Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
NAJS, Matiu 9


NAJS, Matiu 9:18–21 (Nke a bụ ihe odide nke Onye-amụma Joseph Smith weghachiri, e tinyere n’agbata Matiu 9:15 na Matiu 9:16)

(Jisus jụrụ baptism nke ndị Farisi; ọ bụ ya nyere iwu nke Moses.)

18 Mgbe ahụ ndị Farisi wee sị ya, Gịnị mere i gaghị anabata anyị na baptism nke anyị, ebe anyị na edebe iwu dum?

19 Kama Jisus wee sị ha, unu edebeghị iwu. Ọbụrụ na unu debeworo iwu, unu gaara anabata m, n’ihi na a bụ m ya onye nyere iwu ahụ.

20 Anabataghị m unu na baptism unu, n’ihi na ọdịghị uru ọ ga-abara unu.

21 N’ihi na mgbe nke ahụ dị ọhụrụ na-abịa, nke ọchie adịwo na njikere ka iwezuga ya.