Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 137


Nkeji 137

Ọ́hụ̀ e nyere Joseph Smith Onye-amụma n’ime temple na Kirtland, Ohio, 21 Jenuarị 1836 (History of the Church, 2:380–381). Oge ahụ bụụrụ nleba anya nke emume-nsọ nile nke onyinye nsọ dịka e kpugheworo ha.

1–6, Onye-amụma hụrụ nwanne ya nwoke Alvin n’ime ala-eze nke selestịal; 7–9, Ozizi nke nzọpụta nye ndị nwụrụ-anwụ ka e kpughere; 10, Ụmụaka nile ka a zọpụtaworo n’ime ala-eze nke selestịal.

1 Elu-igwe nile meghere nye anyị, na m wee hụ ala-eze selestịal nke Chineke na ebube nke dị na ya, ma anọ n’arụ ma-ọbụ pụta site n’arụ enweghị m ike ịkọ.

2 M wee hụ ịdị nma nke karịrị akarị nke ọnụ-ụzọ-ama ahụ ebe ndị nketa oke nke ala-eze ahụ ga-esi banye, nke dịka ire ọkụ gbara okirikiri;

3 Nakwa oche-eze nke Chineke nke na-enwu ka ọkụ na-ere ere ebe Nna na Ọkpara ahụ na-anọdụ n’elu ya.

4 M wee hụ okporo ụzọ ọma nile nke ala-eze ahụ nke nwere oyiyi ihe akpụrụ n’ọrụ aka nke ọla-edo.

5 M wee hụ Nna Adam na Abraham; na nna m na nne m, nwanne m nwoke Alvin, nke dawororị n’ụra ogologo oge;

6 Ma o juru m anya otu o si bụrụ na o nwetawo òkè n’ime ala-eze ahụ, ọ hapuwororị ndụ nke a tutu Onye-nwe e setipụ aka ya ikpọkọta Israel nke ugboro abụọ, na o meghị baptism n’ihi nsachapụ mmehie nile.

7 Otu a ka olu-okwu nke Onye-nwe bịakwutere m na-asị: Ka ha ra bụ ndị nwụworo na-amaghị maka ozi-ọma nke a, ndị gaara anata ya ma ọbụrụ na ekwere ka ha nọgide, ga-abụ ndị nketa òkè nke ala-eze selestịal nke Chineke;

8 Otu aka ahụ kwa ka ha ra bụ ndị ga-anwụ site ugbu a gawa na-amataghị ya ndị gaara anata ya n’obi ha nile, ga-abụ ndị nketa òkè nke ala-eze ahụ;

9 N’ihi na mụ bụ Onye-nwe, ga-ekpe mmadụ nile ikpe dịka ọrụ ha nile siri dị, dịka ọchịchọ nke obi ha nile siri dị.

10 Na m wee hụkwa na ụmụ-ntakịrị nile ndị nwụrụ tutu ha eruo afọ nke nkọwasị ka a zọpụtara n’ime ala-eze selestịal nke elu-igwe.