2010–2019
Divine Discontent
October 2018


Enweghi afọ-ojuju nke Dị Nsọ

Enweghi afọ-ojuju nke Dị Nsọ n’eme k’anyị n’ejiri okwukwe n’eme ịhe, n’esoro ọkpụkpụ-oku nke Onye Nzọpụta maka ị mee ịhe ọma, ma iji obi umeala nyefe Ya ndu anyị nile.

Oge m nọ na ụlọ-akwụkwọ elementịrị, anyị si na otu ụzọ nọ n’ugwu nke hịkọrọ-ahịkọ etekwara-ete laa ụlọ. Enwekwara ụzọ ozo nke a n’eteghi-ete, nke a na-akpọ “okporo-ụzọ nke ụmụ okorobịa.” Okporo-ụzọ nke umu okorobịa ahụ bụ ụzọ aja-aja nke gbagoro elu ugwu. Ụzọ nke ahụ dị nke-nke ma kpọda-akpọda. Dịka nwa nwanyị nta, a maram na ọ dịrị m mfe ije ije n’ụzọ ọbụla ndị umu nwoke n’eje. Nke ka mkpa, a maram na ebị m n’ụbọchị ikpe-azụ, ma mata na ọ dịrị m mkpa ị mee ịhe ndị siri ike, dịka ndị mbute-ụzọ si mee—nihi nke-a, achọrọ m ikwado-akwado. Nihi nke-a, mgbe na mgbe, a ga m a nọ n’azụ-azụ ndị enyim n’ụzọ nke-a etere-ete, yipụ akpụkpa-ụkwụ m, ma jee ije n’okporo ụzọ ụmụ okorobịa ahụ. Ebum n’uche m bụ ka ụkwụ m sie ike.

Dịka nwata nwanyị onye Praịmarị, ịhe-a bụ ịhe m chere m’geme iji kwado. Ugbua a matawo m ịhe dị iche! Kama ịgba ụkwụ-ọkpọrọ jee ije n’ụzọ nile nọ n’ugwu ahụ, A matawom na a gam akwado ịje ije n’ụzọ ọgbụgba-ndụ ahụ site na ị nabata okù nile nke Mmụọ Nsọ kpọrọ. Nihi Onye Nwe-anyị, site na onye-amụma Ya, n’akpọ onye ọbụla nime anyị k’anyị bie ndụ ma lekọta “n’ụzọ dị elu ma dị nsọ karịa” ma “jee ije dị elu.”1

Okù amụma ndịa n’akpoli mmụọ ịrụ ọrụ, tinyekwara obi anyị nwere n’anyị nwere ike ị mee ịhe ma bụrụkwa ịhe karịa, mgbe ụfọdụ n’arọpụta nime anyị ịhe Okenye Neal A. Maxwell kpọrọ “enweghi afọ ojuju nke dị nsọ” 2 Enweghi afọ ojuju nke dị nsọ n’abịa mgbe anyị jiri “ihe anyịbụ ma-atụ ya na ịhe anyị nwere ikeị bụ.” 3 Onye ọbụla nime anyị, m’ọbụrụ n’anyị gwa onwe anyị eziokwu, mara na enwere oghere dị n’etiti ebe na onye anyị bụ, ya na ebe na onye anyị chọrọ ị bụ. Obi anyị n’achọsike ịnwetekwo ume nke onwe. Anyị nwere mmetụta-obi ndịa nihi n’anyị bụ ụmụ ndị nwanyị na ndị nwoke nke Chineke, ndị amụrụ site n’Ịhè nke Kraịst n’agbanyeghi n’anyị bi n’ụwa nke dara-ada. Mmetụta-obi ndịa bụ ịhe Chineke n’enye, ma ha n’eme k’anyị mata mkpa ọ dị ị mee ịhe ngwa-ngwa.

Anyị kwesịrị ị nabata n’obi anyị mmetụta nke enweghi afọ ojuju nke dị nsọ ndịa, nke n’eme k’anyị gbagoo elu, ma n’otu aka ahu na amatakwa ma gbanarịa udịrị nke Ekwensu—obi ịda-mba nke n’akpọnwụ ịhe. Nke-a bụ oghere pụrụ-iche nke Ekwensu ga-achọ iwuba nime ya n’ike-n’ike. Anyị nwere ike ịhọrọ ije ije n’ụzọ nke dị elu nke n’eduba anyị maka ịchọ Chineke, ma udo na amara Ya, m’ọbụ anyị nwere ike gee ntị nye Ekwensu, onye ga-ezitere anyị ọtụtụ ozi nke n’agaghị ezu oke: ozughi oke n’ụba, ozughi oke n’uche, ozughi oke na nma, ozughi oke n’ịhe ọbụla. Enweghi afọ ojuju nke anyị nwere ike bụrụ nke dị nsọ—m’ọbụ nke n’ebibi-ebibi.

Mee ịhe n’Okwukwe

Otu ụzọ esi amata enweghi afọ ojuju nke dị nsọ na udịrị nke Ekwensu bụ, enweghi afọ ojuju nke dị nsọ n’eme k’anyị mee ịhe n’okwukwe. Enweghi afọ ojuju nke dị nsọ abụghị ọkù akpọrọ k’anyị nọrọ n’ebe ahụ dị anyị mma n’ahụ, m’ọbụkwanụ ma ọ g’ebutere anyị obi ịda mba. A mụtawom na mgbe m n’erugharị nime echiche ịhe nile nkem n’abụghị, A gaghị m enwe ọganihu, ma ọ ga ara m ahụ ịnwete ma soro Mmụọ.4

Mgbe ọ bụ okorobịa, Josef Smith matara nke ọma adịghị-ike ya nile ma o chere oke echiche maka “ọdịnma nke mkpuru-obi anwụghị-anwụ nke [ya]” Dịka otu o siri kwuo, “Uche m nwetere oke mkpagbu, nihi a mara m ikpe nihi mmehie m nile, … ma rie uju nihi mmehie nke m nile ma mmehie nile nke ụwa.”.5Nke-a mere ya ka ọ nwee “oke ntụgharị n’uche na obi-nsogbu.”.6Nke-a, ọ dịka ịhe ị nụrụ na mbụ? Unu ọ n’enwete obi-nsogbu m’ọbụ mkpagbu n’ihi adịghị-ike unu nile?

Ọ dịrị otua, Joseph nwere ịhe ọ mere. O kwuru, “Ọtụtụ mgbe ka m na-asị onwe m: : Gini ka a ga-eme?”7 Joseph mere ịhe n’okwukwe. Ọ gakwuru akwụkwọ-nsọ, gụọ ọkpụkpọ-okù dị nime James 1:5, ma chigharịa n’ebe Chineke nọ maka enyemaka. Ọhụ ahụ ahụrụ kpọbatara anyị nime Mweghachi-azụ. Enwere m obi ekele na enweghi afọ ojuju nke dị nsọ nke Joseph, na obi-nsogbu na mgbawoju-anya nke ya, mere ya ka ọ mee ịhe n’okwukwe.

Soro Mkpali-obi nile nke n’eme ka Ị mee Ịhe-ọma

Mgbe ụfọdụ ụwa n’eji mmetụta enweghi afọ ojuju mee ịhe ngọpụ maka ịche nanị maka onwe, maka itugharị uche ka ọ baa nime ma laa azụ ma chewe maka nanị onye mbụ, ịhe mn’abụghị, ma ịhe mchọrọ. Enweghi afọ ojuju nke dị nsọ n’akpali obi anyị k’anyị soro ọmụmatụ nke Onye Nzọpụta, “onye na-agagharị-agarị n’eme ịhe ọma.”8 Mgbe anyị n’eje ije nke onye n’eso ụzọ, anyị na-anata mmetụta nke mmụọ maka ịgbatịpụ aka nye ndị ọzọ .

Otu akụkọ m nụrụ ọtụtụ afọ gara-aga enyewo m aka ị mata ma mee ịhe nile mkpali nke Mmụọ Nsọ sị m mee. Nwanne-nwanyị Bonnie Parkin, onye bụbụrụ Onye Isi Nduzi Zuru-ọha nke Otù Enyemaka, kwuru ịhe ndịa:

“Susan … bu ezigbote onye ọdụ-akwa. Onye Isi Kimball bụ onye otù ngalaba-ụka [ya] Otu ụbọchị ụka, Susan hụrụ na ọ nwere otu suit ọhụrụ. Otebeghi aka nna ya ... weetere ya otu akwa-silk mara oke nma. Susan kwuru n’obi na akwa ahụ ga-ama mma m’ọbụrụ tie Onye Isi Kimball ga-eji eyi suit ọhụrụ ya. Nihi nke-a, n’ụbọchị Monday, ọ kwara tie ahụ. O kechiri ya nime akwukwọ-tishuu ma jee ruo n’ụlọ Onye Isi Kimball.

“Mgbe ọ n’eru n’ụzọ ụlọ ahụ,ọ kwụsịrị n’otu ntabi-anya ma chee, ’Kedụ onye m bụ ị meere onye-amụma ahụ tie? Akapachaghị anya ọ nwere ọtụtụ.’ Mgbe obi ya gwara ya na o jehewo, o chigharịrị azụ ị laa.

“Mgbe ahụ Nwanne-nwanyị Kimball mehere ụzọ nọ n’ihu ma kwuo, “O Susan!’

“Ezigbote ihere mere ya, Susan ekwuo, ’A hụrụ m Onye Isi Kimball k’oyi suit ọhụrụ ya n’ụbọchị Sunday. Nna m si n’obodo New York wetere mụ ụfọdụ akwa-silk ... Ma nihi nke-a akwara m ya otu tie.

“Tupu Susan a ga n’ihu kwuo okwu, Nwanne-nwanyị Kimball akwụsị ya, jide ya na nku ya nile, ma kwuo: ‘Susan, ekpuchikwala echiche dị nma ọzọ mọlị.’” 9

A hụrụ m nke-a n’anya! “ Ekpuchikwala echiche dị nma ọzọ mọlị” Ụfọdụ oge mgbe m nwetere mmetụta-obi ị meere mmadụ ịhe, A na m eche ma nke ahụ ọ bụ mkpali k’ọbụ nanị echiche m. Mana a n’echetaram nke-a, “ihe ahụ nke bụ nke Chineke na-akpọ-okụ ma na-eto-akpịrị ime ihe ọma esepụghị-aka; ya mere, ihe nile nke na-akpọ-okụ ma na-eto-akpịrị ime ihe ọma, na ịhụ Chineke nʼanya, na ijere ya ozi, mụọ nke Chineke kwalitere ya.” 10

Ma ha ọ bụ mkpali m’ọbụ echiche ị nye aka, ịhe ọma emere efughi ọkpọrọ; nihi “afọ-ọma anaghị ada-ada mọlị”11—ma enweghikwanụ mgbe ịme ịhe ọma bụ ịhe ọjọọ.

Enwere ike oge emere ya adabachayị-adaba, ma anyị anaghị amacha oge nile ebe ịhe ọma ntakịrị anyị mere ruru. Mana mgbe na mgbe, anyị ga-amata na anyị abụrụwo ngwa-ọrụ n’aka Chineke, ma anyị g’enwe obi ekele ị mata na Mmụọ Nsọ, onye n’arụ ọrụ nime anyị bụ ịhe ngosipụta na Chineke kwadoro ya.

Ụmụnne-nwanyị, mụ na unu nwere ike ị rịọ Mmụọ Nsọ ka ọ gosi anyị “ịhe nile [anyị] kwesịrị ị mee,” 12ọbụrụgodi mgbe ahụ aka anyị juru n’ịhe nile ekwesịrị ịme-eme.. Mgbe ọ metụrụ anyị n’obi, anyị nwere ike ị hapụ efere ndị a na-asa-asa, m’ọbụ hapụ edemede ndị a ga-agụ-agụ juru nime inbox, iji gụọra otu nwata akwụkwọ, m’ọbụ jee leta otu enyị, lekọta otu nwa onye agbatobi anyị, m’ọbụ jee ozi nime tempụl. Aghọtahe-kwalam o—A bụ m onye n’edepụta ịhe ọ n’eme, a na m enwe mmasị ị kagbu n’akwụkwọ ịhe ndị m meworo. Mana udo n’abịa mgbe a matara na ị bụkarịa anaghị apụta na ị n’emekarịa. Ị me ka mkpebi obi anyị i soro mkpali nile bụrụ otu ụzọ anyị ji akpasa enweghi afọ ojuju agwa, ga-agbanwe otu m si eche-echiche maka “oge nkem,” ma a na m ahụ ndị mmadụ, n’abụghị dịka ịhe nnochi ụzọ kama dịka ebumn’uche nke ndụ m.

Enweghi afọ ojuju nke Dị nsọ N’eduba Anyị na Kraist

Enweghi afọ-ojuju nke Dị Nsọ n’eduba nime obi-umeala, ọ naghị eduba nime ụta nke onwe m’ọbụ obi ida-mba nke n’abịa site n’iji ịhe abụọ maa atụ nke n’egosirịrị mgbe nile na anyị ezughi oke. Ụmụnne--nwanyị ndị n’edobe ogbụgbandụ n’abịa n’ụdị dị iche-iche, ezin’ụlọ ha, nhụmịhe ndụ ha, na ọnọdụ ha n’adị iche-iche.

Neziokwu, anyị nile gesi na akara-aka nsọ anyị wee daa, ma enwere eziokwu nime mgbe anyị matara anyị ezuighi oke mgbe anyị nọ nanị anyị. Mana ozi ọma nke oziọma bụ na nihi amara nke Chineke, anyị zuruoke. Nihi enyemaka Kraịst, anyị nwere ike ị mee ụhe nile. 13 Akwụkwọ-nsọ nekwe nkwa na anyị “gahụ amara nkegenyere anyị aka mgbe anyị nọ na mkpa.” 14

Eziokwu nke na-atụnanya bụ na adịghị-ike anyị nwere ike ị bụ ngọzị mgbe ha mere k’anyị nwe obi-umeala, ma mee k’anyị chewe ihu n’ebe Kraịst nọ. 15 Enweghi afọ ojuju n’abụ nke dị nsọ mgbe anyị ji obi-umeala bịakwute Jisọs Kraịst maka mkpa anyị, karịa ịsọla azụ nime ụta nke onwe.

N’eziokwu, ọrụ-ebube nke Jizọs n’ebidokarị mgbe a matawara mkpa, ọdịda, na adịghị-ike. Ị chetakwara achicha na azụ ndị ahụ? Odee ọbụla nke Ọziọma kwuru maka otu Jizọs si jiri ọrụ-ebube zụọ ọtụtụ puku ndị soro ya. 16 Mana akụkọ ahụ bidoro mgbe ndị n’eso-ụzọ matara maka ịhe kọrọ ha; ha matara na ha nwere nanị “achịcha ise, na azụ ntakịrị abụọ: mana kedu ịhe ndịa bụ n’etiti igwe mmadụ ahụ?” 17 Ndị n’eso-ụzọ ahụ kwuru nke bụ eziokwu: ha enweghi nrị zuru oke, mana ha nyere Jisọs ịhe ha nwere ma meziri ọrụ-ebube ahụ.

Enwewo mgbe ị chere na akara-aka gị na onyinye gị nile dị ntakịrị maka ọrụ dị n’ihu? E nwewo m. Mana mụ na gị nwere ike ị nye Kraịst ịhe anyị nwere, ma Ọ ga-amụba mgbalị nile anyị. Ịhe ị nwere ike ị nye zuru-ezu—nagbanyeghi adịghị-ike gị dịka mmadụ—m’ọbụrụ na ị dabere n’elu amara nke Chineke.

Eziokwu bụ na onye ọbụla nime anyị bụ nwa nke Chineke. 18 Ma dịka otu Ọ meworo ndị amụma na ndị nwoke na nwanyị ndị nkịtị ka mgbe ụwa, otu ahụ ka Nna bị N’igwe ji chọọ ị gbanwo anyị.

C. S. Lewis kọwara ịke nke mgbanwe ahụ n’ụzọ nke-a: “Chee n’obi gị na ibi nime otu ụlọ. Chineke abịa ị rụgharị ụlọ ahụ. Na mbụ, enwere ike, ị ga-aghọta ịhe Ọ neme. Ọ n’emezị ọwa mmiri nile nke ọma, n’akwụsị ebe nile furu-efu, ya na ịhe ndị ọzọ: ị maara na ọrụ ndịa ahụ bụ nke ekwesịrị ị mee, ma nihi nke-a, ọ tụghị gị n’anya. Mana ugbua Ọ bidozie kụwawa ụlọ ahụ n’ụzọ nke n’afụ-ụfụ nke ukwuu. … [Ị hụwo,] Ọ na-arụzị ụlọ dị iche na nke ị chere. ... Ị cheere na a na-arụ gị ka [ị bụrụ] obere ụlọ : mana Ọ na-arụ obi onye eze. Ebum n’uche Ya bụ ka Ọ bịa biri nime ya.” 19

N’ihi aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta, enwere ike ị mee k’anyị nwe ume eji arụ ọrụ ndị nọ n’ihu. Ndị amụma akụziworo anyị na, dịka anyị na-agbago n’ụzọ nke ndị n’eso-ụzọ, anyị g’enwe ike nweta ịdị-nsọ site na amara nke Kraist. Enweghi afọ-ojuju nke Dị Nsọ g’eme k’anyị mee ịhe n’okwukwe, soro ịkpọ-oku nke Onye Nzọpụta maka ị mee ịhe ọma, ma nye Ya ndụ anyị nile n’obi umeala. N’aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Notes

  1. Russell M. Nelson, in Tad Walch, “‘The Lord’s Message Is for Everyone’: President Nelson Talks about Global Tour,” Deseret News, Apr. 12, 2018, deseretnews.com.

  2. Neal A. Maxwell, “Becoming a Disciple,” Ensign, June 1996, 18.

  3. Neal A. Maxwell, “Becoming a Disciple,” 16; emphasis added.

  4. “Discouragement will weaken your faith. If you lower your expectations, your effectiveness will decrease, your desire will weaken, and you will have greater difficulty following the Spirit” (“What Is My Purpose as a Missionary?” Preach My Gospel: A Guide to Missionary Service, rev. [2018], lds.org/manual/missionary).

  5. Teachings of Presidents of the Church: Joseph Smith (2007), 28.

  6. Joseph Smith—History 1:8.

  7. Joseph Smith—History 1:10; emphasis added.

  8. Acts 10:38.

  9. Bonnie D. Parkin, “Personal Ministry: Sacred and Precious” (Brigham Young University devotional, Feb. 13, 2007), 1, speeches.byu.edu.

  10. Moroni 7:13.

  11. 1 Corinthians 13:8.

  12. 2 Nephi 32:5.

  13. “I can do all things through Christ which strengtheneth me” (Philippians 4:13).

  14. Hebrews 4:16.

  15. “And if men come unto me I will show unto them their weakness. I give unto men weakness that they may be humble; and my grace is sufficient for all men that humble themselves before me; for if they humble themselves before me, and have faith in me, then will I make weak things become strong unto them” (Ether 12:27; emphasis added).

  16. See Matthew 14:13–21; Mark 6:31–44; Luke 9:10–17; John 6:1–14.

  17. John 6:9.

  18. President Boyd K. Packer taught: “However many generations in your mortal ancestry, no matter what race or people you represent, the pedigree of your spirit can be written on a single line. You are a child of God!” (“To Young Women and Men,” Ensign, May 1989, 54).

  19. C. S. Lewis, Mere Christianity (1960), 160.