Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
NAJS, Matiu 16


NAJS, Matiu 16:25–26 (tụlee ihe di iche na Matiu 16:24)

(Mpụtara nkeji okwu ahụ “ibulite obe nke Jisus” bụ ịgọnarị ndụ na-eyighị Chineke.)

25 Mgbe ahụ Jisus sịrị ndị na-eso uzo ya, ọbụrụ na onye ọbụla achọọ ka o so m n’azụ, ya jụ onwe ya, bulite kwa obe ya na-esokwa m.

26 Na ugbụ a maka mmadụ ibulite obe ya, bụ ịgọnarị onwe ya ndụ na-eyighị chi níle, na agụụ ime ihe ọjọọ dum nke ụwa, debe kwa iwu-nsọ m nile.