Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Adam


Adam

Nwoke mbụ e kere n’elu ụwa.

Adam bụ nna na Onye isi ezi na ụlọ nke agbụrụ nke mmadụ n’elu ụwa. Njehie ya n’ime Ogige-ubi Iden (Jen. 3; OznỌd. 29:40–42; Moses 4) kpataara ya ọdịda na ọ bịa bụrụ nke na-anwụ anwụ, otu nzọ-ụkwụ dị mkpa ime ka mmadụ gaa n’iru n’elu ụwa nke a (2 Nif. 2:14–29; Alma 12:21–26). Ya mere, Adam na Iv kwesịrị inye nnukwu ugwu n’ihi omume ha ime ka ito-eto ebighi-ebi anyị kwe omume. Adam bụ Ụbọchị nile nke Agba Ochie, amakwaara ya dịka Maikel (Dan. 7; OznỌd. 27:11; 107:53–54; 116; 138:38). Ọbụ ya bụ onye-isi mụọ-ozi, ọ ga-abịakwa n’ụwa ọzọ dịka Onye isi ezi na ụlọ nke ezi na ụlọ nke mmadụ, na njikere ruo ọbịbịa nke ugboro abụọ nke Jisus Kraịst (OznỌd. 29:26).