Ọgbakọ Zuru ọha
Jizọs Kraịst Bụ Enyem aka
Ọgbakọ Zuru ọha nke Eprel 2023


Jizọs Kraịst Bụ Enyem aka

Anyị nwere ike ijikọ aka anyị na Onye Nzọpụta na-iwetara ndị ahụ nọ na mkpa enyem aka nke anụ ahụ na nke ime mmụọ—ma site nusoro ahụ chọta enyem aka nke onwe anyị.

Site n’okwukwe niime Jizọs Kraịst na olileanya niihe ha nụworo banyere ọrụ ebube Ya niile, ndị nlekọta nke nwoke ahụ nwere ọrịa ahụmkpọnwụ buteere ya Jizọs. Ha nwere uche ịkpọta ya ebe ahụ—ikpughe elu ụlọ ma budata nwoke ahụ, nọ n’elu akwa ya, ruo n’ebe Jizọs na-akuzi ihe. Mgbe Jizọs “hụrụ okwukwe ha, ọ sịrị [onye ọrịa ahụmkpọnwụ ahụ], njọ gị niile ka agbaghaworo gị.”1 Ma mgbe ahụ, “Bilie, ma bulie akwa gị, ma laa n’ụlọ gị”2. Ma ozugbo ahụ nwoke ahụ nwere ọrịa ahụmkpọnwụ biliri ma buru akwa ya wee pụọ laa n’ebe obibi ya, “na-enye Chineke otuto.”3

Olee ihe ndị ọzọ anyị maara banyere ndị enyi ahụ lekọtara nwoke ọrịa ahụmkpọnwụ ahụ? Anyị maara na Onye Nzọpụta chọpụtara okwukwe ha. Ma ebe a hụworo ma nụta site na Onye Nzọpụta ma bụrụ onye aka ebe nye ọrụ ebube Ya niile, ha nwere “nnukwu ịtụnaanya” ma “nye Chineke otuto.”4

Jizọs Kraịst ewetewo olileanya atụrụanya ya maka enyem aka—ọgwụgwọ nke anụ ahụ site na mgbu na ndapụta na-agbajisi ụkwụ nke ọrịa rara ahụ ngwọta N’ụzọ dị mkpa, Onye Nzọpụta ewetewokwa enyem aka nke ime mmụọ n’ịsachapụ nwoke ahụ site na mmehie

Ma ndị enyi ya—niime mbọ ha ilekọta onye nọ na mkpa, ha chọpụtara isi enyem aka; ha chọpụtara Jizọs Kraịst.

Ana m agba ama na Jizọs Kraịst bụ enyem aka. Site na aja Mgbahara Mmehie nke Jizọs Karịst, enwere ike bupụrụ ibu na nsonaazụ niile nke mmehie ịdị ọcha ọzọ dika anyị ma nyere anyị aka na-adịghị ike nke anụ ahụ anyị niile.

Ma niihi na anyị hụrụ Chineke naanya ma mewo ọgbụgba ndụ ijere Ya ozi, anyị nwere ike jikọọ aka anyị na Onye Nzọpụta iji nye aka wete enyem aka nke anụ ahụ na nke ime mmụọ maka ndị ahụ nọ na mkpa.5

Onye amụma anyị hụrụ n’anya, Onyeisi Russell M. Nelson, a kpọkuwo anyị imeri ụwa ma nwete ezumiike.6 Ọ kọwara “ezi ezumiike” dị ka “enyem aka na udo.” Onyeisi Nelson sịrị, “Niihi na Onye Nzọpụta, site na Aja mgbaghara mmehie Ya na-enweghị ọgwụgwụ, gbapụtara onye ọbụla niime anyị site na-adịghị ike niile, mmejọ niile, na mmehie, ma niihi na O nwere nhụmiihe mgbu ọbụla, nchekasị, na ibu nke inwetụgoro, ya mere dị ka ị na-enwe ezi nchegharị ma na-achọ enyem aka Ya, inwere ike kulie merie ụwa nke ugbu a juputara na nsogbu.”7 Nke ahụ bụ enyem aka Jizọs Kraịst na-enye anyị!

Onye ọbụla niime anyị nya akpaazụ dị ka mbụrụ. O nwere ike bụrụ ekete ebuziri nke ọma n’elu isi gị ma ọ bụ obere akpa dị ka nke ụmụakwụkwọ ma ọ bụ otu ukwu ihe eji akwa kekọta ma tụkwasị n’ubu gị. Kama maka ihe anyị ga-eche, ka anyị kpọọ ya akpaazụ

Akpaazụ nke a dị ka mbụrụ bụ ebe anyị na-ebu ibu niile nke ibi niime ụwa na-ada ada. Ibu anyị dịcha ka nkume ndị dị niime akpaazụ ahụ. N’ụzọ niile, e nwere ụdị ụzọ atọ:

  • Nkume ndị nke anyị debere n’onwe anyị niihi mmehie

  • Nkume ndị dị na-akpaazụ anyị niihi mkpebi ndị jọrọ njọ, agwa ọjọọ, na imeso ndị ọzọ omume ọjọọ.

  • Na nkume ndị anyị na-ebu niihi na anyị bi n’ọnọdụ dara ada. Ndị a gụnyere nkume nke ọrịa, mgbu, nrịa nrịa na-ara ahụ ngwọta, arịrị, ndakpọ olileanya, owu ọmụma, na mpụtara niile nke ọdachi eke.

Eji m obi ụtọ na-ekwupụta na ibu nke ndụ anyị pụrụ ịnwụ anwụ, nkume ndị a dị na nka akpaazụ anyị, ekwesịghị ịnyị arụ

Jizọs Kraịst nwere ike ime ka ibu anyị dị mfe.

Jizọs Kraịst nwere ike ibuli ibu anyị.

Jịsọs Kraịst na-ewetere anyị ụzọ esi ebupụrụ anyị arụ nke mmehie.

Jizọs Kraịst bụ enyem aka anyị.

O kwuru:

“Bịakwutenụ m, unu ndi na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndi e bowokwara ibu dị arọ, Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike [nke ahụ bụ, enyem aka na udo].

“Nyaranụ yok m, mụtakwanụ ihe n’aka m; n’ihi na m dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi: ma mkpụrụ obi unu ga-enweta ezumiike.

“N’ihi na yok m esighị ike, ma ibu m dịkwa mfe.”8

Na yok ahụ araghị ahụ ma ibu arụ ahụ dịkwa mfe pụtara na anyị ga-abanye niime yok ahụ anyị na Onye Nzọpụta, ka anyị na Ya kee ibu arụ anyị, ka anyị kwe ka O bulie ibu anyị Nke ahụ pụtara Ịbanye niime mmekọrịta ọgbụgba ndụ gị na Chineke ma na-edobe ọgbụgba ndụ ahụ, bụ nke, Onyeisi Nelson na-akọwaala, “na-eme ihe niile banyere ndụ adị mfe karịa.” Ọ sịrị, “Iyokukọta onwe unu na Onye Nzọpụta pụtara na inwere ohere ruo n’ume na ike nke mgbapụta Ya .”9

Niihi ya gịnị mere anyị ji enwe aka ntagide na nkume anyị? Gịnị mere onye na-akụ baseball nọ nọgbọ egwu ike gwụrụ ga-eji jụ ịhapụ obere ugwu mgbe onye ga-anọchi ya nọ ebe ahụ dị njikere imezu egwuregwu ahụ? Gịnị mere m ji ekwegide aka ịnọgide na post m naanị m mgbe Onye Enyem aka m guzo dị na njikere iso m chee ya?

Dị ka Onyeisi Nelson si kuzie, “Jizọs Kraịst… guzoro ma gbasaa aka ya, nwee olileanya ma dị njikere ịgwọ, ịgbaghara, ịsacha, ịgba ume, ime ka anyị dị ọcha, ma doo anyị nsọ.”10

Niihi ya gịnị mere anyị ji ekwegide aka na-ibu ibu nkume anyị naanị anyị?

Emere ya ka ọ bụrụ ajụjụ nke onwe onye maka onye ọbụla niime anyị itule.

Maka mụ, ọ bụ arụ nke mpako dị kemgbe gboo. “Enwetewo m nke a,” A sị m. “Nsogbu adịghị; Aga m eme ya.” Ọ bụ nnukwu onye nduhie onye nke chọrọ ka m zoo ya site n’ebe Chineke nọ, iji tụgharịa site n’ebe Ọ nọ, ma mee ya naanị m.

Ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị, apụghị m ime ya naanị m, ma ekwesịghị m ime ya, ma agaghị m eme ya. Ịhọrọ ikwe ka ekekọta m na Onye Nzọpụta, Jizọs Kraịst, site na ọgbụgba ndụ niile m meworo mụ na Chineke, “A pụrụ m ime ihe niile site na Kraịst nke na-akwado m.”11

Ndị na-edobe ọgbụgba ndụ bụ ndị agọziri agọzi site na enyem aka nke Onye Nzọpụta.

Tụlee ọmụmaatụ nke a dị na Akwụkwọ nke Mọmọn: Ndị nke Alma ka-akpagburu site “n’inye ha ọrụ, na …ndịisi ọrụ na-achị ha.”12 Amachibidoro iwelite olu kpee ekpere, ha, wụpụtara obi ha nye [Chineke]; ma ọ matara echiche niile nke obi ha.”13

Ma “olu nke Onyenwe anyị rutere ha niime mkpagbu ha, na-asị: Welitenụ isi unu ma nwee nkasi obi dị mma, n’ihi na-ama m maka ọgbụgba ndụ nke unu meworo nye m; ma aga m agba ndụ mụ na ndị m ma napụta ha site n’ịbụ ohu.

“Ma aga kwa m eme ka ibu arọ niile nke e bukwasịworo n’elu ubu unu dị mfe, na ọbụna unu agaghị enwe mmetụta ha n’elu azụ unu.”14

Ma ibu arọ ha “ka e mere ka ha dị mfe,” ma Onyenwe anyị mere ka ha gbasie ike ka ha wee bulie ibu arọ ha na-inwere onwe, ma ha nyefere onwe ha n’ọn̄ụ ma were ndidi ruo n’ọchịchọ nile nke Onyenwe anyị.”15

Ndị ahụ na-edobe ọgbụgba ndụ ha natara enyem aka n’ụdị dị ka nkasi obi, ndidi bawanyere abawanye na inwe ihu ọchị, na-inwere onwe n’ibu ha nke mere na ha nwere mmetụta ịdị mfe, ma mesịa nwete nnapụta.16

Ugbua ka anyị laghachi na akpaazụ dị ka mbụrụ nke anyị.

Nchegharị, site na Aja Mgbaghara Mmehie nke Jịzọs Karịst, bụ ihe na-anapụta anyị site na-arụ nke nkume nke mmehie anyị. Ma site na onyinye nke a mafere mma oke, ebere nke Chineke na-anapụta anyị site n’ụgwọ nke ikpe ziri ezi dị arụ ma n’aka nke ọzọ gaara abụ ihe na-agaghị ekwe omume.17

Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst mekwara ka okwe omume maka anyị ịnata ume iji gbaghara, nke na-enye anyị ohere iji buda ibu anyị bu niihi mmejọ si naka ndị ọzọ.18

Ya mere olee otu Onye Nzọpụta na-esi anapụta anyị site n’ibu niile nke ibi ndụ n’ụwa dara ada site na-ahụ ndị pụrụ ịnwụ anwụ n’ọnọdụ ịkwa arịrị na ihe mgbu?

Ọtụtụ mgbe, Ọ na-eme udị nnapụta ahụ site n’aka anyị Dị ka ndi otu Nzukọ nsọ Ya na-agbawo ndụ, anyị na-ekwe nkwa “isoro ndị na-eru uju ruo uju” ma “kasie ha obi bụ ndị chọrọ nkasi obi”19 Niihi na anyị “abatawo niime otu nke Chineke” ma bụrụwo ndị akpọrọ ndị Ya,” anyị “dị na njikere iburịta ibu nke onye na ibe ya, ka ha wee dị mfe.”20

Ngọzi nke ọgbụgba ndụ anyị bụ isonye Jizọs Kraịst na-iwete enyem aka, ma nke anụ ahụ ma nke ime mmụọ, nye ụmụ Chineke niile. Anyị bụ nnukwu okporo nke Ọ na-esi na ya ewete enyem aka.21

Ma site otu a, dị ka ndị enyi nke nwoke onye ọrịa ahụmkpọnwụ ahụ, anyị “na-elekọta ndị n’adịghị ike, welite aka ndị ahụ rudara ala, ma mee ka ikpere ndị n’adịghị ike ka ha guzozie.”22 Anyị “na-eburịta … ibu arọ onye na ibe ya, ma sị otu a mezuo iwu nke Kraịst.”23 Dị ka anyị na-eme ya, anyị na-abịa mara Ya, bịa dị ka Ya, ma chọta enyem aka Ya.24

Gịnị bụ enyem aka?

Ọ bụ iwepụ ma ọ bụ ime ka ihe na-egbu mgbu, na-enye nsogbu, ma ọ bụ ihe na-anyịgbu anyịgbu, ma ọ bụ ume nke idi ya dị mfe. Ọ na-arụtụ aka n’onye ahụ na-anọchi ọnọdụ nke onye ọzọ Ọ bụ otu esi emezi ihe a na-emezighị emezi n’usoro iwu.25 Mkpụrụokwu Anglo-French sitere na nke French Ochie bịa, mkpụrụokwu ahụ relever, ma ọ bụ “iweli elu,” ma site na Latịn relevare, ma ọ bụ “bilite ọzọ.”26

Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, Jizọs Kraịst bụ enyem aka. Ana m agba aka ebe na O bilitere ọzọ nụbọchị nke atọ ma, ebe o mezuworo Aja mgbaghara mmehie ahụ na-enweghị ọgwụgwụ ma dị ịhụnaanya, guzooro n’ogwe aka ghere oghe, na-enye anyị ohere iji kulie ọzọ, ma nwee nzọpụta, ma nwee mbuli elu ma bịa dị ka Ya Enyem aka Ọ na-enye dị ruo mgbe ebighị ebi.

Dị ka ndịinyom ahụ onye mmụọ ozi bịara lete n’ụtụtụ mbụ nke Ista ahụ, ọ ga-amasị m “ịga ọsịsọ” ma jiri “nnukwu ọńụ” iwete okwu ahụ na O biliwo.27 N’aha nke Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. Luk 5:20.

  2. Mak 2:11.

  3. Luk 5:25.

  4. Luk 5:26.

  5. Lee D. Todd Christofferson, “Iwu Nsọ Nke Mbụ Na Mbụ” (Brigham Young University devotional, Mar. 22, 2022), 2, speeches.byu.edu: “Ịhụnaanya anyị nwere na Chineke na-ebugo ike anyị ji ahụ ndị ọzọ naanya elu n’ụzọ kacha zuo oke ma na-enweghị ntụpọ niihi n’ezie anyị na-ejikọ aka anyị na Chineke na nlekọta nke ụmụ Ya” (nkwusi ike agbakwunyere).

  6. Lee Russell M. Nelson, “Merie Ụwa ma Nweta Ezumiike,” Liahona, Nov. 2022, 95–98.

  7. Russell M. Nelson, “Merie Ụwa ma Nweta Ezumiike,” 96.

  8. Matiu 11:28–30

  9. Russell. M. Nelson, “Merie Ụwa ma Nweta Ezumiike,” 97.“Merie Ụwa ma Nweta Ezumiike,” 97.

  10. Russell M. Nelson, “Anyị Nwere ike Ime Ihe Dị Mma ma Dị Mma karịa,” Liahona, May 2019, 67.

  11. Ndị Filipi 4:13.

  12. Mosaịa 24:9

  13. Mosiah 24:12

  14. Mosaịa 24:13–14; nkwusi ike agbakwunyere.

  15. Mosaịa 24:15

  16. Lee Mozaya 24:13–16

  17. Lee Alma 34:14–16lee kwa Mosaia 15:8–9

  18. Lee Russell M. Nelson, “Onyinye Anọ Nke Jizọs Kraịst Na-enye Gị” (First Presidency Christmas devotional, Dec. 2, 2018), broadcasts.ChurchofJesusChrist.org: “Onyinye nke abụọOnye Nzọpụta na-enye gị bụ ike nke ịgbaghara. Site na Aja mgbaghara mmehie Ya na-enweghị ọgwụgwụ, i nwere ike ịgbaghara ndị ahụ mejọrọ gị ma ndị na-enweghị ike anabata na ha mere gị ezigbo ihe ọjọọ.

    “Ọ na-adịkarị mfe ịgbaghara onye ahụ ji obiọacha na umeala chọọ mgbaghara gị. Mana Onye nzọpụta ga-enye gị ike iji gbaghara onye ọbụla onye kpasịrị gị agwa ọjọọ n’ụzọ ọbụla. Mgbe ahụ ajọọ omume ha apụghịkwa igbu mkpụrụ obi gị ọzọ.”

  19. Mosaịa 18:9

  20. Mosaịa 18:8

  21. Otu Enyem Aka, otu nke ndịinyom nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a, ka ahaziri site n’aka Onye amụma Josef Smit na Maachị 17, 1842, dị ka “otu si na chi agbakwunyere nye ọkwa nchụaja, (Dallin H. Oaks, “Ọtụghe niile na Ikike niileke Ọkwa nchụaja,” Liahona, May 2014, 51). Na-ịhọpụta aha maka otu ọhụụ ahụ, mkpụrụokwu ahụ ime afọ ọma ka atụlere, mana enyem aka ka ahọọrọ site naka ndịinyom ahụ. Ema Smit, onyeisi mbụ nke otu ahụ, na Eliza R. Snow, onye ode akwụkwọ ya onye nke mechara jee ozi dị ka onyeisi nke abụọ nke Otu Enyem aka ahụ, kọwara na ime afọ ọma bụụrụ mkpụrụokwu a maara amara—nke a maara amara na-ewumewu niile nke ụbọchị taa—mana amara amara ahụ “ekwesịghị ịbụ ihe ndụ anyị.” Ema kọwara nke ọma namkpụrụ okwu ahụ, enyem aka kacha kọwaa ozi ha nke ọma. Anyị na-eme ihe pụrụ iche … anyị tụrụ anya mmemme ndị pụrụ iche na oku ndị dị mkpa” (Ema Smit, niime Akwụkwọ Minit Otu Enyem aka na Nauvoo, Mar. 17, 1842, 12,josephsmithpapers.org). N’ezie, ikike nke Otu Enyem aka abụrụwo oge niile iwete enyem aka nke anụ ahụ na nke ime mmụọ Josef Smit kuziri na, “Otu Ahụ abụghị naanị maka inyere ndị ogbenye aka,kama maka ịzọpụta ọtụtụ mkpụrụ obi” (niime Akwụkwọ Minit Otu Enyem aka na Nauvoo, June 9, 1842, 63). Ma site otu a Otu Enyem aka garaniihu na-iwete enyem aka: “Enyem aka site na ogbenye, enyem aka site na nrịa nrịa; enyem aka site ninwe obi abụọ, enyem aka site na amaghị ihe—enyem aka site niihe niile na-egbochi ọńụ na ọganiihu nke onyeinyom” (John A. Widtsoe, Aka ebe niile na Mkpezi niile, arr. G. Homer Durham, 3 vols. in 1 [1960], 308).

  22. Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 81:5lee kwa Ndị Hibru 12:12

  23. Ndị Galetia 6:2

  24. N’otu niime nzukọ ndị isi mbụ nke Otu Enyem aka ahaziri ọhụrụ, Lucy Mack Smit, nne nke Onye amụma Josef Smit, kwuru, anyị ahaghị inwe mmasị n’ebe onye na ibe ya nọ, na-elekọta onye na ibe ya, na-akasi onye na ibe ya obi ma nwete nkuzi, ka anyị niile wee nwee ike nọdụkọta ala ọnụ n’eluigwe Ode agụgụala Jennifer Reeder dere banyere nke a, “Na njikọta aka ọnụ iwete enyem aka, ndịinyom jikọtara aka ha na Kraịst, ma site na-ime otu ahụ, ha chọpụtara enyem aka Ya“ (Nke Mbụ: Ndụ na Okwukwe nke Ema Smit [2021], 130).

  25. Lee Merriam-Webster.com Dictionary. “enyem aka.”

  26. Lee Dictionary.com, “enyem aka.”

  27. Lee Matiu 28:1–8