Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
NAJS, Matiu 21


NAJS, Matiu 21:33 (tụlee ihe dị iche na Matiu 21:32–33)

(Mmadụ garịrị echegharị tutu ya enwee ike ikwere na Kraịst.)

33 N’ihi na onye ahụ nke na-ekwereghị Jọn gbasara m, enweghị ike ikwere m, ewezuga ma o buru ụzọ chegharịa.

NAJS, Matiu 21:47–56 (tụlee ihe di iche na Matiu 21:45–46)

(Jisus kwupụtara na ya bụ isi nkume njikọ. Ozi-ọma ahụ ka e nyere ndị Juu na mgbe ahụ nye ndị Jentaịlụ. Ndị ajọọ mmadụ ka a ga-ebibi mgbe Jisus lọghachiri.)

47 Na mgbe ndị isi nchụ-aja na ndị Farisi nụworo akụkọ ilu ya nile, ha wee mara na ọ na-ekwu okwu banyere ha.

48 Na ha sịrị n’etiti onwe ha, Nwoke a ọ ga-eche na nanị ya ga-enwe ike mebie nnukwu ala-eze nke a? Ha wee wesi kwa ya iwe.

49 Kama mgbe ha na-achọ ijide ya, ha tụrụ egwu ìgwè ndị mmadụ ahụ, n’ihi na ha matara na ìgwè ndị mmadụ ahụ weere ya dịka onye-amụma.

50 Na ugbua ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya, Jisus wee sị kwa ha, Unu na-enwe ịtụ n’anya n’okwu nile nke akụkọ ilu nke m kwuwooro ha?

51 N’ezie, asị m unu, abụ m nkume ahụ, ma ndị ajọọ mmadụ ndị ahụ ajụwo m.

52 Abụ m isi nke njikọ ahụ. Ndị Juu ndị a ga-adakwasị n’elu m, a ga-etiwasị kwa ha.

53 Na a ga-anapụ ha ala-eze nke Chineke, ga-enye kwa ya n’aka mba nke na-ewepụta mkpụrụ nile site na ya, (nke pụtara ndị Jentaịlụ).

54 Ya mere, n’elu onye ọbụla nke nkụme nke a ga-adakwasị, ọ ga-egweri ya ịbụ uzuzu.

55 Na ya mere mgbe Onye-nwe nke ubi vine ga-abịa ọ ga-ebibi ndị ajọọ mmadụ ahụ na-abaghị uru, ga-enyepụ kwa ubi vine ya ọzọ n’aka ndị ọrụ ubi ọzọ, ọbụna n’ụbọchị nile ndị ikpe-azụ, ndị ga-enyeghachi ya mkpụrụ nile n’oge ha nile.

56 Na mgbe ahụ ka ha ghọtara akụkọ ilu ahụ nke o kwuru nye ha, na a ga-ebibi kwa ndị Jentaịlu, mgbe Onye-nwe ga-arịdata site n’elu-igwe ịchị eze n’ime ubi vine ya, nke bụ ụwa na ndị nile bi n’ime ya.