2010–2019
For Him
October 2018


Maka Ya

Ịmata onye  na  mkpa ọ dị ịje ozi maka ọ dị nma ndị ọzọ n’enyere anyị aka ịghọta na ngosipụta ịhụnanya karịchasịrị bụ madu inye Chineke onwe ya kpam kpam.

N’abali a dị oke mkpa, a na m ekwuputa ịhụnanya na obi ekele nye onye ọbụla n’ime unu, ụmụnnem ndị nwanyị. Ọ bụ ezị a n’anyi dị afọ dị iche iche, site kwa n’ebe na ọnọdu dị iche iche, ma anyị ezukọla n’abali a dịka otu ndị, n’ike n’akwa ebum n’obi, na nkwesike sitere na Mụọ Nsọ n’anyị bụ ndị Nna nke Igwe; Onye-nzọpụta anyị bụ Jisọs Kraịst; na onye amụma anyị dị ndụ, Onye Isi Nduzi Russell M. Nelson hụrụ anyi n’anya ma n’edu anyị.

Mgbe anyị lụrụ ọhụrụ, bịshọp anyị kpọrọ mụ na dị m ka anyị wee n’eleta otu ezi na ụlọ nke kwụsịrị ịbia nzukọ ọtụtu afọ. Anyị ji obị anyị nile n’abata ọrụ nke a nke mekwara na anyị gara n’ebe obibi ha ileta ha n’ime mkpụrụ ụbọchị ole n’atufughị oge. Anyi matara ngwa-ngwa mgbe anyị mere nke a na ha achọghị ndị nleta sitere n’ụlọ ụka.

Ya mere na mgbe anyị gara ịleta ha ọzọ, anyi nyere ha onyinye nke ihe ọtịta dị iche iche juputara n’ime ya, kwenyesie ike na ihe ndịa ga eme ka obi ha dịrị nro. Ma ha anabataghịkwa anyị. Di-na-Nwanyị ahụ sitere n’onyonyo ụzọ ha gwa anyị okwu nke mere ka o do anyi anya n’anabataghị anyi n’ụlọ ha. Ma mgbe anyị n’ala, echiche anyị gwara anyị na ha gara anabata anyi ma ọbụrụ na anyi nyere ha onyinye ihe erimeri di oke ọnụ ahịa karia ihe ọtita nke anyị jiri gaa.

Enweghị nhụta nke ime mụọ anyị mere ka ọtụtu mgbalị anyị ndị n’enweghị isi bụrụ mgbakasị ahụ nye anyị. O nweghị onye ọjụjụ n’adi ya nma. Mgbe oge n’aga, anyi jụrụ onwe anyi sị, “Olee mkpaọrụ a dị? Gịnị bụ ebum n’obi anyi?

Elda Carl B. Cook kwuru sị: “Ije ozi n’ime Nzukọ a…n’enwe nramahụ mgbe anyi nwetara ọkpụkpọ oku ime ihe n’atụ anyi egwu, ma ọ bụ mgbe ije ozi gwụrụ anyi ike, ma ọ bụ mgbe anyi nwetara ọkpụkpọ oku ịrụ ọrụ nke anyi n’enweghị nmasi na ya na mbụ.”1Anyi hụtara eziokwu di na okwu nke elda Cook mere anyi kpebiri ichọ ntuzi aka site n’aka Onye nwere nghọta karịri nke anyị.

Ya mere, site n’ọtụtụ ekpere na ntuleuche, anyị matara mkpa ọrụ ije ozi anyi dị. Nghọta anyi gbanwere, obi anyi tụgharịkwara nke bụ uche anyị nwetara n’onwe anyi site na mkpuhe nke Mụo Nsọ.2Dịka anyi chọrọ ntuziaka n’ime akwụkwọ nsọ, Onyenwe kuziere anyi out esi arụ ọrụ ije ozi ka ọdịri mfe ma nwe ebum n’obi. Nke a bụ amokwu nke anyi gụrụ kpatara ngbanwe nke ma obi na nzọmukwu anyi: “Unu ga-ahụ Onye-nwe Chineke unu n’anya jiri obi unu nile, jiri ike gị nile, uche, na ume; ma n’aha nke Jisus Kraịst Ị ga na-ejere ya ozi.”3 N’agbanyeghị n’anyi mara amokwu a na mbu, anyi hụtara ya n’oge a n’ụdị ọhụrụ dị oke mkpa.

Anyi chọpụtara n’anyi gbalisiri ike ijere ezi-na-ụlọ a ozi, ma jekwara bịshọp ozi, ma ajụjụ anyi jụrụ onwe anyị bụ ma anyi n’eje ozi a n’ịhụnanya maka Onye-nwe. Eze Benjamịn kọwara ọdị iche nke a mgbe o kwuru, “Lee, a sị m unu na n’ihi na asịrị m unu na ebiwo m ụbọchị m nile n’ijere unu ozi, a chọghị m itu ọnụ, n’ihi na a nọwo m nanị n’ije ozi nke Chineke.”4

Ọ bụ onye n’ezie ka Eze Benjamịn nọ n’ejere ozi? Nna nke Igwe na Onye Nzọpụta anyị. Ịmata onye na mkpa ọ dịije ozi maka ọ dị nma ndị ọzọ n’enyere anyi aka ịghọta na ngosipụta ịhụnanya karịchasịrị bụ madu inye Chineke onwe ya kpam kpam.

Dịka nlekwasị anya anyi gbanwere ka ekpere anyi si kwa gbanwe. Anyi nwewara ọnụnụ-ọkụ dị ukuu ị na-aga n’eleta ezi na ụlọ a n’ihi ihụnanya anyi nwere n’ebe Onye-nwe nọ.5 Ọ bụ Ya ka anyi n’emere ya. O mere ka nramahụ anyi n’enweburu ghara ịbụzikwa nramahụ nye anyi. Mgbe ọtụtụ ọnwa gachara nke ezi na ụlọ ahụ n’anaghị emepere anyi ụzọ, ha bidoro kpọbatawa anyi n’ime ụlọ ha. Dika oge gaworo anyi malitere kpekoritawa ekpere ma n’atule uche n’oziọma. Anyi biara ghọọ ndi ezi-enyi. Anyi n’efe ma n’ahụ Ya n’anya site n’ịhụ ụmụ Ya n’anya.

Ị nwere ike itule uche azụ rue n’oge Ị ji ịhụnanya jere madụ nọ na mkpa ozi ọ dịrị ka ọdịghị onye hụtara mgbalị gị, o nweghị onye kelere gị ekele kama ọ dịrị zịe ka a ga asị na ozị gị bụ nke a n’abataghị. Mgbe nke ahụ mere, Ị jụrụ onwe gị sị gịnị bụ uru ije ozị a? Ọ bụrụ na ịmere nke a, ka okwu nke Eze Benjamịn wezuga ekwenyeghị na iwe gị: “Unu nọ nanị n’ije ozi nke Chineke unu.”6

Karịa n’anyị ga ewe iwe , anyi nwere ike ime, site n’ije ozi, ka nmekorita nke anyi na Nna nke Igwe zuo oke karia. Ịnwe ịhụnanya ma nyefe Chineke onwe kpam kpam ga eme ka anyi n’aga n’iru ije ozi nkesa ihụnanya Ya ma ọ dị onye n’ahụta anyị ma ọ dịghị.

Mgbe ụfọdi anyị nwere ike n’eje ozi na mbụ n’ihi na ọ bụ oke na ọrụ diri anyi, ma ọbụnadị ije ozi ahụ nwere ike dube anyị ilekwasi anya na ihe dị elu karịa, nke ga eme ka anyi n’eje zi ya bụ ozi “n’ụzọ nke kachasị nma”7-dika Onye Isi Nduzi Nelson si n’akpọ anyị “n’ogo kachasi ọhụrụ ma dikwa nsọ karia iji n’eleta ma n’azụ mkpuru obi ndị ọzọ.”8

Mgbe anyi n’elekwasị anya na ihe nile Chineke meworo anyi, ije ozi anyi n’esite n’obi juputara n’ekele. Mgbe mkpa anyi kwụsịrị ịbụ otu esi ahụta anyi ma anyi n’eje ozi, anyi ga ahụta na ihe nlere anya anyị n’ije ozi ga bụ itinye Chineke n’ihu anyi mgbe nile. 9

Onye Isi Nduzi M. Russell Ballard kuziri, “Ọ bụ nanị mgbe anyi ji obi na uche anyi nile hụ Chineke na Kraịst n’anya ka anyi ga enweli ike ikesa ịhụnanya Ya nye ndị agbatobi anyị site n’ije ozi nakwa igosi obi ebere.”10

Mbu n’ime Iwu Iri gosipụtara amamihe a dị nsọ: “Mụ onwem bụ Onye-nwe Chineke gị. … Gị enwela Chi ọzọ tinyerem.”11 Ọ bụrụ n’anyi lee otu e si tinye iwu a dika nke mbu, ọ ga enyere anyi aka ịghọta na ọbụrụ n’anyi ewere Chineke dịka onye kachasi mkpa na ndụ anyi, ihe nile ọzọ ga anọzi na ndụ anyi-ọbụnadị ije ozi maka ọdịnma ndị ọzọ. Mgbe anyi nyere Chineke ọnọdị kachasi elu n’ime ndụ anyi site na nhọrọ nke onwe anyi, mgbe ahụ ka Ọ ga enwe ike gọzie ihe nile anyi n’eme maka ọ dị nma anyị na ọ din ma ndị ọzọ.

Onye-nwe dụrụ anyị ọdụ sị, “Lekwasị m anya n’echiche gị nile.”12 Ya mere anyi n’eji agba ndụ izu ụka nile ime nke a-iji wee “n’echeta Ya mgbe nile.”13 Anyi o nwere ike iji nlekwasi anya na Chineke nke a n’eme ihe nile na ndụ anyi? Ọbụnadị mgbe anyi n’arụ ọrụ ndị kachasị mfe, anyi o nwere ike iji ya gosipụta ịhụnanya anyi na inyefe Chineke onwe anyi kpam kpam. Ekwenyere m na onwere omume.

Anyi nwere ike ime ka ndepụta ihe omume nile anyi bụrụ ụzọ isi nye Chineke otito. Anyi onwere ike ịhụta ihe omume ọbụla dika ohere ọma iji jere Ya ozi, ma anyị ọ n’arụ ọrụ nwere oge, ma ọ bụ igbanwe akwa nwata?

Dịka Ammon kwuru,E, a matara m na m bụ ihe efu; ọbụrụ ma ike m adịghị m ike; ya mere agaghị  m etu ọnụ site n’onwe m, kama a ga m etu ọnụ site na Chineke m, n’ihi na site n’ike ya enwere m ike ime ihe nile.”14

Mgbe ijere Chineke ozi ghọrọ ihe kachasị mkpa na ndụ anyi, anyị n’atọhapụ onwe anyi, ma mgbe di n’ihu, ọ ga adịrị anyi na nma.15

Onye Nzọpụta kuziri nke a n’ụzọ di ezi nfe: “Ya mere ka ihè unu si otu a n’enwu n’iru ndị a, ka ha wee hụ ọrụ ọma nile unu ma nye Nna unu nke bi n’elu-igwe otuto.”16

Ka m gụpụtara unu okwu amamihe edepụtara na mgbidi otu ụlọ nlekọta ụmụaka nne na nna ha nwụrụ anwụ nọ na alcutta, India: “ Ị bụrụ onye obi ebere, ndị madụ nwere ike ibo gị na ị bụ onwe n’achọ nke onwe nwere ebum n’obi dị agha, Ga n’iru n’egosipụta obi ebere gị n’agbanyeghị ebubo a. Ihe ọma iji ọtụtụ afọ rụpụta ka madu nwere ike iji otu ụbọchị mebịsịe. Ga n’iru n’arụ ihe ọma. Ọrụ ọma ịrụrụ taa ka ndị madụ ga echefu echi. Ga n’iru na arụ ọrụ ọma. Ọbụrụ na ịnye ụwa ihe kachasị nma Ị nwere, onweghị ike izuru ha. Ga n’iru nye ụwa ihe kachasị nma Ị nwere. Ka m gwa zie gi, mgbe emesiworo ihe nile, ọ dịrị nani gị na Chineke gị.”17

Ụmụnne m ndị inyom, ọ dịrị nanị anyi na Onye-nwe mgbe nile. Dika Onye Isi Nduzi James E. Faust kwuru:  ‘“Gịnị kachasị dịrị mkpa n’ime ụwa nile?’ … ‘Ọ bụ n’ọbughị ka onye ọbụla nwe nmekọrita nke onwe ya na Onye Nzọpụta nke ga adigide ụbọchị nile?’ Ịnwe nmekọrịta dị otu a nwere ikike ịtọhapụ ọdịdị nsọ nọ n’ime anyị, n’ezie onweghị ihe ga adịlị ukwu na ndụ anyị karia mgbe anyi matara ma ghọta nmekọrịta dị nsọ nke anyị na Chineke nwere.”18

N’oyiyi nke a ka Alma kọwara nwa ya nwoke, “E, ka ime ihe gị nile bụrụ imere Onye-nwe, ma ebe ọbụla ị na-aga ka ọ bụrụ n’ime Onye-nwe; e, ka echiche gị nile bụrụ ndị eduziri nye Onye-nwe; e, ka a tụkwasị ihụ n’anya nile nke obi gị n’Onye-nwe ruo mgbe nile.”19

Ma Onye Isi Nduzi Russell M. Nelson akụziekwarala anyi n’otu aka ahụ, “Mgbe anyị ghọtara Aja-Mgbapụta nke O jiri onwe Ya nye, ncheta onyinye onwe anyi n’ije ozi ga abụ nke obi juputara n’ekele maka ohere oma anyi nwere ijere Ya ozi ga ekpuchi.”20

Ụmụnne m ndi inyom, a na m agbara unu ama na mgbe Jisus Kraịst, site n’ikike nke Aja-Mgbapụta Ya, rụrụ ọrụ n’onweanyi ma n’ime anyi, Ọ n’ebido rụwa ọrọ site naanyi ịgọzị ndi ọzọ. Anyi n’ejere ndị a ozi, ma anyi n’eme nke a site n’ịhu Ya n’anya na ijere Ya ozi. Anyi ga-abụzị ihe akwụkwọ nsọ kọwara: “Onye ọbụla n’elebe anya banyere ọ dị nma nke agbataobi ya, ma n’eme ihe nile ka otuto nile diri nanị Chineke.”21

N’eleghị anya, bịshọp anyi mara na nke a bụ ihe nmụta nke mụ na dị m ga amụta site na ngbali nile n’ezughị oke nke ụbọchị ndị ahụ gawori ileta ụmụ nke Chineke hụrụ n’anya nke ukwu akpọrọ anyị oku ileta n’oge ahụ. A na m agba ama nke onwe doro m anya banyere idi nma na ịhụnanya Ya nke ọ n’egosi anya mgbe anyi n’agbalisike ije ozi n’ihi Ya. N’aha Jisus Kraịst di nso, amen.