Ọgbakọ Zuru ọha
Anyị Na-ekwu maka Kraịst
Ọgbakọ Zuru ọha Ọktoba 2020


Anyị Na-ekwu maka Kraịst

Dịka ụwa n’ekwu obere ịhe maka Jizọs Kraịst, ọ gadị mma m’anyị kwuo maka Ya karịa.

A na m egosipụta ịhụnanya m nwere banyere unu, ndị enyi anyị hụrụ n’anya ma ndị okwukwe ibe anyị. Okwukwe na obisike unu na-amasị m kemgbe ọnwa ndịa gara-aga, dịka ọrịa nkea zuru ụwa si mebịsịa ndụ anyị ma kpọrọ ọtụtụ ndị ezinụlọ na ndị enyị anyị hụrụ n’anya.

N’oge nkea na-agbangwoju anya, enwetawom obi ekele pụrụ iche na amatawom n’ezie na Jizọs bụ Kraịst ahụ. Ị nwetewo mmetụta dị otua? Enwere ọtụtụ ihe isi ike na-akpagbu onye ọbụla n’ime anyị, mana n’oge niile Ọ bụ Ya nọ n’ihu anyị, ma jiri obi umeala kwuo, “A bụ m ụzọ ahụ, eziokwu ahụ, ma ndụ ahụ.”1 Dịka anyị na-anagide oge nkea onye ọbụla n’esi n’akụkụ onye ọzọ pụọ, anyị ekwesịghị mọlị ịnagide oge nke isi n’akụkụ Ya pụọ n’ime mmụọ, Onye ji ịhụnanya n’akpọ anyị sị, “Bịakwute mụ.”2

Dịka kpakpando nke n’egosi ụzọ n’ime mbara igwe oji chapụrụ-achapụ, Jizọs Kraịst n’enye ịhé n’ụzọ anyị. Ọ bịara n’ụwa nkea site n’ụlọ anụ dị umeala. O biri ndụ zuru oké. Ọ gwọrọ ndị ọrịa ma kpọlite ndị nwụrụ anwụ. Ọ bụ enyị nyere onye ahụ echefuru. Ọ kụziri anyị ị mee ịhe ọma, ịrube isi, ma ịhụrịta onwe anyị n’anya. Akpọgburu Ya n’elu obe, jiri ebube bilie ka ụbọchị atọ gara, wee nye anyị ma ndị anyị hụrụ n’anya ohere ibi ndụ ọzọ mgbe anyị nwụrụ. Nihi ebere ma amara ya nke n’enweghị atụ, Ọ nyekwasịrị onwe Ya mmehie niile na ntarama-ahụhụ niile anyị, wee wetere anyị mgbaghara dịka anyị na-echegharị ma udo n’ime ebili mmiri nke ndụ nkea. Anyị hụrụ Ya n’anya. Anyị n’efe Ya ofufe. Anyị n’esoro Ya. Ọ bụ nkume nke mkpụrụ obi anyị niile.

Dịka ịhe ịtụnanya, n’agbanyeghi na okwukwe ahụ na-etolite n’ime anyị, enwere ọtụtụ n’ime ụwa ndị maara nanị obere ịhe gbasara Jizọs Kraịst, ma enwekwara ụfọdụ mba-ụwa ebe etiri aha Ya na mbụ, mana ugbua okwukwe n’ime Jizọs Kraịst na-agbadata n’ike. Ndị nsọ dị ike n’okwukwe ndị bi na Europe ahuwo otu nkwenye si agbadata n’ime mba ha kemgbe ọtụtụ afọ iri ugbua.3 Ọ dị mwute na n’ime United States nke America okwukwe na-agbadakwa. Otu nnyocha emere oge n’etechaghị-aka gosiri na kemgbe afọ 10 gara-aga, ndị mmadụ ruru nde 30 bi n’ime United States ekwezighi na Jizọs Kraịst bụ chi.4 Gburugburu ụwa, nnyocha ọzọ buru amụma na n’afọ iri ole n’ole dị n’ihu, ndị ga-ahapụ Okpụkpere-Kraịst ga-akarị ugboro abụọ ndị ga-anabata ya.5

N’ezie, anyị n’asọpụrụ oké onye ọbụla nwere ị họọrọ, kosiladị, Nna anyị nke Igwe ekwupụtawo ya sị, “Nkea bụ Ọkpara m: nụrụ olu Ya.”6 A na m agba akaebe na ụbọchị ga-abịa mgbe ikpere niile ga-egburu ala ma ire ọbụla ga-ekwu na Jizọs bụ Kraịst ahụ.7

Kedụ otu anyị g’esi akpa agwa n’ime ụwa nkea n’agbanwe agbanwe? N’agbanyeghi na ụfọdụ na-ahapụ okwukwe ha, ndị ọzọ nakwa achọ eziokwu. Anyị enyekwasiwo onwe anyị aha Onye Nzọpụta. Gịnị ọzọ ka anyị kwesịrị ịme?

Nkwado nke Onyeisi Russell M. Nelson

Ụfọdụ aziza anyị ga-abịa mgbe anyị chetere otu Onyenwe anyị siri kuziere Onyeisi Russell M. Nelson n’ọnwa ndị ahụ tupu okú ya ị bụ Onyeisi nke Nzụkọ-nso. Mgbe ọ n’ekwu okwu otu afọ tupu ọkpụkpọ ya, Onyeisi Nelson kpọrọ anyị k’anyị nwe ọmụmụ-ihe dị ime banyere ugboro 2,200 akpọrọ aha Jizọs Kraịstn’ime Topical Guide.7

Foto, oyiyi
Onyeisi Nelson dịka ọ na-amụ akwụkwọ nsọ nile.

Mgbe ọnwa atọ gasịrị n’ime ọgbakọ zuru ọha nke Eprel, ọ kwuru otu, n’agbanyeghi ọtụtụ afọ iri ọ bụworo onye n’eso ụzọ, ọmụmụ dị ime ọ mere banyere Jizọs Kraịst emetụtawo ya n’ụzọ dị ukwuu. Nwanne nwanyị Wendy Nelson, jụrụ ya maka mmetụta nkea. Ọ zaghachịrị, “Abụrụwom nwoke dị iche!” Ọ bụrụwo nwoke dị iche? N’afọ 93, ka ị bụ nwoke dị iche? Onye-isi Nelson kọwara:

“Mgbe anyị tinyere oge n’imụ banyere Ọnye nzọpụta na Aja mgbaghara mmehie Ya, anyị na-adọbata onwe anyị ruo n’ebe [Ọ] nọ. …

“… Nlekwasi anya anyị [ga-esịzi] ike n’etiti Onye nzọpụta na n’oziọma Ya.”9

Ọnye nzọpụta kwuru, “Lekwasịnụ m anya n’echiche ọbụla.”10

N’ime ụwa nkea jupụtara n’ọrụ, nchekasị, ma mgbalị niile tozuru oké, anyị n’edobe obi anyị, uche anyị, ma echiche anyị niile n’ebe Ọ nọ, onye bụ olileanya na nzọpụta anyị.

Ọ bụrụ na i bido ọzọ mụwa banyere Ọnye nzọpụta nyere aka ịkwado Ọnyeisi Nelson, ọ bụ na ọpụtaghị na ọ ga-enye aka kwadokwa anyị?

Foto, oyiyi
Onye-isi-nduzi Russell M. Nelson

N’ikwu mkpa aha nke Nzukọ nsọ bara, Ọnyeisi Nelson kụziri, “Ọbụrụ na anyị … ga-achọ inwete ike nke Aja-mgbaghara-mmehie nke Jizọs Kraịst—isachapụ na ịgwọ anyị, igba anyị ume na imeba anyị, ma na njedebe ibuli anyị—anyị garịrị anakwere Ya nke ọma dịka ebe ike ahụ si bịa.”11 Onye isi Nelson kụziri n’ọbụrụ n’anyị na-akpọ aha ziri ezi nke Nzụkọ nsọ n’oge ọbụla, ịhe nwere ike ị dị obere, agaghị adị obere mọlị, m’anyị ga-ahazigharị ọdịnịhu nke ụwa nkea.

Nkwa ekwere maka Nkwado Gị

A na m ekwe unu nkwa na dịka unu na-akwado onwe unu dịka Onyeisi Nelson siri mee, unu g’adịkwa iche, unu ga-eche banyere Onye nzọpụta karịa, kwuo banyere Ya mgbe ọbụla karịa n’enweghi obi abụọ. Dịka unu n’abịa n’amata ma n’ahụkwa Ya n’anya n’ụzọ dị omimi, okwu unu niile ga na-asọ dịka mmịrị n’enweghi mgbochi, dịka ha si eme mgbe unu n’ekwuuru otu n’ime ụmụaka umu m’ọbụ otu ezi enyi anyị okwu. Ndị ahụ ga-ege unu ntị agaghị enwe mmụọ isiiri unu agụgọ kama ha ga-achọ ị mụta ịha n’aka unu.

Mụ na unu na-ekwu maka Kraịst, mana enwere ike anyị emee otu ọ dị mma karịa. Ọ bụrụ na ụwa ga-ekwu maka Ya n’ụzọ dị ntakịrị, onyezi ga-ekwu maka Ya karịa? Ọ bụ anyị! Tinyekwara ndị ọzọ kwesịrị ike na Kraịst!

Ikwu maka Kraịst nime Ebe-obibi anyị nile.

Enwere ịhe osise nke Onye-nzọpụta nọ n’ebe obibi anyị? Anyị ọ na-ekwuru ụmụaka anyị banyere ilu nke Kraịst mgbe na mgbe? “Akụkọ niile nke Kraịst [dịka] ikuku n’efe oku ndị ahụ n’enwu n’ime obi niile nke ụmụaka anyị.”12 Mgbe ọbụla ụmụaka unu jụrụ unu ajụjụ, chee maka ikụzi ịhe Ọnye nzọpụta kuziri. N’ịmatụ, ọ bụrụ na nwa gị jụọ, “Nna gịnị mere anyị ji ekpe ekpere?” Ị nwere ike zaghachi, “Nkea bụ ezigbo ajụjụ. Ị na-echeta mgbe Jizọs kpere ekpere? K’anyị kwuo maka ịhe mere Ọ jiri kpee nakwa otu Ọ jiri kpee.”

“Anyị na-ekwu maka Kraịst, anyị na-an̄ụrị-ọn̄ụ n’ime Kraịst, … ka ụmụ anyị wee mata ebe ha ga-esi wee lee anya maka nsachapụ nke mmehie ha niile.”13

Ikwu maka Kraịst nime Nzukọ nsọ.

Otu akwụkwọ nsọ ahụ kwukwara “n’anyị na-ekwusa maka Kraịst.”14 N’ime ofufe nsọ anyị niile, k’anyị lekwasị anya n’ebe Ọnye nzọpụta Jizọs Kraịst nọ, ma n’ebe onyinye nke aja mmehie Ya. Nkea apụtaghị n’anyị agaghị ekwu maka otu nhụmịhe si na ndụ anyị m’ọbụ kesaara ha echiche nke ndị ọzọ. Mgbe isiokwu anyị bụ banyere ezinụlọ mọbụ ije ozi, mọbụ tempụl, mọbụ otu mgbasa oziọma anyị mere, ịhe ọbụla n’ime ofufe anyị kwesịrị irụtụ aka n’ebe Ọnyenwe anyị Jizọs Kraịst nọ.

Afọ iri atọ gara-aga, Onyeisi Dallin H. Oaks kwuru maka otu leta nke ọ natara “site n’aka otu nwoke onye kwuru na ọ gara otu nzukọ [oriri nsọ] ma gee ntị nye mmadụ iri na asaa gbara ama ha, ma ekwughi maka Ọnye nzọpụta.”15 Onyeisi Oaks mesịrị kwuo, “Enwere ike nkọwa nke ahụ erughi otu ọ siri kwuo [mana] a na m ekwu ya nihi ọ na-arọpụta ncheta doro anya maka anyị niile.”16 Ọ mesịrị kpọọ anyị k’anyị kwuo maka Kraịst karịa n’ime okwu anyị nile ma na klasị anyị niile. A hụtawom na anyị kacha elekwasị anya na Kraịst karịa n’ime ọgbakọ Nzụkọ nsọ anyị niile. Ọ g’adị mma m’anyị jiri obi anyị gaa n’ihu na mbọ niile ndịa dị mma.

Ikwueru Ndọ ọzọ maka Kraịst.

Maka ndị nọ anyị n’akụkụ, k’anyị ghara ịgbasị nkiti, k’anyị dịrị njikere karịa i kwu maka Kraịst. Onyeisi Nelson kwuru, “Ezigbo ndị n’eso ụzọ nke Kraịst dị njikere ị guzoro iche, i kwupụta okwu, ma ị pụ iche site na ndị mmadụ nke ụwa.”17

Mgbe ụfọdụ anyị na-eche na mkparịta ụka anyị na onye ọzọ kwesịrị ị mee ka ha bịawa Nzụkọ nsọ mọbụ hụwa ndị mgbasa oziọma. Ka Onyenwe anyị duo ha dịka ha siri chọọ, ma k’anyị chee karịa maka oké n’ọrụ anyị ị kwuchitere Ya, ma n’enwe eziuche ma n’ekwu maka okwukwe anyị. Okenye Dieter F. Uchtdorf akụziworo anyị na mgbe ọbụla mmadụ jụrụ anyị otu ngwụcha izu-ụka anyị dị, anyị kwesịrị ijiri obi ụtọ kwuo na ọ na-amasị anyị ị nụrụ ka ụmụaka ndị Praịmarị n’abụ “I’m trying to be like Jesus.”18 Biko, k’anyị na-agba ama maka okwukwe anyị n’ime Kraịst. Ọ bụrụ na mmadụ gwa anyị maka nsogbu ọ nwere n’ime ndụ ya, anyị nwere ike kwuo, “Jọn, Mary, Ị maara na ekwere m na Jizọs Kraịst. A na m eche maka otu ịhe O kwuru nke nwere ike ị nyere gị aka.”

Bido kwuwe okwu na soshal midia maka ntụkwasị obi i nwere na Kraịst. Ọtụtụ ga-asọpụrụ okwukwe unu, mana ọ bụrụ na mmadụ achọghịdị ị nụ mgbe ị na-ekwu maka Onye nzọpụta, nwe obisike nime nkwa Ya: “Ngọzị ga-adịrị gị, mgbe ụmụ mmadụ ga-akparị gị … n’ihi m. … N’ihi ị nwere nnukwu ụgwọ-ọrụ n’elu-igwe.”19 Ọ na-amasị anyị ị bụ ndị n’eso Ya karịa na-anyị “na-amasị” ndị n’eso anyị. Onye-ozi Pọl nyere ndụmọdụ, “Dịrị na njikere oge ọbụla ịnye aziza [maka] olile anya ahụ nke nọ n’ime gị.”20 K’anyị na-ekwu maka Kraịst.

Akwụkwọ nke Mọmọn bụ akaebe dị ike banyere Jizọs Kraịst. Ọ dịka ihu-akwụkwọ niile ya n’ekwu maka Onye-nzọpụta na mgbasa-ozi Ya dị nsọ.21 Ihu-akwụkwọ ya niile jupụtara na nghọta maka Aja mgbaghara mmehie na amara Ya. Dịka onye nsiso nke Agba Ọhụrụ, Akwụkwọ nke Mọmọn na-enyere anyị aka ị ghọta nke ọma ịhe kpatara Ọnye nzọpụta jiri bịa ị tọghapụ anyị, ma otu anyị nwere ike iji bịakwute Ya nso n’ụzọ dị ukwuu.

Ụfọdụ ndị ibe anyị n’eso Kraịst, mgbe ụfọdụ, amachaghị nkwenye na ebumnuche anyị niile . Ọ g’adị mma m’anyị soro ha ńụrịa n’ime okwukwe anyị na ha nwekọrịtara ọnụ na Kraịst, ma n’ime akwụkwọ nsọ nke Agba Ọhụrụ nke anyị niile hụrụ n’anya. N’ụbọchị ndị na-abịa n’ihu, ndị ahụ kwere na Jizọs Kraịst ga-achọ ị bụkọrịta enyi ma nyekọrịta onwe ha nkwado.22

Foto, oyiyi
Ị̀hè nke ụwa

Dịka ụwa n’ekwu ntakịrị ịhe maka Jizọs Kraịst, ọ gadị mma m’anyị kwuo maka Ya karịa. Mgbe ezi agwa anyị dịka ndị n’eso Ya ga-apụta ihé, ọtụtụ ndị gbara anyị gburugburu g’adị nkwadọ ị gere anyị ntị. Dịka anyị na-ekesa ihé nke anyị natara n’aka Ya, ihé nke Ya na ike nzọpụta Ya ga-amuke n’isi ndị ahụ dị njikere ịmeghe obi ha. Jizọs sịrị “A … bịara M n’ime ụwa [dịka] ihé.”23

Ị buli Ọchịchọ-obi anyi nwere maka Ikwu maka Kraịst elu

Enweghi ihe n’ebuli ọchịchọ-obi m elu ikwu maka Kraịst karịa iche otu mbịaghachi Ya g’esi adị. Ebe anyị amaghị mgbe Ọ ga-abịaghachi, ịhe omume niile maka mbịaghachi Ya g’adị oke ebube! Ọ ga-abịa n’ime igwe-oji nke eligwe n’ebube ma dịka eze, ya na ndị mụọ-ozi Ya dị nsọ. Ọ bụghị nanị ụfọdụ ndị mụọ-ozi, kama ndị mụọ-ozi Ya niile dị nsọ. Ndịa abụghị ndị mụọ ozi ụmụaka ahụ nwere nti na-acha uhe-uhe nke Raphael sere, nke a n’ahụ na card niile nke mmemme Valentine. Ndị anyị n’ekwu bụ ndị mụọ-ozi nke senchuri niile gara-aga, ndị mụọ-ozi ezigara ikwuchi ọnụ nke ọdụm niile,24ị meghe ụzọ niile nke nga,25ị ma okwa maka ọmụmụ Ya nke a na-eche kemgbe,26ị kasị Ya obi na Gethsemane,27ị kasị ndị n’eso ụzọ Ya obi n’oge Nrigo n’elu Ya,28ma ịmeghe Mweghachi dị ebube nke oziọma ahụ.29

Foto, oyiyi
Ọbịbịa nke Abụọ

Ị nwere ike ịche otu ị ga-esi gbagote elu izute Ya, mọbụ na ndụ nkea mọbụkwanụ nke na-abịa abịa?30 Nke ahụ bụ nkwa Ya o kwere ndị eziomume. Nhụmịhe dị itụnanya nkea, ga-akanye ihe na mkpụrụ obi anyị ruo ebighi ebi.

Anyị nwere obi ekele maka ọnye amụma anyị hụrụ n’anya, Onyeisi Russell M. Nelson, onye buliworo ọchịchọ obi anyị elu ịhụ Onye nzọpụta n’anya ma kwupụta na Ọ bụ chi. A bụ m onye akaebe maka aka Onyenwe anyị n’isi ya na onyinye nke mkpughe nke n’edu ya. Ọnyeisi Nelson, anyị ji obi niile na-eche ndụmọdụ gị.

Ndị ezi enyi m gburugburu ụwa, k’anyị kwuo maka Kraịst, ma na-echeta nkwa ebube nke Ya nkea, “Ọnye ọbụla … nke ga-ekwupụta m n’ihu ụmụ mmadụ, a ga M ekwupụta maka ya … n’ihu Nna m [onye] bi n’igwe.”31 A na ma agba ama na Ọ bụ Ọkpara nke Chineke. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen

Hụba-ama

  1. Jọn14:6.

  2. Matiu11:28

  3. See Niztan Peri-Rotem, “Religion and Fertility in Western Europe: Trends across Cohorts in Britain, France and the Netherlands,” European Journal of Population, May 2016, 231–65, ncbi.nlm.nih.gov/pmc/articles/PMC4875064.

  4. “[Sixty-five percent] of American adults describe themselves as Christians when asked about their religion, down 12 percentage points over the past decade. Meanwhile, the religiously unaffiliated share of the population, consisting of people who describe their religious identity as atheist, agnostic or ‘nothing in particular,’ now stands at 26%, up from 17% in 2009” (Pew Research Center, “In U.S., Decline of Christianity Continues at Rapid Pace,” Oct. 17, 2019, pewforum.org).

  5. See Pew Research Center, “The Future of World Religions: Population Growth Projections, 2010–2050,” Apr. 2, 2015, pewforum.org.

  6. Mak 9:7; Luk 9:35; see also Matiu 3:17; Joseph Smith—History 1:17.

  7. Lee Ndị Filipi 2:9, -9–11.

  8. See Russell M. Nelson, “Prophets, Leadership, and Divine Law” (worldwide devotional for young adults, Jan. 8, 2017), broadcasts.ChurchofJesusChrist.org.

  9. Russell M. Nelson, “Drawing the Power of Jesus Christ into Our Lives,” Liahona, May 2017, 40–41.

  10. Ozizi na Ọgbụgbandụ niile 6:36.

  11. Russell M. Nelson, “The Correct Name of the Church,” Liahona, Nov. 2018, 88.

  12. Neil L. Andersen, “Tell Me the Stories of Jesus,” Liahona, May 2010, 108.

  13. 2 Nifaị 25:26.

  14. 2 Nifaị 25:26.

  15. Dallin H. Oaks, “Another Testament of Jesus Christ” (Brigham Young University fireside, June 6, 1993), 7, speeches.byu.edu.

  16. Dallin H. Oaks, “Witnesses of Christ,” Ensign, Nov. 1990, 30.

  17. Russell M. Nelson, “Ị dọbata Ike nke Jizọs Kraist nime Ndụ Anyị niile40.

  18. See Dieter F. Uchtdorf, “Missionary Work: Sharing What Is in Your Heart,” Liahona, May 2019, 17; “I’m Trying to Be like Jesus,” Children’s Songbook, 78.

  19. Matiu 5:11–12.

  20. 1 Pita 3:15.

  21. “As [the Book of Mormon prophetic scribes] wrote their testimonies of the promised Messiah, they mentioned some form of his name on an average of every 1.7 verses. [They] referred to Jesus Christ by, literally, 101 different names. … When we realize that a verse usually consists of one sentence, it appears that we cannot, on the average, read two sentences in the Book of Mormon without seeing some form of Christ’s name” (Susan Easton Black, Finding Christ through the Book of Mormon [1987], 5, 15).

    “While the words atone or atonement, in any of their forms, appear only once in the King James translation of the New Testament, they appear 35 times in the Book of Mormon. As another testament of Jesus Christ, it sheds precious light on His Atonement” (Russell M. Nelson, “The Atonement,” Ensign, Nov. 1996, 35).

  22. Those leaving Christianity in the United States are younger. “More than eight-in-ten members of the Silent Generation (those born between 1928 and 1945) describe themselves as Christians (84%), as do three-quarters of Baby Boomers (76%). In stark contrast, only half of Millennials (49%) describe themselves as Christians; four-in-ten are religious ‘nones,’ and one-in-ten Millennials identify with non-Christian faiths” (“In U.S., Decline of Christianity Continues,” pewforum.org).

  23. Jọn 12:46.

  24. Lee Daniel 6:22.

  25. Lee Ọlụ 5:19.

  26. Lee Luk 2:2–14.

  27. Lee Luk 22:42–43.

  28. Lee Ọlụ 1:9–11.

  29. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 1327:12–13110:11–16Joseph Smith—History 1:27–54

  30. Lee 1 Ndi Tesolonịa 4:16–17Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 88:96–98

  31. Matiu 10:32