Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ìhè, Ìhè nke Kraịst


Ìhè, Ìhè nke Kraịst

Ume dị nsọ, ike, ma-ọbụ ike na-arụ ọrụ n’ime si na Chineke a bịa site na Kraịst na na-enye ihe nile ndụ na ìhè. Ọ bụ iwu ahụ nke e si na ya achị ihe nile n’elu-igwe na n’elu ụwa (OznỌd. 88:6–13). Ọ na-enyekwara ndị mmadụ aka ịghọta ezi-okwu nile nke ozi-ọma na n’enye-aka idobe ha n’ụzọ nke ozi-ọma ahụ nke na-eduga ha na nzọpụta (Jọn 3:19–21; 12:46; Alma 26:15; 32:35; OznỌd. 93:28–29, 31–32, 40, 42).

Ìhè nke Kraịst ekwesịghị ka o megharịa anya, ya na Mụọ Nsọ. Ìhè nke Kraịst enweghị onye Ọ bụ. Ọ bụ ike na-arụ ọrụ n’ime nke na-esi na Chineke abịa na n’ejikere onye ahụ ịnata Mụọ Nsọ. Ọ bụ ike na-arụ ọrụ n’ime maka ezi ihe n’ime ndụ ndị mmadụ nile (Jọn 1:9; OznỌd. 84:46–47).

Otu ngosipụta nke ìhè nke Kraịst bụ mụọ, nke na-enyere mmadụ aka ịhọrọ n’etiti izi-ezi na ezighị-ezi (Moro. 7:16). Dịka ndị mmadụ na-amụta karịa banyere ozi-ọma ahụ, mụọ ha nile na-abịa na-enwe mmetụta karịa (Moro. 7:12–19). Ndị na-an̄a ìhè nke Kraịst ahụ ntị ka a na-eduga na ozi-ọma nke Jisus Kraịst (OznỌd. 84:46–48).