Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ala-mụọ


Ala-mụọ

Mkpughe nke ụbọchị ikpe-azụ na-ekwu banyere ala-mụọ ọdịkaria nta n’uche abụọ. Nke mbụ, ọbụ ebe ichere-oge n’ime ụwa mụọ maka ndị ahụ na-erubeghị-isi na ndụ nke ịnwụ anwụ. N’echiche nke a ala mụọ nwere otu ọgwụgwụ. Mụọ nile nọ ebe ahụ ka a ga-akụziri ozi-ọma ahụ, na oge ufọdụ isochi nchegharị ha, a ga ekulite ha ruo na otu ogo nke ebube nke bụ nke ha toruru. Ndị ahụ na-agaghị echegharị ma na-agbanyeghị ha-abụghị ụmụ nke ila-n’iyi, ga-afọdụ n’ala mụọ site n’isi ruo n’isi nke otu puku afọ Jisus ga-abịa n’ụwa chịa eze mgbe otu puku afọ ịta ahụhụ ndị a gasịrị, a ga-ekulite ha gaa n’otu ebube telestial (OznỌd. 76:81–86; 88:100–101).

Nke abụọ, ọ bụ ebe na-enweghị mgbanwe e dobeere ndị ahụ aja-mmehie nke Jisus Kraịst na-agbapụtaghị. N’echiche nke a, ala mụọ enweghi mgbanwe. Ọbụ maka ndị ahụ a chọtara “nogidere n’iru-inyi” (OznỌd. 88:35, 102). Nke a bụ ebe ahụ ebe Setan, mụọ-ozi ya nile na ụmụ ndịkom nke ila n’iyi—ndị ahụ gọnarịworo Ọkpara ahụ mgbe Nna ahụ kpughesiworo ya—ga-ebi ebighi-ebi (OznỌd. 76:43–46).

Akwụkwọ-nsọ nile n’oge nile ụfọdụ na-atụnye ala-mụọ dịka ọchịchịrị nke ezi.