Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Juda


Juda

N’ime Testament Ochie, nwa-nwoke nke anọ nke Jekọb na Lia (Jen. 29:35; 37:26–27; 43:3, 8; 44:16; 49:8). Jekọb gọziri Juda na ọ ga-abụ onye na-achị-achị n’etiti ụmụ ndịkom nke Jekọb ma na Shailo (Jisus Kraịst) ga-abụ onye si n’agbụrụ ya (Jen. 49:10).

Agbụrụ nke Juda

Agbụrụ nke Juda weere ọnọdụ kacha ipụta ìhè mgbe a nọdụsịrị na Kenean. Onye ya na ya na-azọ isi bụụrụ agbụrụ nke Ifrem. Moses gọziri agbụrụ nke Juda (Deut. 33:7). Mgbe ọchịchị Solomọn gasịrị, agbụrụ nke Juda ghọrọ ala-eze nke Juda.

Ala-eze nke Juda

N’ọchịchị nke Rehoboam, ọtụtụ ebe ọchịchị nke Solomon kewasịrị ụzọ ala-eze abụọ, nke ka nke n’ihi ikwo-ekworo n’etiti agbụrụ Ifrem na Juda. Ala-eze nke ndịda ma-ọbụ ala-eze nke Juda, gunyere agbụrụ nke Juda na nke ka n’ime agbụrụ nke Benjamịn. Jerusalem bụụrụ isi obodo ya. Ọ kachasị n’ụzọ nile inwe ntụkwasị-obi na ofufe nke Jehova karịa ka ala-eze nke elu-elu mere. Juda eghechagị oghe nyere mbuso agha site na mpaghara elu-elu na ọwụwa-anyanwụ, na ike nke kachasị nọgidere n’aka ezi na-ụlọ Devid rụo na ndọkpụ n’agha nke ndị Babịlọn. Ala-eze nke Juda gbalịrị ịnogide ruo afọ 135 mgbe ọdịda nke ka n’ọnụ ọgụgụ na kwa na-ịdị ike bụ ala-eze nke Israel gasịrị.

Osisi nke Juda

Nke a na-atụnye Bible dịka akụkọ ndekọta nke ụlọ nke Juda (Ezik. 37:15–19). N’ụbọchị ndị ikpe-azụ, mgbe ngalaba nile dị iche iche nke ụlọ nke Israel a ga-ekpokọta ha, a ga-ekpokọta kwa akụkọ ndekọta ha nile dị nsọ ọnụ. Ndekọta akwụkwọ nsọ nile ndị a na-emesịrịta onwe ha ike ma na-emejupụta ịgba-ama e jikọrọ ọnụ na Jisus bụ Kraịst ahụ, Chineke nke Israel na Chineke nke ụwa nile (2 Nif. 3; 29; NAJS, Jen. 50:24–36).