Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 112


Nkeji 112

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma rute Thomas B. Marsh, na Kirtland, Ohio, 23 Julaị 1837 (History of the Church, 2:499–501). Mkpughe nke a nwere okwu nke Onye-nwe nye Thomas B. Marsh gbasara ndị-ozi iri na abụọ nke Nwa-atụrụ ahụ. Onye-amụma dere na a natara mkpughe nke a n’ụbọchị ekwusara ozi-ọma mbụ na England. Thomas B. Marsh bụ n’oge nke a Onye-isi nduzi nke ndị Ọnụ-ọgụgụ-juru-aka nke Ndị-ozi Iri na Abụọ ahụ.

1–10, Ndị-ozi iri na abụọ ahụ ga-eziga ozi-ọma na welie olu nke ị dọ aka-na-nti nye mba nile na ndị mmadụ; 11–15, Ha ga-ebuli obe ha, soro Jisus, na zụọ atụrụ ya; 16–20, Ndị ahụ nabatara ndị Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ nabatara Onye-nwe; 21–29, ọchịchịrị kpuchịrị ụwa, na nani ndị nke kweere na mee baptism ka a ga-azọpụta; 30–34, Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ na Ndị-ozi Iri na abụọ ahụ ji ọtughe ụzọ nile nke ọgbọ ahụ nke ozuzu oge nile akara aka.

1 N’ezie, otu a ka Onye-nwe kwuru nye nwa odibo m Thomas: A nụwo m ekpere gị nile; na kwa onyinye gị nile arịgotewo dịka ihe-ncheta n’iru m, n’aha ndị, ụmụnna gị, ndị ahọpụtara ịgba-ama aha nke m na zipụkwa ya mba ndị-ọzọ n’etiti mba nile, ebo nile, ire nile, na ndị mmadụ, ndị echiri echichi site na ụmụ odibọ m.

2 N’ezie a sị m unu, o nweriri ụfọdụ ihe ole na ole dị n’obi gị na n’ebe i nọ nke mụ, Onye-nwe, enweghị ezi nmasị.

3 Otu o sila dị, ebe ọbụ na iwedatawo onwe gị-ala, ị ga-abụ onye eweliri-elu; ya mere, agbagharawo gị mmehie gị nile.

4 Kwee ka obi gị nwee ezigbo an̄ụrị nke m; na ị ga agba-ama nke aha m, ọ bụghi nanị nye ndị Jentaịlụ, mana kwa nye kwa ndị Juu na i ga-ezipụ okwu nke m ruo na nsọtụ nile nke ụwa.

5 Ya mere, rụọ ụka, ụtụtụ kwa ụtụtụ; na ụbọchị na ụbọchị, kwee ka olu nke ịdọ aka-na nti gị gaa n’iru; na mgbe abalị bịara ekwela ka ndị bi n’ụwa rahụ ụra, n’ihi okwu nke gị.

6 Kwee ka amara ebe obibi gị na Zaịọn, na ewepụkwala ụlọ gị; n’ihi mụ Onye-nwe nwere otu ọrụ-ukwu nke ị ga-arụ, n’igbasa aha m n’etiti ụmụ nke mmadụ.

7 Ya mere, kelie ihe okike ukwu gị elu maka ọrụ ahụ. Kwee ka e kpuchitakwa ụkwụ gị, n’ihi a họrọwọ gị, na kwa ụzọ gị dị n’etiti ugwu nile, na n’etiti ọtụtụ mba.

8 Na kwa site n’okwu gị ọtụtụ ndị dị elu ka a ga-eweda ala, na kwa site n’okwu gị ọtụtụ ndị dị ala ka a ga-ebuli elu.

9 Olu gị ga-abụ ihe ịba-mba nye onye njehie; na kwa n’ịba-mba gị mee ka ire nke onye nkwụtọ kwụsị nduhie ya.

10 Ka ịdịrị umeala; na Onye-nwe Chineke gị ga-ejide gị n’aka, ma nye gị ọziza nke ekpere gị nile.

11 A mam obi gị, na nụ kwa ekpere gị nile gbasara ụmụnna gị. Enyela ha oke ịhụn’anya gị karia ndị ọzọ, kama ka ịhụnanya gị dịrị ha dịka onwe gị; ma kwee ka ịhụnanya juputa nye mmadụ nile, na nye kwa ndị nile ndị hụrụ aha m n’anya.

12 Na kpee ekpere maka ụmụnna gị ndị ozi iri na abụọ. Jiri okwu siri ike dọọ ha aka-na-nti n’ihi aha m, na ka a dọọ ha aka-na-ntị maka mmehie ha nile, n’ịkwesị ntụkwasị obi n’iru m nye aha m.

13 Na mgbe ọnwụnwa ha gasịrị, na ọtụtụ mkpagbu, lee, mụ, Onye-nwe ahụ, ga-enwe nye mmetụta ha, na ọ bụrụ na ha emesighị obi ha ike, na ghara ịkpọ ekwe ha nkụ i megide m, a ga-agbanwe ha, na a ga m agwọ ha.

14 Ugbụ a, a si m gị, na ihe m kwuru nye gị, e kwuru m nye Ndị-ozi iri na abụọ nile ahụ: bilie na kee ihe-okike n’ukwu gị, bulie obe unu, soro m, na nye igwe aturu m nri.

15 Ebuli-kwala nụ onwe unu elu; enupụ kwala isi megide nwa odibo m Joseph; n’ihi n’ezie a si m unu, anọnyeere m ya, na aka m ga-ekpuchite ya, na ọtụghe-ụzọ nile ahụ nke m nyefeworo ya, na kwa unu dum ka, a gaghị anapụ ya ruo mgbe m ga-abịa.

16 N’ezie a si m gị, nwa odibo m Thomas, ị bụ onye ahụ Onye m họrọworo ijide ọtụghe-uzọ nile nke ala-eze m, dịka ọ gbasara Ndị-ozi iri na abụọ ahụ, n’obodo-ọzọ n’etiti mba nile—

17 Ka ị wee bụrụ nwa odibọ m nke ga-atụghe ọnụ-ụzọ nke ala-eze ahụ n’ebe nile ebe nwa odibo m Joseph, na nwa odibo m Sidney, na nwa odibo m Hyrum, n’enweghị ike ị bia;

18 Maka n’elu isi ha ka m boworo ibụ-arụ nke nzukọ-nsọ nile maka-nwa oge nta.

19 Ya mere, ebe ọbụla ha ga-eziga gị, gaa ya, na a ga m a nọnyere gị; na n’ebe ọ bụla ị ga ama-ọkwa aha m ọnụ-ụzọ di-ire ka a ga-emeghe nye gị, ka ha wee nabata okwu m.

20 Onye ọbụla nabatara okwu m nabatara m, na onye ọbụla nke nabatara m, nabatara ndị ahụ, Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ, ndị m zipụworo, ndị m meworo ndị ndụmọdụ n’ihi aha m nye unu.

21 Na ọzọ, a sị m gị, na onye ọbụla ị ga-ezipụ n’aha m, site n’olu nke ụmụnna gị, Ndị-ozi iri na abụọ ahụ, nke i họpụtara na nye ikike otu okwesịrị; ga-enwe ike imepe ụzọ ahụ nke ala-eze m nye mba ọbụla ebe unu ga-eziga ha—

22 Ọ bụrụ raa, na ha ga-eme onwe ha umeala n’iru m, na nọgide n’okwu m, na n̄aa ntị n’olu nke mụọ m.

23 N’ezie, n’ezie, a sị m unu, ọchịchịrị ekpuchiwo ụwa, na ọchịchịrị karịrị-akarị kpuchiri obi nile nke ndị mmadụ, na anụ arụ nile a bụrụwo ihe rụrụ-arụ n’iru m.

24 Lee, ịbọ-obo na-abia ọsọ-ọsọ ịdakwasị ndị bi n’ụwa, ụbọchị nke oke-iwe, ụbọchị nke nrepịa, ụbọchị nke ịtọgbọrọ n’efu, nke ịkwa-akwa, nke iru-uju, na nke ịkwa arịrị; na dịka oke ifufe gburu-gburu ọ ga-abịakwasị iru elu ụwa nile, ka Onye-nwe kwuru.

25 Na n’elu ụlọ nke m ka ọ ga-amalite, na site n’ụlọ m ka ọ ga-apụ, ka Onye-nwe kwuru;

26 Mbụ n’etiti ndị ahụ nọ n’etiti unu, ka Onye-nwe kwuru, ndị kwupụtara ịma aha m ma na ha amaghị kwa m, na ha e kwuhiewo megide m n’ime etiti nke ụlọ m, ka Onye-nwe kwuru.

27 Ya mere, hụ kwa na unu enyeghị onwe unu nsogbu gbasara ọrụ nile nke nzukọ-nsọ m n’ebe a, ka Onye-nwe, kwuru.

28 Mana mee nụ ka obi unu dị-ọcha n’iru m; na mgbe ahụ gaa nụ n’ime ụwa nile, na kwusaa ozi-ọma nke m nye ihe nile ekere-eke nke na-anatabeghị ya;

29 Na onye nke kwere na e mee ya baptism ka a ga-azọpụta, na onye nke n’ekweghị na nke n’emeghị baptism ka a ga-ama-ikpe.

30 N’ihi nye unu, Ndị-ozi iri na abụọ ahụ, na ndị ahụ, Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ, ndị ahọpụtara gị na ha ịbụ ndị ndụmọdụ unu na ndị ndu unu, ka e nyere ike nke ọkwa nchụ-aja nke a, maka ụbọchị ndị ikpeazụ na maka oge nke ikpeazụ, n’ime nke enwere ọgbọ nke ozuzu oge nile ahụ akara aka.

31 Bụ ike ahụ nke unu ji, nke ejikọrọ ya na ndị ahụ nile ndị nwetaworo otu ọgbọ n’oge ọbụla site na mmalite nke okike;

32 N’ihi n’ezie a sị m unu, ọtụghe ụzọ nile nke ọgbọ ahụ, nke unu nataworo, gbadataworo site na ndị nna ha na nke ikpeazụ ya, bụrụ nke a na ezidata site n’elu-igwe nye unu.

33 N’ezie a sị m unu, lee ka ịdị-ukwuu nke ọkpụkpọ-oku unu. Sachaa obi unu na uwe unu, a dịghị ama-ama ọbara nke ọgbọ nke a abụrụ ihe aga achọ n’aka unu nile.

34 Kwesị ntụkwasị-obi ruo mgbe m ga-abia, n’ihi a ga m abịa ọsọ-ọsọ; na ụgwọ-ọrụ m dị n’aka m ikwụghachi onye ọbụla dịka ọrụ ya siri dị. A bụ m Alfa na Omega. Amen.