Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
NAJS, Matiu 3


NAJS, Matiu 3:24–26 (tụlee ihe dị iche na Matiu 2:23)

(Oge okorọbịa na nwanta Jisus ka a kọwara nke ọma.)

24 Na o wee ruo na Jisus na ndị ụmụnne ya itolitere, o wee dịwanye kwa ike, na chere Onye-nwe maka oge nke ije-ozị ya ịbịa.

25 O wee fee kwa ofufe n’okpuru nna ya, o kwughị kwa okwu dịka ndị mmadụ ọzọ, ma-ọbụghị kwa na e nwere ike ịkụziri ya ihe; n’ihi na o nweghị mkpa nke mmadụ ọbụla ịkụziri ya ihe.

26 Na mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, oge awa ahụ nke ịgbasa ozi-ọma ya bịara nso.

NAJS, Matiu 3:43–46 (tụlee ihe dị iche na Matiu 3:15–17)

(Jisus ka Jọn mere baptism site na imikpu ya n’ime mmiri.)

43 Na Jisus zara, sị ya, kwere m ka i mee m baptism, n’ihi si otua ka o kwesịrị ekwesị anyị imezu ezi-omume nile. Mgbe ahụ o wee kwere ya.

44 Na Jọn wee gbada n’ime mmiri ahụ mee kwa ya baptism.

45 Na Jisus mgbe e mere ya baptism ọ rịgopụta ngwa ngwa site n’ime mmiri ahụ; na Jọn wee hụ, na lee, e meghere elu-igwe nile nye ya, o wee hụ kwa Mụọ nke Chineke ka ọ na-arịdata dịka nduru na-adakwasị kwa n’elu Jisus.

46 Na lee, o wee nụ olu-okwu sitere n’elu-igwe, na-asị, Nke a bụ Ọkpara m Hụrụ n’Anya, onye ihe ya dị m ezi mma. Nụrụ nụ ya.