2010–2019
The Joy of Unselfish Service
October 2018


Ọńụ nke Ije-ozi N’achọghị ọdịmma onwe onye

Anyị ekwewo nkwa nye Nna anyị Bi N’igwe na anyị ga ejere Ya na ndi ọzọ ozi jiri ịhụnanya ma mee uche Ya n’ihe niile.

Mgbe ọgbakọ zuruọha ikpeazu gasịrị, ọtụtụ ndi mmadụ bịakwutere m jiri otu ụdị ajụjụ: “Oche ndi ahụ ọ bara nke ọma?” Aziza m bụụrụ otu ihe oge ọbụla: “Oche ndi ahụ bara nke ọma ma ọbụrụ na I ghara ikwu okwu.” Ọ bụ eziokwu, ọ kwaya? Oche m ababeghị nke ọma n’ọgbakọ nke a, mana ejupụtara m n’ekele n’ezie maka ngozi na nkwanye ugwu ahụ nke ikwuru unu okwu nabali nke a.

Oge ụfọdụ ka anyị n’eje-ozi, anyị n’enwe oghere ịnọdụ ọdụ n’oche dị iche iche. Ụfọdụ dị nnọọ mma ma ụfọdụ ndi ọzọ adịghị mma, mana anyị ekwewo Nna anyị Bi N’igwe nkwa na anyị ga-ejere Ya na ndi ọzọ ozi jiri ịhụnanya ma mee uche Ya n’ime ihe niile.

Afọ ole na ole gara aga, ndi ntoroọbịa n’ime Nzukọ nsọ mụrụ na “mgbe unu ‘na-esonye n’ije-ozi nke Chineke’ [Ozizi na Ọgbụgba-ndụ 4:2], unu na-esonye njem kacha ibe ya dị ukwuu. I na-enyere Chineke aka ime ka ọrụ Ya mee ọsọ ọsọ, na ọ bụ nhumihe dị ịtụnanya, jupụta n’ọńụ ma dịrị ukwuu.”1 Ọ bụ njem dịrị onye ọbụla—afọ ole ọbụla—ma ọ bụkwa njem nke n’etinye anyị n’ụzọ ihe onye amụma anyị hụrụ n’anya kwuworo maka ya dịka ụzọ nke ọgbụgba-ndụ.”2

Na mwute, otu-o-sila dị, anyị bi n’ime ụwa na-achọ ọdịmma onwe onye n’ebe ndi mmadụ na-ajụkarị ajụjụ, “Kedụ ihe nọ n’ime ya maka m?” kama ịjụ, “Onye ka m nwere ike inyere aka taa?” ma ọbụ “Olee otu m ga-esi ejere Onye-nwe-anyị ozi n’ime okpukpọ-oku m karịa?” ma ọbụ “A na m enye Onye-nwe-anyị ihe m niile?”

Foto, oyiyi
Nwanne nwanyị na Nwanne nwoke Antonietti
Foto, oyiyi
Victoria Antonietti

Nnukwu ọmụmatụ n’ime ndụ m nke ije-ozi n’achọghị ọdịmma onwe onye bụ Nwanne nwanyị Victoria Antonietti. Victoria bụụrụ otu n’ime ndi nkuzi Praịmarị n’ime ngalaba nta m mgbe m naara etolite n’obodo Agentina. Ehihie tusdee ọbụla, mgbe anyị gbakọtara maka Praịmarị, ọ na-ewetere anyị keki chọkọlet. Keki ahụ masịrị onye niile, n’ezie onye niile ewezuga m. Keki chọkọlet amasịghị ma ọlị! Ma na-agbanyeghị ọ ga-agbalị ikenyere m keki ahụ, oge niile anaghị m anara.

Otu ụbọchi mgbe o kesịrị keki chọkọlet ahụ n’etiti ụmụntakịrị ndi fọdụrụ, ajụrụ m ya, “Gịnị mere I naghị ewete nke n’atọ iche—dịka oroma ma ọbụ vanilla?”

Mgbe ọ chịtụrụ obere ọchị, ọ jụrụ m, “Gịnị mere I gaghị eritụ nwa obere? Keki nkea ka eji ngwa nri pụrụ iche mee, ma a na m ekwe gị nkwa na obụrụ na I rịtụ ya, ọ ga-amasị gị!”

E legharịrị m anya, ma n’ịtụnanya m, onye niile naara enwe ańụrị neri keki ahụ. E kwere inwa ya. I nwere ike iche ihe mere? Ọ masịrị m! Mgbe ahụ bụrụ oge mbụ keki chọkọlet masịrị m.

O ruru ọtụtụ afọ gasịrị ka m chọpụtara ihe ngwa nri ahụ pụrụ iche bụ n’ime keki chọkọlet Nwanne nwanyị Antonietti. Mụ na ụmụ m na-aga nleta n’ebe obibi nne m izuka ọbụla. N’otu n’ime nleta ndi ahụ, Mụ na Nne nọọrọ enwe obi ụtọ n’eri otu ibé keki chọkọlet, ma akọọrọ m ya otu m si bịa nwee mmasị na keki ahụ n’isi mbụ. Mgbe ahụ o kọwaziri m ihe niile fọdụrụ n’akụkọ ahụ.

“I hụrụ, Cris,” nne m asị, “Victoria na ezinaụlọ ya enweghị ọtụtụ ihe, ma izuka ọbụla ọ ga-ahọrọ ịkwụ ụgwọ ụgbọ-ala bọsụ ga eburu ya na ụmụntakịrị ya anọ gaa Praịmarị ma ọbụ ịzụ ngwa nrị ndi ahụ o ji eme keki chọkọlet ahụ maka klas Praịmarị ya. Ọ na-ahọrọkarị mgbe niile keki chọkọlet kama ụgwọ ụgbọ-ala bọsụ ahụ, ma ya na ụmụntakịrị ya na-aga ije ihe karịrị milụ abụọ [3 km], n’ụzọ nke ọbụla, n’agbanyeghị ihu igwe.”

Ụbọchị ahụ enwetere m ekele dị mma maka keki chọkọlet ya ahụ. Kacha mkpa, amụtara m na ngwa nrị ahụ pụrụ iche n’ime keki Victoria bụụrụ ịhụnanya o nwere maka ndi ahụ o jerela-ozi na mbụ na ịchụ-aja ya n’achọghị ọdịmma onwe onye n’isi anyị.

Ichegharị azụ maka keki Victoria n’enyere m aka icheta ichụ-aja n’achọghị ọdịmma onwe onye n’ime nkuzi ebighi-ebi akuziri site n’aka Onye-nwe-anyị nye ndi-na-eso-ụzọ Ya ka Ọ gara n’ụlọ ntụnye nke tempụl. Unu matara akụkọ ahụ. Okenye James E. Talmage kuziri n’enwere igbe 13, ma n’ime ihe ndia ndi mmadụ ahụ tụnyere ụtụ ha niile maka ebumnobi [dị iche iche] niile nke egosipụtara site [na] ihe akanyere n’elu igbe ndia ahụ.” Jizọs nọ n’ele ndi niile n’atụ ụtụ, nke gụkọtara ụdị mmadụ niile dị iche iche. Ụfọdụ nyere onyinye ha jiri “ebumnobi ziri ezi” n’ebe ndi ọzọ na-atụnye “nnukwu nchịkọta ọla-ọcha na ọla-edo,” na-achọ ka ahụta ha, mata ha, ma too ha maka ụtụ ha niile.

“N’etiti ọtụtụ ndi ahụ bụụrụ nwanyị isi mkpe dara ogbenye, onye … tụnyere n’ime otu n’ime igbe ntụnye ahụ obere mkpụrụ ego ọla kọpa abụọ amaara dịka ájá; ụtụ ya pụtara ihe n’erughị ọkara ego cent n’ime mba Amerịka. Onye-nwe-anyị kpọkuru ndi-na-eso-ụzọ Ya n’akụkụ Ya, tụgharịa uche ha n’ebe nwanyị isi mkpe ahụ ogbenye kụrụ na ihe o mere, ma kwuo: ‘N’ezie a si M unu, Na nwanyị isi mkpe a dara ogbenye atụnyewo n’ime karịa ndi niile ndi tụnyeworo n’ime igbe ntunye: N’ihi na ha niile sitere na uju ha tụnye; mana o sitere na ụkọ ya tụnye ihe niile o nwere, ọbụna ihe niile o ji biri’[Mak 12:43–44].”3

Foto, oyiyi
The widow’s mites

Nwanyị isi mkpe ahụ abụghị na o nwere ọnọdụ ama ama nke o nọ n’ime obodo ahụ n’oge ndụ ya. N’ezie o jiiri ihe dị mkpa karịa: ebumnobi ya dịịrị ọcha, ma o nyere ihe niile o nwere I nye. Elemanya o nyere ihe pere mpe karịa ndi ọzọ, nke dị nwayọ karịa ndi ọzọ, dị iche karịa ndi ọzọ. N’anya ụfọdụ, ihe o nyere enweghị ihe ejiri ya kpọrọ, mana n’anya nke Onye-Nzọpụta, “onye nghọta uche niile na ebumnobi niile nke obi,”4 o nyere ihe ya niile.

Ụmụnne ndi nwanyị, anyị ọ n’enye Onye-nwe-anyị ihe anyị niile n’eleghị anya n’azụ? Anyị ọ na-achụ aja nke oge na akaraka anyị ka ọgbọ niile n’ebilte nwere ike mụta ịhụ Onye-nwe-anyị n’anya ma debe iwu-nsọ Ya niile? Anyị ọ n’eje-ozi nlekọta ma na ndi nọ anyị n’akụkụ na ndi ọzọ ekenyere anyị jiri nlekọta na ịgba mbọ—n’eji oge anyị na ume nke enwere ike iji mee ihe n’ụzọ ndi ọzọ n’achụ-aja? Anyị ọ na-ebi iwu-nsọ abụọ dị ukwuu—ịhụ Chineke n’anya na ịhụ ụmụ Ya n’anya? ?5 Ọtụtụ mgbe ịhụnanya ahụ na-apụta dịka ije-ozi.

Onye-isi-nduzi Dallin H. Oaks kuziri: “Onye-Nzọpụta nyere Onwe Ya n’ime ije-ozi n’achọghị ọdịmma onwe onye. Ọ kuziri na onye ọbụla n’ime anyị kwesiri isoro Ya site n’ịgọnarị onwe anyị ọchichọ niile n’achọ ọdịmma onwe onye iji nwe ike jere ndi ọzọ ozi.”

Ọ gara nihu:

“Otu ọmụmatụ amaara ama nke ịhapụ onwe anyị n’ime ijere ndi ọzọ ozi … bụ ịchụ-aja nke ndi nne na nna na-eme maka ụmụ ha. Ndi nne na-ata ahụhụ ụfụ na mfulahụ mkpa na nlezi anya nke onwe iji mụọ ma zụọ nwa ọbụla. Ndi nna n’agbanwe ndụ ha na mkpa ha iji kwado ezinaụlọ. …

“… Anyị nakwa ańụrị ọńụ n’ime ndi ahụ n’elekọta ndi otu ezinaụlọ nwere nkwarụ na ndi nne na nna kara nka. Enweghị ije-ozi nkea nke na-ajụ, gịnị nọ n’ime ya maka m? Ha niile na-achọ ka edebe n’akụkụ ndirimfe nke onwe maka ije-ozi n’achọghị ọdịmma onwe onye. …

“[Ma] ihe ndia niile n’egosipụta ụkpụrụ ebigh-ebi ahụ na anyị nwere ańụrị karịa ma jupụta karịa mgbe anyị mere ma jee-ozi maka ihe anyị nyere, n’abụghị maka ihe anyị ga-enwete.

“Onye-Nzọpụta anyị na-akuziri anyị isoro Ya site n’ịchụ-aja ndi ahụ niile dị mkpa ihapụ onwe anyị n’ime ijere ndi ọzọ ozi n’achọghị ọdịmma onwe onye.”6

Onye-isi-nduzi Thomas S. Monson n’otu aka ahụ kuziri na “eleghị-anya mgbe anyị ga-ezute ihu na ihu anyị na Onye-kere anyị, agaghị ajụ anyị, ‘Ọkwa ole ka inọrọ?’ mana kama, ‘Mmadụ ole ka I nyeere aka?’ N’eziokwu, I nweghị ike ịhụ Onye-nwe-anyị n’anya ma ọbụghị mgbe ijerela Ya ozi site n’ijere ndi Ya ozi.”7

N’ụzọ ọzọ, ụmụnne nwanyị, ọ gaghị apụta ihe ọbụla ma anyị nọrọ ọdụ n’oche mara mma ma ọbụ ma anyị dọlia ịnọ ka nzụkọ mesịa n’oche n’adịghị mma n’azụ oche. Ọ gaghị apụta ihe ọbụla ma ọlị ma anyị, ebe ọ dị mkpa, pụrụ ileta nwa-ọhụrụ n’ebe-akwa. Ihe dị mkpa bụ na anyị jiri ọchichọ ije-ozi bịa, na anyị hụtara ndi anyị n’ejere-ozi nlekọta ma kelee ha n’obi ańụrị, na na anyị kọwara onwe anyị nye ndi anyị na ha nọdụrụ n’akụkụ—na-eme nkea n’enyi ma ọbụladị na ekenye ghị anyị ije-ozi nlekọta maka ha. Ma ọ ga-apụtarịrị ihe na anyị ga-eme ihe niile anyị na-eme jiri ngwa nrị ahụ pụrụ iche nke ije-ozi tinyekọrịta ịhụnanya na ịchụ-aja.

Abịawo m mata na anyị agaghị abịa ime keki chọkọlet iji bụrụ onye nkuzi Prịamarị mere nke ọma ma ọbụ nke nyere onye ya , n’ihi na ọbụghị maka keki ahụ. Ọ bụ ịhụnanya nọ n’azụ omume ahụ.

A na m agba-ama na ịhụnanya ahụ ka edoro nsọ site n’ịchụ-aja—ịchụ-aja ahụ nke onye nkuzi ma ọbụna karịa site na ịchụ-aja kacha elu ma dịrị ebigh ebi nke Ọkpara nke Chineke. A na m ekwupụta aka ebe m na Ọ dị ndụ! A hụrụ m Ya n’anya ma nwe ọchịchọ iwezuga ọchịchọ niile n’achọ ọdịmma onwe onye iji nwe ike nwe ịhụnanya ma jee-ozi nlekọta dịka O na-eme. N’aha nke Jizọs Kraịst, amen.