Ọgbakọ Zuru ọha
Welite Ihè Gị Elu
Ọgbakọ Zuru ọha Ọktoba 2021


Welite Ihè Gị Elu

Ọkpụkpọ okù m taa dị mfe: kesaa oziọma ahụ. Bụrụ onwe gị ma welite ihè ahụ elu.

Mgbem nọ nime otu ụgbọelu n’efega Peru obere afọ ole gara aga, A nọdụrụ m n’akụkụ onye ji aka ya kwuo na ọ kweghi na chi. Ọ jụrụ m gịnị kpatara m jiri kwere na Chineke. N’ime mkparịkọta ụka tọrọ ụtọ nke bidoronụ, A gwara m ya na ekwere m na Chineke nihi Josef Smit hụrụ Ya—ma emesịa agbakwụnyere m na mmata ihe nke m na Chineke bịara site na ezigbote nhụmihe ịme mmụọ nke onwem dị irè. A gwara m ya banyere nkwenye nke m na “ihe niile n’egosi na enwere Chineke”1 ma jụọ ya otu o chere na ụwa nke a—naanị ebe ndụ nọ nime mbara oghere nke igwe—siri pụta ma dịrị irè. Ọ zaghachiri na, ma kwuo okwu ndịa, “ihe mberede ahụ” nwere ike ọ mere n’ogologo oke oge rịịrịị. Mgbe m kọwara otu osi o kweghi omume na “ihe mberede” ga-enwe ike rọpụta ụdị ihe mara mma ma nke a ahaziri ahazi, ọ gbara nkịtị ntakịrị ma jiri obi ọma kwuo, “I jidewo m.” A jụrụ m ya ma ọ ga-agụ Akwụkwọ nke Mọmọn. Ọ sịrị ọ g’agụ, emesịa ezigara m ya oti kọpị.

Mgbe ọtụtụ afọ gafere, E metere m otu enyi mgbe m nọ na ọdụ ụgbọ elu nke Lagos Nigeria. Anyị matara onwe anyị dịka ọ na-ekiri passport m. A jụrụ m ya banyere nkwenye ya niile nke okpukperechi, ma o kwuru na ọ nwere okwukwe siri ike na Chineke. A gwara m ya maka obi ụtọ na inwu ọkụ nke oziọma nke Jịzọs Kraịst eweghachitere ma jụọ ya ma ọ ga-achọ ị mata karịa site n’aka ndị mgbasa oziọma. Ọ kwuru eeh, akụziere ya ma emee ya baptizim. Mgbe otu afọ mọbụ abụọ gasịrị, dịka m n’eje site na ọdịda ụgbọelu nke Liberia. A nụrụ m otu olu kpọrọ aha m. Echigharịrị m, ma ọ bụ otu nwanta nwoke ahụ bịakwuterem jiri nnukwu ihu ọchị. Anyị jiri obi ụtọ makụọ ma ọ mere ka m mata na ọ kwụsịrị ike nime Nzukọ nsọ ma ọ n’arụkọ ya na ndị mgbasa oziọma maka ịkụziri enyi ya nwanyị.

Ugbua, a maghịm ma enyị mụ nke ahụ n’ekweghi na chi ma ọ gụrụ Akwụkwọ nke Mọmọn mọbụ banye Nzukọ nsọ. Enyi m nke abụọ mere otu ahụ. Maka ha abụọ, oke n’ọrụ m2—ohere nke m—bụkwa otu ụdị: welite ihè nke oziọma elu—ka ịhụ n’anya, kesaa, ma kpọ onye ọbụla nime ha okù n’ụzọ dị mfe ma dịrị nkịtị.3

Ụmụnne ndị nwoke na nwanyị, E nwetewo m nhụmịhe nke ngọzị niile dị n’ịkesaa oziọma ahụ, ma ha dị ịtụnanya. Nke a bụ ole ma ole nime ha:

Ịkesa Ọziọma ahụ N’ewete Ọn̄ụ ma Olile-anya

Unu ahụwo, mụ na gị maara na anyị bibụụrụ dịka ụmụ nke Nna nke Eluigwe tupu ọbịbịa n’ụwa nke a4nakwa na ekere ụwa nke a maka ebumnobi inye onye ọbụla ohere inwete anụ ahụ, nwete nhụmihe, mụta ihe, ma tolite ka ewe nata ndụ ebighị ebi—nke bụ ndụ nke Chineke.5 Nna nke Eluigwe maara n’anyị ga-ata ahụhụ ma mee mmehie n’elu ụwa, yamere Ọ zidatara Ọkpara Ya, “onye ndụ ya n’enweghi atụ”6 ma aja mgbaghara ya n’adịghị agwụ agwụ7 mere ka ọ kwee omume k’anyị nwete mgbaghara, ọgwụgwọ, ma mee k’anyị zuo oke.8

Ị mata eziokwu ndịa niile ga-agbanwe ndụ n’ezie! Mgbe mmadụ mụtara maka ebumnuche dị ebube nke ndụ, ma bịa ghọta na Kraịst na-agbaghara ma na-enye ndị ahụ sooro Ya aka, ma emesịa họrọ isoro Kraịst baa nime mmiri niile nke baptizim, ndụ ga-agbanwe maka nke ọma—ọ bụrụgodi mgbe ọnọdụ niile nke ndụ agbanweghi.

Otu nwanne nwanyị na-amuke n’an̄ụrị m zutere na Onitsha Nigeria, gwara m na bido n’oge ọ mụtara oziọma ahụ ma mee baptizim (ma ugbua a ga m ekwu okwu nke okwuru), “ihe niile dịịrị mụ mma. E nwere m an̄ụrị. A nọ m nime eluigwe.”9 Ị kesa oziọma na-akpali ọn̄ụ na olileanya nime mkpụrụ obi niile nke onye n’enye enye na onye nnata. N’ezie, “olee ịdị ukwuu nke ọn̄ụ gị”10 dịka ị na ekesa oziọma ahụ! Ị kesa oziọma ahụ bụ ọn̄ụ n’elu ọn̄ụ, olileanya n’elu olileanya.11

Ị kesa Oziọma N’ewebata Ike Chineke nime Ndụ Anyị niile.

Mgbe emere anyị baptizim, onye ọbụla nime anyị banyere nime ọgbụgba ndụ12n’enweghị ọgwụgwụ anyị na Chineke “ịjere ya ozi ma debe iwu nsọ ya niile,”13nke gụnyere “iguzoro dịka ndị akaebe [Ya] “n’oge niile na n’ihe niile, na n’ebe niile.”14 Dika anyị “nogidere nime” Ya site n’idebe ogbụgba ndụ nke a, ike nke ịdị ka chi ga-asọbata nime ndụ anyị site na Kraịst, dịka alaka osisi si a nata ọzụzụ site na vine.15

Ịkesa Ọziọma ahụ N’echekwa Anyị Site n’Ọnwụnwa

Onyenwe anyị enyewo iwu:

“Ya mere, welite ìhè unu elu ka ọ na-enwu nye ụwa. Lee abụ m ìhè ahụ nke unu ga-ewelite elu—ihe ahụ unu hụworo m na-eme. …

“… Enyewo m iwu na … unu bịakwute m, ka unu wee metụ-aka ma hụ; ọbụna otu ahụ ka unu ga-eme nye ụwa; ma onye ọbụla na-emebi iwu nsọ nke a, na-enye onwe ya ka e dụba ya n’ime ọnwụnwa.”16

Ị họọrọ na ị gaghị ewelite ihè gị elu n’eduba anyị nime ọchịchịrị, ebe ọ g’adịrị anyị mfe ịdaba nime ọnwụnwa. Ghọta kwa na, nke a bụkwa eziokwu: ị họrọ iwelite ihè gị elu na-akpọta anyị nso karịa nime ihè ahu, ya na nchekwa ọ n’enye iji megide ọnwụnwa. Nke a bụ ngọzị dị ịtụnanya nime ụwa nke taa jupụtara n’ọchịchịrị!

Ịkesaa Oziọma ahụ N’ewete Ọgwụgwọ

Nwanne nwanyị Tiffany Myloan nabatara ọkpụkpọ okù ị kwado ndị mgbasa oziọma nagbanyeghi ezigbo nnukwu ịma aka nille nke ya, tinyekwara ajụjụ niile ọ nwere maka okwukwe ya. Na nso nso a ka ọ gwara m na ịkwado ndị mgbasa oziọma ahụ emewo ka okwukwe na mmetụta nke ọdịmma ya dịrị ọhụrụ. Dịka o siri kwuo, “Ọru mgbasa oziọma nwere ike ọgwụgwọ.”17

Ọn̄ụ. Olileanya. Ike nkwado sitere na Chineke. Nchekwa site na ọnwụnwa. Ọgwụgwọ. Ihe niile ndịa—na ndị ọzọ (tinyekọta mgbaghara mmehie)18ga-atasa anyị sitere na eluigwe dịka anyị n’ekwusa oziọma ahụ.

Ugbua, Ọ na-abụzi Nnukwu Ọhere nye Anyị

Ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị, “e nwekwararịị ọtụtụ … n’etiti otù niile …usoro okpukperechi dị iche iche … bụ ndị nke na-enwetabeghị eziokwu n’ihi na ha a maghị ebe ha ga-achọta ya.”19 Bido na agụgụala niile nke mmadụ, enwebeghi mgbe ọ kacha mkpa iwelite ihè anyị elu karịa n’oge nke a. Ma eziokwu nke ahụ enwebeghi mgbe ọ kara dị mfe ị natat karịa ugbua.

Jimmy Ton, onye toro dịka onye n’efe Buddha, nwetere obi ụtọ mgbe ọ hụrụ otu ezi na ụlọ gosipụtara ndụ ha na YouTube. Mgbe ọ matara na ha bụ ndị otù Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi-ikpeazu a, ọ wee site na intanet mụọ oziọma ahụ n’onwe ya, gụọ Akwụkwọ nke Mọmọn site na app, ma emee ya baptizim mgbe ọ hụsịworo ndị mgbasa oziọma na kọleji.20 Ugbua Okenye Ton bụzi onye mgbasa oziọma nke uju-oge n’onwe ya.

Ya na ndị mgbasa oziọma ibe ya gburugburu ụwa ha bụ ndị agha nke Onyenwe anyị—ịṅọmi okwu nke onye amụma anyị.21 Ndị mgbasa oziọma ndịa na-agbanwe ọmenala mega n’ụwa taa: ebe nchọpụta kwuru na ndị Gen Z n’echigharị pụọ site na Chineke,22 ndị ntoroọbịa dike anyị23 ndị okenye na ụmụnne nwanyị n’atụgharị ndị mmadụ chewe ihu ha na Chineke. Ma ọtụtụ ọnụ ọgụgụ ndị otù Nzukọ nsọ na-ejikọ aka ha na ndị mgbasa oziọma n’ikwusa oziọma ahụ, n’enyere ọtụtụ ma ọtụtụ ndị enyi na-abịakwute Kraịst ma Nzukọ nsọ Ya.

Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ nke anyị nke Liberia nyere enyi ha ruru 507 aka bata nime mmiri niile nke baptizim n’oge ọnwa 10 ahụ a na enweghi ndị mgbasa oziọma nke uju-oge n’eje ozi n’obodo ha. Mgbe otu nime ndịisi stek ọma anyị n’ebe ahụ nụrụ na ndị mgbasa oziọma nke uju-oge nwere ike ịlaghachi, o kwuru, “Oh ọ dị mma, ugbua ha ga-abịa nyere anyịaka n’ọrụ anyị.”

O kwuru ihe ziri ezi: mkpokọta nke Izrel—ọrụ nka kachasị ibe ya n’elu ụwa nke a24bụ ọrụ ọgbụgbandụ anyị. Ugbua bụ oge anyị! Ọkpụkpọ okù m taa dị mfe: kesaa oziọma ahụ. Bụrụ onwe gị ma welite ihè ahụ elu. Kpee ekpere maka enyemaka nke eluigwe ma soro mkpali nke mmụọ niile. Kesaa ndụ gị n’uzọ dị mfe ma dịkwa nkịtị, kpọọ onye ọzọ okù ị bịa ma hụ, ị bịa ma nye aka, na ị bịa sonye.25 Ma emesịa n̄ụrịanụ ọn̄ụ dịka gị na ndị ahụ ị hụrụ n’anya na-anata ngọzị niile ekwere na nkwa.

A maara m na nime Kraịst ihe ọma ndịa ka a n’ekwusa nye ndị wedara onwe ha n’ala; nime Kraịst ka a na-ekechi ọnyá ndị obi ha tiwara etiwa, nime Kraịst ka a na-ekwupụta mnwere onwe nye ndị adọtara n’agha; ma nime Kraịst, naanị nime Kraịst ka a n’enye ihe ọma n’ọnọdụ ntụ.26 Ya mere, o jiri dị nnukwu mkpa ime ka amata ihe ndị a!24

A na m agba ama na Jizọs Kraịst bụ onye mmalite na ọgwụgwụ nke okwukwe anyị.28 Ọ ga-emesị, Ọ ga-emezu, mgbalị anyị nke okwukwe—nagbanyeghi etozughi oke ya—n’iwelite ihè nke oziọma ahụ elu. Ọ ga-arụ ọrụ ebube nime ndụ anyị ma nime ndụ niile nke ndị Ọ kpọkọtara ọnụ, nihi Ọ bụ Chineke nke ọrụ ebube niile.29 Site na aha dị ịtụnanya nke Jịzọs Kraịst, amen.