Akwụkwọ nsọ
2 Niphaị 29


Isi 29

Ọtụtụ ndị Jentaịlụ ga ajụ Akwụkwọ nke Mọmọn ahụ—Ha ga-asị, Anyị achọkwaghị Bible ọzọ—Onye-nwe na-agwa ọtụtụ mba okwu—Ọ ga-ekpe ụwa ikpe site n’akwụkwọ nile ndị a a ga-edepụta. Ihe dịka n’afọ 559 ruo 545 tutu amụọ Kraịst.

1 Mana lee, ha ga-adị ọtụtụ—n’ụbọchị ahụ mgbe m ga-aga n’iru ịrụ aọrụ dị ịtụ n’anya n’etiti ha, ka m wee cheta bọgbụgba-ndụ m nile nke m meworo mụ na ụmụ nke mmadụ, ka m wee setịpụkwa aka m ọzọ nke cugbọrọ abụọ inweghachi ndị m ọzọ, ndị bụ ndị nke ụlọ nke Israel;

2 Na kwa, ka m wee cheta nkwa nile m kweworo nye gị, Nifaị, na kwa nye nna gị, na a ga m echeta mkpụrụ-afọ unu; na kwa ka aokwu nile nke mkpụrụ-afọ unu wee site n’ọnụ m ruo mkpụrụ-afọ unu; ma okwu m nile bga-agapụ ruo nsọtụ nile nke ụwa, dịka cihe-nlere-anya nke ndị m, ndị bụ ndị nke ụlọ nke Israel;

3 Ma n’ihi na okwu m ga-agapụ—ọtụtụ ndị Jentaịlụ ga-asị: Otu aBible! Otu Bible! Anyị enwetawo Otu Bible, ma enweghị ike inwe Bible ọbụla ọzọ.

4 Ma otu a ka Onye-nwe Chineke kwuru: O ndị nzuzu, ha ga-enwe otu Bible; ma ọ ga-esi n’aka andị Juu pụta, ndị ọgbụgba-ndụ m mgbe ochie. Ma olee otu ha si kelee bndị Juu maka cBible nke ha natara site n’aka ha? E, gịnị ka ndị Jentaịlụ na-egosị? Ha na-echeta ụfụ nile, na ọrụ ike nile, na ihe mgbu nile nke ndị Juu, na mgbalị ha nye m, n’iweta nzọpụta nye ndị Jentaịlụ?

5 O unu ndị Jentaịlụ, unu echetawo ndị Juu, ndị ọgbụgba-ndụ m mgbe ochie? Ee; ma unu abụwo ha ọnụ, ma akpọwo ha asị, ma a chọbeghị inweghachi ha. Mana lee, a ga m eweghachi ihe ndị a nile n’isi nke onwe unu; n’ihi na mụ bụ Onye-nwe echefubeghi ndị m.

6 Unu ndị-nzuzu, nke ga-asị: Otu aBible, anyị enwetawo otu Bible, ma anyị achọkwaghị Bible ọzọ. Unu enwetawo Bible ma ọbụghị site n’aka ndị Juu?

7 Unu amataghị na e nwere ọtụtụ mba karịa otu? Unu amataghị na mụ, Onye-nwe Chineke unu, akere mmadụ nile, na kwa na m na-echeta ndị nile bi bn’elu ala nile nke mmiri osimiri gbara gburu-gburu; na kwa na m na-achị n’elu-igwe nile dị n’elu na n’ala dị n’okpuru; ma a na m ewepụta okwu m nye ụmụ nke mmadụ, e, ọbụna n’elu mba nile nke ụwa?

8 Gịnị mere unu na-atamu, n’ihi na unu ga-anatawanye okwu m? Unu amataghị na ịgba-ama nke amba abụọ gbara bụ baka-ebe nye unu na m bụ Chineke, na m na-echeta otu mba dịka nke ọzọ? Ya mere, a na m ekwu otu ụdị okwu nye otu mba dịka nke ọzọ. Na mgbe cmba abụọ ahụ ga-agbakọta ọsọ, ịgba-ama nke mba abụọ ahụ ga-agbakọta otu aka ahụ.

9 Na a na m eme nke a ka m wee gosipụta nye ọtụtụ na a bụ m aotu ihe ụnyahụ, taa, na ruo mgbe nile; ma na a na m ekwupụta okwu m nile dịka o siri masị m. Ma n’ihi na ekwuwo m otu bokwu, unu ekwesịghị iche na m enweghị ike ikwukwa ọzọ; n’ihi na ọrụ m agwụbeghị; ọbụghị ma ọ ga-agwụ ruo ọgwụgwụ nke mmadụ, ọbụghị site n’oge ahụ gawa na ruo mgbe nile.

10 Ya mere, n’ihi na unu nwere otu Bible, unu ekwesịghị iwere ya dịka na o nwetazuru aokwu m nile; ọbụghị ma o kwesịrị unu iwere ya na mụ emeghị ka ede pụtawaye ndị ọzọ.

11 N’ihi na a na m enye ammadụ nile iwu, ma n’ọwụwa-anyanwụ ma n’ọdịda-anyanwụ, ma n’elu-elu, ma na ndịda-ndịda, ma n’ime ala nile mmiri gbara gburu-gburu nke oke-osimiri, na ha bga-edepụta okwu nile nke m kwuru nye ha; n’ihi na site n’ime cakwụkwọ nile a ga-edepụta, a ga m dekpe ụwa ikpe, mmadụ ọbụla dịka ọrụ ha nile siri dị, dịka ihe ahụ nke e dere ede.

12 N’ihi na lee, a ga m ekwu okwu nye andị Juu ma ha bga-edepụta ya; na a ga m ekwukwa okwu nye ndị Nifaị ma ha ga-edepụta ya; ma a ga m ekwukwa okwu nye agbụrụ ndị ọzọ nile nke ụlọ nke Israel, ndị m dupuworo, ma ha ga-edepụta ya; ma a ga m ekwukwa okwu nye cmba nile nke ụwa ma ha ga-edepụta ya.

13 Ma ọ ga-eru na andị Juu ga-enweta okwu nile nke ndị Nifaị, na ndị Nifaị ga-enweta okwu nile nke ndị Juu; na ndị Nifaị na ndị Juu ga-enweta okwu nile nke bagbụrụ Israel nile furu-efu; na agbụrụ Israel nile furu-efu ga-enweta okwu nile nke ndị Nifaị na ndị Juu.

14 Ma ọ ga-eru na ndị m, ndị bụ ndị nke aụlọ nke Israel, ka a ga-achịkọta rute ụlọ, ruo n’ala nile nke onwunwe ha, ma okwu m nile kwa ka a ga-achịkọta bn’otu. Ma a ga m egosị ha bụ ndị na-alụ ọgụ megide okwu m na megide ndị m, ndị bụ ndị nke cụlọ nke Israel, na a bụ m Chineke, na kwa na emere m dọgbụgba-ndụ mụ na Abraham na a ga m echeta emkpụrụ-afọ ya fruo mgbe nile.