Ọgbakọ Zuru ọha
Tempụl Ahụ na Ntọala nke Ime Mmụọ Gị
Ọgbakọ Zuru ọha Ọktoba 2021


Tempụl Ahụ na Ntọala nke Ime Mmụọ Gị

Mgbe ọbụla ihe ọgba aghara mere nime ndụ gị, ebe kacha nwee nchekwa ime mmụọ ịnọ bụ nime ọgbụgbandụ gị niile nke tempụl!

Ụmụnne m nwoke na nwanyị dịm n’obi, enwere m obi ekele ịnọnyere unu n’ụtụtụ a ịkesara unu mmetụta niile nke obi m.

Dịka unu maara, anyị n’arụgharị ọtụtụ ihe na Tempụl nke Salt Lake. Nnukwu ọrụ nke a gụnyere ịmee ka ntọala nke ochie sikwuo ike, ntọala nke rụworo anyị ọrụ ihe karịrị otu senchuri. Mana tempụl nke a gakwa eguzo ọtọ karịa oge ọ nọworo. Na ngwụcha Me, E lere m ọganihu nke emeworo na nnukwu ọrụ ahụ. E chere m na ọ ga-amasị unu ịhụ ihe mụ na nwunye m Wendy hụrụ. Eche m na unu ga-ahụta ihe kpatara abụ nke a “How Firm a Foundation”1jiri bịa nwe nkọwa ọhụrụ nye anyị.

Vidio nke n’egosi nrụgharị nke Tempụl Salt Lake: “Ihe anyị na-ekiri ugbua bụ ntọala nke mbụ nke Tempụl Salt Lake. Ebe a m guzoro nọ n’okpuru ihe bụbụụrụ Golden Room. Dịka m n’ekiri ọrụaka nke ụlọ niile ahụ, Ọ tụrụm n’anya ihe ndị mbute ụzọ ahụ mepụtara. O juru m ọnụ mgbe m tulere na ha wuru ọmarịcha tempụl nke a naanị ijiri ngwa ọrụ na usoro ọrụ nke dịịrị ha mgbe ahụ ihe karịrị otu senchuri gara aga.

“Kemgbe afọ iri ole na ole ndịa gafere, agbanyeghi, ọ bụrụ n’anyị lee ntọala ahụ ule, anyị g’ahụ mmetụta niile nke mbuze, oghere n’etiti okwute mbụ, ma ọtụtụ ihe niile emere iji mee ka ọ kwụrụ.

“Ugbua dịka m n’ekiri ihe ndị injinia ọhụrụ, ndị akitet ma ndị ọka mmụta n’iwu ụlọ nwere ike ịmee iji mee ka ntọala nke mbụ ahụ sikwuo ike, ọ n’atụ m n’anya nke ukwuu. Ọrụ ha dị ebube!

“Ntọala nke ụlọ ọbụla, nke ka nke, ụdị nke dị nnukwu ka nke a, kwesịrị isi ezigbo ike ma nọgide ruo imegide ala ọmajijiji, nchara, oke ikuku, ma imi nime ala nke ụlọ niiile g’emerịrị. Ọrụ a siri ike nke ịgba ume nke a n’eme ugbua g’eme ka eme ka tempụl nke a nwee ntọala sikwuru ike nke ga-anọ ma guzoro ruo mnwale niile nke oge.”

Anyị anaghị asọ ihe ọbụla ọ g’eri iji nye tempụl nke a nwere ugwu, nke adịghị ike ya na-amụbanye, ntọala nke ga-emegide ike niile nke eke ruo na Millennium. N’otu aka ahụ, ugbua bụ oge nke anyị g’eji tinye ọtụtụ ihe—ọtụtụ ihe anyị n’emebeghi na mbụ mọlị—iji gbaa ntọala nke imme mmụọ anyị ume. Oge a n’ahụtubeghi mbụ ka a na-etinye ọtụtụ ihe a n’emebeghi mbụ.

Ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, ugbua bụ ubọchị ikpeazụ ndị ahụ. Ọ bụrụ na mụ na gị ga-emegide ihe egwu niile ma ibu arọ niile n’abịa niihu, ọ dị mkpa n’ọnye ọbụla nime anyị g’enwe ntọala nke mmụọ siri ike nke ewuru n’elu nkume nke Ọnye Mgbapụta anyị Jizọs Kraịst.2

Nihi nke a, A nam ajụ onye ọbụla nime unu, “kedụ otu ntọala gịsiri sie ike? Ma ele ihe ndị ịchọrọ iji mee ka ịgba ama ma nghọta gị ịnwere maka oziọma sikwuo ike?

Tempụl niile nọ n’etiti ịgba okwukwe anyị na obi ike anyị ume nihi Onye nzọpụta na ozizi Ya nọ n’etiti obi nke tempụl. Ihe niile a n’akụzi nime tempụl, site na nkuzi ma site na mmụọ, n’eme ka nghọta anyị na Jịzọs Kraịst bawaanye. Emume nsọ Ya niile nke dị mkpa n’ekekọta anyị na ya site na ọgbụgbandụ nke ọkwa nchụ aja dị nsọ. Mgbe ahụ, dịka anyị n’edobe ọgbụgbandụ niile anyị, Ọ n’enye anyị onyinye ọgwụgwọ Ya nke n’enye ike.3 Ma oh, anyị chọsịrị ike nke Ya nime ụbọchị niile nke n’abịa nihu.

Ekwewo anyị nkwa na “ọbụrụ na [anyị] nọrọ na-njikere [anyị] agaghị atụ-egwu.”4 Okwu nkasị obi nke a nwere ihe nnukwu mpụta ihe taa. Onyenwe anyị ekwupụtawo na nagbanyeghi ihe ima aka nke taa ndị a na-ahụtụbeghi mbụ, ndị ahụ n’ewu ntọala ha n’elu Jịzọs Kraịst, ma mụta otu esi adọrọ ike Ya, ekwesịghị idaba nime ihe obi ịlọ mmiri nke oge a.

Emume-nsọ nịịle na Ọgbụgba-ndụ nịịle nke Tempụl nke mgbe ochie. Onyenwe anyị kụziri Adam and Ive ịkpe ekpere, ịmee ọgbụgbandụ niile ma ọtụ esi achụ aja.5 N’ezie “oge ọbụla Onyenwe anyị nwere ndị mmadụ n’elu ụwa ndị n’erube okwu Ya isi, a na-enye ha iwu ka ha wuo tempụl.”6 Akwụkwọ nsọ niile jupụtara na nrụtụ aka niile nke nkuzi nke tempụl, uwe, asụsụ, ma ndị ọzọ.7 Ihe niile anyị kwenyere ma nkwa niile nke Chineke meworo nye ndị Ya ndị gbara ndụ na-abịakọta ọnụ nime tempụl. N’ọge nke ọbụla, tempụl egosipụtawo eziokwu nke oke ọnụ ahịa nke a, na ndị ahụ meworo ọgbụgbandụ ha na Chineke ma dobe ha bụ ụmụ nke ọgbụgbandụ ahụ.

Nihi nke a, nime ụlọ nke Onyenwe anyị, anyị na Chineke n’eme otu ụdị ọgbụgbandụ ahụ nke Abraham, Isaac na Jacob mere. M’anyị ga-anatakwa ọtụ ụdị ngọzị ahụ!

Foto, oyiyi
Tempụl nke Kirtland na Nauvoo

Tempụl abụrụwo otu akụkụ nke ọgbọ nke a site ụbọchị niile nke isi mbụ ya.8 Elaịja nyefere ọtụghe niile nke ikike nrachi nye Josef Smit nime Tempụl nke Kirtland. Ọkwa nchụ aja n’uju ya ka eweghachitere nime Tempụl nke Nauvoo.9

Ruo mgbe ogbugbu ya dịka onye nsọ, Josepf Smit gara niihu na-anata mkpughe nke mejupụtara mweghachi azụ nke emume nsọ nke onyinye dị nsọ na nke nrachi.10 Otuosiladị, ọ matara na, ọ dị mkpa ịmezigharị ya. Mgbe e nyere Brigham Young onyinye dị nsọ n’ọnwa Me 1842, Joseph gwara Brigham, “Ahazighi nke a nke ọma, mana anyị emewo otu anyị kacha nwee ike ịmee n’ọkpuru ọnọdụ niile nke edobere anyị, ma ọ bụ ọchịchọ nke m na ị ga-ewere okwu a n’aka gị ma hazie emume niile ndịa.”11

Mgbe Onye amụma nwụrụ, Onyeisi Young hụrụ maka nrụcha nke Tempụl nke Nauvoo12 ma emesịa o wuru ọtụtụ tempụl na Mpaghara nke Utah. Na mmemme ido nsọ nke ụlọ ala nke tempụl nke St. George, Brigham Young jiri n’ike ike kwuo banyere ọsịsọ nke ọrụ nnọchị anya nke ọrụ tempụl dị mgbe ọ kwuru, “Mgbe ọ bụla m chere maka isiokwu nke a, A chọrọ m ka ire nke egbe eluigwe asaa kpọlite ndị mmadụ n’ụra.”13

Bido n’oge ahụ gawa niihu, emume nsọ niile nke tempụl ka a n’emegharị mgbe na mgbe. Onyeisi Harold B. Lee kọwara ihe kpatara usoro ndịa, iwu ndịa, makwa otu esi emee emume nsọ niile nke tempụl ji agbanwe nime Nzukọ nsọ eweghachiri azụ nke Onye nzọpụta. Onyeisi Lee kwuru: “Ozizi nke oziọma nke Jizọs Kraịst bụ ihe dị nsọ. Enweghi mmadụ na-agbanwe ukpuru nile ma [ozizi] nke Nzukọ nsọ mọbụghị Onyenwe anyị site na mkpughe. Mana usoro na-agbanwe dịka odudu nke mmụọ kpalitere n’abịara ndị ahụ n’edu n’isi n’oge ọbụla.”14

Leebagodi anya otu inye oriri nsọ si wee gbanwee kemgbe afọ niile ndị gara aga. N’ubọchị ndị mbụ, mmiri nke oriri nsọ ka enyere ndi igwè ụka site n’otu ebele mmiri. Onye ọbụla n’esi nime ya an̄ụ. Ugbua anyị n’eji iko nke onye ọbụla n̄ụchaa o tufuo. Usoro ahụ gbanwere, mana ọgbụgbandụ ahụ nọkwara otu ụdị ahụ.

Tụgharịa uche na eziokwu atọ ndịa:

  1. Mweghachi azụ bụ usoro, ọ bụghị otu mmemme, ma ọ ga-aga niihu ruo mgbe Onyenwe anyị bịara ọzọ.

  2. Ebumnobi kacha ibe nke mkpọkọta Izrel15bụ ịwete ngọzị niile nke tempụl nye ụmụ nke Chineke kwesịrị ntụkwasị obi.

  3. Dịka anyị n’achọ imezu ebumobi ahụn’ụzọ kacha mma, Onyenwe anyị ekpughekwa mmata ihe ọzọ. Mweghachi azụ nke na-aga niihu chọkwara mkpughe nke na-aga niihu.

Ndị otù Ndị isi Mbụ na Kworum nke Ndị Ozi Iri na abụọ ajụwọ Onyenwe anyị ajụjụ mgbe ụfọdụ ma enwere ụzọ kacha ma iji wegara ngọzị niile nke tempụl nye ụmụ Ya kwesịrị ntụkwasị obi. Anyị n’achọ odudu mgbe niile maka otu eji eme ka nkụzi nke tempụl, ọgbụgbandụ niile ma emume nsọ nille zie ezie ma dabara ụwa niile nagbanyeghi ịdị iche nime asụsụ ma omenala.

N’okpuru ntuzi aka nke Onyenwe anyị ma n’aziza nke ekpere anyị, enwere ufọdụ mgbanwe usoro ndị emeworo n’oge n’adịghị anya. bụ ya bụ Onye chọrọ ka gị ghọta n’ezi uche doro anya ihe ndị ịgbara ndụ na ị ga-eme. bụ ya bụ Onye chọrọ ka ị nwete nhụmihe emume nsọ Ya niile n’ụzọ kacha mma. chọrọ ka ị ghọta nke ọma nrite gị niile, nkwa niile ma oke n’ọrụ gị niile. chọrọ ka ị nwee mmata ihe nke ime mmụọ ma mkpọlite ihe ndị ị n’enwebeghi na mbụ. Ihe nke a ka ọ chọrọ maka ndị petron niile nke tempụl, nagbanyeghi ebe ha bi.

Mgbanwe ndị nke a emeworo ugbua nime usoro niile nke tempụl, ma ndị ọzọ g’esochi n’azụ, bụ eziokwu n’egosi na Onyenwe anyị nọ nnọọ n’edu Nzukọ nsọ Ya. Ọ na-arọpụtara ọtụtụ ohere maka onye ọbụla nime anyị ị mee ka ntọala nke mmụọ anyị sikwuo ike site nịme ka ndụ anyị nọrọ n’etiti nke Ya ma n’etiti emume nsọ na ọgbụgbandụ niile nke tempụl Ya. Mgbe ọbụla ị jiri rekọmendị tempụl gị, obi nke chegharịrị echegharị ma uche n’achọ mmụta bata nime ụlọ ọmụmụ ihe nke Onyenwe anyị, g’akụziri gị ihe.

Ọ bụrụna ịdị anya, ima aka nke ahụike, mọbụ ndọla azụ ndị ọzọ gbochiri gị agala tempụl ruo n’otu n’oge, A na m akpoku gị ka idebe otu oge mgbe ị ga-atụlegharị nime uche gị ọgbụgbandụ ndị ahụ ị mere.

Ọ bụrụ na ibidobeghi hụwa ije tempụl nanya, gawa ugboro n’ugboro karịa—n’abụghị ị ga ugboro dị ntakịrị. Hapụ ka Onyenwe anyị, site na Mmụọ Ya, kuziere ma kpake mmụọ gị n’ebe ahụ. A na m ekwe gị nkwa na mgbe oge gasịrị, tempụl ahụ g’abụrụ ebe nchekwa, ebe nkwasị obi ma ebe mkpughe.

Ọ bụrụ n’ọga ekwere m omume ikwụụrụ nihu nihu mụ na onye ntorobịa ọbụla, A ga m arịọ gị ka ị chọọ onye nsiso a ga-arachi gị na ya nime tempụl. Ị nwere ike chee na kedụ ihe ịdị iche nke g’eme nime ndụ gị. A nam ekwe gị nkwa n’ọga eme ihe niile dị iche! Dịka ị na-agba akwụkwọ nime tempụl, ma na-alọghachị ugboro ugboro, a ga-agba gị ume ma nata odudu nime mkpebi obi niile.

Ọ bụrụ na m nwere ike ikwụụrụ di mọbụ nwunye ọbụla okwu onye n’emebeghi nrachi nime tempụl, a ga m arịọ ya ka ị jee nzọụkwụ dị mkpa iji nata emume nsọ nke ahụ nwere okpueze ma na-agbanwe ndụ.16 Ọ g’eme ihe dị iche? Naanị mọbụrụ na ịchọrọ ịganiihu ruo ebighi ebi ma nọkọọ ọnụ ruo ebighi ebi. Ị nwe ọchịchọ obi ị nọkọ ọnụ ruo ebighi ebi agaghị eme ka ọ dịrị otu ahụ. Enweghi emume ọbụla mọbụ nkwekọrịta ọbụla nwere ịmee ka ọ dị ọtụa.17

Ọ bụrụ na m nwere ike ikwụụrụ nwoke mọbụ nwanyị ọbụla nwere mmasị alụm di na nwunye mana ọ hụbeghi onye nsiso ebighi ebi nke ya, a na agwa gị ka ịghara ịche ruo agbam akwụkwọ gị tupu ị nata onyinye dị nsọ gị nime ụlọ nke Ọnyenwe anyị. Bido ugbua mụtawa ma nwete nhụmihe ihe ọ pụtara ijiri ike nke ọkwa nchụ aja kwara ngwa agha.

Ma nye onye ọbụla nime unu onye meworo ọgbụgbandụ niile nke tempụl, A na m arịọ gị ka ị chọọ—site na ekpere ma mgbe niile—iji ghọta ọgbụgbandụ na emume nsọ niile nke tempụl.18 Uzọ nke ime mmụọ g’emehe. Ị ga-amụta otu esi emeghetụ akwa mgbochi dị n’etiti eluigwe na ụwa, otu esi arịọrọ Chineke maka ndị mmụọ ozi ị nọnyere gị, ma otu dị mma karịa eji anata ọdụdụ si n’eluigwe. Mgbalị gị niile nke di uchu ị mere g’eme ka ntọala gị nke ime mmụọ sikwuo ike.

Ezi Ụmụnne ndi Nwoke na ndi Nwanyị, mgbe a ga-arụcha mmezigharị nime nke Tempụl nke Salt Lake, agaghị enwe ebe kacha nwe nchekwa mgbe ala ọma jijiji g’eme n’ebe niile nke Ndagwurugwu nke Salt Lake karịa nime tempụl ahụ.

N’otu aka ahụ, mgbe ọbụla enwere ihe ọgba aghara mere nime ndụ gị, ebe nchekwa kacha ibe ya bụ ibi nime mmụọ ọgbụgbandụ gị niile nke tempụl!

Biko kwere na mụ mgbe ọbụla m kwuru na mgbe ewusiri ike ntọala gị nke ime mmụọ n’elu Jịzọs Kraịst, ị kwesịghị ịtu egwu mọlị. Dịka ị na-akwụsị ike n’elu ọgbụgba ndụ niile ị mere nime tempụl, a ga-agba gị ume site n’ike Ya. Mgbe ahụ, mgbe ala ọma jijiji nke ime mmụọ mere, ị g’enwe ike guzosie ike nihi ntọala gị nke ime mmụọ siri ike nke n’adịghị apụ apụ.

A hụrụ m unu nanya ezi ụmụnne ndị nwoke na nwanyị. Eziokwu ndịa ka m maara: Chineke, nna anyị nke Eluigwe chọọrọ ka họọrọ ịbịaghachi n’ebe obibi Ya. Atụmatụ ya maka ọganihu nke ebighi ebi agbawojughi anya, ma ọ na-akwanyere ohere nhọrọ gị ugwu. Ọ dị gị n’aka ị họọrọ onye ị g’abụ—ma onye ị chọrọ ị bụ—nime ụwa nke ahụ n’abịa!

Chineke dị ndụ! Jizọs bụ Kraịst ahụ! Nke a bụ Nzukọ nsọ Ya, eweghachiri maka ịnyere gị aka mezuo akara aka nsọ gị. A na m agba-ama n’aha dị nsọ nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. See “How Firm a Foundation,” Hymns,no. 85.

  2. Nihi na “ọ ga-abụ mgbe ekwensu [zipụrụ] [ikuku] ike ya, … ọ gaghị enwe ike nʼarụ [anyị] … n’ihi nkume ahụ nʼelu nke e wuru [anyị], nke bụ ezigbo ntọ-alantọ-ala nʼelu nke ọbụrụ na ndị mmadụ wuo ụlọ, ha agaghị ada” (Helaman 5:12; agbakwụnyere nkọwa).

  3. Lee Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 109:15, 22.

  4. Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 38:30; lee kwa Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 10:55.

  5. Lee Mozis 5:5–6

  6. Ọkọwa okwu Baịbụl, “Tempụl.”

  7. N’ịmatụ, lee Ọpụpụ 28; 29; Leviticus 8. Tabernacle nke Mosis ka amaara dịka “ụlọ ịkwuu nke ịgba ama” (Ọgụgụ 9:15) ma “tabernacle nke ịgba ama” (Ọpụpụ 38:21). Ebibiri tempụl nke Solomon nafọ 587 BC, nanị afọ ntakịrị ezinụlọ nke Lehi hapụrụ Jerusalem. Mweghachi azụ nke tempụl ahụ site naka Zerubbabel mere mgbe afọ 70 gasịrị. Ọkụ mebiri ya n’afọ 37 BC. Herod mebara tempụl ahụ ihe dịka n’oge 16 BC. Emesịa tempụl ahụ, nke Jizọs maara, ka ebibiri n’oge AD 70. Nefi nwere nhụmihe yiri nke tempụl mgbe ọ gara “n’elu-ugwu ahụ ọtụtụ mgbe” ị kpe ekpere (1 Nefi 18:3ma emesịa n’ala Amarịka mgbe ochie, o wuru otu tempụl “ụdị owuwu ya dịka temple nke Solomon,” nagbanyeghi na-achọrọya mma nụzọ dị ntakịrị (lee 2 Nefi 5:16

  8. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:119; 124:31.

  9. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ 10:13–16; 124:28. Isi nkume nke Tempụl nke Nauvoo ga eliri na April 6, 1841, nanị nwantịtị oge Josef Smit natara mkpughe ka arụọ ya. Tempụl nke Nauvoo nwere ọrụ ndị a gbakwụnyere ya. Nịma atụ, Onyenwe anyị kọwara na ebe baptizim dị mkpa aka Ndị nsọ ị mee baptizim maka ndị ahụ nwụrụ anwụ (lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 124:29–30).

  10. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 131; 132. Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 128nwere ozi Josef Smit degara ndị nsọ banyere baptizim ndị nwụrụ anwụ. N’ebe ahụ o kwupụtara na nzọpụta nke ndị nwụrụ anwụ “dị mkpa ma baa-uru nye nzọpụta nke anyị, … [nihi] ha gaghị a bụ ndị e mere ka ha zuo-oke—ma-ọbụ anyị inwe-ike ma ndị anyị nwụrụ-anwụ anọghị ịbụ ndị a ga-eme ka anyị zuo-oke” (amaokwu 15).

  11. Josef Smit, nime Ndị nsọ: Akụkọ ahụ nke Nzukọ-nsọ nke Jizọs Kraịst nime Ụbọchị nile Ikpeazụvol. 1, Ihe Nlere anya ahụ nke Eziokwu, 1815–1846 (2018), 454.

  12. “Onye ndekọọ Agụgụala nke Nzukọ nsọ George A. Smith kwuru na ihe ruru ụmụnne nwoke na nwanyị 5,634 natara onyinye dị nsọ nke ha nke a n’emezughi emezu nime Tempụl nke Nauvoo na December 1845 ma January 1846. Nrachi nke ndị di na nwunye gara niihu bido na Feb. 7, [1846,] mgbe ahụ ihe karịrị di na nwunye ruru 2000 ka ejikọtara ọnụ site nike nke ọkwa nchụ aja maka oge na ebighi ebi” (Bruce A. Van Orden, “Temple Finished before Exodus,” Deseret News, Dec. 9, 1995, deseret.com; see also Richard O. Cowan, “Endowments Bless the Living and Dead,” Church News, Aug. 27, 1988, thechurchnews.com).

  13. “Kedụ ihe ịchere ndị nna nna ha ga-ekwu mọbụrụ ga enwe ike siri nọnwụ kwuo okwu? Ọ bụna ha agaghị ekwu, ‘Anyị edinawo n’ebe afọ puku kwuru puke, n’ebe a nime ụlọ mkpọrọ nke a, n’eche maka ọgbọ nke k’ọbịa’? … Nezie, ọ bụrụ na ha nwere ike, egbe eluigwe niile nle igwe geti na ntị anyị niile, mọbịrị nanyị ga-amata mkpa ọrụ nke anyị nọ nime ya dị. Ndị mmụọ ozi nime eluigwe nele ndị mmadụ ntakịrị nke a anya, ma na-akpake ha maka nzọpụta nke ezi na ụlọ nke mmadụ. … Mgbe ọbụla mchere maka isiokwu nke a, a chọrọ m ka ire nke egbe eluigwe asaa kpọlịte ndị mmadụ nụra” (Discourses of Brigham Young, sel. John A. Widtsoe [1954], 403–4).

  14. Harold B. Lee, “Alaeze nke Chineke—Otu Alaeze Aghaziri ahazi,” Ensign, Jan. 1971, 10. Lee kwa okwu niile nke Onyeisi Wilford Woodruff kwuru n’afọ 1896; o kwupụtara: “A chọrọ m ikwu, dịka onyeisi Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst nke Ndị-Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a, n’anyị kwesịrị ị na-aga ma gaa niihu ugbua. Anyị [enwetachabeghi] mkpughe niile. … ONYEISI [Brigham] Young, Onye sochiri Onyeisi Joseph Smith, dutara anyị nebe a. Ọ haziri tempụl niile ndịa ma mezuo ebumnuche niile nke ọkpụkpọ okù ma okwa ọrụ ya. … Ọ nataghị mkpughe niile nke banyere ọrụ nke a; Onyeisi Taylor, mọbụ Wilford Woodruff anaghị kwa ya. A gaghị enwe ngwụcha ọrụ nke a ruo mgbe o tozuru oke” (The Discourses of Wilford Woodruff, sel. G. Homer Durham [1946], 153–54).

  15. Lee 3 Nefi 29:8–9.

  16. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 131:2–4

  17. Lee Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 132:7.

  18. Okenye John A. Widtsoe dere: “Maka nwoke mọbụ nwanyị ọbụla nke na-aga tempụl, jiri anya emeghere, gee ntị na akara niile na ọgbụgbandụ niile, ma neji nwayọọ na-agba mbọ ịghọta nkọwa ya nuju ya, Chineke nekwu okwu ya, ma mkpughe gabịa. Onyinye dị nsọ nwere ịma atụ nke nanị onye nzuzu ga-agba mbọ ị kọwa ya; ọ jupụtara na mkpughe maka ndị ahụ jiri ume ha chọọ ma hụ, na enweghi okwu nke mmadụ nke nwere ike ịkọwa mọbụ mezupụta ihe niile kwere omume nke nọ nime ije ozi nke tempụl. Onyinye dị nsọ ahụ enyere site na mkpughe ka enwere ike ị kacha ghọta site na mkpughe” (in Archibald F. Bennett, Saviors on Mount Zion [Sunday School manual, 1950], 168).