Akwụkwọ nsọ
Alma 13


Isi 13

A na-akpọ ndị mmadụ dịka ndị isi nchụ-aja n’ihi okwukwe ha karịrị akarị na ọrụ ọma nile—Ha ga-akụzi iwu-nsọ nile ahụ—Site n’ezi-omume a na-asacha ha ma baa n’ime izu-ike nke Onye-nwe—Melkizedek bụụrụ otu n’ime ndị a—Ndị mụọ-ozi na-ekwupụta ozi ọma nile nʼakụkụ nile nke ala ahụ—Ha ga-ekpughe ezigbo ọbịbịa nke Kraịst. Ihe dịka n’afọ 82 tutu amụọ Kraịst.

1 Ma ọzọ, ụmụnne m nwoke, a ga m ewelite uche unu nile lekwasị oge mgbe Onye-nwe Chineke nyere ụmụ ya iwu-nsọ ndị a nile; ma ọ dị m ka asị na unu ga-echeta na Onye-nwe Chineke achiri ndị nchụ-aja nile echichi, dịka usoro ya dị nsọ siri dị, nke bụụrụ n’ụdị usoro nke Ọkpara ya, ịkuziri ndị mmadụ ihe ndị a nile.

2 Ma ndị nchụ-aja ahụ nile ka e chiri echichi an’usoro nke Ọkpara ya, bn’ụzọ nke a ga-eme ka ndị ahụ nwe ike mata otu ha ga-esi lekwasị Ọkpara ya anya maka mgbapụta.

3 Ma nke a bụ otu e siri chie ha echichi—ebe a akpọrọ ma bkwado ha site na cntọ-ala nke ụwa dịka debụzọ mata nke Chineke, site n’okwukwe ha karịrị akarị na ọrụ ọma ha nile; na nke mbụ ịhapụ ka ha ehọrọ mma ma-ọbụ njọ; ya mere ebe ha họrọworo mma, ma na-enwe nnukwu fokwukwe karịrị akarị, a gkpọrọ ha n’ọkpụkpọ dị nsọ, e, n’ọkpụkpọ ahụ dị nsọ nke e jiri kwado, na dịka, nkwadobe mgbapụta maka ụdị ndị ahụ.

4 Ma otu a akpọwo ha an’ọkpụkpọ nke a dị nsọ site n’okwukwe ha, mgbe ndị ọzọ ga-ajụ Mụọ nke Chineke site isi-ike nke obi ha nile na ikpu-isi nke echiche ha nile, mgbe, ọbụrụ na ọbụghị maka nke a ha gaara enwe ụdị nnukwu bohere nke ụmụnne ha nwoke nwere.

5 Ma-ọbụ na nke-nke, na mbụ ha aguzoro n’otu ebe ha na ụmụnne ha nwoke; otu a ọkpụkpọ nsọ nke a akwadoro site na ntọ-ala nke ụwa maka ndị nile na-aghara imesi obi ha nile ike, na-adị n’ime na site na aja mgbaghara mmehie nke Ọkpara a mụrụ Nanị Ya, onye akwadoro akwado—

6 Ma otu a ebe a kpọrọ ha site n’ọkpụkpọ nsọ a, ma chie ha echichi banye n’ọkwa nchụ-aja ahụ nke usoro-nsọ nke Chineke, ikuzi iwu-nsọ ya nile nye ụmụ nke mmadụ, ka ha kwa wee baa n’ime aizu-ike ya—

7 Ọkwa nchụ-aja a ebe ọ dị n’ụdị usoro nke Ọkpara ya, bụ usoro nke sitere na ntọ-ala nke ụwa; ma-ọbụ n’okwu ọzọ, ebe ọ dị an’enweghị mmalite nke ụbọchị nile ma-ọbụ ngwụcha nke afọ nile, ebe akwadoro ya site ebighi-ebi ruo mgbe ebighi-ebi nile, dịka bebụzọ mata ya nke ihe nile siri dị—

8 Ugbua e achịrị ha echichi n’ụdị a—ebe a kpọrọ ha site n’ọkpụkpọ dị nsọ, ma chie ha echichi jiri emume-nso, ma na-ewekwasị onwe ha ọkwa nchụ-aja ahụ nke usoro dị nsọ, ọkpụkpọ nke, na emume-nso, na ọkwa nchụ-aja, dị n’enweghị mmalite ma-ọbụ ọgwụgwụ—

9 Otu a ha ghọrọ andị isi nchụ-aja ruo mgbe nile, dịka usoro nke Ọkpara ahụ, Onye Nna Mụrụ Nanị Ya siri dị, onye nọ n’enweghị mmalite nke ụbọchị nile ma-ọbụ ngwụcha nke afọ nile, onye jupụtara na bamara, ahata-aha, na ezi-okwu. Ma otu a ka ọ dị. Amen.

10 Ugbua, dịka m kwuru gbasara usoro ahụ dị nsọ, ma-ọbụ aọkwa nchụ-aja nke a dị elu, e nwere ọtụtụ ndị e chịrị echichi ma ha ghọọ ndị isi nchụ-aja nke Chineke; ma o sitere n’inwe okwukwe ha karịrị akarị na bnchegharị, na ezi-omume ha n’iru Chineke, ha, ebe ha họọrọ ichegharị ma rụọ ọrụ ezi-omume karịa ịla n’iyi.

11 Ya mere a kpọrọ ha dịka n’usoro a dị nsọ, ma e adoro ha nsọ, ma buwe ha nile ka a sapụrụ ọcha site n’ọbara nke Nwa-atụrụ ahụ.

12 Ugbua ha, mgbe e adoworo ha nsọ site na bMụọ Nsọ ahụ, ebe e meworo uwe ha ka ha dị ọcha, ebe ha dịworo cọcha na enweghị ntụpọ n’iru Chineke, enweghị ike ilekwasị dmmehie anya ma ọ bụghị ma-ọbụ en’ịkpọ nnukwu asị; ma ha dị ọtụtụ, nnukwu ọtụtụ karịrị akarị, ndị e mere ka ha ghara inwe ntụpọ ma baa n’ime izu-ike nke Onye-nwe Chineke ha.

13 Ma ugbua, ụmụnne m nwoke, ọ dị m ka asị na unu ga-adị umeala n’iru Chineke, ma mịta amkpụrụ na-egosị nchegharị, ka unu wee baa kwa n’ime izu-ike ahụ.

14 E, dị nụ umeala ọbụna dịka ndị ahụ n’ụbọchị nile nke aMelkizedek, onye bụ kwa onye isi nchụ-aja dịka otu usoro nke a nke m kwuworo, onye wekwasịrị onwe ya ọkwa nchụ-aja ahụ ruo mgbe nile.

15 Ma-ọbụ otu Melkizedek ahụ onye aAbraham kwunyere botu-ụzọ-n’ụzọ-iri ya nile; e, ọbụna nna anyị Abraham kwụrụ ụtụ otu-ọzọ-n’ụzọ iri nke ihe nile o nwere.

16 Ugbua aemume-nso ndị a nile ka e nyere n’ụdị dị otu a, na site otu a ndị ahụ ga-enwe ike ilepụ anya legide Ọkpara nke Chineke ahụ, ebe ọ bụ bụdị dịka usoro ya, ma-ọbụ ebe ọ bụ usoro ya, ma nke a ka ha wee lepụ anya legide ya maka nsachapụ nke mmehie ha nile, ka ha wee baa n’ime izu-ike nke Onye-nwe ahụ.

17 Ugbua Melkizedek a bụ eze n’ala nke Salem; ma ndị ya agbasịwo ike n’ajọọ-omume na ihe arụ; e, ha nile akpafuwo, ha jupụtara n’ụdị ajọọ-omume nile dị iche iche;

18 Mana Melkizedek ebe o gosịworo nnukwu okwukwe, ma nata ọkwa nke ọkwa nchụ-aja dịka ausoro dị nsọ nke Chineke, kwusara nchegharị nye ndị ya. Ma lee, ha chegharịrị; ma Melkizedek hiwere udo n’ala ahụ n’ụbọchị ya nile; ya mere a kpọrọ ya ọkpara-eze nke udo, n’ihi na ọ bụụrụ eze nke Salem; ma ọ chịrị n’okpuru nna ya.

19 Ugbua, e nwere aọtụtụ tutu o rute ya, na kwa e nwere ọtụtụ mgbe ọ chịchara, mana bọdịghị ndị ka ukwuu; ya mere, maka nanị ya ka ha kpọworo aha karịsịa.

20 Ugbua ọ dịghịrị m mkpa ikwugharị maka nke ahụ; ihe m kwuworo nwere ike izu. Lee, aakwụkwọ-nsọ nile dị n’iru unu; ọbụrụ na unu bga-emegharị ha ọ ga-abụ na mbibi nke onwe unu.

21 Ma ugbua o wee ruo na mgbe Alma gwaworo ha okwu nile ndị a, o setịpụụrụ ha aka ya ma tie na nnukwu olu, na-asị: Ugbua bụ oge anchegharị ahụ, n’ihi na ụbọchị nke nzọpụta na-abịa nso;

22 E, ma olu nke Onye-nwe, site an’ọnụ nke ndị mụọ-ozi, na-ekwupụtara ya mba nile; e, na-ekwupụta ya, ka ha wee nwe ozi ọma nke oke ọn̄ụ; e, ma ọ na-ekwupụta ozi ọma ndị a nile n’etiti ndị ya nile, e, ọbụna nye ha bụ ndị gbasasịrị na mba ọzọ n’elu iru nke ụwa; ya mere ha abịakwutewo anyị.

23 Ma a na-eme ka anyị mata ha an’asụsụ nile dị mfe nghọta, ka anyị wee ghọta, ka anyị wee ghara imehie; ma nke a n’ihi anyị bụ bndị-ije n’ala anyị na-amaghị; ya mere, anyị nwetara iru ọma dị elu, n’ihi na anyị nwere ozi ọma ndị a e kwupụtara nye anyị n’akụkụ nile nke ubi-vine anyị.

24 N’ihi na lee, andị mụọ-ozi na-ekwupụta ya nye ọtụtụ n’oge a n’ala anyị; ma nke a bụ maka ebum-n’obi nke ịkwado obi nile nke ụmụ nke mmadụ ịnabata okwu ya n’oge nke ọbịbịa ya n’otuto ya.

25 Ma ugbua anyị na-eche nanị ịnụ akụkọ an̄ụrị nile ahụ e kwupụtara nye anyị site n’ọnụ nke ndị mụọ-ozi, maka ọbịbịa ya; n’ihi na oge ahụ n’abịa, anyị aamataghị otu ọsọ-ọsọ ya ga-adị. Ọ dị m ka n’aha Chineke na ọ ga-abụ n’ụbọchị m; mana ka ọ bụrụ na nso-nso ma-ọbụ ma emesịa, n’ime ya a ga m an̄ụrị ọn̄ụ.

26 Ma a ga-eme ka andị ezi-omume na ndị dị nsọ mata ya, site n’ọnụ ndị mụọ-ozi, n’oge nke ọbịbịa ya, ka e wee mezuo okwu nile nke ndị nna anyị ha, dịka ihe ahụ nke ha kwuworo gbasara ya siri dị, nke bụ dịka mụọ nke ibu-amụma siri dị nke dị n’ime ha.

27 Ma ugbua, ụmụnne m nwoke, ọ ana-agụ m site n’ebe kachasị ime nke obi m, e, jiri nnukwu nchekasị arụ ọbụna ruo na mgbu, na unu ga-an̄a ntị n’okwu m nile, ma wezuga mmehie unu nile, ma ghara igbu oge ụbọchị nke nchegharị unu;

28 Mana unu ga-adị umeala n’onwe unu n’iru Onye-nwe, ma kpọkuo aha nsọ ya, ma achee nche ma kpee ekpere esepụghị aka, ka a ghara bịnwa unu ọnwụnwa karịa ka unu ga-ebụli, ma si otu a Mụọ Nsọ a na-edu unu, na-aghọọ ndị n’eweda onwe ha ala, dị cnwayọ, na-erube isi, nwe ndidi, jupụta n’ịhụnanya na ogologo ntachi-obi;

29 aNa-enwe okwukwe n’ime Onye-nwe; na-enwe olile-anya na unu ga-enweta ndụ ebighi-ebi; na-enwe bịhụnanya nke Chineke ahụ oge nile n’obi unu nile, ka e wee bulite unu elu n’ụbọchị ikpeazụ ma baa n’ime cizu-ike ya.

30 Ma ka Onye-nwe nye unu nchegharị, ka unu ghara iwedata oke iwe ya nye unu, ka a ghara ikeda unu site n’ụdọ-igwe ya nile ruo aala mụọ, ka unu ghara ịta ahụhụ bọnwụ nke ugboro abụọ.

31 Ma Alma gwara ndị ahụ ọtụtụ okwu ndị ọzọ, ndị a na-edeghị n’ime akwụkwọ a.