2010–2019
Ndị-nwanyị na Ọmụmụ Oziọma n’ime Ezin’ụlọ
October 2018


Ndị-nwanyị na Ọmụmụ Oziọma n’ime Ezin’ụlọ

Kicker to come

Ndị ụmụnne m nwanyi ọma, ọ bụ ịhe ọma ịnọnyere unu. Oge nke-a bụ oge ọṅụ nime Nzụkọ nke Jisọs Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị Ikpeazụ. Onye nweanyị na-awụkwasị mmata-ịhe n’elu Nzukọ Ya dịka O kwere nkwa na Ọ g’eme.

Unu n’echeta ịhe O kwuru: “Rụọ ole mgbe ka mmiri na asọ-asọ ga-anọ n’adịghị ọcha? Ole ike ga-akwụsi elu-igwe nile? Ọzọ kwa mmadụ o nwere ike ịsetipụ ntakịrị aka ya ịkwụsị Osimiri Missouri n’ụzọ ya akara-aka, ma-ọbụ ịtụgharị mmịrị ahụ isi, iji kwụsị Onye Pụrụ Ime Ihe nile site na ịwụsa mmụta site n’elu-igwe n’isi nke Ndị-nsọ nke Ụbọchị-Ikpeazụ a.”1

Otu ụzọ Onye-nweanyị si n’ekekasị mmata-ịhe ugbua bụ otu O si n’eme ngwa-ngwa n’ịwụkwasị n’elu isi nile ma n’ime obi nile nke ndị Ya. Ọ mewo ka odoo anya na ụmụ ndị nwanyị nke Nna bi N’igwe ga-esoro rụọ ọrụ ebube ahụ dị ngwa-ngwa. Otu ịhe n’egosi ọrụ ebube ahụ bụ otu Ọ si n’edu onye-amụma Ya ka ọ kwuo nke-ka-nke, mkpa ọ dị ikuzi oziọma n’ime ezin’ulọ.

Unu nwere ike jụọ, “Kedụ otu nke-a si eme ụmụnne ndị-nwanyị kwụsịrị-ike n’okwukwe, ka ha bụrụ igwe-bụ-ike n’ịnyere Onye-nweanyị aka ị wụkwasị mmata-ịhe n’elu Ndị-nsọ Ya?” Onye-nweanyị nyere ọsịsa nke-a nime “Ezin’ulo: Nkwuputa enyere Ụwa.” Unu n’echeta okwu nile ahụ, mana unu g’ahụ nkọwa ọhụrụ ma mata na Onye-nweanyị hụrụ ọhụụ maka mgbanwe ndịa. Nime nkwupụta ahụ, Ọ jiri okwu ndịa nye ndị-ụmụnne nwanyị iwu ka ha bụrụ ndị n’akụzi oziọma n’ime ezin’ụlọ: “Ọ bụ ọrụ ndị-nne izụlịte ụmụ ha.”2 Nke-a gbasakwara izulite eziokwu nke oziọma na mmata-ịhe.

Nkwupụta ahụ gara n’ihu kwuo: “Ọ bụ oke-n’ọrụ ndi nne na nna ị nyekọrịta onwe ha aka dịka mmadụ abụọ ha otu.”3 Ha bụ mmadụ ha otu, ha ha otu nime ito-eto nke mụọ, ma nime ị nwete mmata ịhe, nihi nke-a, ha ga-adị n’otu n’ịnyekọrịta onwe ha aka.. Ha ha otu nime ohere nsọ nke ha maka mbuli-elu nke ha abụọ. Eziokwu-eziokwu, enweghi ike ibuli nanị otu onye elu.

Gini meziri, otu nwa nke nwanyị nke Chineke, onye ya na di ya ha otu, jiri kete ọrụ nke nzulite, site n’iwere ngwa-ọzụzụ nke ahụ onye ọbụla kwesịrịrị ị nata, mmata-ihe nke eziokwu nke si n’igwe bịa? Dịka ọ kwere m ghọta, nke-a bụ ụzọ nke Onye-nweanyị kemgbe ekere ezin’ụlọ n’ime ụwa nke-a.

Ọ bụ Iv bụ onye natara mmata-ịhe, na Adam kwesịrị iri mkpụrụ-osisi nke osisi nke mmata ịhe ahụ, ka ha wee nwe ike dobe iwu nile nke Chineke ma rọpụta ezin’ụlọ. A maghịm ịhe kpatara o ji bịara Iv na mbụ, mana Adam na Iv nwere idi-n’otu mgbe awụkwasịrị mmata-ịhe nke-a n’elu Adam.

Ọmụmatu ọzọ n’egosi otu Onye-nweanyị si ejiri onyinye ọzụzụ nke ndị nwanyị nwere n’arụ orụ, bụ otu O si gbaa ụmụ ndị nwoke Hilama ume. Ọ na-agbakụrụ m n’okpo mgbe ọbụla m gụrụ akụkọ nke-a, ma cheta olu nke nnem dị juu, mgbe ọ na-akasị m obi dịka m na-ahapụ ulọ dka onye agha.

Hilaman dere:

“ Akụziworo ha site n’aka ndị nne ha nile, na ọbụrụ na ha enweghị obi-abụọ, Chineke ga-anapụta ha..

“ Ma ha kwugharịrị nye m okwu nile nke ndị nne ha nile, na-asị: Anyị enweghị obi-abụọ ndị nne anyị matara ya.”4

N’agbanyeghi na amaghịm ịhe nile kpatara Onye-nweanyị jiri nye ndị ụmụnne ndị nwanyị ọrụ nke ọzụzụ nime ezin’ụlọ, ekwere m na enwere otu osi metụta ike unu nwere ị nwe ịhụnanya. Ọ bụ nnukwu ịhụnanya g’eme ka mkpa onye ọzọ metụta unu n’obi karịa mkpa nke unu. Nke-a bụ ịhụnanya nke Kraịst nke n’enweghi ntụkpọ maka onye ahụ ị n’enye ọzụzụ. Mmetụta nke afọ-ọma nke-a n’abịa site n’aka onye ahụ aghọrọ ị bụ onye-ọzụzụ, nihi na o tozuwo irite mmetụta nke Aja Mgbaghara-mmehie nke Jizọs Kraịst. Motto nke ndị Otu Enyem-aka, nke nne m gosiri na ndụ ya, dịm ka ihe mụọ kpalitere: “ Afọ-ọma Enweghi Ọdịda.”

Dịka ndị ụmụ ndị nwanyị nke Chineke, unu nwere ike eji amata mkpa ndị ọzọ ma ike eji ahụ nanya. Nke-a, mere ka ọ dịrị unu mfe ị nata ntaka nile nke Mụọ. Mgbe ahụ Mụọ g’edu echiche unu, okwu onu unu, ma ịhe unu n’eme iji zulite ndị mmadụ ka Onye-nweanyi wee wụkwasị mmata-ịhe, eziokwu, na ume n’isi ha nile.

Ụmụnne ndị nwanyị n’anụ olu m, onye ọbụla nọ nime unu nọ n’ọnọdụ pụrụ-iche dịka unu n’eje njem ndụ nke gị. Ụfọdụ bụ ụmụ-agbọghọ nta ndị n’abịa ọgbakọ ụmụnwanyị zuru-ọha nke mbụ ha. Ụfọdụ bụ ụmụ-agbọghọ ndị n’akwado ịbụ ndị ọzụzụ nke Chineke g’achọ ka ha bụrụ. Ụfọdụ bụ ndị lụrụ di ọhụrụ ma ha amụbeghi ụmụ, ndị ọzọ bụ ndị nne nwere otu nwa m’ọbụ karịa. Ụfọdụ bụ ndị nne nwere ụmụ aka ntoro-ọbịa nta, ma ndị ọzọ bụ ndị nwere ụmụ nọ nime ubi mgbasa-oziọma. Ụfọdụ nwere ụmụ ndị okwukwe ha dara mba ma biri ebe dị anya. Ụfọdụ bi nanị ha, n’enweghi onye-nsọ kwụsịrị-ike n’okwukwe. Ụfọdụ bụ ndị nne-ukwu.

N’agbanyeghi ọnọdụ nke onwe gị, ị bụ—onye dị mkpa—onye ezin’ụlọ nke Chineke, na onye ezin’ụlọ nke gị, m’ọbụ n’ọbịanihu, nime ụwa nke-a, m’ọbụ n’ụwa nke mụọ. Ọrụ nke Chineke nyere gị bụ ijiri ịhụnanya na okwukwe nime Jisọs Kraịst zulite ọtụtụ ndị ezin’ụlọ Ya na ndị ezin’ụlọ nke gị dịka ike kwere gị.

Ibu dịrị gị bụ ị mata ọnye ị ga-enye ọzụzụ, otu isi eme ya, na oge ị g’eme ya. Ị ga-achọ enyem-aka nke Ọnye nweanyị. Ọ mara obi ndị ọzọ, ma Ọ makwara mgbe ha dị na njikere ị nabata ọzụzụ gị. Ekpere nke okwukwe gị g’abụ ọtụghe nke mmeri gị Ị nwere ike ị dabere na Ya maka idu gị.

Ọ nyere agbam ume nke-a: “Rịọ Nna n’aha m, n’okwukwe na-ekwere na unu ga-anata, ma unu ga-enwe Mụọ Nsọ, nke na-egosipụta ihe nile ndị kwesịrị.”5

Tinyekwara ịkpe-ekpere, ezigbote ọmụmụ akwụkwọ-nsọ ga-abụ otu nime ịhe ga-ewulite ume iji enye ọzụzụ. Nke-a bụ nkwa nke-ahụ: “Ọbụghị ma-ọbụ unu iche echiche tutu oge ahụ ihe unu ga-ekwu; mana kpakodo n’echiche unu nile mgbe nile okwu nile nke ndụ, ma a ga-enye unu ya n’awa ahụ akụkụ ahụ nke a ga-enyefe mmadụ nile.”6

Nihi nke-a, ị ga-etinyekwo oge n’ịkpe-ekpere, n’ịtule n’uche, ma chee oke echiche maka ịhe mụọ. A ga-awụkwasị gị mmata-ịhe nke eziokwu ma ume iji enye ndị ezin’ụlọ gị ọzụzụ g’eto-eto.

A ga-enwe oge ị g’eche na mgbalị gị ị matakwoo otu isi enye ọzụzụ nke ọma anaghị agasị ike. Okwukwe g’enyere gị aka ịnagide. O zitere gị agbam-ume nke-a:

“ Ya mere, ike agwụla unu n’obi n’ime ihe ọma, n’ihi na unu na-atọ ntọ-ala nke oke ọrụ. Ma site n’ihe nta nile ka oke ihe si apụta.

“Lee, Onye-nwe, chọrọ obi na echiche dị na njikere, ma ndị dị na njikere na ndị na-erube isi ga-eri ihe ọma nke ala nke Zaịọn n’ụbọchị ikpeazụ ndịa.”7

Otu a ịsi nọrọ ebe-a n’abalịa bụ ịhe ngosi na ị dị na njikere ị nabata ọkpụkpọ-oku nke Onye-nweanyi kpọrọ ị nye ọzụzụ. Nke-a kacha bụrụ eziokwu maka ndị ụmụaka nọ ebe-a nabalị a. Ị nwere ike ị mata onye ị nwere ike ị nye ọzụzụ nime ezin’ụlọ gị. Ọ bụrụ na ijiri obi-ọcha kpee ekpere, otu aha m’ọbụ otu ihu mmadụ g’abịa n’uche gị. Ọ bụrụ na ịkpe ekpere ka ị mata ịhe ị g’eme, m’ọbụ kwuo, ị ga-anata ọsịsa. Oge ọbụla ịrubere isi, ume iji enye ọzụzụ g’eto. A ga-akwado gị maka ụbọchị ahụ mgbe ị ga-enwe ike nye ụmụ nke gị ọzụzụ.

Ndị nne ụmụ-ntorobịa nwere ike kpee ekpere maka ị mata otu esi enye nwa ha nke nwoke m’ọbụ nwanyị ọzụzụ, onye nke n’achọghị ị nabata ọzụzụ. Ị nwere ike kpee ekpere ka ị mata onye ahụ nwere mmetụta nke mụọ nke nwa gị chọrọ ma nwee ike nabata. Chineke na-anụ ma n’aza ụdị ekpere a si n’obi nke ndị nne nile obi n’akpagbu, ma Ọ n’ezidata enyem-aka.

Ọzọ, otu nne-ukwu nọ ebe-a n’abalịa nwere ike n’enwe mkpagbu n’obi ya nihi nsogbu nke ụmụ ya na nke ụmụ-ụmụ ya. Ị nwere ike nwete ume na ezi-ndu site na ahụmịhe nile nke ezin’ụlọ nile dị nime akwụkwọ-nsọ.

Site n’oge Adam na Iv, site na Nna Isrel, ma ruo ezin’ụlọ nile nime Akwụkwọ nke Mọmọn, enwere otu nkuzi kwụ chịm: ị hụ nanya gị akwụsịkwala.

Anyị nwere ọmụmatụ nke ga-agba anyị ume nke Ọnye Nzọpụta gosiri dịka Ọ nyere ọzụzụ nye ndị ụmụ-mụọ nke Nna Bi N’igwe ndị nupuru-isi. N’agbanyeghi mgbe ha, makwa anyị, mere ya ịhe ụfụ, Onye Nzọpụta setịpụta-kwara aka ya.8 O kwuru nime 3 Nifaị maka ndị ụmụnne ya ndị nwoke na nwanyị nke mụọ, ndị ọ gbara mbọ n’efu ị nye ọzụzụ: “O unu ndị ... ndị bụ ndị agbụrụ nke Jekọb, e, ndị bụ nke ụlọ nke Israel, ugboro ole ka m kpọkọtaworo unu dịka nnekwu ọkụkọ si na-akpọkọta ụmụ ya n’okpuru nku ya nile, ma zụọ unu.”9

Maka ndị ụmụnne ndị nwanyị nọ nime ọnọdụ njem-ndụ ọbụla, nime ọnọdụ ezin’ụlọ ọbụla, ma gburugburu ọmenala ọbụla, Ọnye Nzọpụta bụ ezi ọmụmatụ nye gị maka otu ị g’esi rụọ ọrụ nime atụmatụ Ya ị mee ka-aghọta mkpa ọmụmụ oziọma dị nime ezin’ụlọ.

Ị g’etinye afọ-ọma chi nyere gị nime mgbanwe ị g’eme maka mmemme nile na agwa nile nke ezin’ụlọ gị. Nke-a ga-ewete nnukwu ito-eto nke mụọ. Mgbe gị na ndị ezi gi n’ekpekọrịta ekpere ma n’ekpekwara ha ekpere, ịhụnanya ị nwere maka ha, ma nke Onye Nzọpụta nwere maka ha g’emetụta gị n’obi. Nke-ahụ g’abụrụ gị onyinye-nsọ nke gị dịka ị n’achọ ya. Dika ị n’ekpe nnukwu ekpere nke okwukwe, ọ ga-emetụta ndị ezin’ụlọ gị n’obi.

Mgbe ezin’ụlọ gbakọrọ ị gụpụta akwụkwọ-nsọ ka ọ da-ụda, tupu oge a, ị diwo na mbụ gụọ ya ma kpe ekpere n’isi ha iji kwado onwe gị. Ị dịwo na mbụ chọpụta oge ị ga-achọ ịkpe ekpere maka Mụọ ị bawanye uche mmụta gị. Mgbe ahụ, mgbe ọ bụ ohere gị ị gụpụta, ndị ezin’ụlọ gị ga-amata n’obi ha ịhụnanya ị nwere maka Chineke ma maka okwu Ya. Ha ga-enwete ọzụzụ site n’aka Ya ma site na Mụọ Ya.

M’wụkwasị dị otu a ga-abịara ezị ọbụla agbakọrọ ọnụ m’ọbụrụ na ekpe ekpere maka ya ma hazie ya ahazie. A ga etinye ya mgbalị na oge, ma ọ g’ewete ọrụ-ebube. A nam echeta otu nkuzi nne m kuziri m mgbe m dị na nwata. Ruo taa, a na m ahụ n’uche m ọtụ map ọ sere nke gosipụtara njem nile nke Onye Ozi Pọl. A na m atule otu o si nwete oge na ike iji mee nke ahụ. Ma ruo taa, enweterem ngọzị site n’ịhụnanya ọ nwere maka Onye Ozi ahụ kwụsịrị ike n’okwukwe.

Unu n’otu n’otu ga-achọta ụzọ unu si etinye aka ka awụkwasa eziokwu n’elu ndị ezịn’ụlọ unu nime Nzụkọ nke Onye Nweanyị nke-a eweghachiri azụ. Ọnye ọbụla nime unu ga-ekpe ekpere, mụọ, ma tulee, ka ị mata aka ị g’enye. Mana nke-a ka m mara: ọnye ọbụla nime unu, dịka unu na ụmụnwoke nke Chineke jikọtara aka, g’abụ ọtu nime ọrụ-ebube nke ọmụmụ ma ibi ndụ nke oziọma, nke g’eme ka mkpọkọta Isrel dị ngwa-ngwa, ma nke ga-akwado ezin’ụlọ Chineke maka nlaghachi ebube nke Onye Nweanyị Jisọs Kraịst N’aha nke Jizọs Kraịst, amen.