Ọgbakọ Zuru ọha
Kpọkuo Kraịst ka O Dee Akụkọ Gị
Ọgbakọ Zuru ọha Ọktoba 2021


Kpọkuo Kraịst ka O Dee Akụkọ Gị

Ka akụkọ gị bụrụ nke nwere okwukwe, n’esoro Onye Ọmụmaatụ gị, Onye Nzọpụta Jịzọs Kraịst.

A na m ebido site n’ịjụ ọtụtụ ajụjụ, e mere maka ntụgharị uche nke onwe:

  • Kedụ ụdị akụkọ nkeonwe ị na-ede maka ndụ gị?

  • Ụzọ ahụ ị kọwara n’ime akụkọ gị ọ dị eziokwu?

  • Akụkọ gị ọ kwụsịrị ebe o bidoro, n’ebe obibi eluigwe gị?

  • Enwere onye ọmụmaatụ n’ime akụkọ gị—ma ọ bụ Onye Nzọpụta Jizọs Kraịst?

A na m agba ama na Onye Nzọpụta bụ “onye odee na onye mmezu nke okwukwe anyị.”1 Ị ga-akpọku Ya ịbụ onye odee na onye mmezu nke akụkọ gị?

Ọ maara mbido site na ngwụcha ahụ. Ọ bụ Onye Okike nke eluigwe and ụwa. Ọ chọrọ anyị ịlaghachikwuru Ya na Nna anyị nke Eluigwe. O nwere ihe niile etinyere n’ime anyị ma chọọ ka anyị mee nke ọma.

Kedụ ihe i chere na-egbochi anyị site n’inyefe Ya akụkọ anyị?

Elemanya ngosipụta nkea ga-enyere ntule nke onwe gị aka.

Ọka iwu na-ekpe ikpe maara ọrụ ya maara na n’ịjụ ajụjụ ọnụ mnwale, i kwesịghị ịjụ onye akaebe ajụjụ nke ị na-amaghị aziza ya. Ịjụ ụdị ajụjụ ahụ bụ ịkpọku onye akaebe ahụ ịgwa gị—na ọka ikpe na ndị otu ọka ikpe a họpụtara—ihe nke ị na-amaghị na mbụ. I nwere ike nwete aziza nke tụrụ gị n’anya ma dịrị iche na akụkọ nke i kwadoworo maka ikpe gị.

Agbanyeghị na-ịjụ onye akaebe ajụjụ nke ị na-amaghị aziza ya bụ nnọọ ihe nzuzu nye ọka iwu na-ekpe ikpe, nke ọzọ bụ eziokwu maka anyị. Anyị nwere ike jụọ ajụjụ niile banyere Nna anyị nke Eluigwe dị ịhụnaanya, n’aha nke Onye Nzọpụta anyị dị ebere, ma onye akaebe onye na-aza ajụjụ anyị niile bụ Mmụọ Nsọ ahụ, onye na-agba ama mgbe niile banyere eziokwu.2 N’ihi na Mmụọ Nsọ na Nna nke Eluigwe na Jịzọs Kraịst na-arụ ọrụ n’ịdị n’otu zuru oke, anyị maara na ngosipụta niile nke Mmụọ Nsọ kwesịrị ntụkwasị obi. Gịnị mere, mgbe ahụ, mgbe ụfọdụ anyị anaghị eguzogide ịrịọ maka ụdị enyem aka nke eluigwe a, eziokwu egosipụtara nye anyị site na Mmụọ Nsọ? Gịnị mere anyị na-eji ahapụ ịjụ ajụjụ nke anyị amaghị aziza ya mgbe onye akaebe adịghị naanị eme enyi kama garịrị ekwu eziokwu mgbe niile?

Elemanya ọ bụ n’ihi na anyị enweghị okwukwe ịnabata aziza ahụ anyị nwere ike ịnata. Elemanya ọ bụ n’ihi na nwoke ma ọbụ nwanyị anụ ahụ dị n’ime anyị n’eguzogide ịtụgharị ihe niile kpam kpam nyefee Onyenwe anyị ma tụkwasị obi na Ya kpam kpam. Enwere ike nke ahụ bụ ihe mere anyị ji a họrọ ịnọgide n’akụkọ nke anyị dewooro onwe anyị, ụdị doro anya nke akụkọ anyị a na-edegharịghị site n’aka Onyeisi Odee. Anyị achọghị ịjụ ajụjụ ma nwete aziza nke na-adabaghị nke ọma n’ime akụkọ anyị n’edere onwe anyị.

Eziokwu, ole ma ole nime anyị eleghị anya na-edenye n’ime akụkọ anyị mnwale niile na-eme anyị adị mma. Mana ọ bụ na njedebe dị ebube nke akụkọ anyị gụrụ anaghị amasị anyị mgbe onyeisi akụkọ meriri ndọlị ahụ? Ọnwụnwa niile bụ mmewere nke emereme ahụ na-eme akụkọ anyị kacha nwee mmasị a dị mmanye, n’enweghị mgbe, na-akwalite okwukwe, ma dị nkwesị ikwu ekwu. Ọmarịcha ndọlị niile edenyere n’ime akụkọ anyị bụ ihe na-akpọketa anyị nso n’ebe Onye Nzọpụta nọ ma mezie anyị, na-eme anyị adịrị ka Ya karịa.

Maka Devid imeri Goliath, nwata nwoke ahụ gara lụsị dimkpa nwoke ahụ ọgụ. Akụkọ doro anya nke Devid gaara abụ ịlaghachi gaa lekọta atụrụ. Kama ọ chere maka nhumihe ya ịzọpụta ụmụ atụrụ site n’aka otu ọdụm na otu atụ. Ma inye nkwado na mmeri nke dike ndị ahụ, o nwere okwukwe na mgbam ume ikwe ka Chineke dee akụkọ ya, na-ama ọkwa, “Jehova nke napụtara m n’aka ọdụm, ma n’aka atụ, ya onwe ya ga-anapụta m n’aka onye Filistia nke a.”3 Na ọchịchọ ikwe ka Chineke merie, na-ige ntị nye Mmụọ Nsọ na ịdị na njikere ikwe ka Onye Nzọpụta bụrụ onye odee na onye mmezu nke akụkọ ya, nwata nwoke ahụ Devid meriri Goliath ma zọpụta ndị ya.

Ụkpụrụ magburu onwe ya nke ohere nhọrọ, n’ezie, n’ekwe ka anyị dee akụkọ nke onwe anyị niile—Devid gaara ala ụlọ, laghachi ilekọta atụrụ. Mana Jịzọs Kraịst guzoro dị njikere iji anyị mere ihe dịka ngwa ọrụ si n’igwe, mkpisi odide dị nkọ n’aka Ya, ide ihe otu kachasị mma eji nka dee! N’obi ebere Ọ dị njikere iji m mee ihe, mkpisi odide tara ahụ, dịka ngwa ọrụ n’aka Ya, ọ bụrụ na m nwee okwukwe ikwe Ya, ọ bụrụ na m ga-ekwe Ya dee akụkọ m.

Esta bụ ọmarịcha ọmụmaatụ ọzọ nke ikwe ka Chineke merie. Kama ịnọgide n’akụkọ mkpachapụ anya nke nchekwa nke onwe, o nwere okwukwe, nyefee onwe ya kpamkpam n’aka Onyenwe anyị. Haman naara akpa nkata mbibi nke ndị Juu niile nọ na Persia. Mordecai, ikwuu nke Esta, matara maka nkata ahụ ma degara ya akwụkwọ, na-agba ya ume ka ọ gwa eze ahụ okwu maka ọdịmma nke ndị ya. O chetaara ya na onye nke na-abịaru eze nso mgbe a na-akpọghị ya ka enwere ike igbu. Mana n’oke omume nke okwukwe, ọ rịọrọ Mordecai ka akpọkọta ndị Juu ma buo ọnụ n’ihi ya. “Mụ onwe m na ụmụagbọghọm ga-ebukwa ọnụ otu a,” ka o kwuru, “ma n’ụzọ dị otu a ka m ga-abakwuru eze, nke na-adịghị ka iwu si dị: ma a sị na m laa n’iyi, alawo m n’iyi.”4

Esta dịịrị njikere ikwe ka Onye Nzọpụta dee akụkọ ya ọbụnadị, site na anya nke ndụ anụ ahụ, ngwụcha ahụ nwere ike jọọ njọ. Dị ngọzi, eze ahụ nabatara Esta, ma azọpụtara ndị Juu nọ na Persia.

N’ezie, adịkarịghị achọ ogo mgbam ume nke Esta n’aka anyị. Mana ikwe ka Chineke merie, ikwe Ya bụrụ onye odee na onye mmezu nke akụkọ anyị, na-achọ ka anyị debe iwu nsọ Ya niile na ọgbụgba ndụ niile anyị meworo. Ọ bụ ndebe iwu nsọ na ọgbụgba ndụ anyị ga-emeghe ụzọ nke nkwukọrịta maka anyị ịnata mkpughe site n’aka Mmụọ Nsọ. Ma ọ bụ site na ngosipụta nke Mmụọ ka anyị ga-enwete mmetụta aka nke Nna Ukwu soro anyị na-ede akụkọ anyị.

Na Epril 2021, onye amụma anyị, Onyeisi Russell M. Nelson, rịọrọ anyị itule ihe anyị nwere ike ime ma ọbụrụ na anyị enwee okwukwe n’ime Jịzọs Kraịst karịa. Na okwukwe karịrị akarị n’ime Jịzọs Kraịst, anyị nwere ike ịjụ ajụjụ nke anyị na-amaghị azịza ya—rịọ Nna nke eluigwe, n’aha nke Jịzọs Kraịst, izite azịza site na Mmụọ Nsọ, onye na-agba ama nke eziokwu. Ọbụrụ na anyị enwe okwukwe karịa, anyị ga-ajụ ajụjụ ahụ ma mgbe ahụ dịrị njikere ịnabata azịza anyị natara, ọbụna ma ọ dabaghị na akụkọ dị anyị mma. Ma ngọzi ekwere na nkwa nke ga-abịa site na ime ihe n’okwukwe n’ime Jịzọs Kraịst bụ okwukwe bawanyere n’ime Ya dịka onye odee na onye mmezu anyị. Onyeisi Nelson mara ọkwa na anyị “na-anata okwukwe karịa site na ime ihe nke chọrọ okwukwe karịrị akarị.”5

Ya mere, di na nwunye n’enweghị nwa na-ata ahụhụ nke amụghị nwa nwere ike rịọ n’okwukwe ma ha kwesịrị ikuru ụmụ ma dị njikere ịnabata azịza ahụ, ọbụna agbanyeghị ma akụkọ ahụ ha deworo maka onwe ha tinyekọtara ọmụmụ nwa dị ebube.

Otu di na nwunye agadị nwere ike jụọ ma oge oruwo maka ha ije ozi mishọn ma dị njikere ịga, ọbụna agbanyeghị na akụkọ ha deworo maka onwe ha tinyekọtara oge karịrị akarị n’ọrụ ha. Ma ọbụ enwere ike azịza ahụ ga-abụ “orubeghị,” ma ha ga-amụta n’isi nke akụkọ ha ndị ọzọ na-abịa ihe mere eji chọọ ha n’ebe obibi nwaobere ogologo oge.

Onye ikom nta ma ọbụ onye inyom nta gbara afọ iri na ụma nwere ike rịọ n’okwukwe ma nchụso nke egwuregwu ma ọbụ agụm akwụkwọ ma ọbụ egwu bụ nke kachasị baa uru ma dị njikere isoro mkpali niile nke akaebe ahụ zuru oke, Mmụọ Nsọ ahụ.

Gịnị mere anyị ji chọọ Onye Nzọpụta ịbụ onye odee na onye mmezu nke akụkọ anyị niile? N’ihi na Ọ ma zuru oke ike mmepụta anyị, Ọ ga-akpọ anyị gaa ebe ndị anyị echeghị ma ọlị n’onwe anyị. O nwere ike ime anyị otu Devid ma ọbụ otu Esta. Ọ ga-agbatị anyị ma mee anyị mma ịdịzi ka Ya karịa. Ihe ndị anyị ga-emeta dịka anyị na-arụ ọrụ n’okwukwe karịa ga-abawanye okwukwe anyị n’ime Jịzọs Kraịst.

Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, naanị otu afọ gara aga ezi onye amụma anyị jụrụ: “Ị dị njikere ikwe ka Chineke merie n’ime ndụ gị? … Ị dị njikere ikwe ihe ọbụla Ọ chọrọ ka ị mee bute ụzọ n’ihe ọbụla ọzọ ị chọrọ ime?”6 N’obi umeala a na m agbakwunye ajụjụ amụma ndị ahụ: “Ị ga-ekwe ka Chineke bụrụ onye odee na onye mmezu nke akụkọ gị?”

Na mkpughe anyị na-amụta na anyị ga-eguzo n’ihu Chineke ma ekpee anyị ikpe site n’akwụkwọ niile nke ndụ, dịka otu ọrụ anyị niile sịrị dị.7

A ga-ekpe anyị ikpe site n’akwụkwọ nke ndụ anyị. Anyị nwere ike họrọ ide akụkọ dị mma maka onwe anyị. Ma ọbụ anyị ekwe Nna Ukwu Odee na Onye Mmezu isoro anyị dee akụkọ anyị, kwe ka ọrụ nke Ọ chọrọ anyị ịrụ bute ụzọ karịa nnukwu agụụ ndị ọzọ.

Kwe ka Kraịst bụrụ onye odee na onye mmezu nke akụkọ gị!

Kwe ka Mmụọ Nsọ bụrụ onye akaebe gị!

Dee otu akụkọ nke ụzọ ị nọ na ya dị ogologo, dị n’ụzọ na-edu gị alaghachi n’ebe obibi gị nke eluigwe ibi n’ihu nke Chineke.

Ka nsogbu na mkpagbu nke bụ akụkụ nke akụkọ dị mma bụrụ ụzọ nke ị ga-esi abịaru nso na, ma dịrịzie karịa dịka, Jịzọs Kraịst

Kọọ otu akụkọ nke ị matara na eluigwe mepere emepe. Jụọ ajụjụ ndị nke ị na-amaghị azịza ya, mara na Chineke dị njikere ime ka a mara uche Ya maka gị site na Mmụọ Nsọ.

Ka akụkọ gị bụrụ nke nwere okwukwe, n’esoro Onye Ọmụmaatụ gị, Onye Nzọpụta Jịzọs Kraịst. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen