Akwụkwọ nsọ
Mọmọn 9


Isi 9

Moronaị wee kpọkuo ndị nke na-ekweghị na Kraịst ka ha chegharịa—O wee kwupụta Chineke nke ọrụ-ebube nile, onye-na-enye mkpughe nile ma na-awụpụtakwasị ndị okwukwe onyinye nile na ihe iriba-ama nile—Ọrụ-ebube nile na-akwụsị n’ihi ekweghị-ekwe—ihe iriba-ama na-eso ndị nke kwere ekwe—A na-agba ndị mmadụ ume inwe amamihe na idebe iwu-nsọ nile ahụ. Ihe dịka afọ 401 ruo 421 mgbe a mụsịrị Kraịst.

1 Ma ugbua, ana m ekwu kwa gbasara ndị ahụ na-ekweghị na Kraịst.

2 Lee, unu ga-ekwere nʼụbọchị nke nleta unu—lee, mgbe Onye-nwe ga-abịa, e, ọbụna nnukwu ụbọchị ahụ mgbe a ga-afụkọta ụwa ọnụ dịka akwụkwọ afụkọtara afụkọta, ma ihe nile dị nʼime ya ga-agbaze site nʼoke ọkụ na-eresike, e, na nnukwu ụbọchị ahụ mgbe a ga-akpọta unu iguzo nʼiru Nwa-atụrụ nke Chineke—mgbe ahụ unu ga-asị na ọdịghị Chineke dị?

3 Mgbe ahụ unu ga-aga nʼiru na-agọnarị Kraịst ahụ, ma-ọbụ unu nwere ike ile Nwa-atụrụ nke Chineke ahụ? Unu nwere ike ibinyere ya na mmata nke ikpe-ọmụma nke mụọ unu nke ọma? Unu chere na unu ga-enwe an̄ụrị ibinyere Onye nsọ ahụ, mgbe a tara mkpụrụ-obi unu ahụhụ na mmata nke ikpe-ọmụma nke mụọ na unu nọgidere nʼijehie iwu ya nile?

4 Lee, asị m unu na unu ga-anọ nʼọnọdụ nhuju-anya karịa nʼibinyere Chineke ahụ dị nsọ na onye ziri-ezi, nʼọmụma nke iru-inyi unu nʼiru ya, karịa ka unu ga anọ ibinyere mkpụrụ-obi nile ndị a mara ikpe nʼala-mụọ.

5 N’ihi na lee, mgbe a ga-akpọta unu ịhụ ịgba-ọtọ unu nʼiru Chineke, na kwa ebube nke Chineke, na ịdị nsọ nke Jisus Kraịst, ọ ga amụnye-kwasị unu ire ọkụ na anaghị-ekwe-mmenyụ.

6 O mgbe ahụ unu ndị na-anaghị ekwe ekwe, tụgharịkwute nụ Onye-nwe; kpọkuo Nna nnukwu mkpọku nʼaha nke Jisus, na mgbe ụfọdụ a ga-enweta unu nʼenweghị ntụpọ, ịdị-ọcha, ịma mma, na ọcha, ebe a sachaworo unu site nʼọbara nke Nwa-atụrụ ahụ, na nnukwu na ụbọchị ikpe-azụ ahụ.

7 Ma ọzọ ana m agwa unu ndị na-agọnarị mkpughe nile nke Chineke, ma sị na-ewezugawo ha, na enweghị mkpughe ọbụla dị, ma-ọbụ amụma nile, ma-ọbụ onyinye nile, ma-ọbụ ọgwụgwọ, ma-ọbụ ịkwu nʼasụsụ nile, na ịsụgharị asụsụ nile;

8 Lee asị m unu, onye nke na-agọnarị ihe ndị a amaghị ozi-ọma nke Kraịst; e, ọ gụbeghị akwụkwọ-nsọ nile; ọbụrụ otu ahụ, ọ ghọtaghị ha.

9 Ma ọ bụ na anyị anaghị agụ na Chineke bụ otu ihe ahụ ụnyahụ, taa, na ruo mgbe nile, ma nʼime ya ọ dịghị mgbanwe dị ọbụghị ma enwere onyinyo nke ịgbanwe agbanwe?

10 Ma ugbua, ọbụrụ na unu echeliteworo onwe unu otu chi onye na-agbanwe agbanwe, na nʼime onye nke e nwere onyinyo nke ịgbanwe agbanwe, mgbe ahụ ka unu cheliteworo onwe unu otu chi onye na abụghị Chineke nke ọrụ-ebube nile.

11 Mana lee, aga m egosị unu otu Chineke nke ọrụ-ebube nile, ọbụna Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aịsak, na Chineke nke Jekọb; ma ọ bụ otu Chineke ahụ onye kere elu-igwe nile na ụwa, na ihe nile nke dị nʼime ha.

12 Lee, o kere Adam, ma site na Adam ka ọdịda nke mmadụ siri bịa. Ma n’ihi ọ dịda nke mmadụ ahụ ka Jisus Kraịst jiri bịa, ọbụna Nna na Ọkpara; ma n’ihi Jisus Kraịst ka mgbapụta nke mmadụ siri bịa.

13 Ma n’ihi mgbapụta nke mmadụ, nke sitere na Jisus Kraịst bịa, a na akpọghachị ha nʼebe Onye-nwe nọ; e, nke a bụ ụzọ nke esị nʼagbapụta mmadụ nile, n’ihi na ọnwụ nke Kraịst na-eme ka mbilite-nʼọnwụ mezuo, nke na-eweta na mmezu mgbapụta site nʼụra agwụgh-agwụ, site nʼụra nke a ga-akpọte mmadụ nile site nʼike nke Chineke mgbe opi ga ada; ma ha ga-apụta, ma ndị nta ma ndị ukwu, ma ha nile ga eguzoro nʼiru oche-ikpe ya, ebe a gbapụtara ha ma tọpụ ha site nʼagbụ ebighi-ebi nke ọnwụ a, ọnwụ nke bụ ọnwụ nke arụ.

14 Ma mgbe ahụ ka ikpe nke Onye Nsọ ahụ ga-abịakwasị ha; ma mgbe ahụ ka oge ahụ ga-abịa mgbe onye nke ruru inyị ga-anọgide nʼiru inyi; ma onye nke bụ onye ezi-omume ga-anọgide kwa nʼezi-omume; onye nke nwere an̄ụrị ga-anọgide kwa nʼan̄ụrị; ma onye nke na-enweghị an̄ụrị ga-anọgide kwa na-enweghị an̄ụrị.

15 Ma ugbua, O unu nile ndị cheliteworo nye onwe unu otu chi onye na enweghị ike ime ọrụ-ebube nile, aga m ajụ unu, ihe nile ndị a ha a gafewo, nke m kwuworo maka ha? Nsọtụ ahụ ọ bịawo? Lee asị m unu, E-e; ma Chineke akwusịbeghị ịbụ Chineke nke ọrụ-ebube nile.

16 Lee, ihe nile nke Chineke meworo ha atụghị unu nʼanya? E, onye nwere ike ịghọta ọrụ ịtụ nʼanya nile nke Chineke?

17 Onye ga-asị na ọ bụghị ọrụ-ebube na site nʼokwu ya elu-igwe na ụwa ga-adị; na site nʼike nke okwu ya e kere mmadụ site nʼuzuzu nke aja; na site nʼike nke okwu ya ka e meworo ọrụ-ebube nile?

18 Ma onye ga-asị na Jisus Kraịst emeghị ọtụtụ nnukwu ọrụ-ebube nile? Ma e nwere ọtụtụ nnukwu ọrụ-ebube nile e jiri aka nile nke ndị-ozi mee.

19 Ma ọbụrụ na e nwere ọrụ-ebube nile e mere mgbe ahụ, gịnị mere Chineke jiri kwusị ịbụ Chineke nke ọrụ-ebube nile ma na-abụ kwa Onye na anaghị agbanwe agbanwe? Ma lee, asị m unu ọ naghị agbanwe agbanwe; ọbụrụ otu ahụ ọ ga-akwụsị ịbụ Chineke; mana ọ kwusịghị ịbụ Chineke, ma-ọbụ Chineke nke ọrụ-ebube nile.

20 Ma ihe mere o jiri kwusị ime ọrụ-ebube nile nʼetiti ụmụ nke mmadụ bụ n’ihi na ha na-ala-azụ n’ihi ekweghị-ekwe, ma pụọ site nʼezigbo ụzọ, ma ha amaghị Chineke nʼime onye nke ha ga-atụkwasị obi.

21 Lee, asị m unu na onye ọbụla nke kwere na Kraịst, na-enweghị obi abụọ nʼihe ọbụla, ihe ọbụla ọ ga-arịọ Nna nʼaha nke Kraịst a ga-enye ya ihe ahụ; ma nkwa nke a dịrị mmadụ nile, ọbụna ruo na nsọtụ nile nke ụwa.

22 N’ihi na lee, otu a ka Jisus Kraịst, Ọkpara nke Chineke gwara ndị na-eso-ụzọ ya ndị ga-anọdụ, e, na kwa gwa ndị na-eso-ụzọ ya nile, na ọnụnụ nke igwe-mmadụ ahụ: Gaa nụ nʼime ụwa nile, ma kwusaa ozi-ọma ahụ nye ihe ọbụla e kere eke;

23 Ma onye nke kwere ma e mee ya baptism a ga-azọpụta ya, mana onye nke na-ekweghị a ga-ama ya ikpe.

24 Ma ihe iriba-ama ndị a ga-eso ndị nke kwere ekwe—nʼaha m ka ha ga-achụpụ mụọ-ọjọọ nile; ha ga-eji ire ọhụrụ kwuo okwu; ha ga-ewelite agwọ nile; ma ọbụrụ na ha n̄ụọ ihe ọbụla na egbu-mmadụ ọ gaghị emerụ ha arụ; ha ga-ebịkwasị ndị ọrịa aka ma ha ga-enweta arụ-ike ọzọ;

25 Ma onye ọbụla nke ga-ekwere nʼaha m, na enweghị obi abụọ nʼihe ọbụla, ya ka m ga-akwadoro okwu m nile, ọbụna nye nsọtụ nile nke ụwa.

26 Ma ugbua, lee, onye nwere ike iguzo imegide ọrụ nile nke Onye-nwe? Onye nwere ike ịgọnarị ihe nile o kwuru? Onye ga-ebilite imegide ike kacha ike nile nke Onye-nwe? Onye ga-elelị ọrụ nile nke Onye-nwe? Onye ga-elelị ụmụ nke Kraịst? Lee, unu nile ndị na-elelị ọrụ nile nke Onye-nwe, n’ihi na unu ga-echegide echiche ma laa nʼiyi.

27 O mgbe ahụ elelịkwala, ma echekwala echiche kama n̄aa-ntị nʼokwu nile nke Onye-nwe, ma rịọ Nna nʼaha nke Jisus maka ihe ọbụla nke unu ga-achọ. Enwela obi-abụọ, kama na-ekwere, ma malite dịka nʼoge mgbe ochie nile, ma bịakwute Onye-nwe jiri obi unu nile, ma rụpụta nzọpụta nke unu jiri egwu na ịma jijiji nʼiru ya.

28 Mara ihe nʼụbọchị nile nke mnwale unu, wezuga onwe unu na adịghị ọcha nile; arịọla, ka unu wee mefuo ya nʼọchịchọ-nke-anụ-arụ unu nile, kama jiri nụ ịgbasi ike nke akwaa-akwụrụ rịọ, ka unu ghara ịdanye nʼọnwụnwa, kama na unu ga-efe Chineke nke ezi-okwu dị ndụ.

29 Hụ na emeghị unu baptism nʼezughị-oke; hụ na unu eketaghị-oke nʼoriri-nsọ nke Kraịst nʼezughị-oke; kama hụ na unu mere ihe nile nʼitozu-oke, ma mee ya nʼaha nke Jisus Kraịst, Ọkpara nke Chineke dị ndụ; ma ọbụrụ na unu mee nke a, ma anọgide ruo ọgwụgwụ, agaghị achụpụ unu ma ọlị.

30 Lee, ana m agwa unu okwu dịka m na ekwu site na ndị nwụrụ-anwụ; n’ihi na a matara m na unu ga-anata okwu m nile.

31 Amala m ikpe n’ihi ezughị-oke m, ma-ọbụ nna m, n’ihi ezughị-oke ya, ma-ọbụ ndị nke deworo tutu ya edee; kama nye Chineke ekele na o mewo ka ezughị-oke anyị nile pụta ìhè nye unu, ka unu wee mụta ịma ihe karịa ka anyị maworo.

32 Ma ugbua, lee, anyị edewo akụkọ-ndekọta nke a dịka anyị siri mụta, na mkpụrụ-akwụkwọ nile nke a na-akpọ nʼetiti anyị, aka-akwụkwọ-ndị-Ijipt e dezigharịrị edezịgharị, ebe e nyedatara ya ma gbanwe ya site nʼaka anyị, dịka ụdị ikwu okwu anyị siri dị.

33 Ma ọbụrụ na epekele anyị nile buwororịị ibu dịka o siri kwesi anyị gaara ede nʼasụsụ ndị Hibru, mana nke ndị Hibru ahụ anyị agbanwewo kwa ha; ma ọbụrụ na anyị nwererịị ike dee nʼasụsụ ndị Hibru, lee, unu agaraghị enwe ezughị-oke nʼakụkọ-ndekọta anyị.

34 Mana Onye-nwe matara ihe ndị nke anyị deworo, ma kwa na ọdịghị ndị ọzọ matara asụsụ anyị; ma n’ihi na ọdịghị ndị ọzọ matara asụsụ anyị, ya mere ọ kwadowo ụzọ maka nsụgharị ya.

35 Ma ihe ndị a e dere ha ka anyị wee wezuga uwe-mwụda anyị nile nʼọbara nke ụmụnne anyị ndị laworo-azụ n’ihi ekweghị ekwe.

36 Ma lee, ihe ndị a nke anyị chọworo gbasara ụmụnne anyị, e, ọbụna ịkpọghachị ha na mmata nke Kraịst, bụ dịka ekpere nile nke ndị nsọ nile ndị biworo nʼala ahụ siri dị.

37 Ma ka Onye-nwe Jisus Kraịst mee ka e wee zaa ekpere ha nile dịka okwukwe ha siri dị; ma ka Chineke Nna cheta ọgbụgba-ndụ ahụ nke o meworo ya na ụlọ nke Israel; ma ka o wee gọzie ha ruo mgbe nile, site nʼokwukwe nʼaha nke Jisus Kraịst. Amen.