Ọgbakọ Zuru ọha
Ka Chineke Merie
Ọgbakọ Zuru ọha Ọktoba 2020


Ka Chineke Merie

Ịdị njikere ị kwe ka Chineke merie n’ime ndụ gị? Ịdị njikere ị kwe ka Chineke bụrụ mmetụ kachasị mkpa n’ime ndụ gị?

Ezi ụmụnne m ndi nwoke na ndi nwanyị, ụdị obi ekele m nwere maka ozi ebube niile nke ọgbakọ nkea na maka ohere ọma m nwere ikwuru unu okwu ugbua.

Na ihe karịrị afọ 36 m buworo Onye Ozi, ozizi niile nke nchịkọta nke Izrel enwetewo uche m.1 Ihe niile banyere ya akpaliwo mmụọ m, tinyekọta mgbasa ozi niile na aha ndị2 dịka nke Ebraham, Aịzik, na Jekọb; ndụ ha niile na ndị nwunye ha; ọgbụgba ndụ nke ha na Chineke meworo ma gbatịwo rute agbụrụ ha;3 mgbasasị nke ebo iri na abụọ ahụ; na imerime mkpughe banyere nchịkọta ahụ n’ụbọchị anyị a.

A mụwo m banyere nchịkọta ahụ, kpee ekpere banyere ya, tinye uche m niile n’akwụkwọ nsọ ndị gbasara ya, ma rịọ Onyenwe anyị ịmụba nghọta m.

Ya mere chee maka obi ụtọ m mgbe m nwetere odudu banyere echiche ọhụrụ na nso nso a. Site n’enyemaka nke ndị ọkà mmụta Hibru, a mụtara m na otu n’ime nkọwa nke mkpuru okwu ahụ Izrel bụ ka Chineke Merie.”4 Ya mere, aha ahụ nnọọ akpọrọ Izrel n’ekwu banyere otu onye onye dị njikere ikwe ka Chineke merie n’ime ndụ ya. Echiche nke ahụ n’akpali mmụọ m!

Mkpuru okwu ahụ akpọrọ dị njikere dị oke mkpa nye nkọwa nke Izrel.5 Anyị niile nwere ohere nhọrọ nke anyị. Anyị nwere ike họrọ ị bụ Izrel, ma ọbụ agaghị. Anyị nwere ike họrọ i kwe Chineke merie n’ime ndụ anyị, ma ọbụ agaghị. Anyị nwere ike kwe Chineke bụrụ mmetụta kacha ike n’ime ndụ anyị, ma ọbụ agaghị.

Na nwa oge, ka anyị cheta maka mgbe kacha mkpa n’ime ndụ nke Jekọb, nwanwa nke Ebraham. N’ebe ahụ Jekọb gụrụ Peniel (nke pụtara “ihu nke Chineke”),6 Jekọb na otu mwale tara akpụ gbara mgba. Ohere nhọrọ ya ka anwalere. Na mgba niile a, Jekọb gosiri ihe dị ya oke mkpa. O gosipụtara na ya dị njikere ikwe Chineke merie na ndụ ya. Na nzaghachị, Chineke gbanwere aha Jekọb ị bụ Izrel,7 nke pụtara “kwe ka Chineke merie.” Mgbe ahụ Chineke kwere Izrel nkwa na ngọzi niile nke ekweworo n’isi nke Abraham ga-abụkwa nke ya.8

Na mwute, ụmụ ụmụ Izrel mebiri ọgbụgba ndụ ha na Chineke. Ha tụrụ ndị amụma okwute ma ha adịghị njikere ịkwe ka Chineke merie na ndụ ha. Mgbe emesịrị, Chineke gbasasịrị ha gaa n’akụkụ anọ niile nke elu ụwa.9 Na njupụta ebere, O mesịrị kwee nkwa ịkpokọta ha, dịka Aịzaịa kwuru: “Na nwa oge ka m hapụworo gị [Izrel]; kama na nnukwu ebere ka ga-akpokọta gị.”10

I buru n’obi nkọwa nke Izrel na asụsụ Hibru, anyị na-achọpụta na mkpokọta nke Izrel n’agbakwunye nkọwa ọzọ. Onyenwe anyị n’ekpokọta ndị niile dị njikere ịkwe ka Chineke merie na ndụ ha. Onyenwe anyị n’ekpokọta ndị niile ga-ahọrọ ịkwe ka Chineke bụrụ mmetụta kacha mkpa na ndụ ha.

N’ime afọ narị dum, ndị amụma ekwuwo maka mkpokọta nkea,11 ma ọ n’eme ugbua! Dịka ihe mbute ụzọ nke Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Onyenwe anyị, ọ bụ ọrụ nke kachasị mkpa n’ime ụwa!

Mkpokọta tupu milenia nkea bụ ihe-ihe mere otu-otu nke ịgbasasị okwukwe na ume nke ime mmụọ nye nde kwuru nde mmadụ. Ma dịka ndị otú nke Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a, ma ọbụ “Izrel gbara ndụ nke ụbọchị ikpeazụ a,”12 enyewo anyị iwu ịnyere Onyenwe anyị aka n’ọrụ a dị oke mkpa.13

Mgbe anyị n’ekwu maka ịkpokọta Izrel n’ala mmụọ ma n’ala mmadụ, anyị ekwu, n’ezie, maka ọrụ nke mgbasa oziọma, tempụl, na agụgụala ezi na ụlọ. Anyị nakwa ekwu banyere iwulite okwukwe na ọgbụgba ama n’ime obi nke ndị anyị na ha bi, na-arụ ọrụ, ma a n’ejere ozi. Oge ọbụla anyị mere ihe ọbụla nke n’enyere ọnye ọbụla aka—ma n’ọnwụ ma na ndụ—ịme ma ịdebe ọgbụgba ndụ ha na Chineke mere, anyị n’enye aka ịkpokọta Izrel.

Oge n’etebeghị aka gara aga, nwunye nke otu nime nwa nwa anyị nwoke naara adọlị n’ime mmụọ. A ga m akpọ ya “Jill.” N’agbanyeghị obubu ọnụ, ekpere, na ngọzi ọkwa nchụaja niile, Nna Jill nọ n’ọnụ ọnwụ. Ụjọ bịara ya na nna ya na ọgbụgba ama ya ga-efulahụrụ ya.

Otu abalị, nwunye m, Nwanne nwanyị Wendy Nelson, gwara m maka ọnọdụ Jill. Ụtụtụ sotere Wendy nwetere mmetụta ịgwa Jill na azịza m nye mgba ime mmụọ ya bụụrụ otu mkpụrụ okwu! Mkpụrụ okwu ahụ bụụrụ mkpụmkpụ.

Jill mesịrị gwa Wendy na n’isi mbụ obi gbawara ya maka azịza m. O sịrị, “A naara m enwe olile anya na Nna nke ukwu ga-ekwe m nkwa ọrụ ebube maka nna m. A nọọrọ m n’eche ihe kpatara mkpụrụ okwu ahụ mkpụmkpụ si bụrụ nke metụrụ ya ikwu.”

Mgbe emesịrị nna Jill anwụọ, mkpụrụ okwu ahụ mkpụmkpụ nọọrọ na-abịa ya n’uche. O mepere obi ya ịghọta ọbụna nke ọma karịa na mkpụmkpụ pụtara “ịhụ naanị ihe dị nso.” Mgbe ahụ echiche ya bidoro ịnọgharị. Emesịa Jill asị, “Mkpụmkpụ mere mụ akwụsị, chee echiche, ma nwete ọgwụgwọ. Mkpụrụ okwu ahụ ugbua n’ejupụta m n’udo. Ọ na-echetere m ịgbasaa echiche m ma chọọ nke ebighị ebi. Ọ na-echetere m na enwere atụmatụ dị nsọ ma na nna m ka dị ndụ ma hụ m n’anya ma n’elepụrụ m anya. Mkpụmkpụ edubawo m na Chineke.”

Obi na-atọ m nnukwu ụtọ maka ọmarịcha nwa nwa ọgọ anyị. N’oge nkea na-agbawa obi n’ime ndụ ya, ọmarịcha Jill na-amụta otu esi anabata uche nke Chineke maka nna ya, jiri echiche nke ebighị ebi maka ndụ nke onwe ya. Site n’ịhọrọ ịkwe ka Chineke merie, ọ na-achọta udo.

Ọ bụrụ na anyị ga-ekwe ya, enwere ọtụtụ ụzọ nkọwa na asụsụ nke Hibru jiri kọwaa Izrel nwere ike si nyere anyị aka. Chee otu ekpere anyị maka ndị mgbasa oziọma anyị—na maka mgbalị nke onwe anyị ikpokọta Izrel—nwere ike isi agbanwe buru echiche nkea n’uche. Mgbe ụfọdụ anyị n’ekpe ekpere n’aga edu anyị na ndị mgbasa oziọma ruo na ndị kwadoro ịnata eziokwu niile nke oziọma nke Jizọs Kraịst eweghachitere. Ọ na-atụ m n’anya, onye ka a ga-eduga anyị mgbe anyị rịọrọ ịchọta ndị ahụ dị njikere ịkwe ka Chineke merie n’ime ndụ ha?

Enwere ike iduga anyị ruo ụfọdụ ndị n’ekwetụbeghị na Chineke ma ọbụ Jizọs Kraịst ndị ugbua n’enwe agụụ ịmụta banyere Ha na atụmatụ nke ańụrị Ha. Ndị ọzọ nwere ike bụrụ ndị “amụrụ n’ime ọgbụgba ndụ”14 ma kemgbe agafuwo pụọ site n’ụzọ ọgbụgba ndụ. Enwere ike ha ejikerewo ugbua ịchegharị, laghachị, ma kwe ka Chineke merie. Anyị nwere ike ịnyere ha aka site n’iji aka na obi mepere emepe nabata ha. Ma ụfọdụ ndị enwere ike iduga anyị nwere ike ọmetụwo ha mgbe niile na enwere ihe n’ezughị oké n’ime ndụ ha. Ha kwa ka ojuju na ọńụ na-agụ nke na-abịara ndị ahụ dị njikere ị kwe ka Chineke merie n’ime ndụ ha.

Net nke ozi ọma iji kpokọta Izrel gbasasịrị dị oke ọnụ. Enwere ohere maka onye ọbụla onye ga-anabata kpam kpam oziọma nke Jizọs Kraịst. Onye ọbụla gbanwere na-abụrụzi otu n’ime ụmụ ọgbụgba ndụ nke Chineke,15 ma ọbụ n’ọmụmụ ma ọbụ na nkuchi. Nke ọbụla abụrụzie onye nketa n’uju nye nkwa niile nke Chineke kweworo ụmụ nke Izrel jupụtara n’okwukwe!16

Onye ọbụla n’ime anyị nwere ike dị nsọ n’ihi na onye ọbụla bụ nwa nke Chineke. Onye ọbụla hara ọnụ n’anya Ya. Nchọpụta nke eziokwu a dị omimi. Ụmụnne nwoke na nwanyị, biko kpachapụ anya gee ntị n’ihe m ga ekwu ugbua. Chineke ahụghị otu agbụrụ n’anya karịa nke ọzọ. Ozizi banyere okwu a kwere nghọta. Ọ na-akpọku ndị niile ịbịakwute Ya, “ndị ojii na ndị ọcha, ndị oru na ndị nwe onwe ha, nwoke na nwanyị.”17

A na m ekwe unu nkwa na ọnọdụ gị n’ihu Chineke abụghị maka ụcha ahụ gị. Ihu ọma ma ọbụ enweghị ihu ọma na Chineke dabeere na nkwesi gị ike na Chineke na iwu nsọ Ya niile n’abụghị na ụcha ahụ gị.

Ọ n’ewute m na ụmụnne anyị ndị nwoke na ndị nwanyị Ojii gburugburu ụwa na-atachị obi nke mgbu sitere n’ịkpa ókè ọjọọ na obi ọjọọ. Taa a na m akpọku ndị otu anyị ebe niile ibute ụzọ n’ịhapụ akparam agwa na omume ndị nke obi ọjọọ. A na m arịọ unu imelite nsọpụrụ maka ụmụ Chineke niile.

Ajụjụ nye onye ọbụla n’ime anyị, n’agbanyeghị agburu, bụ otu ụdị. dị njikere ị kwe ka Chineke merie n’ime ndụ gị? dị njikere ị kwe ka Chineke bụrụ mmetụ kachasị mkpa n’ime ndụ gị? Ị ga ekwe ka okwu Ya niile, iwu nsọ Ya, na ọgbụgba ndụ Ya niile metụta ihe i na-eme kwa ụbọchị? Ị ga-ekwe ka olu Ya dịrị mkpa karịa ihe ọbụla? Ị dị njikere ịkwe ihe ọbụla Ọ chọrọ ka gị mee bute ụzọ n’ihe niile ndị ọzọ ị chọrọ ime? Ị dị njikere ị kwe ka uche Ya kpugide uche gị?18

Tulee otu ụdị njikere nkea nwere ike isi gọzie gị. Ọ bụrụ na ị lụbeghị ọlụlụ ma na-achọ onye nsiso, ọchịchọ gị ị bụ “nke Izrel” ga-enyere gị aka kpebie onye gị na ya ga-akpa na otu unu si akpa.

Ọ bụrụ na ị lụwo di ma ọbụ nwunye onye mebiworo ọgbụgba ndụ ya, njikere gị ị kwe ka Chineke merie n’ime ndụ gị ga-ekwe ka ọgbụgba ndụ gị na Chineke nọrọ enweghị nsogbu. Onye Nzọpụta ga-agwọ obi gị gbawara. Eluigwe ga-emepe dịka ị na-achọ ịmara otu esi aga n’ihu. Ọ baghị uru na ị ga-akpafu ma ọbụ hụjụọ anya.

Ọ bụrụ na ị nwere ajụjụ ziri ezi banyere oziọma ma ọbụ Nzukọ nsọ, dị ka ị na ahọrọ ị kwe ka Chineke merie, a ga-edu gị ịchọta ma ghọta eziokwu zuruoké dị ebighị ebi nke ga-edu ndụ gị ma nyere gị aka kwụrụ chịm n’ụzọ nke ọgbụgba ndụ.

Mgbe ọnwụnwa chere gị ihu—ọbụna ọnwụnwa na-abịa mgbe ike gwụrụ gị ma ọbụ ịnwe mmetụta nanị gị nọ ma ọbụ na-aghọtaghere gị—chee ume nke ị nwere ike ịnwete dịka ị họọrọ ị kwe ka Chineke merie n’ime ndụ gị ma dịka ị na-arịọ Ya ịgba gị ume.

Mgbe ọchịchọ gị kachasị bụ i kwe ka Chineke merie, ịbụrụ otu akụkụ nke Izrel, ọtụtụ mkpebi na-adịrịzi mfe karịa. Ọtụtụ mkpa abụrụzie nke abụghị nke! Gị amara ụzọ ka mma imezi onwe gị. Gị amara ihe ị ga-ele ma gụọ, ebe ị ga-egbu oge gị, na ndị ị ga-eme enyi. Gị a mara ihe ị chọrọ imepụta. Gị a mara nke ọma ụdị mmadụ ị chọrọ ịbụrụzi.

Ugbua, ezi ụmụnne ndi m nwoke na ndi nwanyị, ọ na-ewe ma okwukwe ma ume i kwe ka Chineke merie. Ọ na-ewe nnọgidesi ike, ọrụ ime mmụọ siri ike ichegharị na iwepụ mmụọ nke ịbụ mmadụ anụ ahụ site na Aja-mgbaghara-mmehie nke Jizọs Kraịst.19 Ọ na-ewe mgbalị kwa ụbọchị n’enweghị mgbanwe ịmepụta agwa nke onwe ịmụ oziọma, ịmụtakwu banyere Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst, na ịchọ ma mee ihe nye mkpughe nke onwe.

N’oge ndịa niile dị egwu nke Onye Ozi Pọl buru amụma,20 Setan anaghịkwa agbalị ọbụna izo agha ya niile megide atụmatụ nke Chineke. Nnukwu ihe ọjọ jupụtara ebe niile. Ya mere, nanị ụzọ esi alanarị ime mmụọ bụ ịnwe mkpebi ị kwe ka Chineke merie n’ime ndụ anyị, ịmụta ị nụrụ olu Ya, na iji ume anyị nyee aka kpokọta Izrel.

Ugbua, olee otu o si emetụ Onyenwe anyị banyere ndị mmadụ ga-ekwe ka Chineke merie? Nifaị chịkọtachara ihe niile nke ọma: “[Onyenwe anyị] hụrụ n’anya ndị ahụ niile ga-ewere ya ịbụ Chineke ha. Lee, Ọ hụrụ nna anyị n’anya, ma ya na ha gbara ndụ, e, ọbụna Abraham, Aịsak, na Jekọb; ma o chetara ọgbụgba ndụ ahụ nke o [meworo].”21

Ma gịnị ka Onyenwe anyị dị njikere ị mere Izrel? Onyenwe anyị ekwewo nkwa na Ya ga-alu agha [anyị] niile na agha nke ụmụ [anyị], na agha nke ụmụ ụmụ [anyị] … ruo ọgbọ nke atọ na nke anọ”!22

Ka ị na-amụ akwụkwọ nsọ gị n’ọnwa isii ndị n’abịa, a na m agba unu ume idetu nkwa niile nke Onyenwe anyị kweworo na Ọ ga-emere Izrel gbara ndụ. E chere m na ọ ga-atụ gị n’anya! Tụgharịa uche na nkwa ndịa niile. Kwuo maka ha gị na ezi na ụlọ gị na ndị enyi. Ma bie ndụ ma mata mgbe nkwa ndịa ga-emezu n’ime ndụ nke onwe gị.

Ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, dị ka ị na ahọrọ ị kwe ka Chineke merie n’ime ndụ gị, ị ga-ahụta n’onwe gị na Chineke anyị bụ “Chineke nke ọrụ ebube.”23 Dịka mmadụ, anyị bụ ụmụ ọgbụgba ndụ Ya, ma aga akpọ anyị na aha Ya. Nkea a na m agba-ama n’aha dị nsọ nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. E kwuwo m maka Izrel n’ihe ruru ugboro 378 nke ozi karịrị 800 m kwuworo n’oge afọ 36 m dịka Onye Ozi.

  2. In Hebrew, Abram is a noble name meaning “exalted father.” But when God changed that name to Abraham, the name took on even greater significance, meaning “father of a multitude.” Indeed, Abraham was to be the “father of many nations.” (See Genesis 17:5; Nehemiah 9:7.)

  3. The Lord God Jehovah made a covenant with Abraham that the Savior of the world would be born through Abraham’s seed, certain lands would be inherited, and all nations would be blessed through Abraham’s lineage (see Bible Dictionary, “Abraham, covenant of”).

  4. See Bible Dictionary, “Israel.”

  5. The word Israel appears more than a thousand times in the scriptures. It can apply to Jacob’s (Israel’s) family of 12 sons, plus daughters (see Genesis 35:23–26; 46:7). Today it can apply geographically as a place on planet Earth. Iji ya eme ihe nusoro nke ozizi gbasara ndị mmadụ dị njikere ikwe ka Chineke merie n’ime ndụ ha.

  6. See Genesis 32:30; also spelled as Penuel in Genesis 32:31.

  7. See Genesis 32:28.

  8. See Genesis 35:11–12.

  9. For further study, see Topical Guide, “Israel, Scattering of.”

  10. Isaiah 54:7.

  11. Lee Isaiah 11:11–12; 2 Nifaị 21:11–12; Mosaia 15:11.

  12. See Encyclopedia of Mormonism (1992), “Covenant Israel, Latter-Day,” 1:330–31.

  13. As we participate in the gathering of Israel, the Lord has a wonderful way of describing those being gathered. He refers to us collectively as His “peculiar treasure” (Ọpụpụ 19:5; Abụ ọma 135:4), as His “jewels” (Malachi 3:17; Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 101:3), na dịka otu “mba dị nsọ” (Exodus 19:6; lee kwa Deuteronomy 14:2; 26:18).

  14. This phrase refers to the very covenant that God made with Abraham, saying, “In thy seed shall all the kindreds of the earth be blessed” (3 Nifaị 20:27). “Born in the covenant” means that before a person was born, that person’s mother and father were sealed in the temple.

  15. Such a promise was taught by God to Abraham: “As many as receive this Gospel shall be called after thy name, and shall be accounted thy seed, and shall rise up and bless thee, as their father” (Abraham 2:10; see also Ndị Rom 8:14–17; Ndị Gale 3:26–29).

  16. Each faithful member may request a patriarchal blessing. Through the inspiration of the Holy Ghost, the patriarch declares that person’s lineage in the house of Israel. That declaration is not necessarily a pronouncement of his or her race, nationality, or genetic makeup. Rather, the declared lineage identifies the tribe of Israel through which that individual will receive his or her blessings.

  17. 2 Nifaị 26:33.

  18. Lee Mosaia 15:7. Being of Israel is not for the faint of heart. To receive all the blessings that God has in store for Abraham’s seed, we can each expect to be given our own unique “Abrahamic test.” God will test us, as the Prophet Joseph Smith taught, by wrenching our very heartstrings. (See recollection of John Taylor in Teachings of Presidents of the Church: Joseph Smith [2007], 231.)

  19. Lee Mosaia 3:19.

  20. Lee 2 Timoti 3:1–13

  21. 1 Nifaị 17:40; okwu agbakwunyere.

  22. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 98:37; lee kwa Abụ ọma 31:23; Isaiah 49:25; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 105:14

  23. Mọmọn 9:11.