Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Onye-isi nchụ-aja


Onye-isi nchụ-aja

Otu ọkwa dị n’ime ọkwa nchụ-aja. Akwụkwọ-nsọ nile na-ekwu banyere “onye isi nchụ-aja n’echiche abụọ: (1) otu ọkwa-ọrụ n’ime Ọkwa nchụ-aja nke Melkizedek; na (2) n’okpuru iwu Moses, ọkwa onye-ọrụ nduzi nke Ọkwa nchụ-aja nke Erọn.

Uche nke mbụ metụtara Jisus Kraịst dịka nnukwu Onye Isi Nchụ-aja ahụ. Adam na ndị isi ezi na ụlọ nile bụkwaara ndị-isi nchụ-aja. Taa ndị isi nduzi ndị-isi nchụ-aja atọ mejupụtara otu ndị-isi nduzi nke Nzukọ-nsọ na na-anọ n’isi ndị nile ọzọ ji ọkwa nchụ-aja na ndị otu Nzukọ-nsọ nile. Ndị nwoke ọzọ tozuru oke ka a na-echi echichi ndị-isi nchụ-aja, dịka ọ dị mkpa gazuo Nzukọ-nsọ taa. E nwere ike ịkpọ ndị isi nchụ-aja, dopụ ha iche na chie ha echichi dịka ndị ụkọchukwu na-elekọta ngalaba Nzukọ-nsọ (OznỌd. 68:19; 107:69–71).

N’uche nke abụọ, n’okpuru iwu Moses, onye ji ọkwa onye-ọrụ isi oche nke Ọkwa Nchụ-aja nke Erọn ka a kpọrọ onye isi nchụ-aja. Ọkwa ahụ ka nwa na-eketa site na nna ya ma ọ na-abịa site na nwa ebu-ụzọ mụọ n’etiti ezi na ụlọ nke Erọn. Erọn n’onwe ya bụụrụ onye-isi nchụ-aja nke mbụ n’usoro nke Erọn (Ọpụ. 28; 29; Lev. 8; OznỌd. 84:18).