Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Àkàrá


Àkàrá

I ji ihe dịka ihe yiri ma-ọbụ onyinyo nke ihe ọzọ. Àkàrá n’ime akwụkwọ-nsọ nile na-eji ihe metụtara ihe ma-ọbụ ọnọdụ iji nọchite anya otu ụkpụrụ ma-ọbụ nkụzi nke ozi-ọma. Maka ịma-atụ, Onye-amụma nke Akwụkwọ nke Mọmọn, Alma jiiri otu mkpụrụ osisi ka ọ nọchite anya okwu nke Chineke (Alma 32).

Ndị amụma gazuo akwụkwọ-nsọ nile jiri àkàrá na-akụzi maka Jisus Kraịst. Ụfọdụ àkàrá ndị a gụnyere mmemme nile na emume-nsọ nile (Moses 6:63), ịchụ-aja nile (Ndị-Hib. 9:11–15; Moses 5:7–8), Oriri-nsọ ahụ (Luk 22:13–20; NAJS, Mak 14:20–24), na baptism (Ndị-Rom 6:1–6; OznỌd. 128:12–13). Ọtụtụ aha nke Bible bụ ụdị àkàrá. Mmemme ụlọ-ofufe Testament Ochie na iwu nke Moses nọchitere anya ezi-okwu nile ebighi-ebi (Ndị-Hib. 8–10; Mosa. 13:29–32; Alma 25:15; Hil. 8:14–15). Maka ịma-atụ ndị ọzọ nile, hụ Mat. 5:13–16; Jọn 3:14–15; Jekọb 4:5; Alma 37:38–45.