Ọgbakọ Zuru ọha
Merie Ụwa ma Nweta Ezumiike
Ọgbakọ zuruọha Ọktoba 2022


Merie Ụwa ma Nweta Ezumiike

Chọta ezumiike site na ekpom ọkụ, amaghị nke emere, na nhuju anya nke ụwa nke a site na imeri ụwa site n’okpuru ọgbụgba ndụ niile nke gị na Chineke.

Ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, eji m obi ekele na-ekele unu n’ụtụtụ Ụbọchị Izu ike nke a dị ebube. Unu nọ m n’obi oge niile. Ọ na-eju m anya n’ụzọ unu na-esi adaba na-ime ihe mgbe ọbụla unu hụrụ ndị ọzọ nọ na mkpa. Ana m enwe nnukwu ịtụnaanya n’okwukwe na ama unu na-agba ugboro ugboro. Ana m akwa akwa niihi obi mgbu unu, enwetaghị ihe unu chọrọ, na nchekasị unu niile. A hụrụ m unu naanya. Ana m ekwe unu nkwa na Nna anyị nke Eluigwe na Ọkpara Ya Ọ hụrụ naanya, Jizọs Kraịst, hụrụ unu n’anya. Ha maara nke ọma n’obi Ha niile banyere ọnọdụ unu, ịdị mma unu, mkpa unu, na ekpere unu niile maka enyem aka. Ugboro ugboro, ana m ekpe ekpere maka unu inweta mmetụta ịhụnaanya Ha nwere maka unu.

Inweta ịhụnaanya Ha dị mkpa, ebe ọ dị ka anyị na-ezute ibuso agha dị egwu site n’akụkọ na-alọ obi mmiri kwa ụbọchị. Unu nwere ike nwewo ụbọchị ndị unu chere na unu nwere ike yiri pajamas unu, gbakụọ ka bọl, ma gwa mmadụ ka ọ kpọtee unu mgbe nsogbu nke a niile gafere.

Mana, ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, ọtụtụ ihe ndị dị ịtụnaanya dị niihu. N’ụbọchị ndị na-abịa abịa, anyị ga-ahụ ngosịpụta nke ike nke Onye Nzọpụta kachasị ihe niile nke ndị ụwa na-ahụtụbeghị mbụ. Site ugbua ruo oge Ọ ga-alọghachi “jiri ike na ebube dị ukwuu,”1 Ọ ga-enye ndị nwere okwukwe ohere dị iche iche, ngọzi niile na ọrụ ebube dị iche iche nke ọnụ apụghị ịgụta.

Na-agbanyeghị nke a, n’oge ugbua anyị bi niihe a maara nke ọma bụ oge kachasị gbagwojuo anya n’agụgụala nke ụwa. Ihe ndị rara ahụ nghọta na ihe aka mgba niile mere ka ọtụtụ mmadụ nwee mgbagwoju anya na ezigbo ike ọgwụgwụ. Otu osila dị, tụlee nhụmiihe mere na nso nso a nke nwere ike izi ihe na otu mụ na gị nwere ike isi chọta ezumiike.

N’oge mmepe ụlọ e mere na nso nso a nke Tempụl Washington D.C., otu onye otu kọmitii mmepe ụlọ ahụ gbara ama otu mkparịta ụka gosịrị ezi nghọta dị ka ọ naara edugharị ọtụtụ ndị nta akụkọ pụrụ iche na gburu gburu tempụl ahụ. Otu ọ dị otu ezi na ụlọ dị nta bịara nwee mmasị na njegharị ndị ụzọ mgbasa ozi nke a. Otu onye kwunsara nọgidere na-ajụ ihe gbasara “njem” nke tempụl petrọn dị ka ya bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị ahụ na-agagharị na gburugburu tempụl ahụ. Ọ chọburu ịma ma ọ bụ na njem tempụl ahụ bụ akara na-egosị aka mgba niile dị na njem mmadụ na-ahụ na ndụ.

Otu nwata nwoke nọ niime ezi na ụlọ ahụ ghọrọla nkata ahụ. Mgbe otu ndị njegharị ahụ batara n’ọnụ ụlọ onyinye dị nsọ, nwata nwoke ahụ tụrụ aka ebe nchụaja, ebe ndị mmadụ na-egbisa iji mee ọgbụgba ndụ ha na Chineke, ma sị, “Ewoo, nke ahụ amaka. Ebe a bụ ebe e nwere maka ndị mmadụ izu ike n’oge njem tempụl ha.”

Amaghịkwa m ma nwata nwoke ahụ ọ maara nnọọ otu nhụta ya jiri bụrụ kpoo. O nwere ike bụrụ na ọ maghị gbasara njikọ kwụ ọtọ dị na-agbata anyị na Chineke ime ọgbụgba ndụ na tempụl na nkwa mabigara mma oke nke Onye Nzọpụta:

“Bịakwutenụ m, unu ndi na-adọgbu onwe unu n’ọrụ na ndị e bokwara ibu dị arọ, Mụ onwe m ga-enyekwa unu ezumiike.

“Wekwasịnụ onwe unu yok m, ma mụọ ihe banyere m; … ma unu ga-achọta ezumiike nye mkpụrụ obi unu.

“N’ihi na yok m esighị ike, ma ibu m dịkwa mfe.”2

Ezi ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị,ana m enwe mwute nke ukwuu maka ndị ahụ na-apụ na Nzukọ nsọ niihi na ha chere na ị bụ onye otu chọrọ nnukwu ihe n’aka ha. Ha a ka achọpụtabeghị na ime na idobe ọgbụgba ndụ niile n’ezie na-eme ka ndụ dị mfe karịa. Onye ọbụla nke mere ọgbụgba ndụ niile na fọnt ndị nke baptizim na niime tempụl niile—ma na-edobe ha—nwere ụzọ bara ụba esi enweta ike nke Jizọs Kraịst. Biko tụgharịa uche n’eziokwu ahụ mabigara mma oke!

Ụgwọ ọrụ nke idobe ọgbụgba ndụ niile nke gị na Chineke bụ ike nke eluigwe—ike nke na-agba anyị ume iji nagide mnwale niile, ọnwụnwa niile, na obi mgbu niile n’ụzọ dị mma karịa. Ike nke a na-eme ka ụzọ anyị nwere onwe ya. Ndị ahụ n’edobe iwu ndị dị elu nke Jizọs Kraịst nwere ụzọ iji nweta ike Ya dị elu karịa. Site otu a, ndị na-edobe ọgbụgba ndụ ka o ruuru inweta ụdị ezumiike pụrụ iche nke na-abịara ha site na mmekọrịta nke ọgbụgba ndụ ha na Chineke.

Tupu Onye Nzọpụta enyefee Onwe Ya n’oke mgbu nke Gesamane na nke Kalvarị, Ọ mara ọkwa nye Ndịozi Ya, “Niime ụwa unu ga-enweta nsogbu: kama nweenụ ezi ańụrị; emeriwo M ụwa.” 3 Mgbe nke a gasịrị, Jizọs rịọsiri onye ọbụla niime anyị arịrịọ ike ime otu ụdị ihe ahụ mgbe Ọ sịrị, “Mụ onwe m ga-achọ ka ununwee ike merie ụwa.”4

Ezi ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị, ozi m nye unu taa bụ na niihi na Jizọs Kraịst meriri ụwa nke a dara ada, ma niihi na Ọ chụrụ aja mgbaghara mmehie maka onye ọbụla niime anyị, gị onwe gị kwa nwere ike imeri ụwa nke a juputara na mmehie, ndị na-achọ maka ọdịmma nke naanị ha, na ọtụtụ mgbe ụwa na-eme ka ike gwụchaa mmadụ.

Niihi na Onye Nzọpụta, site na Aja mgbaghara mmehie Ya na-enweghị ọgwụgwụ, gbapụtara onye ọbụla niime anyị site na-adịghị ike niile, mmejọ niile, na mmehie, ma niihi na O nwere nhụmiihe mgbu ọbụla, nchekasị, na ibu nke inwetụgoro,5 ya mere dị ka ị na-enwe ezi nchegharị ma na-achọ enyem aka Ya, inwere ike kulie merie ụwa nke ugbu a juputara na nsogbu.

I nwere ike merie ajọọ ọrịa niile na-efe efe nke ime mmụọ na nke echiche na-adịghị agwụ agwụ dị n’ụwa, tinyere nganga, mpako, iwe, enweghị ezi agwa, mkpọrọm asị, anya ukwu, ekworo, na ụjọ. Na-agbanyeghị ihe mmegheri anya niile na okwu ụgha niile na-asọniike gbara anyị gburugburu, unu nwere ike chọta ezigbo ezumiike—nke pụtara enyem aka na udo—ọbụna n’etiti nsogbu unu ndị na-akpasu iwe.

Eziokwu nke a dị mkpa na-akpalite ọkpụrụkpụ ajụjụ atọ:

Nke mbụ, kedụ ihe ọ pụtara imeri ụwa?

Nke abụọ, Kedụ ka anyị ga-esi eme ya?

Ma nke atọ, olee otu imeri ụwa na-esi agọzi ndụ anyị?

Gịnị ka ọ pụtara imeri ụwa a? Ọ pụtara imeri ọnwụnwa nke inwe mmasị niihe ndị nke ụwa karịa niihe ndị nke Chineke. Ọ pụtara ịtụkwasị obi na ozizi nke Kraịst karịa ihe ndị mmadụ na-eche gbasara ndị nọ n’ụwa. Ọ pụtara inwe ọńụ n’eziokwu, na-akatọ nghọgbu, ma na-aghọ “ndị dị umeala na-eso Kraịst.”6 Ọ pụtara ịhọrọ ihiwe mgbochi site niihe ọbụla na-achụpụ Mmụọ. Ọ pụtara ịdị na njikere “ịhapụ” ọbụna mmehie ndị na-aka amasị anyị.7

Ugbua, imeri ụwa a n’ezie apụtaghị ịghọ onye zuru oke niime ndụ nke a, ọ bụghị ma ọ pụtara na nsogbu gị niile ga-ekufu n’ụzọ anwansị—niihi na ha agaghị eme otu ahụ. Ma ọ pụtaghị na unu agaghịkwa emejọ. Mana imeri ụwa apụtaghị na nguzogide gị nye mmehie ga-amụba. Obi gị ga-adị nro dị ka okwukwe gị n’ime Jịzọs Kraịst na-abawanye.8 Imeri ụwa pụtara ito inwe ịhụnaanya n’ebe Chineke na Ọkpara Ya Ọ hụrụ naanya nọ karịa ka isi hụ onye ọbụla ma ọ bụ ihe ọbụla ọzọ naanya.

Kedụzie otu anyị si emeri ụwa a? Eze Benjamin kụziiri anyị ka esi eme ya. Ọ kụziri na “mmadụ eke bụ onye iro nye Chineke” ma ga-anọgide otu ahụ ruo ebighị ebi “ewezuga ma o nyefere onwe ya niihe ndị na-amasị Mmụọ Nsọ, ma wezuga mmadụ eke ma ghọọ onye nsọ site na aja mgbaghara mmehie nke Kraịst bụ Onyenwe anyị.”9 Oge ọbụla ịchọrọ ma soro mkpake niile nke Mmụọ, oge ọbụla i mere ihe ọbụla dị mma—ihe ndị nke “mmadụ eke” na-agaghị eme— ị na-emeri ụwa.

Imeri ụwa a bụghị mmemme a na-eme n’otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ. Ọ na-eme n’ụbọchị niile nke ndụ dị ka anyị na-anabata ozizi nke Kraịst ugboro ugboro na-esepụghị aka. Anyị na-ehiwe okwukwe niime Jizọs Kraịst site na ichegharị kwa ụbọchị na idobe ọgbụgba ndụ niile na-eme ka anyị juputa na-ike. Anyị na-anọ n’okporo nke ọgbụgba ndụ ma na-abụ ndị a gọziri agọzi site na ike nke ime mmụọ, mkpughe nke onwe, mbawanye n’okwukwe, na ije ozi nlekọta nke ndị mmụọ ozi. Ibi ndụ ozizi nke Kraịst nwere ike mepụta ike omume ọma kachasị dị ike, na-agba gburugburu, na-ekewapụta ihe nke ime mmụọ na-aga ọkụ ọkụ niime ndụ anyị.10

Dị ka anyị na-agba mbọ ibi ndụ idobe iwu ndị dị elu karịa nke jizọs Kraịst, obi anyị na ọdịdị nke onwe anyị na-amalite ịgbanwe. Onye Nzọpụta na-ebuli anyị elu gafee ihe ndị na-adọtu nke ụwa nke a dara ada site na-ịgọzi anyị jiri afọ ọma, mmefụ aka, obi ọma, ezigbo ọzụzụ nke mkpụrụ obi onwe, udo, na ezumiikekarịrị akarị.

Ugbua, i nwere ike ị na-eche na nke a na-ada ka ọrụ nke ime mmụọ siri ike karịa ezumiike Mana ebe a ka ọkpụrụkpụ eziokwu dị: ebe ndị ụwa kwesịrị ike na ike, akụ na ụba ndị e nwere, iwu ewu, na ihe ndị na-amasị anụ ahụ na-eweta ọńụ, ha anaghị eme ya! Ha enweghị ike! Ihe ha na-emepụta enweghị ihe ọ bụ kama oghere na-anọchi anya maka “ịdị ngọzi na ọnọdụ an̄ụrị nke ndị ahụ [bụ ndị] na-edebe iwu nsọ niile nke Chineke.”11

Nke bụ eziokwu bụ na ọ na-akacha agwụ ike ịchọ ọńụ ebe na ị na-enweghị ike ịchọta ya! Otu osila dị, mgbe i yokukọtara onwe gị na Jisọs Kraịst ma rụọ ọrụ nke ime mmụọ a chọrọ iji merie ụwa, Ya, na naanị Ya onwe Ya, nwere ike i buli gị bufee ihe niile na-adọtu mmadụ nke ụwa nke a.

Ugbua, kedụ otu imeri ụwa na-esi agọzi ndụ anyị? Azịza ahụ doro anya: Ịbanye na mmekọrịta ọgbụgba ndụ gị na Chineke na-ekedo anyị na Ya n’ụzọ nke na-eme ihe niile banyere ndụ adị mfe karịa. Biko aghọtahiekwala m: asịghị m na ime ọgbụgba ndụ niile na-eme ndụ adị mfe. N’ezie, tụọ anya mmegide, niihi na onye iro anaghị achọ ka ịchọpụta ike nke Jizọs Kraịst. Mana iyokukọta onwe unu na Onye Nzọpụta pụtara na inwere ohere ruo n’ume na ike nke mgbapụta Ya

Foto, oyiyi
Onyeisi Ezra Taft Benson

Ana m ekwusigharị ike nkuzi mara oke mma nke Onyeisi Ezra Taft Benson: “Ndị nwoke na ndị nwanyị ndị na-enyefe Chineke ndụ ha ga-achọpụta na O nwere ike ime ihe karịrị akarị site na ndụ ha karịa ka ha nwere ike. Ọ ga-eme ka ọńụ ha mikwuo emi, gbasakwuo ịhụ ụzọ ha, mee ka uche ha dị nkọ, … bulie mmụọ ha, mụbaa ngọzi ha, bawanye ohere ha, kasie ha obi na mkpụrụ obi, kpọlite ndị enyi, ma wụpụta udo.”12

Ohere ndị a na-enweghị atụ na-eso ndị ahụ na-achọ nkwado nke eluigwe inyere ha aka imeri ụwa nke a. Niihi nke a, ana m akpọkwa ndị otu Nzukọ nsọ niile otu oku ahụ m kpọkwara ndị dimkpa nta na Me gara aga. A rịọsiri m ha ike mgbe ahụ—ma na-arịọkwa unu ugbua—ka unu were ama nke unu na-agba banyere Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya kpọrọ ihe. Rụọ ọrụ maka ya. Zụlite Ya ka o wee nwee ike too eto. Were eziokwu zụọ ya. Ejikwala echiche ụgha nke ndị nwoke na ndị nwanyị na-anaghị ekwe ekwe wee gbarụọ ya. Dị ka ị na-anọgide na-agba ama gị banyere Jizọs Kraịst ume na-esepụghị aka ị bụ ihe kachasị iji kpọrọ ihe, tụọ anya ọrụ ebube dị iche iche ime na ndụ gị.13

Arịrịọ m na-arịọ unu na ụtụtụ a bụ ịchọta ezumiike site na ekpom ọkụ, amaghị nke emere, na nhuju anya nke ụwa nke a site na imeri ụwa site n’okpuru ọgbụgba ndụ niile nke anyị na Chineke. Mee ka ha mara site na ekpere unu na ihe unu na-eme na unu kwesịrị ike niihe gbasara imeri ụwa. Rịọ Ya ka O nye uche unu ihe ma zitere unu enyemaka unu chọrọ. Ụbọchị ọbụla, dedata echiche niile bịara n’uche unu mgbe unu na-ekpe ekpere; mgbe ahụ gbasoro ya na mgbasi ike. Were oge gị karịrị akarị nọrọ na tempụl, ma chọọ ịghọta otu tempụl na-esi akụziri gị iheotu isi emeri ụwa nke a dara ada.14

Dị ka m kwuru na mbụ, mkpọkọta nke Izrel bụ ọrụ kachasị mkpa nke na-eme n’elu ụwa taa. Otu mmewere nke ọgbakọ nke a dị oke mkpa bụ ịkwado ndị dị iche iche bụ ndị nwere ike, ndị dị na njikere, na ndị tozuru oke ịnabata Onyenwe anyị mgbe Ọ ga-abịa ọzọ; ndị dị iche iche ndị na-ebuworị ụzọ họrọ Jizọs Kraịst karịa ụwa nke a dara ada; ndị dị iche iche bụ ndị na-ańụrị ọńụ na ohere nhọrọ ha idobe iwu niile nke Jizọs Kraịst kacha dị elu, kacha dị nsọ.

Ana m akpọku unu, ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, ka unu ghọọ ndị nke a bụ ndị ezi omume. Dịnụ ire n’obi unu ma kwanyere ọgbụgba ndụ niile unu ugwu karịa ihe ndị ọzọ niile unu na-eme. Dị ka unu na-ekwe ka Chineke nwee mmeri na ndụ unu, ana m ekwe unu nkwa udo, ntụkwasị obi, ọńụ, na ee, ezumiikekarịrị akarị.

Site n’ike nke ị bụ onye ozi dị nsọ e nyefere m, ana m agọzi unu na-ọchịchọ unu imeri ụwa nke a. Ana m agọzi unu ka unu bawanye na okwukwe unu niime Jizọs Kraịst ma mụta ihe karịa otu esi a dọrọ ike Ya. Ana m agọzi unu ka unu nwee ike huzie nke ọma eziokwu site na mmejọ. Ana m agọzi unu inwe mkpachara anya niihe ndị nke Chineke karịa ihe ndị nke ụwa. Ana m agọzi unu ịhụta mkpa nke ndị ahụ gbara unu gburugburu ma gbaa ndị ahụ unu hụrụ naanya ume. Niihi na Jizọs Kraịst meriri ụwa nke a, unu nwekwara ike. Ana m agba ama n’aha dị nsọ nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. Josef Smit—Matiu 1:36: “Mgbe ahụ ga-apụta ihe iruba ama na Nwa nke Mmadụ nọ n’eluigwe, ma mgbe ahụ ka ebo niile nọ n’ụwa ga-eru uju; ma ha ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka o si n’urukpuru nke eluigwe na-abịa, jiri ike na nnukwu ebube.”

  2. Matiu 11:28–30; nkwusi ike agbakwunyere.

  3. Jọn 16.33; nkwusi ike agbakwunyere.

  4. Ozizi na ọgbụgba ndụ niile 64:2; nkwusi ike agbakwunyere.

  5. Lee Alma 7:11–13

  6. 2 Nifaị 28:14

  7. Lee nkọwapụta nke nna Eze Lamonaị niime Alma 22, kachasị Alma 22:18.

  8. Lee Mosaịa 5:7

  9. Mozaya 3:19; nkwusi ike agbakwunyere.

  10. Lee 2 Nifaị 31; 3 Nifaị 27:16–20

  11. Mosaịa 2:41

  12. Nkuzi niile nke Ndịisi Nzuko nsọ: Ezra Taft Benson (2014), 42–43.

  13. Lee Russell M. Nelson, “Nhọrọ niile maka Ebighị ebi” (worldwide devotional for young adults, May 15, 2022), broadcasts.ChurchofJesusChrist.org.

  14. Onyeisi Devid O. McKay sịrị na niime tempụl anyị na-eji nzọ ụkwụ nzọ ụkwụ agbago Nebe ihu Dị Ebighị ebi” (niime Truman G. Madsen, Tempụl Ahụ: Ebe Eluigwe Na-ezute Ụwa [2008], 11).