Akwụkwọ nsọ
Alma 54


Isi 54

Amorọn na Moronaị wee kwuzie maka ịgbanwe ndị-mkpọrọ nile—Moronaị wee rịọ ka ndị Leman laghachị-azụ ma kwụsị ibuso-agha igbu mmadụ ha nile—Amorọn wee chọọ ka ndị Nifaị tọgbọ ngwa-agha ha nile ma nọrọzie n’okpuru ndị Leman. Ihe dịka n’afọ 63 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ugbua o wee ruo na mmalite nke iri afọ abụọ na iteghete nke ndị-ikpe, na Amorọn zigara Moronaị ozi na-achọ ka o wee gbanwe ndị-mkpọrọ nile.

2 Ma o wee ruo na o metụrụ Moronaị ịn̄ụrị-ọn̄ụ karịa n’arịrịọ nke a, n’ihi na ọ chọrọ ihe ndị ahụ e wetara nke e nyere maka nkwado nke ndị-mkpọrọ nke ndị Leman maka nkwado nke ndị nke ya; ma ọ chọkwara ndị nke ya maka ịgba ndị-agha ya ume.

3 Ugbua ndị Leman akpọrọwo ọtụtụ ndịnyom na ụmụ-ntakịrị, ma e nweghị nwanyị ọbụla ma-ọbụ nwata n’etiti ndị-mkpọrọ nile nke Moronaị, ma-ọbụ ndị-mkpọrọ Moronaị kpọrọworọ; ya mere Moronaị kpebiri n’ụzọ aghụghọ inweta ndị-mkpọrọ nke ndị Nifaị ole ọbụla o nwere ike site n’aka ndị Leman.

4 Ya mere ọ dere akwụkwọ-ozi, ma ziga ya site n’aka nwa-oru nke Amorọn, otu onye ahụ nke wetaworo Moronaị akwụkwọ-ozi. Ugbua ndị a bụ okwu ndị ahụ o degaara Amorọn, na-asị:

5 Lee, Amorọn, edegaworo m gị ihe ole na ole gbasara agha nke a nke ịlụworo megide ndị m, ma-ọbụ n’ụzọ ọzọ nile nwanne gị nwoke lụworo megide ha, na nke ị ka kpebịkwara ime ka ọ gaa n’iru mgbe ọ nwụworo.

6 Lee, aga m agwa gị ihe ole na ole gbasara ikpe-ziri-ezi nke Chineke, na mma-agha ji ike nile nke oke-iwe ya, nke koro n’ofe-isi unu ma ọbụghị na unu chegharịrị ma dughachị ndị-agha nile unu n’ime ala nile nke onwe unu, ma-ọbụ ala nile nke onwunwe unu nile, nke bụ ala nke Nifaị.

7 E, aga m agwa gị ihe ndị a ma ọbụrụ na ị nwere ike ịn̄a ha ntị; e, aga m agwa gị gbasara ala-mụọ ahụ dị egwu nke na-eche ịnabata ụdị ndị ogbu-mmadụ nile dịka gị na nwanne gị nwoke bụworo, ma ọbụghị na i chegharịrị ma kpọghachi ebum-n’obi igbu-mmadụ gị nile, ma laghachi gị na ndị-agha gị nile n’ala nke aka unu nile.

8 Mana dịka unu jụworo ihe ndị a otu ugboro, ma unu alụwo ọgụ megide ndị nke Onye-nwe, ọbụna otu ahụ e nwere m ike ịtụ-anya na unu ga-eme ya ọzọ.

9 Ma ugbua lee, anyị nọ na njikere ịnabata unu; e, ma ma-ọbụghị na unu wepụrụ ebum-n’obi nile unu, lee unu ga-adọdata oke-iwe nke Chineke ahụ onye unu jụworo ịdakwasị unu, ọbụna ruo mbibichasị unu.

10 Mana, dịka Onye-nwe na-adị ndụ, ndị-agha anyị nile ga-abịakwasị unu ma ọbụghị na unu laghachiri-azụ, ma a ga-eleta unu jiri ọnwụ n’oge na-adịghị anya, n’ihi na anyị ga-edebe obodo-ukwu anyị nile na ala anyị nile; e, ma anyị ga-echekwa okpukpe-chi anyị na ụzọ nke Chineke anyị.

11 Mana lee, e chere m na a na m agwa gị okwu gbasara ihe nile ndị a n’efu; ma-ọbụ e chere m na ị bụ nwa nke ala-mụọ; ya mere aga m emechi akwụkwọ-ozi m site n’ịgwa gị na-agaghị m agbanwe ndị-mkpọrọ, ma-ọbụghị n’ọnọdụ na Ị ga-enyepu otu nwoke na nwunye ya na ụmụ ya, maka otu onye-mkpọrọ; ọbụrụ na nke a bụrụ otu ọ ga-adị na i ga-eme ya, aga m agbanwe.

12 Ma lee, ọbụrụ na imeghị nke a, aga m abịa imegide unu mụ na ndị-agha m nile; e, ọbụna aga m enye ndịnyom m na ụmụ-ntakịrị m ngwa-agha, ma aga m abịa imegide unu, ma aga m eso unu ọbụna ruo n’ala nke aka unu, nke bụ ala nke nketa mbụ anyị; e, ma ọ ga-abụ ọbara maka ọbara, e, ndụ maka ndụ; ma aga m enye unu agha ruo mgbe e bibiri unu site n’elu iru nke ụwa.

13 Lee, anọ m n’oke iwe m, na kwa ndị m; unu achọwo igbu anyị, ma anyị achọwo nanị ichekwa onwe anyị. Mana lee, ọbụrụ na unu chọrọ ibibi anyị karịa anyị ga-achọ ibibi unu; e, ma anyị ga-achọ ala anyị, ala nke nketa mbụ anyị.

14 Ugbua ana m emechi akwụkwọ-ozi m. Abụ m Moronaị; abụ m otu onye-ndu nke ndị nke ndị Nifaị.

15 Ugbua o wee ruo na Amorọn, mgbe ọ nataworo akwụkwọ-ozi a, were iwe; ma o dere akwụkwọ-ozi ọzọ nye Moronaị, ma ndị a bụ okwu nile nke o dere, na-asị:

16 Abụ m Amorọn, eze nke ndị Leman; abụ m nwanne-nwoke nke Amalakaịa onye unu gbuworo. Lee, aga m abọkwasị unu ọbọ ọbara ya, e, ma aga m abịakwasị unu mụ na ndị-agha m nile n’ihi na anaghị m atụ-egwu mmaja gị nile.

17 N’ihi na lee, ndị nna unu nile mejọrọ ụmụnne ha nwoke, nke mere na ha zunara ha ihe ruru ha nke ọchịchị mgbe ọ bụ nke ha n’ezi-okwu.

18 Ma ugbua lee, ọbụrụ na unu ga-atọgbọ ngwa-ọgụ unu n’ala, ma nyefee onwe unu ka ndị ọchịchị bụ nke ha n’ezi-okwu chịa unu, mgbe ahụ ka m ga-eme ka ndị m tọgbọ ngwa-ọgụ ha nile n’ala ma anyị agaghị alụ agha ọzọ.

19 Lee, i kupụtawo n’ume ọtụtụ mmaja nile megide mụ na ndị m; mana lee, anyị anaghị atụ-egwu mmaja gị nile.

20 Otu o sila dị, aga m ekwe ịgbanwe ndị-mkpọrọ nile dịka arịrịọ gị siri dị, n’ịn̄ụri-ọn̄ụ, na m ga-edozi nri m maka ndị nwoke nke agha m; ma anyị ga-alụ agha nke ga-adị ruo mgbe ebighi-ebi, ma-ọbụ n’idebe ndị nke Nifaị n’okpuru nke ikike anyị ma-ọbụ ruo na adịghị kwa ọzọ ha.

21 Ma dịka gbasara Chineke ahụ onye ị sị na anyị jụrụ, lee, anyị amataghị onye dị otu ahụ; ọbụghị ma unu matara; mana ọ bụrụ na o nwere onye dị otu ahụ, anyị amataghị kama na o mewo anyị na kwa unu.

22 Ma ọ bụrụ na e nwere ekwensu na ala-mụọ, lee ọ gaghị eziga unu n’ebe ahụ ka unu biri unu na nwanne m nwoke onye unu gbuworo, onye unu tụrụ ero na ọ gawo n’ụdị ebe ahụ? Mana lee ihe ndị a nile adịghị ihe ha mere.

23 Abụ m Amorọn, na onye si n’agbụrụ nke Zorọm, onye ndị nna unu kwagidere ma kpọpụta site na Jerusalem.

24 Ma lee ugbua, abụ m onye Leman na-enweghị egwu; lee, agha nke a a lụrụ ya ịbọ ọbọ mmejọ nile e mejọrọ ha, na ichekwa na inweta ihe nile ruru ha n’ọchịchị; ma e mechie m akwụkwọ-ozi nye Moronaị.