharịa echiche anyị, ma mezie omume anyị ịdịrị dịka Ya karịa. Ma site enyem aka Ya, anyị nwere ike debe mgbanwe ahụ Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen