Ọgbakọ Zuru ọha
Inweta Ike nke Chineke site na Ọgbụgba ndụ niile
Ọgbakọ Zuru ọha nke Eprel 2023


Inweta Ike nke Chineke site na Ọgbụgba ndụ niile

Dị ka ị na-eje ije n’ụzọ ọgbụgba ndụ ahụ, site na baptizim ruo na tempụl na gburugburu ndụ, ana m ekwe gị nkwa ike iji gaa megide ụsọ eke nke ụwa.

Nọvemba ikpeazụ a, e nwetere m ohere ọma ịraranyeTempụl Belém Brazil. Ọ bụụrụ ihe ọńụ ịnọnyere ndị otù Nzukọ nsọ nyefechasịrị onwe ha dị n’ime mpaghara ugwu Brazil. N’oge ahụ, a matara m na Belém bụ ụzọ ama gara na mpaghara nke gụnyere osimiri ahụ kachasị dị ike n’ụwa, Osimiri Amazon.

Na-agbanyeghị ike nke osimiri ahụ, ugboro abụọ n’afọ otu ihe yiri ihe na-abụghị akarachi na-eme. Mgbe anyanwụ, ọnwa, na elu ụwa hazịrị onwe ha n’otu ahịrị, oke ebili mmiri na-ebuli osimiri ahụ elu, megide osụsọ eke nke mmiri ahụ. Ebili mmiri ruru mita 6 dị elu1 na-eme njem ihe ruru dị ka kilomita 502 elu iyi ka ededataworo na-akwụkwọ. Ihe omume nke a, a maara n’izugbe dị ka ebili mmiri, ka a na-akpọ n’ala ahụ dị ka pororoca, ma ọ bụ “oke mbigbọ,” nihi mkpọtụ dara ụda ọ na-eme. Anyị nwere ike kwubie nke ọma na ọbụna na oke Amazon ahụ garịrị asọpụrụ ike nke eluigwe.

Dị ka Amazon ahụ, anyị nwere ụsọ eke nye ndụ anyị; anyị na-emekarị ihe na-abịara anyị na nkiti. Dị ka Amazon ahụ, jiri enyemaka nke eluigwe anyị nwere ike mee ihe ndị yiri ihe na-abụghị akarachi. Emesịa ihe niile, ọ bụghị eke nye anyị ịdị umeala, ịdị nwayọọ, ma ọ bụ ịdị njikere inyefe uche anyị n’aka Chineke. Otu ọ dị naanị site na-ime otu a ka anyị nwere ike isi gbanwee, laghachi ibi n’ihu Chineke, ma nwete akara aka ebighị ebi anyị.

Na-adịghị ka Amazon ahụ, anyị nwere ike họrọ ịsọpụrụ ike niile nke eluigwe ma ọ bụ “soro ụsọ ahụ gaa.”3 Imegide ụsọ ahụ nwere ike sie ike. Mana mgbe anyị dabara n’aka “ịdọ akpịrị nke Mmụọ Nsọ” ma yipụ ọchịchọ nke ọdịmma onwe niile nke nwoke ma ọ bụ nwanyị eke,4 anyị nwere ike nata ike mgbanwe nke Onye Nzọpụta nime ndụ anyị, ike nke iji mee ihe ndị siri ike.

Onyeisi Russell M. Nelson kuziiri anyị otu esi eme nke a. O kwere nkwa, “Onye ọbụla nke mere ọgbụgba ndụ niile na fọnt niile nke baptizim na niime tempụl niile—ma dobe ha—nwere ụzọ bara ụba esi enweta ike nke Jizọs Kraịst … [iji bulie] anyị karịa ịdọ adọ nke ụwa nke a dara ada.”5 N’aka nke ọzọ, anyị nwere ike inweta ike nke Chineke, mana naanị mgbe anyị jikọtara anyị na Ya site na ọgbụgba ndụ ndị dị nsọ.

Tupu e kee ụwa, Chineke hiwere ọgbụgba ndụ niile dị ka usoro nke site na ya anyị, ụmụ Ya, nwere ike ijikọ onwe anyị na Ya. Dabere na iwu dị ebighị ebi, na-adịghị agbanwe agbanwe, o kwuru kpọmkwem ọnọdụ niile n’enweghị nkwekọrịta site na ya anyị agbanwe, azọpụta, ma ebulie elu. N’ime ndụ nke a, anyị na-eme ọgbụgba ndụ ndị a site n’isonye n’emume nsọ ọkwa nchụaja niile na ikwe nkwa ime ihe Chineke rịọrọ anyị ime, ma na nzaghachi, Chineke kwere anyị nkwa ụfọdụ ngọzị.6

Ọgbụgba ndụ bụ nkwa na anyị kwesịrị ikwadobe maka, ghọtazie nke ọma, ma nye nkwanye ugwu zuru oke.7 Ịme ọgbụgba ndụ anyị na Chineke dị iche karịa ikwe nkwa na nkiti. Na mbụ, ikike ọkwa nchụaja bụ ihe achọrọ. Nke abụọ, nkwa na-esighị ike enweghị ike njikọ ahụ, iji bulie anyị elu karịa ịdọ adọ nke ụsọ eke ahụ. Anyị na-eme ọgbụgba ndụ naanị mgbe anyị bu n’obi itinye onwe anyị nnọọ n’ụzọ pụrụ iche iji mejupụta ya.8 Anyị na-abụ ụmụ ọgbụgba ndụ nke Chineke na ndị nketa oke nke alaeze Ya, kachasị nke mgbe anyị matara onwe anyị kpamkpam na ọgbụgba ndụ.

Okwu a ụzọ ọgbụgba ndụ na-ekwu maka usoro niile nke ọgbụgba ndụ site ebe anyị si abịakwute Kraịst ma jikọọ na Ya. Site na njiko ọgbụgba ndụ nke a, anyị nwere ohere nke ike ebighị ebi Ya. Ụzọ ahụ na-eji okwukwe n’ime Jizọs Kraịst na nchegharị amalite, nke baptizim na ịnata Mmụọ Nsọ na-esote.9 Jizọs Kraịst gosiri anyị otu esi abanye n’ụzọ ahụ mgbe O mere baptizim.10 Dị ka otu ndekọihe Ozi ọma Testament Ọhụrụ sịrị dị nime Mak na Luk, Nna nke Eluigwe gwara Jizọs okwu kpọmkwem na baptizim Ya, na-asị, “Gị bụ Ọkpara m hụrụ naanya; nime gị obi dị m ụtọ.” Mgbe anyị banyere n’ụzọ ọgbụgba ndụ site na baptizim, enwere m ike iche Nna nke Eluigwe na-asị otu ụdị ihe ahụ nye onye ọbụla nime anyị: “Gị bụ ezi nwa m n’ime onye obi dị M ụtọ. Na-aganiihu.”11

Na baptizim na mgbe anyị na-eri oriri nsọ,12 anyị na-agba aka ebe na anyị dị njikere iwekwasị n’onwe anyị aha nke Jizọs Kraịst.13 N’ọnọdụ nke a, ka anyị kpachara anya maka iwu nsọ Testament Ochie, “Gị agaghị eji aha nke Onyenwe anyị Chineke gị mee ihe efu.”14 N’oge ugbua, nke a dara ụda dị ka mmachibido iwu megide enweghị nkwanye ugwu n’ojiji aha nke Onyenwe anyị. Iwu nsọ ahụ gụnyere nke ahụ, mana iwu nke a miri emi ọbụna karịa. Mkpụrụ okwu Hibru atụgharịrị asụsụ dị ka “were” pụtara “ibuli elu” ma ọ bụ “buru” dị ka mmadụ ga-esi ebu ọkọlọtọ na-akọwapụta onwe ya n’etiti otu onye ma ọ bụ otù.15 Mkpụrụ okwu ahụ atụgharịrị asụsụ dị ka “ihe efu” pụtara “efu” ma ọ bụ “nghọgbu.”16 Iwu nsọ ahụ ka aghara iwere aha nke Onyenwe anyị mee ihe efu nwere ike site otu a pụta, “Gị ekwesịghị ịkọwapụta onwe gị dị ka onye na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst ma ọbụghị ma i bu n’obi ịnọchite anya Ya nke ọma.”

Anyị na-abụrụ ndị n’eso ụzọ Ya ma nọchite anya Ya nke ọma mgbe anyị kpachapụrụ anya wekwasị onwe anyị aha nke Jizọs Kraịst site na ọgbụgba ndụ niile. Ọgbụgba ndụ anyị na-enye anyị ike ịnọgide n’ụzọ ọgbụgba ndụ ahụ n’ihi na mmekọrịta anyị na Jizọs Kraịst na Nna anyị nke Eluigwe agbanwewo. Ejikọrọ anyị nye Ha site na njikọ nke ọgbụgba ndụ.

Ụzọ nke ọgbụgba ndụ na-eduba na emume nsọ niile nke tempụl, ụdị dị ka onyinye dị nsọ tempụl.17 Onyinye dị nsọ bụ onyinye Chineke nke ọgbụgba ndụ dị nsọ na ejikọ anyị nye Ya n’ụzọ zuru ezu karịa. N’onyinye dị nsọ, anyị, na-agba ndụ, nke mbụ, ịgba mbọ idebe iwu nsọ niile nke Chineke; nke abụọ, ichegharị jiri obi tiwara etiwa na mmụọ dị nchegharị; nke atọ, ibi ndụ ozi ọma nke Jizọs Kraịst. Anyị na-eme nke site ninwe okwukwe na Ya, na-eme ọgbụgba ndụ gị na Chineke dị ka anyị na-anata emume nsọ niile nke nzọpụta na mbuli elu, edebe ọgbụgba ndụ niile ndị ahụ gburugburu ndụ anyị, ma na-agba mbọ idebe iwu nsọ ukwu abụọ ahụ iji nwee ịhụnaanya n’ebe Chineke na onye agbata obi nọ. Anyị na-agba ndụ, na nke anọ, idebe iwu nke ịdị ọcha mmekọrịta ma, nke ise, inyefechasị onwe anyị na ihe niile Onyenwe anyị jiri gọzie anyị iji wulite Nzukọ nsọ Ya.18

Site na ime na idebe ọgbụgba ndụ niile nke tempụl, anyị na-amụkwu banyere nzube niile nke Onyenwe anyị ma nata uju nke Mmụọ Nsọ.19 Anyị na-anata ntụzi aka maka ndụ anyị. Anyị na-etozu oke n’ịbụ ndị na-eso ụzọ ka anyị ghara ịnọgide na-abụ ụmụ na-amaghị ihe, ruo mgbe ebighị ebi.20 Kama, anyị ji echiche ebighị ebi ji biri ma nwee nkpali karịa iji jeere Chineke na ndị ọzọ ozi. Anyị na-anata ike bawanyere iji mejupụta nzube anyị na ndụ anụ ahụ. Echekwara anyị site na-ajọọ ihe,21 ma anyị na-erite ike ka ukwuu iji guzogide ọnwụnwa ma ji chegharịa mgbe anyị sụrụ ngọngọ.22 Mgbe anyị dara, ụbụrụ ncheta ọgbụgba ndụ anyị na Chineke na-enyere anyị aka laghachị n’ụzọ ahụ. Site n’ijikọ n’ike nke Chineke, anyị na-abụrụ pororocanke onwe anyị, nwee ike imegide ụsọ nke ụwa, gburugburu ndụ anyị ma n’ime ebighị ebi niile. N’ikpeazụ, akara aka anyị niile ka agbanwere n’ihi na ụzọ ọgbụgba ndụ ahụ na-eduba na mbuli elu na ndụ ebighị ebi.23

Idebe ọgbụgba ndụ niile emere na fọntụ baptizim niile na nime tempụl niile nakwa ewetere anyị ume iji guzogide mnwale niile na obi mgbu niile nke ndụ anụ ahụ.24 Ozizi metụtara ọgbụgba ndụ ndị a na-eme ụzọ anyị adị mfe ma na-enye olile anya, nkasi obi, na udo.

Ndị nne na nna m nke ukwu Lena Sofia na Matts Leander Renlund natara ike nke Chineke site na ọgbụgba ndụ baptizim ha mgbe ha sonyere Nzukọ nsọ n’afọ 1912 na Finland. Obi dịrị ha ụtọ iso bụrụ akụkụ nke ngalaba nta nke mbụ nke Nzukọ nsọ na Finland.

Leander nwụrụ site na ụkwara nta mgbe afọ ise gasịrị oge Lena dị ime nwa ha nke iri. Nwa ahụ, nna m, ka a mụrụ ọnwa abụọ mgbe ọnwụ Leander gasịrị. Lena n’ikpeazụ liri ọbụghị naanị di ya mana ọzọkwa ụmụ asaa n’ime ụmụ ya iri. Dị ka nwanyị isi mkpe dara ogbenye, ọ dọlịrị. Ruo afọ 20 o nweteghị ezumiike abalị dị mma. N’oge ehihie, ọ gbagharịrị inwete nri maka ezi na ụlọ ya. N’abalị, o legidere ndị otu ezi na ụlọ ya nọ n’ọnụ ọnwụ. O siri ike iche otu o si nagide.

Lena nagidere n’ihi na ọ maara na di ya na ụmụ ya ndị nwụrụ anwụ nwere ike ịbụ nke ya na mgbe ebighị ebi niile. Ozizi nke ngọzi tempụl niile, gụnyere nke ezi na ụlọ niile mgbe ebighị ebi ahụ, weteere ya udo n’ihi na ọ tụkwasịrị obi n’ike nrachi. Mgbe ọ nọ na ndụ anụ ahụ, ọbụghị ma ọ natara onyinye dị nsọ ma ọ bụ ma a rachiri ya nye Leander, mana Leander nọgidere dị ka mmetụta dị mkpa na ndụ ya na akụkụ nke olileanya ya dị ukwuu maka ọdịniihu.

N’afọ 1938, Lena nyefere ndekọihe niile ka e wee nwee ike mee emume nsọ niile nke tempụl maka ndị otù ezi na ụlọ ya nwụrụ anwụ, ụfọdụ nime ndị mbụ enyefere site na Finland. Mgbe ọ nwụsịrị, emume nsọ tempụl niile ka emere site n’aka ndị ọzọ maka ya, Leander, na ụmụ ya ndị nwụrụ anwụ. Site na nnọchianya, ọ natara onyinye dị nsọ, arachiri Lena na Leander nye onwe ha, na ụmụ ha ndị nwụrụ anwụ na nna m ka arachiri nye ha. Dị ka ndị ọzọ, Lena “nwụrụ n’okwukwe, na-anatabeghị nkwa niile ahụ, mana ebe ọ hụwo ha n’ebe dị anya, … [ka] ha akwagidere, ma nabata ha.”25

Lena biri ndụ dị ka na o meworịị ọgbụgba ndụ ndị a na ndụ ya. Ọ maara na ọgbụgba ndụ baptizim na nke oriri nsọ ya jikọrọ ya nye Onye Nzọpụta. O “kwere ka ọchịchọ ọma nke ebe dị nsọ [nke Onye Mgbapụta] wete olileanya nye mkpụrụ obi [ya] tọgbọrọ n’efu.”26 Lena weere ya dị ka otu nime oke ebere niile nke Chineke nke ọ mụtara banyere ezi na ụlọ mgbe ebighị ebi niile tupu inwete nhụmiihe ọjọọ niile nke ndụ ya. Site na ọgbụgba ndụ, ọ natara ike nke Chineke iji nagide ma bilie karịa ịdọ adọ ịda mbà n’obi nke aka mgba na ihe isi ike ya niile.

Dị ka ị na-eje ije n’ụzọ ọgbụgba ndụ ahụ, site na baptizim ruo na tempụl na gburugburu ndụ, ana m ekwe gị nkwa ike iji gaa megide ụsọ eke nke ụwa—ike nke ịmụ ihe, ike nke ichegharị ma asachapụ, na ike nke inwete olileanya, nkasị obi, ma ọbụna ọńụ dị ka ị na-ezute aka mgba niile nke ndụ. Ana m ekwe nkwa nchekwa megide mmetụta nke onye iro nye gị na ezi na ụlọ gị, kacha nke mgbe i na-eme tempụl a bụrụ isi ebe nlekwasị anya n’ime ndụ gị.

Dị ka i na-abịakwute Kraịst ma ejikọọ gị na Ya na Nna anyị nke Eluigwe site n’ọgbụgba ndụ, otu ihe yiri abụghị eke na-eme. Ị na-agbanwe ma gị ezuo oke n’ime Jizọs Kraịst.27 Gị na-abụzi nwa ọgbụgba ndụ nke Chineke na onye nketa nke alaeze Ya.28 Enwere m ike iche ka Ọ na-asị gị, “Gị bụ ezi nwa m onye m na-enwe obi ụtọ na ya. Nnọọ n’ụlọ.” Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen

Hụba-ama

  1. Ihe dị ka fiit 20.

  2. Ihe dị ka maịlụ 30.

  3. Anyị nwere nhọrọ nihi na Chineke enyewo anyị ohere iji họrọ ma mee ihe n’onwe anyị. Lee Odudu nye Akwụkwọ nsọ, “Ohere Nhọrọ,” scriptures.ChurchofJesusChrist.org; 2 Nefi 2:27; Mozis 7:32.

  4. Lee Mozaya 3:19.

  5. Russell M. Nelson, “Merie Ụwa ma Nweta Ezumiike,” Liahona, Nov. 2022, 96, 97.

  6. Lee Nduzi nye Akwụkwọ nsọ nile, “Ọgbụgba ndụ,” scriptures.ChurchofJesusChrist.org.

  7. Onye ọbụla na-asụ ngọngọ mgbe ụfọdụ, mana Chineke na-enwe ndidi na ịsụ ngọngọ anyị ma enyewo anyị onyinye nke nchegharị ọbụla mgbe emebisiworo ọgbụgba ndụ. Dị ka Okenye Richard G. Scott kuziri, “Onyenwe anyị na-ahụ adịghị ike niile n’ụzọ dị iche iche karịa ka O [si ahụ] nnupụ isi … [n’ihi na] mgbe Onyenwe anyị na-ekwu maka adịghị ike niile, ọ na-abụkarị na ebere” (“Ume nke Onwe site na Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst,” Liahona, Nov. 2013, 83). Site otu a, anyị ekwesịghị inwe obi abụọ maka ike nke Onye Nzọpụta iji nyere anyị aka na adịghị ike anyị. Kosiladị, ikpachapụ anya emebi ọgbụgba ndụ jiri atụmatụ dị njọ ichegharị ma emesịa—n’ụzọ ọzọ, mmehie na nchegharị adị mbụ tụọ—na-asọ Onyenwe anyị oyi (lee Hibru 6:4-6).

  8. Lee Robert Bolt, Nwoke nye Oge Niile: Egwuregwu Omume ụzọ Abụọ (1990), xii-xiv, 140.

  9. Lee 2 Nifaị 31:17–18.

  10. Lee 2 Nifaị 31:4-15.

  11. Luk dekọrọ, “Ma Mmụọ Nsọ rịdatara n’ọdịdị anụ ahụ dị ka nduru nelu ya, ma olu si eluigwe bịara, nke sịrị, Gị bụ Ọkpara m hụrụ naanya; n’ime gị enwere m obi ụtọ” (Luk 3:22). Mak dekọrọ, “Ma enwere olu sitere n’eluigwe bịa, na-asị, Gị bụ Ọkpara m hụrụ naanya, onye ihe ya dị m ezi mma” (Mak 1:11). Ntụgharị asụsụ William Tyndale doro anya ma daba adaba ọbụna karịa Vashọn nke Eze Jemis. Na ntụgharị asụsụ ya, olu nke Nna nke Eluigwe na-asị, “Thou arte my dear Son in whom I delyghte” (n’ime Brian Moynahan, God’s Bestseller: William Tyndale, Thomas More, na Odide ihe nke Baịbụl Inglish—Akụkọ nke Ogbugbu n’ihi okwukwe na Nranye [2002], 58). Naanị Matiu nyere nkọwapụta na olu ahụ ka ekwuru n’izugbe kpọmkwem, na-asị, “Ma lee olu sitere n’eluigwe, na-asị, Nke a bụ Ọkpara m hụrụ naanya, onye ihe ya na-adị m mma” (Matiu 3:17). Ozi ọma nke Jọn na-akọwapụta naanị maka baptizim site n’aka Jọn Omee Baptizm: “Ma a hụrụ m, ma gbaa aka ebe na nke a bụ Ọkpara nke Chineke” (Jọn 1:34).

  12. Lee 2 Nephi 31:13; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:77.

  13. Onyeisi Dallin H. Oaks kọwara mkpa okwu ahụ “ịdị njikere” dị ka anyị na-eji oriri nsọ emegharị ọgbụgba ndụ baptizim anyị ọhụrụ: “Ọ dị mkpa na mgbe anyị na-eri oriri nsọ anyị anaghị agba aka ebe na anyị na-ewekwasị onwe anyị aha nke Jizọs Kraịst. Anyị na-agba aka ebe na anyị dị njikere ime otu ahụ. [Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:77.] Eziokwu na anyị naanị na-agba aka ebe nye ịdị njikere anyị na-atụ arọ na aga emerịrị ihe ọzọ tupu anyị n’ezie ewekwasị ahụ nsọ ahụ n’onwe anyị n’echiche kachasị dị mkpa” (“Iwekwasị na Anyị Aha nke Jizọs Kraịst,” Ensign, Me 1985, 81). “Ihe ọzọ” ahụ rụtụrụ aka na ngọzi niile nke tempụl na mbuli elu ọdịniihu.

  14. Ọpupu 20:7.

  15. Lee Jems Strong, Nkwekọrịta nke Baịbụlụ Agbasaworo Kpamkpam nke Strong Dị Ọhụụ (2010), mpaghara ọkọwa okwu Greek, peeji 192, ọnụọgụgụ 5375.

  16. Lee Strong, Nkwekọrịta nke Baịbụlụ Agbasaworo Kpamkpam nke Strong Dị Ọhụụ, mpaghara ọkọwa okwu Greek, peeji 274, ọnụọgụgụ 7723.

  17. Okenye Devid A. Bednar kuziri: “Ọgbụgba ndụ nke baptizim na-atụle ihe omume ọdịniihu ma ọ bụ karịa ma na-atụ anya tempụl. … Usoro nke iwekwasị onwe anyị aha nke Jizọs Kraịst nke malitere na mmiri nke baptizim na-aganiihu ma bawanye n’ụlọ nke Onyenwe anyị. Dị ka anyị n’eguzo na mmiri nke baptizim, anyị na-atụ anya tempụl. Dị ka anyị n’eri oriri nsọ, anyị na-atụ anya tempụl. Anyị na-ekwe nkwa icheta Onye Nzọpụta mgbe niile ma debe iwu nsọ Ya dị ka nkwadobe nsonye n’emume nsọ dị nsọ niile nke tempụl ma nata ngọzi kachasị elu dị adị site n’aha ma site n’ikike nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst. Site otu a, n’emume nsọ niile nke tempụl dị nsọ anyị n’ewekwasị kpamkpam n’uju aha nke Jizọs Kraịst” (“Na nkwanye ugwu Jide Aha na Ọnọdụ,” Liahona, Me 2009, 98). Usoro ahụ nwere ike ozughị ezu tutu ruo “anyị adị ka ya” (Moronaị 7:48), mgbe agbanwere anyị n’uju.

  18. Dị ka akọwara nime Akwụkwọ ntụziaka Izugbe: Ije ozi na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazu a, 27.2 (ChurchofJesusChrist.org), ọgbụgba ndụ niile ahụ bụ ibi ndụ iwu nke nrube isi, rube isi nye iwu nke ịchụ aja, rube isi nye iwu nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst, debe iwu nke ịdị ọcha mmekọrịta, ma debe iwu nke nnyefechasi; leekwa Devid A. Bednar, “Kwe Ka Ewuo Ụlọ Nke a nye Aha M,” Liahona, Me 2020, 84–87.

  19. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 109:14-15. Okenye D. Todd Christofferson kuziri, “‘Uju nke Mmụọ Nsọ’ gụnyere ihe Jizọs kọwara dị ka ‘nkwa ahụ nke m na-enye gị nke ndụ ebighị ebi, ọbụna ebube nke alaeze seletịal; ebube nke bụ nke nzukọ nsọ nke Onye E Buzọ mụọ, ọbụna nke Chineke, kachasị ihe niile ịdị nsọ, site na Ọkpara ya Jizọs Kraịst’ (D&C 88:4–5)” (“Ike nke Ọgbụgba ndụ niile,” Liahona, Me 2009, 23, note 5).

  20. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 109:15

  21. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ nile 109:22, 25-26.

  22. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 109:21.

  23. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 109:15, 22; Russell M. Nelson, “Ike nke Ume Ime Mmụọ,” Liahona, Me 2022, 98.

  24. Lee Russell M. Nelson, “Merie Ụwa ma Nweta Ezumiike,” 96; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:20. Nke amaara ama, Onyeisi Nelson kwuru sị, “Oge ọbụla ịchọrọ ma soro mkpake niile nke Mmụọ, oge ọbụla i mere ihe ọbụla dị mma—ihe ndị nke ‘mmadụ eke’ na-agaghị eme— ị na-emeri ụwa” (“Merie Ụwa ma Nweta Ezumiike,” 97).

  25. Ndị Hiburu 11:13

  26. Onye Mgbapụta nke Izrel,” Abụ niile, no. 6, verse 5. Nke a bụ abụ kachasị masị Lena Sofia Renlund.

  27. Lee Moronai 10:30-33.

  28. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 132:19-20.